Ọgbakọ Zuru ọha
Ndị na-eso Onyeisi Udo
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Ndị na-eso Onyeisi Udo

Dịka anyị na-agba mbọ iwulite ágwá ndị dịka nke Onye Nzọpụta, anyị nwere ike ịghọ ngwa ọrụ niile nke udo Ya nime ụwa.

Iji mezuo amụma ahụ e buuru nye Zakaraya,1 Jizọs nọkwasịrị na ịnyịnya ibu wee banye n’obodo nsọ ahụ nke ọma, nke e weere na agụmagụ dịka “ọdịmara oge ochie nke ọchịchị eze ndị Juu,”2 dịka okwesịrị Eze nke ndị eze na Onyeisi Udo n’ezie.3 Ndị na-eso ụzọ nwere ọńụ gbara Ya gburugburu gbasara uwa ha, igu nkwụ niile, na akwụkwọ ndụ ndị ọzọ na ụzọ ahụ Jizọs gafere. Ha toro Chineke, were oke olu na-ekwu, “Ngọzi diri Eze nke na-abịa n’aha nke Onyenwe anyị: udo dị n’eluigwe, na ebube kachasị elu.”4 Ma ọzọkwa, “Hosana dịrị Nwa nke Devid: Ngọzị dịịrị onye ahụ n’abịa n’aha Onyenwe anyị; Hosana kachasị elu”5 Ihe omume a dị ebube, nke anyị na-eme n’ụbọchị nke a amaara dịka Sọnde Igu nkwụ, bụ ihe mmalite nke ọńụ maka ihe omume jọgburu onwe ya nke ga-eme n’izu ahụ akaraka nke na-ejedebe na ịchụ aja onwe nke Onye Nzọpụta na-echeghị maka onwe na ọrụ ebube mafere mma oke nke ili tọgbọrọ chakoo.

Dịka ndị na-eso ụzọ Ya, anyị bụ ndị Ya pụrụ iche, ndị a kpọrọ ikwusa omume ọma Ya niile,6 ndị nkwalite nke udo nke agbasara aka nye site n’aka Ya na aja mgbaghara mmehie Ya. Udo a bụ onyinye ekwere na nkwa nye ndị niile tụgharịrị obi ha n’ebe Onye Nzọpụta nọ wee bie ndụ ezi omume; udo dị otu ahụ na-enye anyị ume inwe ọńụ na ndụ apụrụ ịnwụ anwụ ma na-enyere anyị aka ịnagide ọnwụnwa niile na-egbu mgbu nke njem anyị .

N’afọ 1847, Onyenwe anyị nyere Ndị nsọ na-asụ ụzọ nkuzi, bụ ndị chọrọ udo ka ha nọrọ jụụ ma dịrị n’otu dị ka ha na-ezute ihe isi ike na-atughị anya ha na njem ịgawa ọdịda anyanwụ ha. Tinyere ihe ndị ọzọ, Onyenwe anyị gwara ndị-nsọ ka ha “kwụsị esemokwu onye n’ibe ya; kwụsị ikwu okwu ọjọọ onye gbasara ibe ya.”7 Akwụkwọ-nsọ niile na-ekwusi ike na ndị na-arụ ọrụ nke ezi omume ma na-agbalisi ike na-eje ije nụdị nwayọ nke Mmụọ nke Onyenwe anyị ka ekwere nkwa udo ha chọrọ iji nyaa ndụ ụbọchị niile nke ọgbaghara nke anyị bi nime ya taa.8

Dịka ndị na-eso ụzọ nke Onyeisi Udo, a kuziworo anyị ka anyị ibi ndụ jiri “obi niile ejikọtara ọnụ na-ịdị n’otu na n’ịhụnanya n’ebe ibe anyị nọ.”9 Onye amụma anyị hụrụ n’anya, Onyeisi Russell M. Nelson, na oge adịghị anya kwuru, “Esemokwu megidere ihe niile Onye Nzọpụta guzooro maka ya ma kuzie.”10 Onye amụma anyị rịọkwara ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji kwụsị esemokwu onwe anyị nke na-ere ọkụ nime obi anyị na nime ndụ anyị ugbu a.”11

Ka anyị tulee ụkpụrụ niile ndị a n’ihi ịhụnanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ nwere n’ebe anyị nọ ka anyị, dịka ndị na-eso Ya, na-achọ inwe maka onye na ibe ya. Akwụkwọ nsọ niile na-akọwa ụdị ịhụnanya nke a dịka afọ ọma.12 Mgbe anyị na-eche maka afọ ọma, uche anyị na-agbakarị na n’imesapụ aka na onyinye niile iji belata nhụjuanya nke ndị ahụ na-enwe ihe isi ike anụ ahụ, nke akụrụngwa, mọbụ mmetụta uche. N’agbanyeghị, afọ ọma abụghị nanị nke gbasara ihe anyị na-enye mmadụ, kama ọ bụ ágwá nke Onye Nzọpụta ma nwere ike ịghọ akụkụ nke ágwá anyị. Ọ bụghị ihe ịtụnaanya na Onyenwe anyị gwara anyị ka anyị yikwasị onwe anyị “nkwekọrịta nke afọ ọma, … “nke bụ nkwekọrịta nke ozuzu oke na udo.”13 Ewezuga afọ ọma, anyị abụghị ihe ọbụla14 ma anyị enweghị ike iketa ebe Onyenwe anyị kwadowooro anyị n’ọmarịcha ebe obibi nke Nna anyị nke Eluigwe.15

Jizọs gosipụtara n’ụzọ zuru oke ihe inwe nkwekọrịta nke izu oke na udo pụtara, karịsịa mgbe a na-ezute ihe omume ndị dị egwu nke butere ogbugbu Ya niihi okwukwe ụzọ. Chegodị echiche obere oge otu obi dị Jizọs mgbe O ji obi umeala saacha ụkwụ ndị na-eso ụzọ Ya, ebe ọma na otu nime ha ga-arara Ya nye n’abalị ahụ.16 Mọbụ mgbe Jizọs, mgbe awa ole na ole gachara, jiri obi ebere gwọọ ntị nke otu nime ndị ikom ahụ sooro Judas, onye raara Ya nye, ijide Ya.17 Mọbụ ọbụna mgbe Onye Nzọpụta ahụ, guzoro n’ihu Pilate, ebe ndịisi nchụaja na ndị okenye boro Ya ebubo ụgha, ma okwughị kwa okwu ọbụla megide ebubo ụgha niile nke eboro Ya, ma O wee hapụ onyeisi Rom n’inwe ịtụnaanya.18

Site na ihe omume atọ ndị a jọgburu onwe ha, Onye Nzọpụta, na-agbanyeghị oke obi ọjọọ na nchekasị o nwere, kuziiri anyị ihe site na ọmụmaatụ Ya na “afọ ọma na-ata ahụhụ ogologo oge, ma na-adịkwa obiọma; … ọ dịghị ekworo onwe ya ekworo; … ọ dịghị anya isi n’onwe ya, ọ dịghị afụli elu, ọ dịghị eme onwe ya ihe n’adịghị mma, ọ dịghị achọ kwa nke ya, ọ dịghị ewe iwe ngwa ngwa, [ma] ọ dịghị eche kwa ihe ọjọ.”19

Akụkụ ọzọ dị mkpa a ga-ekwusi ike, na nke nwere mmetụta kpọmkwem na anyị ị bụ ndị na-eso ụzọ na otu anyị si akwalite udo nke Onye Nzọpụta, bụ ụzọ anyị si emeso ndị ọzọ. N’oge mgbasa ozi Ya n’elu ụwa, nkuzi niile nke Onye Nzọpụta lekwasịrị anya—ọ bụghị nanị, mana okachasị—na omume ọma niile nke ịhụnanya, afọ ọma, ndidi, ịdị umeala n’obi, na ọmịiko—agwa ndị bụ isi nye ndị chọrọ ịbịaru Ya nso ma kwalite udo Ya. Agwa ndị dị otu ahụ bụ onyinye ndị sitere n’aka Chineke, ma ka anyị na-agbalisi ike iwulite ha, anyị ga-amalite ịhụ ndịiche niile na adịghị ike niile nke ndị agbata obi anyị na-enwe mmetụta ọmịiko, nghọta, nkwanye ugwu, na nnakwere karịa. Otu nime ihe iriba ama kachasị pụta ihe na anyị na-abịarute Onye Nzọpụta nso ma na adịwanye ka Ya bụ ụzọ dị ịhụnanya, nwere ndidi, na obiọma nke anyị si emeso mmadụ ibe anyị omume, na-agbanyeghị ọnọdụ anyị niile.

Anyị na-ahụkarị ndị mmadụ na-etinye aka niihe na-adịghị mma ma ọbụna okwu mkparị banyere ihe ahụtara dịka ejiri mara niile, adịghị ike niile, na echiche nke ndị ọzọ, tụmadi mgbe ejiri mara ndị ahụ na echiche ndị ahụ dị iche mọbụ megidere otu ha si eme ihe na eche echiche. Ọ bụ ihe a na-ahụkarị ịhụ ndị a na-agwa ndị ọzọ okwu ndị dị otu ahụ, ndị na-ekwugharị ihe ha nụrụ na-amaghị n’ezie ọnọdụ niile gbara ọnọdụ ndị gbara ọnọdụ ahụ gburugburu. N’ụzọ dị mwute, soshal midịa na-akwado ụdị omume nke a n’aha ihe yiri eziokwu na nghọta. Na-enweghị mgbochi, mkparịta ụka digital na-edubakarị ndị mmadụ na mbuso agha nkeonwe na esemokwu kpụ ọkụ n’ọnụ, na-ebute ndakpọ olileanya, na-agbawa obi, ma na-agbasa iro na-ere ọkụ.

Nifaị buru amụma na nụbọchị ikpeazụ niile, onye iro ga-ewe iwe ma kpalite ndị mmadụ iwe megide ihe dị mma.20 Akwụkwọ nsọ niile na-akuzi na “ihe ọbụla nke na-akpọku ma na-eto akpịrị ime ihe ọma, na ịhụ Chineke nʼanya, na ijere ya ozi, bụ nke mmụọ nke Chineke kwalitere.”21 N’akụkụ nke ọzọ, “ihe ahụ nke dị njọ na-esi nʼaka ekwensu wee bịa; n’ihi na ekwensu bụ onye-iro nke Chineke, ma na-ebu agha megide ya esepụghị-aka, ma na-akpọku ma na-eto akpịrị ime mmehie, na ime ihe ahụ nke dị njọ esepụghị-aka.”22

N’ịtụle nkuzi amụma nke a, ọ bụghị ihe ijuanya na otu nime ụzọ aghụghọ nke onye mmegide ahụ bụ ịkpali iro na ịkpọasị nime obi ụmụ Chineke. Obi na adị ya ụtọ ma ọ hụ ndị mmadụ na-akatọ, na-akwa emo, ma na-ekwutọkwa otu onye na ibe ya. Omume a nwere ike imebi agwa nke mmadụ, aha ọma ya, na úgwú onwe, ọkachasị mgbe e kpere ya ikpe na-ezighị ezi. Ọ dị oke mkpa ikwupụta na mgbe anyị nyere ụdị omume nke a ohere nime ndụ anyị, anyị na-enye ohere nime obi anyị maka onye iro ịkụ mkpụrụ nke esemokwu n’etiti anyị, na-etinye ihe ize ndụ ịdaba n’ọnya ya dị anya ukwu.

Ọ bụrụ na anyị akpachapụghị anya na echiche anyị niile, okwu anyị niile, na omume anyị niile, anyị nwere ike imecha bụrụ ndị aghụghọ niile nke onye iro, na-emebi mmekọrịta niile anyị na ndị gbara anyị gburugburu na ndị niile anyị hụrụ nanya.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, dịka ndị nke Onyenwe anyị pụrụ iche na ndị nkwalite nke udo Ya, anyị ekwesịghị ikwe ka aghụghọ niile nke ekwensu were ọnọdụ nime obi anyị niile. Anyị enweghị ike iburu ibu ọjọọ nke a na emebi mmetụta niile, mmekọrịta niile, ma ọbụna ndụ niile. Ozi ọma ahụ na-egosi ihe obi-ụtọ niile nke oke ọn̄ụ.

N’ezie, ọdịghị onye zuru oke nime anyị, ma nke doro anya bụ na e nwere oge mgbe a na-aghọgbu anyị ịbanye n’ụdị omume a. N’ịhụnanya Ya na-enweghị ntụpọ na ọmụma ihe nke gbasara omume nke anyị jiri bụrụ mmadụ, Onye Nzọpụta na-agbalị mgbe niile ịdọ anyị aka na ntị maka ihe egwu ndị dị otu ahụ. Ọ kuziri anyị, “N’ihi na ihe ọbụla unu jiri kpee ikpe, ka a ga-eji kpee kwa unu; ma ihe ọbụla unu jiri tụọ, ka a ga-eji tụọrọ unu ọzọ.”23

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ n’anya, dịka anyị na-agba mbọ iwulite ágwá ndị dịka nke Onye Nzọpụta, anyị nwere ike ịghọ ngwa ọrụ Ya nke udo nime ụwa dịka otu ụkpụrụ ahụ nke Ya onwe Ya hiwegoro. Ana m akpọku unu itụle ụzọ niile anyị nwere ike iji gbanwee onwe anyị na ịbụrụ ndị na-ebuli ma na-akwado ndị mmadụ, ndị nke nwere nghọta na obi mgbaghara, ndị na-achọ ihe kachasị mma nime ndị ọzọ, na-echeta mgbe niile na “ọ bụrụ na onwere ihe ọbụla bụ ezigbo omume, dị ịhụnanya, mọbụ e kwuru nke ọma mọbụ kwesịrị ọjịja mma, anyị na-achuso ihe ndị a niile.”24

Ana m ekwe unu nkwa na dịka anyị na-achụso ma na-ewulite ejiri mara ndị a, anyị ga na-enwekwu obi ụtọ karịrị akarị ma na-elebara mkpa ndị mmadụ ibe anyị anya25 ma ga-enweta ọńụ, udo, na uto nke ime mmụọ.26 Na-enweghị obi abụọ, Onyenwe anyị ga-amata mbọ niile anyị na-agba ma nye anyị onyinye ndị anyị chọrọ iji na-enwe nnakwere na ndidi ndịiche niile, maka adịghị ike niile, na-ezughị oke niile nke onye na ibe ya. Ọzọkwa, anyị ga-enwe ike karịa ịgbanarị ọchịchọ nke iwe iwe mọbụ iweso ndị mejọrọ anyị iwe. Ọchịchọ anyị ịgbaghara, dịka Onye Nzọpụta mere, ndị ahụ na-emejọ anyị mọbụ na-ekwu ihe ọjọọ gbasara anyị ga-aba ụba n’ezie ma ghọọ akụkụ nke agwa anyị.

Ka anyị taa, n’ụbọchị Sọnde nke Igu nkwụ nke a, gbasaa uwe mwụda nke ịhụnanya anyị na igu nkwụ nke afọ ọma, na-eje ije na nzọụkwụ niile nke Onyeisi Udo dịka anyị na-akwado ime mmemme, na Sọnde a na-abịa abịa, ọrụ ebube nke ili dị chakoo. Dịka ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị nime Kraịst, ka anyị jiri ọńụ kwusaa, “Hosana nye Nwa nke Devid: Ngọzị dịịrị onye ahụ n’abịa n’aha Ọnyenwe anyị; Hosana n’elu kachasị elu”27

Ana m agba-ama na Jizọs Kraịst dị ndụ nakwa na ịhụnanya Ya na-enweghị ntụpọ, nke egosipụtara site na aja mgbapụta Ya, ka a na-ekesaara ndị niile chọrọ iso Ya na-eje ije na inwe ańụrị udo Ya n’ụwa nke a na n’ụwa nke na-abịa abịa. Ana m ekwu ihe ndịa n’aha dị nsọ nke Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta, Jizọs Kraịst, amen.