Ọgbakọ Zuru ọha
Ndị ome udo Ka Achọrọ
Ọgbakọ Zuru ọha nke Eprel 2023


Ndị ome udo Ka Achọrọ

I nwere ohere nhọrọ gị iji họrọ esemokwu ma ọ bụ mkpezi. Ana m arịọsi unu ike ịhọrọ ịbụ onye ome udo, ugbua na mgbe niile.

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị m hụrụ naanya, ọ bụ ihe ọńụ ị nọnyere unu. Niime ọnwa isii ndị a gara aga, unu nọ m nobi ma na-ekpere m oge niile. Ana m ekpe ekpere ka Mmụọ Nsọ gwaruo unu ihe Onyenwe anyị ga-achọ ka unu nụ mgbe m na-ekwu okwu ugbua.

N’oge ọrụ ozuzu agụmakwụkwọ m dị ka onye dọkịnta ọtụtụ afọ gara aga, e nyeere m dọkịnta ọwa ahụ aka igbubi otu ụkwụ juputara na ọnya ọnwụnwụ na nreka dị egwu. Ọwụwa mma ahụ rara ahụ. Emesịa, ịgbakwunyere obi ịlọ mmiri ahụ, otu niime ndị otu ahụ rụrụ ọrụ ọjọọ, ma nnukwu iwe were dọkịnta ọwa ahụ ahụ. N’etiti oke iwe ọkụ ya, ọ tụpụrụ obere mma ọwụwa ahụ ya nke jupụtara na nje. Ọ danyere n’ogwe aka m!

Onye ọbụla nọ niime ụlọ ọwụwa ahụ ahụ—ewezuga dọkịnta ọwụwa ahụ ahụ na-amazighị onwe ya—tụrụ oke egwu maka mmebi usoro emume ọwụwa ahụ nke a dị egwu. N’obi ekele, ebuteghị m ọrịa. Mana nhụmiihe nke a nọgidere niime m ogologo oge. N’oge awa ahụ nnọọ, e kwere m onwe m nkwa na ihe ọbụla mere niime ọnụ ụlọ ọwụwụ ahụ m, na enweghị m ike ịdapụ na-ijikwata onwe m site na-iwe iwe. Ekwekwara m nkwa ụbọchị ahụ na enweghị m ike itufu ihe ọbụla n’iwe—ma ọ bụ na ọ bụ obere mma eji awa ahụ ma ọ bụ mkpụrụokwu.

Ọbụla ugbu a, ka ọtụtụ iri afọ gasịrị, ana m ahụta onwe m ka na-eche echiche na a sị na obere mma ọwụwa ahụ ahụ bu ọrịa dabara nogwe aka m nwere nsi karịrị nsi esemokwu nke na-emetụta mkparịta ụka obodo anyị na ọtụtụ mmekọrịta anyị na ibe anyị taa. Iche echiche ka mmadụ na ịdị mma eyiela ka ihe riri mbọ mbọ n’oge nke a juputara n’ịkpa oke na ọtụtụ nghọtahie na-emetụ n’obi.

Ikwu okwu rere ure, ime nnyochasị ihe na-enweghị isi, na ikwu okwu ọjọọ banyere ndị ọzọ bụcha ihe ndị a na-ahụkarị. Ọtụtụ ndị mụtara akwụkwọ nke ọma, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị na-eme ihe nkiri, na ndị na-eme ihe ndị ọzọ na-ekwu okwu mkparị esepụghị aka. Ọ na-ewute m nke ukwuu na ọtụtụ mmadụ na-adị ka ha na-ekwenye na ọ dị mma nụzọ niile ịma ikpe, ịkatọ, na imebi ezi aha onye ọbụla nke na-ekwnyereghị ha. Ọtụtụ dị na njikere imebi ezi aha ndị ọzọ site n’ikwu okwu na-akpasu iwe na ndị na-egbu mmụọ!

Iwe enweghị mgbe ọ na-akwagịde. Iro anaghị eme onye ọbụla mmadụ. Esemokwu anaghị eduba n’ụzọ nchọpụta sitere na mkpatemmụọ. Nke jọgburu onwe ya, mgbe ụfọdụ anyị na-ahụta agwa esemokwu ọbụla netiti onwe anyị. Anyị na-anụ maka ndị na-akparị di ha ma ọ bụ nwunye ha na ụmụ ha, banyere ndị ahụ na-eji ịba mba na-iwe na-achịkwa ndị ọzọ, nakwa banyere ndị ahụ ndị na-ata ndị otu ezi na ụlọ ahụhụ site na “ịdagbu ha naanya.” Anyị na-anụ maka ndị ntoroọbịa na ụmụntakịrị ndị ji ikike eyi ndị ọzọ egwu na maka ndị eweere n’ọrụ ndị na-ekwutọ ezi aha nke ndị ha na ha so arụ ọrụ.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, nke a ekwesịghị ịdị. Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, anyị ga-abụ ndị ọmụmaatụ nke otu esi akparịkọta anyị na ndị ọzọ—nke ka nke mgbe anyị nwere echiche dị iche iche. Otu niime ụzọ ndị kachasị mfe iji chọpụta ezigbo onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst bụ otu onye ahụ si na-eji ọmịiko emeso ndị ọzọ omume.

Onye Nzọpụta mere ka nke a doo anya niime okwu chukwu Ya nye ndị na-eso ụzọ n’ọkara ụwa abụọ. “Ngọzi na-adịrị ndị ome udo,” Ka O kwuru.1 “Onye ọbụla ọ bụ ga-akụ unu ihe na nti aka nri, tụgharịa kwara ya nti nke ọzọ.”2 Ma emesịa, n’ezia, Ọ dọrọ aka na ntị nke na-eche onye ọbụla niime anyị aka mgba: “Hụ ndị iro unu n’anya, gọzie ha bụ ndị na-akọcha unu, na-emere ndị kpọrọ unu asị ihe ọma, ma na-ekpere ndị na-eji unu eme ihe nleda anya ma na-esogbu unu ekpere.”3

Tupu ruo ọnwụ Ya, Onye nzọpụta nyere Ndị ozi Iri na abụọ Ya iwu ị hụkọrịta otu onye n’ibe ya n’anya dịka O siworo hụ ha naanya.4 Ma emesịa Ọ gbakwunyere, “Site otua ka ụmụ mmadụ niile si amata na unu bụ ndi na-eso ụzọ m, ọ bụrụ ma unu nwee ịhụnaanya onye ọbụla nye ibe ya.”5

Ozi nke Onye Nzọpụta doro anya: Ezi ndị na-eso ụzọ Ya na-ewu, na-ebuli elu, na-agba ume, na-akwagide, ma na-akpakemmụọ—na agbanyeghị otu ọnọdụ ahụ jiri sie ike. Ezigbo ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraist bụ ndị ome udo.6

Taa bụ Sọnde Igu Nkwụ Anyị na-akwado ime nkwanye ukwu nye mmemme kachasị mma nke ahụtụrụla n’elu ụwa, nke bụ Aja mgbaghara mmehie na Mbilite n’ọnwụ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Otu niime ụzọ kachasị mma anyị nwere ike iji kwanyere Onye Nzọpụta ugwu bụ ịghọ onye ome udo.7

Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta mere ka o kwe omume anyị imeri ajọọ ihe niile—tinyerekwara esemokwu. Enwekwala nghọtahie gbasara ya: esemokwu bụ ajọọ ihe! Jizọs Kraịst mara ọkwa na ndị ahụ nwere “mmụọ nke esemokwu“ abụghị ndị nke Ya, kama “ọ bụ nke ekwensu, onye bụ nna nke esemokwu, ma [ekwensu] na-akpalite obi ụmụ mmadụ iji iwe see okwu, otu onye na ibe ya.”8 Ndị ahụ na-akpake esemokwu na ewepụ otu ibe akwụkwọ site na akwụkwọ egwuregwu nke Ekwensu, ma ọ bụ na ha matara ya ma ọ bụ na ha amataghị. “Ọ dịghị onye nwere ike ife nna ukwu abụọ.”9 Anyị enweghị ike ịkwado Ekwensu site n’egbe ọnụ anyị ma mesịa chee na anyị ka nwekwara ike ijere Chineke ozi.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, otu anyị si emeso ndị ọzọ omume dịkwa mkpa n’ezie! Otu anyị si agwa ndị ọzọ okwu na otu anyị sị ekwu ihe gbasara ndị ọzọ n’ebe obibi, na nzukọ nsọ, n’ebe ọrụ, na n’ikuku dịcha mkpa. Taa, ana m arịọ anyị ka anyị na ndị ọzọ na-akpakọta n’ụzọ kacha elu, kacha dị nsọ. Biko gee ntị nke ọma. “Ọ bụrụ na e nwere ihe ọbụla nwere omume ọma, dị ezigbo mma, ma ọ bụ dị mma okwukwu ma ọ bụ inye otuto”10 nke ahụ ka anyị nwere ike ikwu gbasara onye ọzọ—ma ọ bụ niihu ya bụ nwoke ma ọ bụ na-azụ ya bụ nwanyị—nke ahụ kwesịrị ịbụ ọkọlọtọ mkparịta ụka anyị.

Ọ bụrụ na nwoke na nwanyị mere ọlụlụ nọ na ngalaba ukwu gị gbara alụkwaghịm, ma ọ bụ onye mgbasa ozi ọma nta alọta nebe obibi tupu ozuzu oge, ha achọghị ikpe ikpe gị. Ha kwesịrị inweta nhụmiihe ịhụnaanya Jizọs Kraịst na-enweghị ntụpọ egosịpụtara n’okwu na ihe omume gị niile.

Ọ bụrụ na otu enyi nọ na soshal medịa nwere nhụta ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ mmekọrịta ọha siri ike nke na-emebi ihe niile i kwenyere na ya, nzaghachị n’oke iwe, na-egbu obi si gị n’ọnụ agaghị enye aka. Iwu akwa mmiri niile nke nghọta ga-achọ ọtụtụ ihe site n’aka gị, mana nke ahụ bụ nnọọ ihe enyị gị chọrọ.

Esemokwu na-achụpụ Mmụọ ahụ—oge niile. Esemokwu na-eme echiche ụgha esie ike na izukọta ihu na ihu n’iwe bụ ụzọ esi edozi nghọtahie dị iche iche; mana onweghị mgbe ọ bụ ma ọli. Esemokwu bụ otu nhọrọ. Ime udo bụ otu nhọrọ. I nwere ohere nhọrọ gị ịhọrọ esemokwu ma ọ bụ mkpezi. Ana m arịọsi unu ike ịhọrọ ịbụ onye ome udo, ugbua na mgbe niile.11

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, anyị nwere ike gbanwee ụwa n’ụdị ya—otu onye na otu mkparịta ụka n’otu oge. Kedụ? Site na-igosịpụta otu esi achịkwata ndịiche niile nke echiche kwụọtọ site na nkwekọrịta nkwanye ugwu na mkparịta ụka na-enye nsọpụrụ.

Echiche gbara iche iche bụ akụkụ ihe dị na ndụ. Ana m arụ ọrụ ụbọchị niile mụ na ndị odibo nke Onyenwe anyị dị uchu n’ọrụ ndị na-anaghị ahụta ihe mgbe niile n’otu ụdị ụzọ. Ha maara na m chọrọ ịnụ echiche na mmetụta ha kwụ ọtọ gbasara ihe niile anyị kparịtara na nkata—nke ka nke ihe ndị na-enye oke mmetụta.

Foto, oyiyi
Onyeisi Dallin H. Oaks na Onyeisi Henry B. Eyring

Ndị ndụmọdụ abụọ m nwere nnukwu ugwu, Onyeisi Dallin H.Oaks na Onyeisi Henry B. Eyring, bụ ndị eji ama atụ n’ụzọ ha na-esi ekwupụta mmetụta ha—nke ka nke mgbe ha gbara iche iche n’echiche. Ha na-eme otu ahụ site n’ịhụnaanya na-enweghị ntụpọ n’ebe onye na ibe ya nọ. Onweghị onye niime ha na-atụ aro na ọ kachasịrị maara ma ya mere ahaghị ịgbalịsi ike chekwaa ọnọdụ ya. Onweghị onye niime ha na-ahụta mkpa ịsọ mpi ya na onye ọzọ. Niihi na onye ọbụla juputara na afọ ọma, “ịhụnaanya Jizọs Kraịst na-enweghị ntụpọ,” nkata anyị nwere ike bụrụ nke eduziri site na Mmụọ nke Onyenwe anyị. Lee ụdị ịhụnanya na nnukwu ugwu m nwere n’ebe nnukwu ndịikom abụọ ndị a nọ!

Afọ ọma bụ ajụire nye esemokwu. Afọ ọma bụ onyinye nke ime mmụọ nke na-enyere anyị aka wezuga mmadụ nke anụ ahụ, nke maara naanị onwe ya ma na-enye mgbochi, na-enwe mpako, ma na-ekwo ekworo. Afọ ọma bụ isi njiri mara nke ezi onye na-eso Jizọs Kraịst.13 Afọ ọma na-akọwa onye ome udo.

Mgbe anyị wedara onwe anyị ala niihu Chineke ma kpee ekpere jiri ume niile nke obi anyị, Chineke ga-enye anyị afọ ọma.14

Ndị agọziri site na onyinye nke a kachasị elu na enwe ogologo ntachi obi na obi ọma. Ha anaghị enwe ntaji anya nebe ndị ọzọ nọ ma otu ha dị anaghị ebu ha isi. Ha anaghị ewe iwe ọsịsọ ma naghị echere ndị ọzọ ihe ọjọọ.15

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ bụ azịza nye esemokwu ahụ nke na-esogbu anyị taa. Afọ ọma na-akwalite anyị ịganiihu “ibukọrịta ibu nke onye na ibe ya”16 karịa ibukwasị onye na ibe ya ibu. Ịhụnaanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ na-enye anyị ohere “iguzo dị ka ndị aka ebe nke Chineke oge niile na n’ihe niile”17nke ka nke n’ọnọdụ ndị siri ike. Afọ ọma na-enye anyị ohere igosịpụta otu ndịikom na ndịinyom nke Kraịst na-esi ekwu okwu ma na-eme ihe—nke ka nke mgbe ha nọ na nsogbu.

Ugbua, anaghị m ekwu okwu gbasara “udo na-otu ọbụla a chọrọ.”18 Ana m ekwu okwu banyere imeso ndị ọzọ omume n’ụzọ ndị kwụ chịm na-idobe ọgbụgba ndụ ị na-eme mgbe ị na-eri oriri nsọ. Anyi na-eme ọgbụgba ndụ mgbe niile icheta Onye Nzọpụta. Niime ọnọdụ ndị kpụ ọkụ nọnụ ma juputa na esemokwu, ana m akpọku gị ka icheta Jizọs Kraịst. Kpee ekpere inwe mgbam ume na amamiihe ikwu na ime ihe Ọ gaara eme. Dị ka anyị na-eso Onyeisi Udo, anyị ga-aghọ ndị ome udo Ya.

N’oge nke a i nwere ike ịna eche na ozi nke a ga-enyere onye ị maara aka n’ezie. Ikekwe ị na-atụanya na ọ ga-enyere ya bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị aka ịdị mma karịa n’ebe ị nọ. Ana atụanya na ọ ga-eme! Mana anakwa m atụanya na ị ga-eleba anya niime ime obi gị iji hụ ma enwere nkedo nke mpako ma ọ bụ ekworo nke na-egbochi gị site na-ịghọ onye ome udo.19

Ọ bụrụ na ị chọsiri ike niihe gbasara inye aka na-ikpokọta Izrel na gbasara iwulite mmekọrịta ndị ga-anọgide ruo ebighị ebi niile, ugbua bụ oge iji wezuga obi ilu. Ugbua bụ oge iji kwụsị ịdị na-ekwusi ike na ọ ga-abụ otu i si chọọ ma ọ bụ ọ gaghị eme. Ugbua bụ oge iji kwụsị ime ihe ndị ga-eme ndị ọzọ ejee ije n’elu mkpekere akwa n’ụjọ ịhapụ imebi ya Ugbua bụ oge ili ngwa agha nke agha.20 Ọ bụrụ na egbe ọnụ gị jupụtara na mkparị na ebubo, ugbua bụ oge iwezuga ha.21 Ị ga-ekuli dị ka nwoke ma ọ bụ nwannyị nke Kraịst gbasiri ike niime mmụọ.

Tempụl nwere ike inyere anyị aka na mbọ anyị. Ebe ahụ ka ana enye anyị onyinye dị nsọ juru nike nke Chineke, na-enye anyị ike imeri Ekwensu, onye njanye nke esemokwu niile .22 Wezuga ya na mmekọrịta gị niile! Mara na anyị nakwa abara onye iro mba oge ọbụla anyị meziri nghọtahie ma ọ bụ jụ iwe iwe. Kama, anyị nwere ike gosị obi ebere nke bụ ejiri mara ezigbote ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst. Ndị ome udo na-egbochi onye iro.

Ka anyị dị ka mmadụ ghọọ ezi ihe nọ nelu ugwu—ihe nke a na-enweghị ike izo ezo.”23 Ka anyị gosi na enwere ụzọ na-enye udo, nwere ugwu iji mezie ihe ndị gbagọrọ agbagọ na ụzọ juru na amamiihe iji dozie nghọtahie niile. Dị ka ị na-egosịpụta afọ ọma nke ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst na-egosịpụta, Onyenwe anyị ga-ebuli mbọ gị elu n’ụzọ kacha elu ị pụrụ ichetụ n’echiche.

Ojokolo ozi ọma bụ ojokolo kachasị ibu niime ụwa. Chineke akpọkuwo ndị niile ịbịakwute Ya, “ndị ojii na ndị ọcha, ndị oru na ndị nwe onwe ha, nwoke na nwanyị.”24 O here dịịrị onye niile. Ka osila dị, enweghị ohere maka akpamoke, amamikpe, ma ọ bụ esemokwu n’ụdị ọbụla.

Ezi ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, nke kacha mma ka na-abịa abịa maka ndị ahụ na-etinye ndụ ha n’iwulite ndị ọzọ. Taa ana m akpọku gị inyocha iso ụzọ gị niime ụzọ ị na-esi akpasu ndị ọzọ agwa. Ana m agọzi unu ime nhazigharị ọbụla nwere ike ịdị mkpa nke ọ ga-abụ na agwa unu ga-abụ nke otu ndị dị elu a na-akwanyere ugwu, na-enye nsọpụrụ, na onye na-anọchi anya ezi onye na-eso Jizọs Kraịst.

Ana m agọzi unu ijiri ịrịọsi arịrịọ ike dochie ọnọdụ ibu agha, jiri nghọta dochie ọnọdụ ọkpụkpọ asị, ma jiri udo dochie esemokwu.

Chineke dị ndụ! Jizọs bụ Kraịst ahụ. O guzo niisi nke Nzukọ nsọ nke a. Anyị bụ ndị odibo Ya. Ọ ga-enyere anyị aka ịghọ ndị ome udo Ya. Ana m agba ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.