Ọgbakọ Zuru ọha
Ịtụkwasị Ozizi nke Kraịst obi
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Ịtụkwasị Ozizi nke Kraịst obi

Mgbe anyị wuworo ebe obibi anyị niile na ntọala nke mmekọrịta ịgba ndụ anyị na Kraịst, anyị na-atụkwasị obi n’ozizi nke Kraịst.

Na nghọta nke uche m, ana m ahụ onye amụma Nefi na-aka nka na deski ya, epekele niile nke ọlaedo gbasasịrị nihu ya, stylus ya n’aka.

Nefi nọ n’usoro nke imesị nkanye ikpeazụ ya n’ime ndekọihe ahụ. O dere, “Ma ugbua, ụmụnne m nwoke ndị m hụrụ n’anya, a bịawo m na ngwụcha okwu m niile.”1 Mana n’oge na-adịghị anya, Mmụọ ahụ gbara Nefi ume ịlaghachi na ndekọihe ya ma dee ozi mmechi. N’okpuru mmetụta dị ike nke Mmụọ Nsọ, oke onye amụma ahụ weere stylus ya ọzọ n’aka ma dee, “Ya mere, ihe ndị m deworo zuuru m, ewezuga ma ọ bụ mkpuru okwu ole ma ole … aga m ekwurịrị banyere ozizi nke Kraịst.”2

Ụdị obi ekele anyị nwere maka “mkpụrụ okwu mole ma ole” ndị ahụ3 na maka Mmụọ ahụ na-akwanye Nefi ide ha. Ndezi nke Nefi maka ozizi nke Kraịst bụ akụ nye ndị ahụ ndị na-eri oriri n’elu ya. O nwere nime ya ọhụ baptizim nke Onye Nzọpụta4 na olu nke Ọkpara ahụ, na-akpọku ndị niile isoro Ya5 ma “mee ihe niile nke [anyị] hụworo [O] mere.”6 O nwere n’ime ya aka ebe nke Nefi na ndị ahụ ndị, site n’okwukwe n’ime Kraịst, n’ezie chegharịa site na mmehie ha ma soro Onye Nzọpụta banye n’ime mmiri niile nke baptizim “ga-anata Mmụọ Nsọ; ee, baptizim nke ọkụ na nke Mmụọ Nsọ.”7 Anyị na-anụkwa olu nke Nna na-agba ama: “Ee, okwu niile nke Onye m Hụrụ N’anya bụ eziokwu ma kwesị ntụkwasị obi. Onye ọbụla nke na-anagide ruo ọgwụgwụ, onye ahụkwa ka a ga-azọpụta.”8

Onyeisi Russell M. Nelson kwusiri ike otu ịdị mkpa nke ozizi nke Kraịst dị n’oge ikwu okwu nye ndị ndu mishọn akpọrọ ọhụrụ: “Karịa ihe ọbụla ọzọ, anyị na-achọ ndị mgbasa ozi ọma anyị … inwe ozizi nke Kraịst akanyere n’ime obi ha—gbaa mgbọrọgwụ … n’ime ụmị ọkpụkpụ ha.”9

Kwusaa Ozi ọma M na-achịkọta ihe ise dị mkpa nke ozizi nke Kraịst. Ọ na-asị, “[Anyị] na-akpọku ndị ọzọ ịbịakwute Kraịst site n’inyere ha aka nata ozi ọma eweghachitere site n’okwukwe n’ime Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, nchegharị, baptizim, ịnata onyinye nke Mmụọ Nsọ, na ịnagide ruo ọgwụgwụ.”10

Mana ịdị mkpa nke ozizi nke Kraịst abụghị nnọọ naanị maka ndị mgbasa ozi ọma! Ma ọ dịkarịrị omimi karịa nnọọ nchịkọta nkwugharị okwu nke ihe ya ise dị mkpa. Ọ na-emetụta iwu nke ozi ọma. Ọ bụ nnukwu atụmatụ maka ndụ ebighị ebi.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ọ bụrụ na anyị ga-anabata ọkpụkpọ oku nke Onyeisi Nelson inwe ozizi nke Kraịst n’ime ụmị ọkpụkpụ anyị, anyị garịrị eme ka mgbanwe anyị nye Onyenwe anyị mie emie site n’ọmụmụ ihe, ekpere, ibi ndụ ntụkwasị obi, na nchegharị na-aganiihu. Anyị garịrị akpọku Mmụọ Nsọ ịkanye ozizi nke Kraịst na “uru ahụ niile nke obi [anyị]”11 dị ka imi emi ma dị ka ịdịgide adịgide dị ka akanyere ya site n’aka Nefi n’elu epekele niile nke ọla edo.

Na Ọktoba nke ikpeazụ a, Onyeisi Nelson jụrụ ajụjụ sị, “Gịnị ka ọ pụtara imeri ụwa?” Netiti ihe ndị ọzọ, o kwuru sị, “Ọ pụtara ịtụkwasị obi na ozizi nke Kraịst karịa ihe ụmụ mmadụ na-eche.”12

Mkpụrụ okwu ahụ ntụkwasị obi ka a kọwara dị ka “ndabere kwenyesiri ike n’agwa, ike, ume, ma ọ bụ eziokwu nke otu onye ma ọ bụ nke otu ihe.”13 Otu onye ahụ bụ Jizọs Kraịst, ma otu ihe ahụ bụ ozizi Ya.

Ya mere kedu otu ịmara ama atụkwasị obi n’ozizi nke Kraịst si agbanwe ụzọ anyị si ebi ndụ anyị?

Ọ bụrụ ma anyị tụkwasị obi n’ozizi nke Kraịst, anyị ga-atụkwasị Kraịst obi nke ọma iji bie ndụ site n’okwu Ya niile.14 Anyị ga-amụ ihe ọmụmụ nke Jizọs Kraịst ogologo ndụ,15 ije ozi Ya, nkuzi Ya niile, na Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ọgwụgwụ, tinyekọta Mbilite n’ọnwụ Ya dị ebube. Anyị ga-amụ nkwa Ya niile na ọnọdụ niile esi enye nkwa ndị ahụ.16 Dị ka anyị na-amụ ihe, anyị ga-ejuputa na nnukwu ịhụnaanya nye Onyenwe anyị.

Ọ bụrụ ma anyị tụkwasị obi n’ozizi nke Kraịst, anyị ga-abịarute Nna nke Eluigwe ụbọchi ọbụla n’ekpere nzuzo dị umeala n’obi ebe anyị ga-enwe ike kwuputa obi ekele maka onyinye nke Ọkpara Ya na maka ngọzi anyị niile dum.17 Anyị pụrụ ikpe ekpere maka nsiso nke mkpughe nke Mmụọ Nsọ,18 kpee ekpere ijikọta uche anyị na uche Ya,19 kpee ekpere iji tulee n’elu ọgbụgba ndụ anyị ma megharịa ọhụrụ mkpebi anyị idebe ha.20 Anyị nwere ike ikpe ekpere iji kwadoo ma gosipụta ịhụnaanya anyị nye ndị amụma anyị, ndị ọhụụ, na ndị mkpughe;21 kpee ekpere maka ike nke nsacha nke mgbaghara;22 ma kpee ekpere maka ike iji guzogide ọnwụnwa.23 Ana m akpọku unu ime ka ekpere bụrụ ihe dị mkpa nime ndụ gị, na-achọ ụbọchi ọbụla iji melite nzikọrịta ozi gị na Chineke.

Ọ bụrụ ma anyị tụkwasị obi n’ozizi nke Kraịst, anyị ga-edebe n’akụkụ ụmụ ihe ndị n’egbuke egbuke nke ụwa ka anyị wee nwee ike lekwasị anya na Onye Mgbapụta nke ụwa.24 Anyị ga-ebelata ma ọ bụ kpochapụ oge anyị n’egbu na midia mmekọrịta ọha; egwuregwu dijitaalụ niile; mmemme mefusị ihe, gafere oke, ma ọ bụ na-ekwesịghị ekwesị; ịdọ akpịrị nke akụ n’ụba niile na ihe efu niile nke ụwa; na ihe omume ndị ọzọ na-enye omenaala ụgha niile na nkà ihe ọmụma niile nke ụmụ mmadụ na enye nduhie. Ọ bụ naanị nime Kraịst ka anyị na-achọta eziokwu na mmejuputa na-adịgịde.

Ezi nchegharị25 ga-aghọ akụkụ na-aganiihu juputara n’ọńụ26 na ndụ anyị—ma iji nwete mgbaghara nke mmehie ma iji mee mgbanwe n’oyiyi nke Kraịst.27 Nchegharị nwere okwukwe n’ime Kraịst na-enye anyị ohere ruo Aja mgbaghara mmehie nke Kraịst. Onyeisi Dallin H. Oaks akuziwo na mgbe Onye Nzọpụta na-agbaghara, Ọ “na-eme karịa ịsachapụ [anyị] site na mmehie. Ọ na-enyekwa [anyị] ume ọhụrụ.”28 Onye ọbụla n’ime anyị nwere mkpa ume nke a iji debe iwu nsọ niile nke Chineke na iji mejuputa nzube ebighị ebi nke ndụ anyị.

N’ime Jizọs na n’ime ozizi Ya, anyị na-achọta ume. Ọ sịrị, “N’ezie, n’ezie, asị m unu, na nke a bụ ozizi m, ma onye ọbụla wukwasịrị ụlọ n’elu nke a wukwasịrị n’elu nkume m, ma ọnụ ụzọ ama niile nke ala mmụọ agaghị emeri ha.”29

Anyị na-ahụta nkwa a ka emejuputara ya n’ime ndụ nke ndị niile kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụ ihe gafetụrụ otu afọ nke m nwetere ohere iji zute Travis na Kacie. Ha alụwo n’usoro iwu obodo n’afọ 2007. N’oge ahụ, travis abụghị onye otu Nzukọ nsọ. Kacie, na-agbanyeghị na-azụlitere ya n’ezi na ụlọ Ndị nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a kwesịrị ntụkwasị obi, adapụwo site n’okwukwe ya mgbe ọ dị afọ iri na ụma ma esitewo na ntọala ya kpafuo.

N’afọ 2018, Travis zutere ndị mgbasa ozi ọma, ma e mere ya baptizim n’afọ 2019. Travis bịara bụrụ onye mgbasa ozi ọma nye Kacie, onye nwetekwara nhumiihe ntọgharị na-agbanwe ndụ. A rachiri ha n’ime tempụl na Septemba 2020. Ihe dị ka afọ abụọ baptizim ya gasịrị, akpọrọ Travis ije ozi n’ime otu bishọp.

Travis nwere ọrịa na-adịghị ahụkebe nke na-aganiihu na-akpụ tumọ niile nime ọgan niile dị na ahụ. O mewo ọtụtụ ịwa ahụ iji wepụ tumọ ndị na-apụtagharị, kama ọrịa ahụ enweghị ọgwụgwọ. Ọtụtụ afọ gara aga, enyere Travis ihe na-erughị afọ 10 ibi ndụ.

Kacie nwere retinitis pigmentosa, ọrịa mkpụrụ ndụ ihe nketa na-adịghị ahụkebe nke na-akpata mbelata na-enweghị ntụgharị ’nụzọ esi ahụ ụzọ tutu ruo ikpu isi kpamkpam amalite.

Kacie gwara m okwu maka ọdịniihu ya. Ọ tụrụ anya oge ahụ, na-adịghị anya, mgbe ọ ga-abụ nwanyị isi mkpe, kpuo isi, na-enweghị nkwado maka ego, ma nọrọ naanị ya izulite ụmụ ha anọ na-eto eto. A jụrụ m Kacie otu ọ ga-esi ejikwali ọdịnihu nke a gbara njọ. Ọ turu ọnụ ọchị n’udo ma kwuo sị, “Ọ dịbeghị mgbe m nwere obi ụtọ ma ọ bụ nwee olileanya karịa n’ime ndụ m. Anyị dabeere na nkwa niile anyị natara n’ime tempụl.”

Travis ugbu a bụ bishọp. Ọnwa abụọ gara aga o mere nnukwu ịwa ahụ ọzọ. Mana o nwere nchekwube na udo. Ịhụ ụzọ nke Kacie adịkwuwo njọ. Ugbu a o nwere ihe na-edu ya ma o nweghịkwa ike ịnya ụgbọala. Mana o nwere afọ ojuju, na-azụlite ụmụ ya ma n’eje ozi dị ka onye ndụmọdụ nime otu ndịisi Ndịinyom Nta.

Travis na Kacie na-ewu ebe obibi ha n’elu nkume. Travis na Kacie tụkwasịrị obi n’ozizi nke Kraịst na nkwa ahụ na Chineke “ga-enyefechasị mkpagbu [ha] maka uru [ha].”30 N’ime atụmatụ nke Chineke zuru oke, ntaram ahụhụ na okwukwe n’ime Kraịst ka ejikọtara na ịdị ntozu oke anyị n’ime Kraịst.31 Dị ka nwoke amamiihe ahụ dị n’ime nkọnilu onye wuru ụlọ ya n’elu nkume,32 mgbe mmiri ozuzo gbadatara, ma iju mmiri abịa, ma ufufe mmiri efee, ma dakwasị n’ụlọ Travis na Kacie na-ewu, ọ gaghị ada, n’ihi na edebere ya n’elu nkume.33

Jizọs ekwughị maka ikwe omume nke mmiri ozuzo na iju mmiri na ufufe mmiri n’ime ndụ anyị; O kwuru maka eziokwu na oké ifufe ga-amalite. Mgbanwe dị n’ime nkọnilu nke a abụghị ma oké ifufe ga-abịa kama otu anyị si zaghachi nye ọkpụkpọ oku Ya dị ịhụnaanya ma na-ịnụ ma na-ime ihe Ọ kuziworo.34 Enweghị ụzọ ọzọ eji a lanarị.

Mgbe anyị wuworo ebe obibi anyị niile na ntọala nke mmekọrịta ịgba ndụ anyị na Kraịst, anyị na atụkwasị obi n’ozizi nke Kraịst ma dị ka anyị na abịakwute Ya, anyị na-enwe nkwa Ya nke ndụ ebighị ebi. Ndị mmadụ tụkwasịrị obi na Kraịst na-aganiihu na nguzosike nime Kraịst ma nagide ruo ọgwụgwụ. Enweghị ụzọ ọzọ esi a zọpụta nime alaeze nke eluigwe.35

Ana m agba m aka ebe nke onwe m maka ịdị ndụ eziokwu nke Jizọs Kraịst bilitere n’ọnwụ. Ana m agba ama na Chineke Nna anyị n’ezie hụrụ ụwa naanya O zitere Ọkpara Ya ịgbapụta anyị site na mmehie36 ma gwọọ anyị site na mwute.37 Ana ma agba ama na Ọ kpọwo onye amụma nke Chineke n’oge anyị, ọbụna Onyeisi Russell M. Nelson, onye site na ya Ọ na-agwa anyị okwu ma na-edu anyị.

Jiri obi m niile, ana m akpọku unu ịtụkwasị obi n’ozizi nke Kraịst ma wulite ndụ unu niile n’elu nkume nke Onye Mgbapụta. Ọ nweghị ike ichefu gị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen