Akwụkwọ nsọ
Ita 5


Isi 5

Ndị aka-ebe atọ na ọrụ ahụ nʼonwe ya ga eguzoro dịka ịgba-ama nke ezi-okwu nke Akwụkwọ nke Mọmọn.

1 Ma ugbua mụ, Moronaị, edewo okwu nile nke enyere m nʼiwu, dịka m siri cheta; ma agwawo m unu ihe ndị nke m arachiworo; ya mere emetula ha aka ka unu wee sụgharịa-asụsụ; n’ihi na ihe ahụ egbochiri unu ime ya, ma ọbụghị mgbe oge ahụ ruru ọ ga-abụ amamihe nʼime Chineke.

2 Ma lee, unu ga-enwe ohere ka unu wee gosị epekele nile ahụ nye andị nke ga-enye aka iwepụta ọrụ nke a;

3 Ma ammadụ atọ ka a ga-egosị ya site nʼike nke Chineke; ya mere ha ga bamata nʼezi-okwu na ihe ndị a bụ cezi-okwu.

4 Ma nʼọnụ nke andị aka-ebe atọ ka a ga ehiwe ihe ndị a; ma ịgba-ama nke mmadụ atọ, na ọrụ nke a, nʼime nke a ga-egosịpụta ike nke Chineke na kwa okwu ya, ndị nke Nna ahụ, na Ọkpara ahụ, na Mụọ Nsọ gbara ama maka ha—ma ihe ndị a nile ga eguzo dịka ịgba-ama megide ụwa nʼụbọchị ikpe-azụ.

5 Ma ọbụrụ na ha chegharịa ma abịakwute Nna ahụ nʼaha nke Jisus, a ga-anabata ha nʼime ala-eze nke Chineke.

6 Ma ugbua, ọbụrụ na enweghị m ikike maka ihe ndị a, kpee nụ, n’ihi na unu ga-amata na enwere m ikike mgbe unu ga-ahụ m, ma anyị ga-eguzo nʼiru Chineke nʼụbọchị ikpe-azụ. Amen.