Ọgbakọ Zuru ọha
Repọọtụ Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, 2022
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Repọọtụ Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, 2022

Nye Otu Ndịisi Mbụ nke Nzukọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchị ikpeazu a

Ezi ụmụnne ndị Nwoke: Dịka mkpughe siri nye ntuzi aka, dịka e dere nime nkeji 120 nke Ozizi na Ọgbụgbandụ nile, Òtù Kansụl maka Imefu Otu ụzọ n’ụzọ iri—nke ndị mejupụtara ya bụ Otu Ndịisi Mbụ, ndị Kworum nke Ndị Ozi Iri Na Abụọ, na nke Ndị Ọchịchị Ụkọchukwụ—bụ ndị na-enye ikike imefu ego nile nke Nzukọ nsọ. Ngalaba Nzụkọ-nsọ nile, n’emefu ego nile dịka atụmatụ akwadoro maka mkpata na mmefu siri dị, dịkakwa otu iwu na usoro nile akwadoro sịrị dị.

Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, nke ndị nọ n’ime ya bụ ndị ọkammụta ịhe gbasara ego bụ ịgba, ma ha enweghi ngalaba ọzọ nke Nzụkọ nsọ nke ha nọ na okpuru ya, ha nwere oke-n’ọrụ ime nnyocha maka ebum nobi ido onye ọbụla anya gbasara ego niile e nwetara, mmefu nile e mere, nakwa nchekwa akụ-n’ụba niile nke Nzụkọ nsọ.

Nihi nnyocha niile e mere, Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ kwekọtara na dị ka ihe niile sịrị dị, ego niile a natara, mmefu niile e mere, na akụ na ụba niile nke Nzụkọ nsọ nke afọ 2022 ka edekọtaworo ma mezuo dị ka atụmatụ nke Nzukọ nsọ kwadoro maka mkpata na mmefu siri dị, dị ka kwa otu iwu na usoro niile akwadoro siri dị. Nzukọ nsọ nke a, n’esorokwa nkuzi nile nke ha n’akụziri ndi otu ya maka ibi ndu dịka otu akpa ego ha ha, hapụ iji ụgwọ, na n’edebe ego maka oge ọ ga-adị mkpa.

N’obi nsọpụrụ k’anyị na enyefe ndekọta nke a.

Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ

Jared B. Larson

Onye Isi Nhazi