Ọgbakọ Zuru ọha
A Gbagharawo M N’ezie?
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


A Gbagharawo M N’ezie?

Nkwa nke mgbaghara zuru ezu ma zuo oke ka a na-emere onye niile—n’ime ma site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na-enweghị ọgwụgwụ.

Ọtụtụ afọ gara aga, Nwanne nwanyị Nattress na m kwagara Idaho, ebe anyị mepere azụmahia ọhụrụ. E nwererịị ogologo ụbọchi na abalị niile n’ụlọ ọrụ. N’ekele, anyị biiri ebe ụlọ ole ma ole dị site n’ebe ụlọ ọrụ. Izu ụka ọbụla, Shawna na ụmụada anyị atọ—ha niile erubeghị afọ isii—ga-abịa n’ụlọ ọrụ irikọta nri ehihie ọnụ.

N’otu ụdị ụbọchi ahụ mgbe nri ehihie ezi na ụlọ anyị gasịrị, achọpụtara m na nwaada anyị gbara afọ ise, Michelle, debeere m ozi nke onwe, e dere na Nootu postuo-ya ma tapanye ya na ekwe ntị ụlọ ọrụ m.

Ọ na-agụ naanị, “Nna, cheta ịhụ m naanya. Ịhụnaanya, Michelle.” Nke a bụụrụ ihe ncheta dị ike nye nna na-eto eto banyere ihe ndị ahụ kachasị dị mkpa.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ana m agba ama na Nna anyị nke Eluigwe na-echeta anyị mgbe niile ma na Ọ hụrụ anyị naanya n’ụzọ zuru oke. Ajụjụ m bụ nke a: Anyị ọ na-echeta Ya? Ma anyị ọ hụrụ Ya naanya?

Ọtụtụ afọ gara aga, e jere m ozi dị ka onye ndu Nzukọ nsọ n’obodo. Otu n’ime ndịikom nta anyị, Danny, dịịrị ezi mma pụrụ iche n’ụzọ ọbụla. O nwere nrube isi, dị obi ọma, dị mma, ma nwee nnukwu obi. Kosiladị, mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ site n’ụlọakwụkwọ dị elu, ọ malitere ịkpa ya na ìgwè mmadụ na-eme ike ike. O tinyere aka n’ọgwụ, methamphetamine kpọmkwem, ma gbadaa ala na mkpọda na-achị achị nke mmara ahụ na mbibi. N’eteghị aka, ọdịdị ya gbanwere kpamkpam. Ọ rara ahụ ịmata ya. Mgbanwe kachasị pụta ihé bụ n’ime anya ya—ihek dị n’ime anya ya ebelataworịị. Ọtụtụ mgbe akpọtụụrụ m ya, mana ọ baghị uru. O nweghị mmasị.

O siri ezigbo ike ịhụta nwaokoroọbịa nke a dị ịtụnanya ịta ahụhụ ma bie ndụ na-abụghị ya! O nwere ike ime ihe ndị ọzọ dị ukwuu.

Emesịa otu ụbọchi, ọrụ ebube ya malitere.

Ọ gara nzukọ oriri nsọ ebe nwanne ya nwoke nke nta gbara ama ya tupu ịpụ gaa mishọn. N’oge nzukọ ahụ, Danny nwetere mmetụta ihe ọ na-enwetụbeghị ogologo oge. O nwetere mmetụta ịhụnaanya nke Onyenwe anyị. N’ikpeazụ o nwetere olileanya.

Na-agbanyeghị o nwere ọchịchọ ịgbanwe, o siri ike nye Danny. Mmara ahụ ya niile na ụta sonyere dịịrị ka ọ karịrị ihe o nwere ike ịnagide.

Otu ehihie kpọmkwem, mgbe m nọ n’ezi na-asụ ahịhịa, Danny nyabatara n’ụgbọala ya na-amaghị ọkwa. Ọ naara agbasị mbọ ike. Agbanwụrụ m igwe ịsụ ahịhịa, ma anyị nọdụkọtara ala ọnụ na ndò ihe ụlọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ kọrọ mmetụta niile nke obi ya. Nezie ọ chọrọ ịlọghachi. Kosiladị, ịtụgharị pụọ site na mmara ahụ ya niile na ụdị ibi ndụ ya rara ezigbo ahụ. Ịgbakwunye nke a, ọ tara onwe ya ụta nke ukwuu, ihere mere ya maka ịdapụ ebe dị anya otu a. Ọ rịọrọ, “Enwere ike ịgbaghara m n’ezie? Enwere nnọọ ụzọ iji laghachi?”

Mgbe o kwupụtasịrị obi ya na nchegbu ndị a niile, anyị gụkọtara Alma isi nke 36 ọnụ:

“Ee, echeterem njọ m na ajọọ omume m niile. …

“Ee, … echiche ahụ nnọọ nke ịbata nihu nke Chineke m jiri egwu ana a pụghị ịkọwa ji taa mkpụrụ obi m ahụhụ” (amaokwu 13-14).

Mgbe agụsịrị amaokwu ndịa ahụ, Danny kwuru sị, “Nke a bụ n’ezie otu o si emetụta m!”

Anyị garaniihu:

“Mgbe e nyere m ahụhụ site na ncheta nke ọtụtụ mmehie m, lee, echetakwara m na anụwo m rịị ka nna m na-eburu ndị ahụ amụma gbasara ọbịbịa nke otu Jizọs Kraịst, Ọkpara nke Chineke, ga-achụ aja maka mmehie niile nke ụwa. …

“Ma o, lee ọn̄ụ, ma lee ìhè ịtụnaanya m hụrụ” (amaokwu 17, 20).

Dị ka anyị gụrụ edereede ndị a, anya mmiri malitere ịwụsị. Ọńụ nke Alma bụ ọńụ nke ọ naara achọ maka ya!

Anyị kpara nkata na Alma abụworịị onye ajọọ omume pụrụ iche. Kosiladị, ozugbo ahụ o chegharịrị, ọ dịghị mgbe o lere anya n’azụ ọzọ. Ọ bịara bụrụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst jupụtara n’okwukwe. Ọ ghọrọ onye amụma! Anya Danny mepere nke ọma. Onye amụma?” ka o kwuru.

Azaghachiri m nnọọ, “Ee, onye amụma. Ọ dịghị oke nsogbu dịịrị gị!”

Anyị kpara nkata na ebe njọ ya nnile erughị ogo nke alma, otu ụdị nkwa nke mgbaghara zuru ezu ma zuo oke ka e mere nye onye niile--nime ma site na Aja mgbaghara mmehie na-enweghị nsọtụ nke Jizọs Kraịst.

Ugbua Danny aghọtawo. Ọ maara ihe o kwesịrị ime: o kwesịrị ịmalite njem ya site nịtụkwasị Onyenwe anyị obi ma gbaghara onwe ya!

Nnukwu mgbanwe obi nke Danny abụghị ihe ọbụia karịa ọrụ ebube. Ka oge na-aga, mbara ihu ya gbanwere, ma mgbuke dị n’ime anya ya lọghachiri. Ọ bịara tozuo oke tempụl! Ọ lọghachiri azụ n’ikpeazu!

Mgbe ọtụtụ ọnwa gasịrị, a jụrụ m Danny ma ọ ga-amasị ya itinye akwụkwọ ije ozi mishọn n’uju oge. Azịza ya bụ nke nkụja na nsọpụrụ na egwu.

O kwuru sị, Ọ ga-amasị m ije ozi mishọn, mana ị maara ebe m nọburịị na ihe ndị m mewororịị! Echere m na etozughị m etozu.”

Azaghachiri m, “Ị nwere ike ikwu eziokwu. Kosiladị, ọ dịghị ihe na-egbochi anyị site n’ịrịọ arịrịọ. Ọ bụrụ ma agụpụ gị, ma enweghị ihe ọzọ ị ga-ama na ikwupụtawo ezi ọchịchọ ijere Onyenwe anyị ozi.” Anya ya gbukere egbuke. Echiche nke a kplitere mmụọ ya. Nye ya nke a bụ ezigbo mbọ, mana ọ bụ ohere ọ dị njikere iwere.

Izu ole ma ole gasịrị, ma nye ịtụnaanya ya, ọrụ ebube ọzọ mere. Danny natara ọkpụkpọ oku ije ozi mishọn n’uju oge.

Ka ọnwa ole ma ole gasịrị Danny garuru ogige mishọn, enwetere oku ekwe ntị. Onyeisi ya naanị kwuru sị, “Gịnị na-eme nwata a? Ọ bụ onye mgbasa ozi ọma kachasị dị ịtụnanya nke m hụwororịị!” I huwo, onyeisi nke a anataworịị Alma nke Nta nke ụbọchị ugbua.

Mgbe afọ abụọ gasịrị, Danny lọghachiri ebe obibbi na nkwanye ugwu, ebe ọ jewooro Onyenwe anyị ozi jiri obi ya, ike, uche, na ume ya niile.

Isote repọọtụ mgbasa ozi ọma ya n’ime nzukọ oriri nsọ, alaghachiri m ebe obi, naanị ịnụta aka akụrụ n’ọnụ ụzọ ama. Lekwa ka Danny guzooro n’anya mmiri nke juputara n’anya ya. Ọ sịrị, “Anyị nwere ike ikwu okwu otu nkeji?” Anyị gara ezi n’otu ihe owuwu ụzọ mbata ahụ.

Ọ sịrị, “Onyeisi, ọ dị gị ka na-agbagharawo m n’ezie?”

Ugbua anya mmiri nke m sonyere nke ya. N’ihu m guzooro otu onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst jupụtara n’okwukwe onye nyeworo ihe ya niile n’ikuzi ihe na n’ịgba ama banyere Onye Nzọpụta. Ọ bụ nhazi nke ọgwụgwọ na ike mgbam ume nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta.

A sịrị m, “Danny! I lewo anya na ugegbe? I hụwo anya gị? Ha juputara n’ihe, ma ị na-egbuke egbuke na Mmụọ nke Onyenwe anyị. N’ezie agbagharawo gị! Ị dị ịtụnaanya! Ugbua ihe ị kwesịrị ime bụ ịganiihu na ndụ gị. Elekwala anya na-azụ! Jiri okwukwe gaaniihu ruo na emume nsọ nke sotere.”

Ọrụ ebube nke Danny na-aganiihu taa. Ọ lụrụ alụm di na nwunye nime tempụl ma laghachi ụlọakwụkwọ, ebe ọ natara nzere masta. Ọ na-aganiihu ijere Onyenwe anyị ozi na nsọpụrụ na nnukwu ugwu nime ọkpụkpọ oku ya niile. Nke ka nke, ọ bụrụwo di dị ịtụnanya na nna kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst raara onwe ya nye.

Onyeisi Russell M. Nelson kuziri, “Ewezuga Aja mgbaghara mmehie [nke Onye Nzọpụta] na-enweghị nsọtụ, ụmụ mmadụ niile gaara efucha kpamkpam.”1 Danny efughị efu, ma ọ bụghịkwa ma anyị nye Onyenwe anyị. O guzooro nọnụ ụzọ ibuli anyị elu, ịgba anyị ume, na ịgbaghara anyị. Ọ na-echetakarị ịhụ anyị naanya!

Ngosipụta ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta dị ịtụnaanya maka ụmụ Chineke ka edekọtara n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn: “Mgbe Jizọs kwuworo site otu a, ọ lepụkwara anya ya gburugburu ọzọ n’igwe mmadụ ahụ, ma hụ na ha nọ n’anya mmiri, ma lekwasịgide ya anya dị ka ha ga-arịọ ya ịnọnyekwuru ha nwa ogologo oge” (3 Nefi 17:5).

Onye Nzọpụta anọnyeworo ha rịị uju ụbọchi n’ejere ha ozi nlekọta. Otu ọ dị O nwere ihe ndị ọzọ ime—O kwesịrị ileta atụrụ Ya ndị ọzọ; O kwesịrị ịgakwuru Nna Ya.

N’agbanyeghị ọrụ ndị a, Ọ ghọtara na ndị mmadụ ahụ chọrọ ka Ya nọtụkwuo nwa obere. Emesịa, site n’obi nke Onye Nzọpụta juputara n’ọmịiko, otu n’ime ọrụ ebube kachasị elu n’agụgụala nke ụwa mere:

O nọkwuru.

Ọ gọziri ha.

O jeere ụmụ ha ozi nlekọta n’otu n’otu.

O kpeere ha ekpere; O soro ha kwaa akwa.

Ma Ọ gwọrọ ha. (Lee 3 Nịfaị 17).

Nkwa Ya dị ebighị ebi: Ọ ga-agwọ anyị.

Nye ndị ahụ gafuru site n’ụzọ ọgbụgba ndụ, biko mara na olileanya dị mgbe niile, ọgwụgwọ dị mgbe niile, ma ụzọ nlaghachi azụ dị mgbe niile.

Ozi olileanya nke ebighị ebi Ya bụ balm ọgwụgwọ nye ndị niile bi n’ime ụwa nsogbu. Jizọs kwuru, “A bụ M ụzọ, eziokwu na ndụ” (Jọn 14:6).

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ka anyị cheta ịchọ Ya, ịhụ Ya naanya, na icheta Ya mgbe niile.

Ana m agba ama na Chineke dị ndụ ma na Ọ hụrụ anyị naanya. Ana m agbakwu ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụwa. Ọ bụ nnukwu onye ọgwọ ọrịa. A maara m na Onye Mgbapụta m dị Ndụ! N’ha nke Jizọs Kraịst, amen

Lee anya

  1. Russell M. Nelson, “Kwadoo maka Ngọzi niile nke Tempụl,” Ensign, Mar. 2002, 21.