Ọgbakọ Zuru ọha
“E Nweghị Ike Inwe Ihe Mara Mma ma na-Atọ Ụtọ dịka Ọńụ M ”
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


“E Nweghị Ike Inwe Ihe Mara Mma ma na-Atọ Ụtọ dịka Ọńụ M”

Ichegharị kwa ụbọchị na ịbịakwute Jizọs Kraịst bụ ụzọ isi nweta ọńụ—ọńụ karịrị echiche anyị.

N’ime oge ije ozi Ya n’oge ndụ anụ ahụ, Onye Nzọpụta gosipụtara ọmịịko dị ukwuu maka ụmụ Chineke niile—karịsịa maka ndị ahụ na-ata ahụhụ mọbụ ndị dapụworo. Mgbe ndị Farisii katọrọ Jizọs maka iso ndị mmehie na-akpakọrịta na iri ihe, Jizọs zara site na-ịkụzi ilu atọ a maara nke ọma.1 Na ilu nke ọbụla niile ndị a, O kwusiri ike mkpa ọ dị ịchọ ndị ahụ kpafuru akpafu na ọńụ a na-enwe mgbe ha lọghachiri. Na ọmụmaatụ, na ilu nke atụrụ furu efu, O kwuru, “[Nnukwu] ọńụ ga-adị na eluigwe n’ihi otu onye mmehie nke chegharịrị.”2

Ebumnobi m taa bụ ịgba ume nye ihe jikọtara ọńụ na nchegharị—kpọm kwem, ọńụ nke na-abịa mgbe anyị chegharịrị na mmetụta niile nke ọńụ anyị na-enweta dịka anyị na-akpọ ndị ọzọ ka ha bịakwute Kraịst ma naata aja mgbaghara mmehie Ya nime ndụ ha niile.

Anyị Dị, Ka Anyị Wee Nwee Ọn̄ụ

N’ime akwụkwọ nsọ niile, okwu ahụ ọńụ pụtara ihe karịrị oge niile nke afọ ojuju ndị ahụ n’agafe agafe mọbụ ọbụna mmetụta nke ańụrị. Ańụrị n’akụkụ a bụ ágwá nsọpụrụchi, nke a na-ahụ n’uju ya mgbe anyị laghachiri ibi n’ihu Chineke.3 Ọ dị omimi, na-ebuli elu, na-edi, ma na-agbanwe ndụ karịa ihe ụtọ mọbụ nkasi obi ọbụla ụwa a nwere ike inye.

E kere anyị ka anyị nwe ọn̄ụ. Ọ bụ akara aka anyị bu n’obi dịka ụmụ nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya. Ọ chọrọ ka anyị soro kerịta ọńụ Ya. Onye amụma Lehi kuziri na atụmatụ nke Chineke maka onye ọbụla nime anyị bụ ka anyị “nwee ọn̄ụ.”4 N’ihi na anyị bi n’ụwa dara ada, na-anagide ọńụ ma ọ bụ ọńụ dị ebighị ebi na-adịkarị ka agaghị erute anyị aka . Otu ọ dị nime amaokwu na-eso, Lihaị gara nihu site na ịkọwa na “Mezaya ahụ [bịara ka] … o gbapụta [anyị] site na ọdịda.”5 Mgbapụta, site na Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst, na-eme ka ọńụ kwee mnweta.

Ozi ọma bụ ozi nke olile anya, nke “ihe ọma niile nke oke ọńụ,”5 na ụzọ ndị mmadụ niile ga-esi nweta udo na oge ọńụ na ndụ nke a ma nweta njupụta nke ọńụ nime ndụ nke na-abịa.7

Ọńụ anyị na-ekwu maka ya bụ onyinye maka ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ma ọ na-abịa na ọnụ ahịa. Ọńụ adịghị ọnụ ala mọbụ ihe a na-enye n’efu. Kama, e ji “ọbara dị oke ọnụ nke [Jizọs] Kraịst zụta ya.”8 Ọ bụrụ n’ezie na anyị ghọtara uru nke ọńụ ziri ezi, nke nsọpụrụchi bara, anyị agaghị ala azu ịchụ ihe onwunwe ọbụla nke ụwa n’aja mọbụ mee mgbanwe ọbụla dị mkpa na ndụ iji nweta ya.

Otu eze dị ike ma dị umeala n’obi n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn ghọtara nke a. “Gini ka m ga-eme,” ka ọ jụrụ, “ka e wee mụọ m na Chineke, i ji fopụta ajọọ mmụọ a site n’obi m, ma nabata Mmụọ ya, ka e wee mejupụta m na ọn̄ụ … ? Lee, ka o kwuru, aga m enyepụ ihe nile nke m nwere, e, aga m ahapụ ala-eze m, ka m wee nweta nnukwu ọn̄ụ nke a.”9

Na nzaghachi nye ajụjụ eze ahụ, onye mgbasa ozi ọma Erọn kwuru, “Ọbụrụ na ị chọrọ ihe nke a, … kpọọ isi ala n’iru Chineke … [ma] chegharịa site na mmehie gị niile.”10 Nchegharị bụ ụzọ nke ọńụ11 n’ihi na ọ bụ okporoụzọ ahụ na-eduga ruo na Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst.12

Ọńụ N’abịa Site na Ezi Nchegharị

Maka ụfọdụ, iche echiche banyere nchegharị dịka okporoụzọ eji enweta ọńụ nwere ike ịdịka nke n’abụghị eziokwu. Nchegharị, mgbe ụfọdụ, nwere ike na-egbu mgbu ma sie ike. Ọ na-achọ ikweta na ụfọdụ echiche na omume anyị niile—ọbụna ụfọdụ nkwenye anyị—ezighị ezi. Nchegharị na-achọkwa mgbanwe, nke, mgbe ụfọdụ, nwere ike bụrụ ihe nsogbu. Kama ọńụ na nkasi obi abụghị otu ihe. Mmehie—gụnyere mmehie ahụ nke afọ ojuju—na-ebelata ọńụ anyị.

Dị ka onye abụ ọma kwuru, “Ịkwa akwa nwere ike ịdịgide otu abalị, mana ọńụ na-abịa n’ụtụtụ.”13 Dịka anyị na-echegharị na mmehie anyị, anyị ga-elekwasịrịrị anya na nnukwu ọńụ nke na-esote. Abalị niile ndị ahụ nwere ike dị ogologo, mana ụtụtụ na-abịa, ma oo, lee ụdị udo na ọńụ dị ebube anyị na-enwe mmetụta ya dịka Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta na-atọhapụ anyị na mmehie na ahụhụ.

E Nweghị Ike Inwe Ihe Mara Mma ma na-Atọ Ụtọ

Tulee ahụmihe ahụ nke Alma n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. E tinyere ya “oke ntarama ahụhụ ebighị ebi” ma mkpụrụ obi ya “ka e nyelitere ntaram-ahụhụ” maka mmehie ya niile. Mana ozugbo ọ tụgharịrị gakwuru Onye Nzọpụta maka ebere, ọ “nweghị ike icheta mgbu [ya] niile ọzọ.”14

“Ma o, lee ọn̄ụ,” o kwuru, “ma lee ìhè ịtụ-n’anya m hụrụ; ee, … agaghị enwe ihe ọbụla nke mabigara mma ma dị ụtọ dịka ọńụ m sịrị dị.”15

Nke a bụ ụdị ọńụ dịịrị ndị na-abịakwute Jizọs Kraịst site na nchegharị.16 Dịka Onyeisi Russell M. Nelson kuziworo:

“Nchegharị n’emehere anyị ohere ị nweta ike nke Aja Mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. …

“Mgbe anyị họrọ nchegharị, anyị họọrọ ị gbanwe! Anyị n’ahapụ ka Onye Nzọpụta gbanwee anyị, k’anyị bụrụ mmadụ kachasị nma nke anyị kwesịrị ị bụ. Anyị na-ahọrọ ito-eto nime mmụọ ma nata ọñụ—ọñụ nke mgbapụta enwetara nihi Ya. Mgbe anyị họrọ ị chegharị, anyị họrọ ị dịka ka Jizọs Kraịst karịa!”17

Nchegharị na-eweta ọńụ nihi na ọ na-akwado obi anyị ịnata mmetụta nke Mmụọ Nsọ. Ịjupụta na Mmụọ Nsọ pụtara ịjupụta na ọńụ. Ma na ijupụta n’ọńụ pụtara ijupụta na Mmụọ-Nsọ.18 Ańụrị anyị na-abawanye ka anyị na-arụ ọrụ kwa ụbọchị iweta Mmụọ nime ndụ anyị niile. Dịka onye amụma Mọmọn kuziri: “Otu o sila dị ha buru ọnụ ma kpee ekpere ugboro ugboro, ma gbasie ike nʼelu mgbasike nʼumeala ha, na nkwụsike nʼelu nkwụsike nʼokwukwe [ha] [nime] Kraịst, ruo nʼimejupụta mkpụrụ-obi ha niile nʼọn̄ụ na nkasiobi.”19 Onyenwe anyị na-ekwe ndị niile na-arụ ọrụ iso Ya nkwa, “A ga m ekenye gị … Mmụọ m, nke ga-agba ama nye echiche gị, nke ga-emeju mkpụrụ-obi gị n’ọn̄ụ.”20

Ọńụ nke Inyere Ndị Ọzọ Aka Chegharịa

Mgbe anyị nwetasịrị ọńụ nke na-abịa site n’ezi nchegharị, anyị na-achọ nnọọ ịkọrọ ndị ọzọ maka ọńụ ahụ. Dịka anyị na-eme otua, ọńụ anyị na-amụbawanye. Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe mere Alma.

“Nke a bụ ebube m,” ka o kwuru, “na eleghị anya aga m abụ ngwa-ọrụ n’aka niile nke Chineke iweta ụfọdụ mkpụrụ-obi na nchegharị; ma nke a bụ ọńụ m.

“Ma lee, mgbe m na-ahụ ọtụtụ ụmụnne m nwoke chegharịrị n’ezi-okwu, ma na-abịakwute Onyenwe anyị Chineke ha, mgbe ahụ ka mkpụrụ obi m jupụtara na ọn̄ụ; mgbe ahụ ana m echeta ihe Onyenwe anyị mewooro m, … ee, mgbe ahụ aga m echeta aka ebere ya nke o setịpụrụ [nye] n’ebe m nọ.”21

Inyere ndị ọzọ aka chegharịa bụ nnọọ ụzọ esi egosipụta obi ekele anyị n’ebe Onye Nzọpụta nọ, ma ọ bụ isi iyi nke nnukwu ọńụ. Onyenwe anyị ekwela nkwa:

“Ma ọbụrụ na ị ga … kpọta, ọbụna otu mkpụrụ-obi nye m, olee otu ịdị ukwuu nke ọn̄ụ gị ga-adị na ya n’ala-eze nke Nna m!

“Ma ugba a, ọ bụrụ na ọn̄ụ gị ga-adị ukwuu n’otu mkpụrụ obi nke ị kpọbatara nye m … , olee ịdị ukwuu nke ọn̄ụ gị ma ọbụrụ na ị kpọbata ọtụtụ mkpụrụ obi nye m!”22

Lee Ịdị Ukwuu nke Ọn̄ụ Ya na Mkpụrụ-obi Nke Chegharịrị

A hụrụ m na ọ na-enyere m aka ịgbalị iche ụdị ọńụ Onye Nzọpụta ga-enwetarịrị mgbe ọbụla anyị nwetara ngọzi niile nke aja mgbaghara mmehie Ya na ndụ anyị.23 Dịka Onyeisi Nelson kwuru,24 Onye Ozi Pọl nime Akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru kwuru nghọta dị nrọ nke a: “Wepụ … mmehie ọbụla nke na-adakwasị anyị n’ụzọ dị mfe, … na-ele Jizọs anya onye bụ mbido na ọgwụgwụ nke okwukwe anyị; onye nihi ọńụ nke edobere n’iru ya nagidere obe ahụ … ma edowo ya n’aka nri nke oche-eze nke Chineke.”25 Anyị na-ekwukarị maka mgbu na nhụjuanya nke Getsemani na Calvary, ma anyị anaghị adịkarị ekwu maka oke ọńụ nke Onye Nzọpụta ga-atụ anya ya mgbe O nyere ndụ Ya maka anyị. N’ụzọ doro anya, atụmatụ Ya na nhụjuanya Ya bụ maka anyị, ka anyị wee nweta ọńụ nke iso Ya laghachi n’ihu nke Chineke.

Ka ọ kuzichara ndị mmadụ nime America ochie, Onye Nzọpụta gosipụtara oke ịhụnanya Ya n’ebe ha nọ site n’ịsị:

“Ugbu a, lee, ọńụ m dị ukwuu, ọbụna ruo ojuju, n’ihi unu … ; ee, ma ọbụna Nna na-ańụrị ọńụ, na kwa ndị mmụọ ozi niile dị nsọ. …

“… Nime [unu] E nwere m [otu] uju nke ọńụ.”26

Bịakwute Kraịst ma Nata Ọńụ Ya.

Ụmụnne nwoke na nwanyị, A na m emechi site na-ịgba ama nke onwe m, bụ nke m na-ewere dịka onyinye dị nsọ. A na m agba ama na Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụwa. A maara m na Ọ hụrụ onye ọbụla nime anyị n’anya. Otu ihe nlekwasị anya, Ya “ọrụ [Ya] na ebube Ya,”27 bụ inyere anyị aka ịnata njupụta nke ọńụ nime Ya. A bụ m onye akaebe na ichegharị kwa ụbọchị na ịbịakwute Jizọs Kraịst bụ ụzọ isi nweta ọńụ—ọńụ karịrị echiche anyị.28 Nke ahụ bụ ihe mere anyị jiri nọrọ ebe a n’elu ụwa. Ọ bụ ya mere Chineke ji kwadoro anyị nnukwu atụmatụ nke Ya maka obi ụtọ anyị. Jizọs Kraịst n’ezie bụ “ụzọ ahụ, eziokwu ahụ, na ndụ ahụ”29 na naanị “aha e nyere n’okpuru elu-igwe nke mmadụ ga-esi nwe nzọpụta n’ala-eze nke Chineke.”30 A na m agba ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.