Ọgbakọ Zuru ọha
Nkọwa Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, 2021
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Nkọwa Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, 2021

Maka Otù Ndịisi Mbụ nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a

Ụmụnne ndị Nwoke: Dịka mkpughe sịrị dị, dịka e dere nime nkeji 120 nke Ozizi na Ọgbụgbandụ niles, Òtù Kansụl maka Imefu Otu-ụzọ n’ụzọ iri nile—nke ndị mejupụtara ya bụ Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, ndị Kworum nke Ndị Ozi Iri Na Abụọ, na nke Ndị Ọchịchị Ụkọchukwụ—bụ ndị enyere ikike ịmefu ego nile nke Nzukọ-nsọ. Ngalaba Nzụkọ-nsọ nile, n’emefu ego nile dịka atụmatụ akwadoro maka mkpata na mmefu siri dị, dịkakwa otu iwu na usoro nile akwadoro sịrị dị.

Nnyocha Nzukọ nsọ, nke ndị nọ n’ime ya bụ ndị ọka mmụta ihe gbasara ego, ma ha enweghi ngalaba ọzọ nke Nzukọ nsọ nke ha nọ na okpuru ya, ha nwere oke na ọrụ ị mee nnyocha maka ị doo onye ọbụla anya gbasara ego niile e nwetara, mmefu niile e mere, nakwa nchekwa akụ na ụba niile nke Nzukọ nsọ.

Nihi nnyocha niile e mere, Ngalaba Nnyocha Nzukọ nsọ kwekọtara na dị ka ihe niile sịrị dị, ego niile a natara, mmefu niile e mere, na akụ na ụba niile nke Nzụkọ nsọ nke afọ 2021 ka edeworo ma mezuo dị ka atụmatụ nke Nzukọ nsọ kwadoro maka mkpata na mmefu siri dị, dị ka kwa otu iwu na usoro niile akwadoro sịrị dị. Nzukọ nsọ nke a, n’esorokwa nkuzi niile nke ha n’akụziri ndị otù ya maka ibi ndụ dị ka otu mkpa ego ha ha, hapụ iji ụgwọ, ma n’edebe ego maka oge mkpa.

N’obi nsọpụrụ ka anyị na enyefe ndekọta nke a.

Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ

Jared B. Larson

Onyeisi Njikwa