Ọgbakọ Zuru ọha
Uche M Jigidere Echiche Nke a banyere Jizọs Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Uche M Jigidere Echiche Nke a banyere Jizọs Kraịst

Dịka unu n’aga nihu kpachara anya n’etinye echiche niihe banyere Jizọs Kraịst, A nam ekwe unu nkwa na unu ga-enwete n’abụghị naanị odudu nke eluigwe makwa ike nke eluigwe.

N’ọmalịcha oge Ista nke a, A na m ekwugharị ekpere nke dị nime abụ nke a dị ike, “Duo Anyị, Ọ Jehova Onye Ukwu.”1

Otu akụkọ ama ama nime Akwụkwọ nke Mọmọn kwuru maka otu okorobịa sitere na ezinụlọ ama ama, onye akpọrọ Alma, onye akwụkwọ nsọ kọwara dịka onye n’ekweghi ekwe n’efe arụsị.2 Ọ maara otu esi ekwu okwu ma ọ dị mfe ikwere okwu ya site n’iji ọnụ ụtọ n’eme ka ndị ọzọ soro ya. N’ịtụnanya, otu mmụọ ozi zutere Alma na ndị enyi ya. Alma dara n’ala ma ezigbo ike gwụrụ ya nke mere ejiri buru ya nihi ọnweghi ume lawa ebe obibi nke nna ya. Ọ nọọrọ n’ọnụ ọnwụ ruo ụbọchị atọ.3 Mgbe emesịrị, ọ kọwara na n’oge ọ dị dịka ọtọgbọrọ dịka ozu nye ndị ahụ nọ n’akụkụ ya, uche ya nọ n’ọrụ dịka mkpụrụ obi ya nọ na mwute, n’eche echiche banyere ndụ ya nke n’ejighi iwu nsọ Chineke kpọrọ ihe. Ọ kọwara uche ya dị ka nke “e nyere ahụhụ site na ncheta nke ọtụtụ mmehie [ya]”4ma nke “enyere oke ntaram-ahụhụ dị ebighi-ebi.”5

N’oge obi ịlọ mmiri ya dị omimi, ọ chetara mgbe akụziri ya n’oge ntorobịa ya gbasara “ọbịbịa nke otu Jizọs Kraịst, Ọkpara nke Chineke, ga-achụ aja maka mmehie nile nke ụwa.”6 Nke ọzọ o kwuru okwu nke a n’akpake mmụọ: “Dịka echiche m jidere uche nke a, etiri m mkpu n’ime obi m: O Jizọs, gị Ọkpara nke Chineke, meere m ebere.”7 Ma dịka ọ rịọrịọ maka ike nke eluigwe nke Onye Nzọpụta, otu ihe ọrụ ebube mere: “Mgbe m chere nke a,” o kwuru “echetaghị kwa m mgbu m nile ọzọ”8 N’otu ntabianya ọ nwere mmetụta udo na ihè. “Agaghị enwe ihe ọbụla mabigara mma oke ma dị ụtọ dịka ọn̄ụ m siri dị,”9ka o kwuru.

Alma “jidere” eziokwu ahụ banyere Jizọs Kraịst. Ọ bụrụ n’anyị n’ekwu banyere “jidere” dịka otu ọ pụtara na mmadụ, anyị nwere ike ikwu , “o jidere okporo igwe ahụ n’aka dịka ọ na-ada ada,” nke pụtara na ọ setịpụrụ aka ya n’otu ntabianya ma jidesie aka ya ike n’ihe akpụrụ akpụ ahụ nke awụgidere n’elu ntọala siri ike.

Dịka otu nke Alma sịrị dị, ọ bụ uche ya setịpụrụ aka ma jidesie eziokwu nke aja mgbaghara Jizọs Kraịst ahụ ike. Site n’itinye okwukwe n’elu eziokwu ahụ, ma site n’ike na amara nke Chineke, azọpụtara ya site n’obi nkoropụ ma mejupụta ya n’olile anya

Nagbanyeghi na nhụmịhe anyị nwere ike ọ gaghị adị dịka nke Alma, ha nwekwara uru dị ebighi ebi. Echiche anyị “enwetewo kwa uche nke a” banyere Jizọs Kraịst na aja obi ebere Ya, ma mkpụrụ obi anyị enwetawo ihè na ọńụ nke n’esochi.

Ichekwa Echiche ahụ nke Jizọs Kraịst

Ekpere m n’oge Ista nke a bụ n’anyị ga-ejiri obi anyị niile hazie, gba ume nye, ma chekwaa echiche nke Jizọs Kraịst a kachasị mkpa nime ụlọ nke mkpụrụ obi anyị,10 ma hapụ ya ka ọ n’asọbata mgbe niile nime uche anyị, duo anyị nime ihe anyị n’eche na obi ma nke anyị n’eme, ma na-ewete ọńụ ahụ dị ụtọ nke ịhụnaanya Onye Nzọpụta.11

Ijiri ike nke Jizọs Kraịst mejupụta obi anyị apụtaghị na ọ bụ naanị Ya g’abụ echiche anyị g’enwe. Mana ọ pụtara na echiche anyị niile ga-agbaso gburugburu ịhụnaanya Ya, ndụ Ya na nkuzi Ya, ma aja mgbaghara na Mbilite n’ọnwụ Ya dị ebube. Jizọs mọlị agaghị anọ n’akụkụ ebe echefuru echefu, nihi echiche niile anyị banyere Ya nọgidere mgbe niile ma “ihe niille nke dị [anyị nime n’efe] ya ofufe!”12 Anyị ga-ekpe ekpere ma kwugharịa nime uche anyị nhụmịhe ndị ahụ kpọtara anyị nso nso n’ebe Ọ nọ. Anyị ga-anabata nime uche anyị ihe osise nsọ niile, akwụkwọ nsọ niile, abụ niile nke mmụọ kpalitere ka ha jiri wayọ merie echiche nille nke kwa ụbọchị ndị na-agbata nime ndụ ezughi ike anyị. Ịhụnaanya anyị nwere n’ebe Ọ nọ agaghị egbochiri anyị site na mnwute ahụ na iri uju nke ndụ anụ ahụ nke a, kama ọ na-ekwe omume k’anyị jee ije gafee n’ihu aka mgba niile jiri ume nke karịrị ike anyị nke ọma.

Jizọs, echiche ahụ banyere gị

Jiri ụtọ nke n’ejupụta m obi;

Mana nke kacha ụtọ bụ ịlekwasị ihu gị anya

Ma zuo ike n’ebe ị nọ.13

Chetakwa, ị bụ nwa nke Nna nke Eluigwe mụrụ na mmụọ. Dịka Onye Ozi Pọl kọwara, “anyị bụ mkpụrụ afọ nke Chineke.”14 I biriwọrịị na mbụ mbụ, gị na ejirimara nke onwe gị tutu ịbịa n’ụwa. Nna anyị kepụtaara anyị atụmatụ zuru oke maka anyị ị bịa n’ụwa, ị mụta ihe, ma laghachikwuru Ya. O zitere Ọkpara Ya Ọ Hụrụnanya ka site n’ike nke Aja mgbaghara mmehie na Mbilite n’ọnwụ Ya nke n’enweghi atụ, anyị g’ebi ndụ gafere ala ili; ma dịka anyị dị njikere itinye okwukwe na Ya ma chegharịa site na mmehie niile anyị,15 a ga agbaghara anyị ma anyị ga-anata olile anya nke ndụ ebighị ebi.16

Inye Uche na Mmụọ anyị Nlebara anya Pụrụiche

N’oge ndụ anụ ahụ nke a, uche anyị na mmụọ anyị ga-achọ nlebara anya pụrụ iche.17 Uche anyị n’ahapụ anyị k’anyị bie ndụ, mee nhọrọ, ma mata nke bụ ezi ihe na ajọọ ihe.18 Mmụọ anyị na anata akaebe ahụ na-ekwenye na Chineke bụ Nna anyị, na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara nke Chineke, nakwa na nkuzi Ha niile bụ odudu anyị ruo ịnwete ọńụ n’ebe a ma ndụ ebighị ebi nke gafere ala ili.

Uche nke Alma jidere echiche nke a banyere Jizọs Kraịst. Ọ gbanwere ndụ ya. Ọgbakọ zuru ọha bụ oge iji ghọta ihe ahụ Onyenwe anyị chọrọ kanyị mee ma bụrụ. Ọ bụkwa oge iji tulee uche n’ọganihu anyị. Dịka ọrụ m niile si kpọga m gburugburu ụwa niile, a hụwom ike ime mmụọ nke n’amụba n’isi ndị otù Nzukọ nsọ nwere ezi omume, ndị kwụdesiri ike.

Afọ ise gara aga, agwara anyị k’anyị debekwuo Onye Nzọpụta nime ihe niile anyị n’eme site n’ikpọ ezi aha nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a.19 Anyị n’ekwuzi aha Ya n’ụzọ nwere olile anya.

Afọ anọ gara aga, site n’ibelata oge ọgbakọ oriri nsọ anyị, anyị amụbawazie nlekwasị anya anyị n’elu iri oriri nsọ nke Onyenwe anyị. Anyị n’echezi maka Jizọs Kraịst karịa ma sikwuo ike nime nkwa anyị kwere ịcheta Ya mgbe niile.20

N’oge ọrịa mkpochapụ ụwa ahụ onye ọbụla nọrọ onwe ya ma tinye enyemaka nke Bịanụ, Soro M, nkụzi niile nke Onye Nzọpụta n’abụzi ihe kacha pụta ihè nime ebe obibi anyị, n’enyere anyị aka ife Onye Nzọpụta ofufe ruo izu ụka ahụ.

Site n’isoro ndụmọdụ nke Onyeisi Russell M. Nelson maka ị “nụrụ Ya,”21 anyị n’enwogharị ume anyị iji mata ntaka niile nke Mmụọ Nsọ ma hụ aka nke Onyenwe anyị nime ndụ anyị niile.

Site na-ịma ọkwa na nrụcha ọtụtụ tempụl niile, anyị na-akachazi abanye ụlọ nke Onyenwe anyị ugboro ugboro ma na anata ngọzị niile nke O kwere na nkwa. Anyị n’enwete mmetụta ịma mma nke Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị n’ụzọ sikwuru ike.

Onyeisi Nelson kwuru: “Enweghị ihe ọbụla dị mfe ma ọbụ nke n’eme n’onwe ya gbasara ịbụ [otu] [onye na-eso] ụzọ dị ike. Nekwasi anya anyị ga esịrịrị ike n’etiti Onye nzọpụta na oziọma Ya. Ọ bụ ihe siri ike n’uche ịgbalịsi ike ilekwasị Ya anya n’echicheọbụla.” 22

Site n’ịtụkwasị uche anyị n’ebe Jizọs Kraịst nọ, ihe ndị ọzọ nọ gburugburu anyị—mgbe ọ ka nọ ebe ahụ—ka a n’ele anya site n’ịhụnaanya anyị nwere maka Ya. Ịhe ndị ndọpụ uche ahụ n’adịghị mkpa anyụọ, ma anyị ewepụ ihe ndị ahụ n’adabaghị dịka otu ihè na agwa Ya sịrị dị. Dịka unu n’aga nihu kpachara anya n’enwete mgbata uche nke a banyere Jizọs Kraịst, tụkwasị obi na Ya, ma dobe iwu nsọ Ya niile, A na m ekwe unu nkwa na unu ga-enwete n’abụghị naanị odudu nke eluigwe makwa ike nke eluigwe—ike nke n’eweta ume nye ọgbụgba ndụ unu niile, udo n’oge ihe isi ike unu, ma ọńụ nye ngọzị unu niile.

Ịcheta Jizọs Kraịst

Izu ụka ole ma ole gara aga, Kathy na mụ zutere ebe obibi nke Matt na Sarah Johnson. N’ahụ aja ka ekobere foto nke ezinụlọ ha n’oge gara aga, ọmarịcha oyiyi nke Onye Nzọpụta, ma ihe ngosịpụta nke tempụl.

Ụmụ ha ndị nwanyị anọ, Maddy, Ruby, Claire na June, jiri obi ụtọ kwuo maka otu ha siri hụ nne ha naanya.

Kemgbe ihe gafere otu afọ, Sarah n’arọpụta oge maka ndị ezinụlọ ya i gakọrịta tempụl ọnụ ụbọchị Satọde ọbụla, nke n’eme ka ụmụ aka ndị nwanyị ahụ sonye nime baptizim maka ndị otù ezinụlọ ha ndị bibụrụ na mbụ.

N’ọnwa Nọvemba nke afọ gara aga, Sarah haziri oge maka ezinụlọ ya ịga tempụl ka ọ daba n’izu ụka nke ikpeazu n’ọnwa Disemba n’ụbọchị Tọọsde karịa ibụ Satọde. “Akwa nke a dịịrị gị mma,” ka ọ jụrụ Matt.

Sarah ka achọpụtara na ọ nwere kansa, mana ndị dọkịnta cheburu na ọ nwere afọ abụọ mọbụ atọ ị dị ndụ. N’oge otu ọgbakọ oriri nsọ, Sarah gbara ama ya dị ike, n’ekwu na nagbanyeghi ịhe ọbụla mere ya, ọ jiri obi ya niile hụ Onye Nzọpụta naanya, ma na “mmerị ahụ ka enwetewororịị” site n’aka Ya. Mgbe Disemba nọ na-aganiihu, ahuike nke Sarah agbadakwuo n’atụghị nanya, ma anabatara ya n’ụlọ ọgwụ. N’isi ụtụtụ nke Tọọsde ahụ, Disemba 29, ọ jiri nwayọọ bizuo ndụ anụ ahụ ya. Matt nọbuuru n’akụkụ Sarah n’abalị ahụ niile.

Site n’obi mgbawa ya ma ịke ọgwụgwụ nke anụ ahụ na nke uche, ọ ruru ebe obibi ya, ya na ụmụ ya ndị nwanyị n’eru uju. Dịka Matt lere ekwentị ya anya, ọ hụtara ihe ncheta maka nhazi oge tempụl pụrụ iche nke Sarah meworo maka ụbọchị nke ahụ. Matt kwuru, “Mgbe m hụrụ ya na mbụ, e chere m n’echiche, Nke a agaghị ekwe omume.”

Mana mgbe ahụ, uche Matt gbatara na-echiche nke a: Onye Nzọpụta dị ndụ. Enweghi ebe ga akara anyị mma ị nọ dịka ezinụlọ karịa nime ụlọ nsọ Ya.

Foto, oyiyi
Ezinaụlọ Johnson

Matt, Maddy, Ruby, Claire na June bịarutere tempụl ahụ maka nhazi oge tempụl nke Sarah mewororịị maka ha. Site n’anya mmiri n’asọdata na nti ya, Matt na ụmụ ya ndị nwanyị mere ọtụtụ baptizim. Ha nwetere mmetụta nke ịhụnaanya dị omimi ma njikọ ebighị ebi ha na Sarah, ma ha nwetere mmetụta ịhụnaanya dị ukwuu ma udo n’akasị obi nke Onye Nzọpụta. Matt jiri obi dị nro kwuo nke a, “Dịka m n’enwete iri uju na obi mwute dị omimi, ana m etiku n’olu ọńụ, nihi a maara m atụmatụ nke nzọpụta dị ịtụnaanya.”

N’oge Ista nke a, ana m agba akaebe na eziokwu zuruoke nke aja mgbaghara mmehie n’enweghi atụ nke Onye nzọpụta na Mbilite n’ọnwụ Ya dị ebube. Dịka uche unu kwụsịrị ike ma nogide ebighi ebi n’elu echiche nke Jizọs Kraịst, ma dịka ị n’aga nihu n’etinyecha ndụ gị karịa nime nke Onye Nzọpụta, A na m ekwe gị nkwa na ị ga-enwete olileanya Ya, udo Ya, na ịhụnaanya Ya. N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. “Duo Anyị, O Jihova Onye Ukwu,” Hymns, no. 83.

  2. Lee Mosaịa 27:8.

  3. Lee Alma 36:10.

  4. Alma 36:17.

  5. Alma 36:12.

  6. Alma 36:17.

  7. Alma 36:18. Oge ọzọ ekwuru maka “ijide aka” nime Akwụkwọ nke Mọmọn bụ maka ndị ahụ bịara “jisie isi okporo igwe ahụ ike” (1 Nefi 8:24, 30).

  8. Alma 36:19.

  9. Alma 36:21.

  10. “Agha ndụ nke kachasi ibe ya ka a na-alụ nime ọnụ ụlọ gbara nkịtị nke mkpụrụ obi unu”(David O. McKay, nime Ndekọtaihe Ọgbakọ, Apr. 1967, 84).

  11. “[Echiche niile] na-akwalite ihe omume niile. Echiche anyị bụ ebe mgbịị na mgbanyụ ọkụ, nke na-achị ihe omume anyị niile” (Boyd K. Packer, Ka Onye niile Nwee ike nwee Mmụta [1982], 33).

    Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri: “Anyị nwere ike pịgide ajọọ ọchịchọ niile n’ala ma jiri ndị ezi omume dochie ha. Nke a ga-ewe ọzụzụ na ọrụ. Onyeisi Joseph F. Smith kuziri na ‘ọzụzụ … nke ọchịchọ anyị niile bụ otu nime ihe kacha mkpa’” (Ịdị ọcha nime Obi [1988], 149).

  12. “Otịto dịrị Onyenwe anyị, nke Kachasi,” Hymns, no. 72.

  13. “Jizọs, Echiche ahụ banyere Gị,” Hymns, no. 141.

  14. Ọlụ 17:29.

  15. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:42–43.

  16. Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 14:7.

  17. “Enweghị onye ọbụlaghị ọzọ n’abụghị nanị Chineke nke matara uche gị nile na nzube nile nke obi gị.” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:16).

  18. “Ezi mmadu site n’ezi àkù nke obi ya n’eweputa ihe ahụ bụ ezi ihe; ma ajọ mmadu site kwa n’ajọ àkù nke obi ya n’eweputa ihe ahụ bụ ajọ ihe: n’ihi na site n’ihe nke obi nwebigara ókè ka ọnu ya n’ekwu okwu.” (Luk 6:45).

  19. Lee Russell M. Nelson, “Aha Ziri ezi nke Nzukọ nsọ,” Liahona, Nov. 2018, 87–89.

  20. Ọgbụgba ndụ anyị izu ụka ọbụla nime ekpere nke oriri nsọ bụ n’anyị ga “na-echeta ya oge niile” (Moronaị 4:3; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:77). Akwụkwọ nke Mọmọn na-agba anyị ume site ikwu okwu a ugboro abụọ, otu n’esochi ibe ya “cheta, cheta” (Mosaia 2:41; Alma 37:13; Helaman 5:9). Ịnwe ncheta nke ime mmụọ n’abịa site n’ike nke Mmụọ Nsọ: “Ọ ga-akuziri gị ihe niile, ma weta ihe niile na ncheta gị.” (Jọn 14:26).

  21. Russell M. Nelson, “Nụrụ Ya,” Liahona, May 2020, 90.

  22. Russell M. Nelson, “Ịdọbata Ike nke Jizọs Kraịst nime Ndụ anyị,” Liahona,, Me 2017, 41. Onyeisi. Nelson ekwuwo kwa, “Ọńụ ahụ [Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a] n’enwe nwere ntakịrị mmetụta nye ọnọdụ niile nke ndụ anyị ma ihe niile gbasara olileanya nke ndụ anyị.” (“Ọńụ na Ịnya ndụ nke Ime Mmụọ,” Liahona, Nov. 2016, 82).