Ọgbakọ Zuru ọha
Ngọzi nke Onye Petrak Gị—Ntụziaka Mkpatemmụọ site n’aka Nna nke Eluigwe
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Ngọzi nke Onye Petrak Gị—Ntụziaka Mkpatemmụọ site n’aka Nna nke Eluigwe

Ngọzi nke onye petrak m nyeere m aka ghọta ezigbo ejiri mara m dị ebighị ebi—onye m bụụrụ n’ezie na onye m nwere ike ịghọ.

A zụrụ m site n’aka ndị nne na nna dị ịtụnaanya ndị ji ịhụnaanya na okwukwe kuziere anyị, ụmụ ha, ozi ọma ahụ. Nke ka njọ, ndị nne na nna m hụrụ naanya ka na ọdịghịrị mfe na alụm di na nwunye ha ọtụtụ afọ. Abụụrụ m nwata Praịmarị mgbe a gwara m na ọ dị ka ha ga-agba alụkwaghịm otu ụbọchị ma mụ na ụmụnne m ga-enwe mkpa ịhọrọ onye nne ma ọ bụ nna nke a ga-ebinyere. Niihi ya, ihe weere ọtụtụ afọ, a hụtara m obi nkorụpụ kpụ okụ n’ọnụ; ka osila dị, onyinye si n’aka Nna nke Eluigwe n’ikpeazụ nyere aka gbanweere m ihe niile—ngọzi nke onye petrak m.

Na-afọ 11, mgbe nchekasị banyere mmekọrịta nke ndị nne na nna m bịara bawanye, a chọsiri m ike inwe ngọzi nke onye petrak m. A maara m na Nna m nke Eluigwe maara onye m bụ nke ọma ma maara ọnọdụ m nke ọbụla kpọm kwem. Ma amakwaara m na m ga-anata ntuziaka site n’aka Ya. Ozugbo m gbachara afọ 12, anatara m ngọzi nke onye petrak m. Nke ahụ bụ ihe karịrị ọkara narị afọ gara aga, mana ana m echeta n’uju nhụmiihe ahụ dị nsọ.

N’obi ekele, anyị akpatewo mmụọ ntuziaka gbasara ngọzi niile nke onye petrak niime Akwụkwọ Ntụziaka Izugbe: nke Nzukọ nsọ

“Onye otu ọbụla tozuru oke, mere baptizim nwere oke ịnata ngọzi nke onye petrak, nke na-enye ntuziaka sitere na mkpatemmụọ site n’aka Nna nke Eluigwe.”

Onye otu kwesịrị “itozu oke nke ọma ịghọta uru na ọdịdị dị nsọ nke ngọzi ahụ” ma “ghọta isi ozizi nke ozi ọma ahụ.”

“Dị ka o kwesịrị, onye otu ahụ ga-adị nta nke ọma na ọtụtụ mkpebi dị mkpa na ndụ ka dịchakwa niihu. … Ndị ndu ọkwa nchụaja ekwesịghị ihiwe ogo afọ dị nta maka onye otu ịnata ngọzi nke onye petrak. …

“Ngọzi nke onye petrak ọbụla dị nsọ, kenzizo, ma bụrụ nke onwe. …

“Onye nke natara ngọzi nke onye petrak kwesịrị iji mkpụrụokwu niile ya kpọrọ ihe, tụgharịa uche na ha, ma bie ndụ itozu oke ịnata ngọzi niile ndị ekwere na nkwa niime ndụ nke a na niime ebighị ebi.”1

Onyeisi Russell M. Nelson anyị hụrụ naanya akuziwo ugboro ugboro gbasara mkpa nke ngọzi onye petrak dị,2 na ọ na-enye onye ọbụla na-anata ya “ọkwa nke agbụrụ laghachi azụ ruo na Abraham, Aịzik, na Jekọb”3 ma na ngọzi ọbụla “bụ akwụkwọ nsọ nke onwe nye gị.”4

Ngọzị nke onye petrak m dịịrị m oke mkpa mgbe m dị na nwata niihi ọtụtụ ihe. Na mbụ, site nike nke Mmụọ Nsọ, ngọzi nke onye petrak m nyeere m aka ghọta ezigbo ejiri mara m dị ebighị ebi—onye m bụụrụ n’ezie na onye m nwere ike ịghọ. O nyeere m aka mata, dị ka Onyeisi Nelson kuziworo, na mụ onwe m bụ “otu nwa nwoke nke Chineke,” “ otu [nwata] nke ọgbụgba ndụ,” na “ onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.”5 A maara m na amatara onye mbụ ma hụ m naanya site n’aka Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta ma na Ha na-onwe Ha nọ n’ọrụ niime ndụ m. Nke a nyeere m aka nwee ọchịchọ irute Ha nso ma bawanye okwukwe na ntụkwasị obi m niime Ha.

Otu ezi enyi nke sonyere Nzukọ nsọ dị ka dimkpa nta kọwara: “Mgbe onye petrak bikwasịrị aka ya n’elu isi m ma kpọọ aha m, ihe niile gbanwere, … ọbụghị nnọọ naanị mgbe ahụ kama n’oge ndụ m niile. Ozugbo aghọtara m na—site n’ike nke o ji kwuo okwu—a matara onye m bụ nke ọma ma n’ụzọ dị omimi. Okwu ndị o kwuru mikpuru niime ndụ m niile A maara m na Nna nke Eluigwe maara onye m bụ, ihu na azụ.”

Ịmata onye m bụ n’ezie nyeere m aka ghọta ma chọọ ime ihe Chineke tụrụ anya n’aka m.6

Nke a dubara m n’ịmụ ọgbụgba ndụ niile m gbaworo na ngọzi ndị ekwere na nkwa niime ogbụgba ndụ nke Chineke na Abraham.7 O nyere m uche ịhụta nkwa dị ebighị ebi nke kpateremmụọ m idobezu ọgbụgba ndụ m niile.

A mụrụ m ngọzi nke onye petrak m mgbe na mgbe ma, dị ka onye ntoroọbịa, ọtụtụ mgbe kwa ụbọchị, nke nyeere m aka nweta nduzi mmetụta nke Mmụọ Nsọ na-enye nkasi obi, nke nyere m aka belata obi nkorupụ m dị ka m sooro nkwagide Ya niile. Nke a bawanyere ọchịchọ m ịdị ike na-ịnabata ihe, eziokwu, na Mmụọ Nsọ site na-ịmụ akwụkwọ nsọ na ikpe ekpere kwa ụbọchị ma gbalịsie ike karịa na-amụ ma na-esoro nkuzi niile nke onye amụma na ndị ozi nke Chineke. Ngọzị nke onye petrak m nyekwaara m aka nwee ọchịchọ ị na-enwekarị nnakwere nye uche nke Nna m nke Eluigwe, ma nlekwasị anya ahụ nyeere m aka nwete nhụmiihe ọńụ dị ukwuu, na-agbanyeghị ọnọdụ niile nke onwe m.8

Anatara m ume nke ime mmụọ oge ọbụla m mụrụ ngọzi nke onye petrak m. Mgbe nne na nna m mechara n’ikpeazụ gbaa alụkwaghịm, ngọzi nke onye petrak m, dị ka Onyeisi Tọmọs S. Monson siri kuzie, aghọworo m “akụ nke onwe m bara oke uru na nke ego na-apụghị ịzụta,” ọbụna “Liahona nke onwe.”9

Ugbua, biko enwela nghọtahie. Ezughị m oke. E mere m ụdị mmejọ dị iche iche. Onye nsiso m dị ebighị ebi ga-ekwe na m ka na-eme otu ahụ. Mana ngọzi nke onye petrak m nyeere m aka ma na-aganiihu enyere m aka enwe ọchịchọ ime nke ọma karịa ma dị mma karịa.10 Ị na-amụ ngọzi nke onye petrak m mgbe na mgbe bawanyere ọchịchọ m ịkọta ma guzogide ọnwụnwa. O nyeere m aka nwee ọchịchọ na mgbam ume ichegharị, ma nchegharị bịara bawanye ghọọ usoro nke na-enye ọńụ.

Ọ dịịrị m oke mkpa ịnata ngọzi nke onye petrak m mgbe m dị nta na mgbe ama m ka nọ na-eto eto. Ma obi m juru na-ekele ruo ebighị ebi na nne na nna m na bishọp ghọtararịị na ọchịchọ m gosipụtara na m dị njikere.

Mgbe m gbara afọ 12, ụwa adịchaghị mgbagwoju anya na mmegheri anya karịa ka ụwa dị taa. Onyeisi Nelson kọwara ụbọchị taa dị ka “oge akachasị nwee mgbagwoju anya niime agụgụala nke ụwa.” ụwa “nke mmehie juputara” na “onwe eche naanị.”11 Ebe ọ dabara nke ọma ndị ntoroọbịa anyị taa kacha etozu oke karịa ka m dị n’afọ 12, ma ha onwe ha kwa nwere mkpebi ndị dị mkpa siri ezigbo ike ime mgbe ha ka dị nta! Ha kwesịkwara ịma onye ha bụ n’ezie nakwa na Chineke hụrụ ha na anya ma mazuru ha nke ọma!

Ọbụghị mmadụ niile ga-enwe ọchịchọ ngọzi nke onye petrak ha mgbe m mere nke m. Mana ana m arịọ ka ndị otu ndị na-aka anatabeghị ngọzi nke onye petrak ha ga-eji ekpere chọọ ịma mgbe ha dị na njikere. Ana m ekwe nkwa n’ọbụrụ na ịkwadoo niime mmụọ, nhụmiihe gị, dị ka nke mụ onwe m, ga-adị nsọ nye gị. Ana m arịọkwa ka ndị ahụ na-anataworịị ngọzi nke onye petrak ha na-amụ ya ma were ya kpọrọ ihe nke ọma. Ịdị na-enwe mmasị na ngọzi nke onye petrak m mgbe m dị ntakịrị jiri mgbam ume gọzie m mgbe m dara mba, kasie m obi mgbe m na-atụ egwu, nye m udo mgbe obi na-alọ m mmiri, olileanya mgbe m chere na ụwa agwụla, na ọńụ mgbe m kachasị nwee mkpa ya. Ngọzi nke onye petrak m nyeere m aka bawanye okwukwe na ntụkwasị obi m niime Nna m nke Eluigwe na Onye Nzọpụta. Ọ mụbakwara ịhụnaanya m maka Ha—ma ọ ka na-emekwa otu ahụ.12

Ana m agba ama na ngọzi niile nke onye petrak na-eji mkpatemmụọ enye ntuziaka si n’aka Nna nke Eluigwe. Ana m agba aka ebe banyere ịdị ndụ n’ezie nke Nna anyị bi n’Eluigwe na Ọkpara Ya—Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst—onye maara anyị, hụ anyị naanya, ma nwee ọchịchọ ịgọzi anyị. A maara m n’ezie na Onyeisi Russell M.Nelson bụ onye amụma nke Chineke n’elu ụwa ụbọchị taa. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Akwụkwọ ntụzi aka Izugbe: Ije ozi niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, 18.17, 18.17.1,ChurchofJesusChrist.org.

  2. Lee Russell M. Nelson, “I meela maka Ọgbụgba ndụ ahụ” (Brigham Young University devotional, Nov. 22, 1988), speeches.byu.edu; “Olileanya nke Kacha Dị mma” (Brigham Young University devotional, Jan. 8, 1995), speeches.byu.edu; “Njirimara, Nke Kacha Amasị, na Ngọzi niile” (Brigham Young University devotional, Sept. 10, 2000), speeches.byu.edu; “Mgbọrọgwụ niile na Alaka niile,” Liahona, Me 2004, 27–29; “Ọgbụgba ndụ niile,” Liahona, Nov. 2011, 86–89; “Ndị Ntoroọbịa bụ Ndị Ọpara Nwere Ugwu: Gịnị ka Unu Ga-Ahọrọ?,” (Brigham Young University–Hawaii devotional, Sept. 6, 2013), broadcasts.ChurchofJesusChrist.org; “Akwụkwọ nke Mọmọn, Mkpokọta nke Israel, na Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ,” Ensign, Julaị 2014, 26–31; Liahona, Julaị 2014, 24–29; “Kwee ka Chineke Merie,” Liahona, Nov. 2020, 92–95; “Ọgbụgba ndụ Ahụ Dị Ebighị ebi,” Liahona, Oct. 2022, 1–6.

  3. Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ niile,” 88.

  4. Russell M. Nelson, “Imeela maka Ọgbụgba ndụ ahụ,” speeches.byu.edu.

  5. Russell M. Nelson, “Nhọrọ niile maka Ebighị ebi” (ofufe nke gburugburu ụwa maka ndị dimkpa nta, Me 12, 2022), ChurchofJesusChrist.org; nkwusi ike agbakwunyere.

  6. lee Russell M. Nelson, “Ọgbụgba ndụ niile,” 86– 89.

  7. Lee Genesis 17:1–10Lee kwa Russell M. Nelson,“Ụmụ nke Ọgbụgba ndụ,” EnsignMe 1995, 32–34.

  8. Russell M. Nelson, “Ọńụ na Ịnya ndụ nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2016, 81–84.

  9. Thomas S. Monson, “Ngọzị nke Onye Petrak Gị: Liahona nke Ihe,” Ensign, Nov. 1986, 65–66.

  10. Lee Russell M. Nelson, “Anyị Nwere ike Ime Ihe Kacha dị mma ma Dị Mma karịa,” Liahona, May 2019, 67–69.

  11. Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nov. 2022, 95–96.

  12. Mkpatemmụọ si n’aka Jemis E. Faust, “Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja,” Ensign, Nov. 1995, 62–64.