Ọgbakọ Zuru ọha
Ị Gwọ Ụwa
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Ị Gwọ Ụwa

Ọnya niile na ịdị iche niile ka e nwere ike imezi ma gwọọ mgbe anyị kwanyere Chineke ugwù, Nna nke anyị niile, na Jizọs Kraịst, Ọkpara Ya.

Ụmụnne nwoke na nwanyị, n’oge ebube nke Ista nke a, agọziri anyị izute ma nata ndụmọdụ na odudu site n’aka ndị oru nke Chineke.

Odudu dị nsọ na nkụzi niile sitere na Nna anyị nke Eluigwe n’enyere anyị aka ịgafee ndụ n’oge niile ndịa nke ize ndụ. Dị ka otu esiri buo n’amụma, “ọkụ niile, na oke ikuku mmiri niile,” “agha niile, asịrị niile nke agha niile, na ala ọma jijiji niile nʼọtụtụ ebe niile dị iche iche,” “na ụdị ihe arụ niile dị iche iche,”1 “ajọọ ahụhụ,”2 “oké unwu, na ọrịa na-efe efe”3 n’ekpochapụ ọtụtụ ezi na ụlọ, ogbe na ọbụna mba niile.

Enwere ihe mmekpa ahụ ọzọ nke n’agazụ ụwa ugbua: mbuso agha nye nnwere onwe okpukperechi nke mụ na gị. Mmetụta nke a n’eto eto chọrọ ị wepụ okpukperechi na okwukwe n’ime Chineke site na mbara ọha, ụlọakwukwọ niile, ihe nlere anya niile nke obodo na mkparịta ụka nke mmadụ na mmadụ. Ndị mmegide nnwere onwe nke okpukperechi n’achọ igbochi mkparịta ụka metụtara nkwenye niile nke si n’obi. Tụmadị, ha na-akọcha ma na-akwa omenaala niile nke okwukwe emo.

Ụdị agwa dị otua na-achụba mmadụ n’akụkụ, ọ n’ebelata ugwù ụkpụrụ nke onwe, izi ezi, nkwanye ugwù, agwa ime mmụọ na udo nke obi.

Kedụ ihe bụ nnwere onwe nke okpukperechi?

Ọ bụ nnwere onwe nke ife ofufe n’ụzọ ya niile: nnwere onwe nke ọgbakọ, nnwere onwe nke ikwu okwu, nnwere onwe nke ịme dị ka nkwenye nke onwe sịrị dị, na nnwere onwe maka ndị ọzọ ị mee otu ahụ. Nnwere onwe nke okpukperechi n’ahapụ anyị ka anyị kpebie n’onwe anyị ihe anyị kwenyere, otu anyị ga-esi ebi ma mee dị ka okwukwe anyị sịrị dị, ma ihe Chineke chọrọ n’aka anyị.

Mgbalị niile ndịa ịbelata nnwere onwe nke okpukperechi abụghị ihe ọhụrụ. Kemgbe agụgụala, ndị okpukperechi atawo nnukwu ahụhụ n’aka ndị ọzọ. Ndị otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a adịghị iche.

Site na mmalite anyị, ọtụtụ ndị na-achọ Chineke ka adọbatara na Nzukọ nsọ nke a n’ihi nkuzi ozizi dị nsọ ya, tinyekwara okwukwe n’ime Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, nchegharị, atụmatụ nke añụrị, na Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị.

Mmegide, mkpagbu, na omume isi ike dakwasịrị onye amụma mbụ anyị nke ụbọchị ikpeazụ, Josef Smit, ya na ndị n’eso ya.

N’etiti ọgbaghara nke 1842, Josef bipụtara ụkpụrụ ntọala nke Nzukọ nsọ nke a n’eto-eto, nke gụnyere nke a: “Anyị nabatara ohere nke ife Chineke Pụrụ Ime Ihe niile ofufe dị ka ọchịchọ nke mmụọ anyị siri dị, ma hapụkwara mmadụ niile otu ohere ahụ, ka ha fee ofufe otu, ebe, ma-ọbụ ihe ha chọrọ.”4

Okwu ya ka a na-agụnye, na-atọghapụ, ma dị nkwanye ugwù. Nke ahụ bụ nkọwa dị omimi nke nnwere onwe nke okpukperechi.

Onye amụma Josef Smith kwukwara:

“Obi siri m ike ikwupụta n’ihu Eluigwe na a dị m njikere ịnwụ ọnwụ n’ihi nchekwa nke ugwù niile nke onye Presbyterian, onye Baptist, ma ọ bụ nwoke agwa ọma nke okpukperechi ọbụla; nihi na otu ụdị ụkpụrụ ahụ nke ga-azọgide ugwù niile nke … Ndị nsọ ụkwụ, ga-azọgidekwa ugwù niile nke onye Roman, mọbụ nke okpukperechi ọbụla nke a n’amaghị ama mọbụ nke n’eweghi ike ịchekwa onwe ha.

“Ọ bụ ịhụnnanya maka nnwere onwe [na] akpali mkpụrụ obi m—nnwere onwe nke omume na nke okpukperechi maka agbụrụ ụmụ mmadụ niile.”5

N’agbanyeghi nke a, ndị otù isimbụ nke Nzukọ nsọ ka ebusoro agha ma chụpụ n’ebe dị oke anya, site na New York ruo Ohio ruo Missouri, ebe akanachị obodo ahụ wepụtara iwu na ndị otù Nzukọ nsọ bụ ndị “ekwesịrị ịkpaso agwa dị ka ndị iro ma ka egbuo ha mọbụ chụpụ ha site na steti ahụ.”6 Ha gbara ọsọ gbaba na Illinois, mana ntaramahụhụ ahụ gara n’ihu. Otu ìgwè mmadụ gburu Onye amụma Josef, wee n’eche na ogbugbu ya ga-ebibi Nzukọ nsọ ahụ ma gbasasịa ndi kwere ekwe. Mana ndị kwere ekwe nọgidere. Brigham Young onye nọchiri Josef, duuru puku kwuru puku mee njem ahụ ruru maịlụ 1,300 (2,100km) jewere ụzọ ọdịda anyanwụ ahụ ruo ebe ihe bụzi steti nke Utah.7 Ndị nnanna ochie nke mụ onwem so n’ime ndị isimbụ ahụ bịaruru ebe a.

Site n’ụbọchị niile nke oke mkpagbu ahụ, Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị etowo ruo ndị otù ruru nde 17, ihe gafere ọkara ya bị n’èzí United States.8

Na Eprel 2020, Nzukọ nsọ anyị mere mmemme ncheta afọ 200 nke Mnweghachi nke oziọma ahụ site n’ịwepụta nkwupụta nye ụwa, nke akwadoro site n’aka Ndịisi Mbụ anyị na ndị Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ. O bidoro, “N’obi nwayọ anyị na-ama ọkwa na Chineke hụrụ ụmụ Ya n’anya n’ime mba niile nke ụwa.”9

Onye amụma anyị hụrụ naanya, Russell M. Nelson, ekwuwo nke a:

“Anyị kwere na mnwere onwe, obi ebere, ma izi ezi maka ụmụ nile nke Chineke.

“Anyị niile bụ ụmụnne nwoke na nwanyị, onye ọbụla bụ nwa nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya. Ọkpara Ya Ọnyenwe anyị Jizọs Kraịst, na-akpọku ndị niile ịbịakwute Ya,‘ndị ojii na ndị ọcha, ndị oru na ndị nwe onwe ha, nwoke na nwanyị.’ (2 Nefi 26:33).”10

Soro m leeba anya n’ụzọ anọ nke obodo na mmadụ ga-esi erite uru site na nnwere onwe nke okpukperechi.

Nke mbụ. Nnwere onwe nke okpukperechi na-akwanye ugwù nye nnukwu iwu nsọ nke mbụ na nke abụọ, n’edobe Chineke n’etiti ndụ anyị niile. Anyi n’agụ na Matiu:

“Ị ga-ewere obi gị niile, na mkpụrụ obi gị niile, na uche gị niile hụ Onyenwe gị Chineke gị n’anya.”11

“Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị”12

Ma a nọ n’ime chapụl, synagogue, mosque, mọbụ ụlọaja akụrụ gbam gbam, ndị n’eso ụzọ Kraịst na ndị ọzọ niile kwere ekwe, nwere ike igosipụta nraranye ha na Chineke site n’ife Ya ofufe ma dị njikere ijere ụmụ Ya ozi.

Jizọs Kraịst bụ ọmụmatụ ahụ zuru oke maka ụdị ịhụnanya na ije ozi dị otu a. N’oge ozi nlekọta Ya, O lekọtara ndị ogbenye,13 gwọọ ndị nọ na ọrịa14 na ndị kpuru isi.15 O nyere ndị agụrụ na-agụ nri,16 gbasara ụmụaka aka Ya,17 ma gbaghara ndị ahụ mejọrọ Ya, tụmadị ndị kpọgburu Ya n’obe.18

Akwụkwọ nsọ kọwara na Jizọs “gagharịrị n’eme ihe ọma.”19 Anyị kwesịrị imekwa otu a.

Nke Abụọ. Nnwere onwe nke okpukperechi n’ewulite ngosipụta nke nkwenye, olileanya na udo.

Dị ka nzukọ nsọ, anyị jikọtara aka anyị ndị okpukperechi ndị ọzọ iji chekwa ndị okwukwe na nkwenye niile ma ugwù ha nwere iji kwupụta nkwenye niile ha. Nke a apụtaghị n’anyị nabatara nkwenye ha, mọbụ ha nabatara nke anyị. Kama anyị na ha nwere ihe njikọta karịa otu anyị na ndị ahụ nwere ọchịchọ ị kwuchi anyị ọnụ si nwee.

Oge n’eteghi aka, a nọchiri m anya Nzukọ nsọ n’ime Ọgbakọ Okpukperechi niile nke omenaafọ emere na Italy. E nwetere m mgbam ume mgbe m zutere ndị ndu gọmentị na okpukperechi si gburugburu ụwa. A matara m na ọnya niile na ịdị iche niile ka e nwere ike imezi ma gwọọ mgbe anyị kwanyere Chineke ugwù, Nna nke anyị niile, na Jizọs Kraịst, Ọkpara Ya. Nnukwu Ọgwọ ọrịa Ahụ nke onye niile bụ Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst.

Enwere ihe na-adọrọ mmasị merenụ dị ka m n’emechi okwu. Mmadụ asaa kwuru okwu na mbụ emechighi okwu ha n’ụdị omenaala ọbụla nke okwukwe mọbụ n’aha Chineke. Dị ka m n’ekwu, echere m, “A ga m ekwu naanị unu emeela ma ga nọdụ ala, ka ọbụ a ga m emechi ‘n’aha nke Jizọs Kraịst’?” E chetaram onye m bụ, ma a maara m na Onyenwe anyị ga-achọ ka m kwuo aha ya iji mechie ozi m. Nihi nke a, emere m otu ahụ. Mgbe m leghachiri anya n’azụ, ọ bụụrụ m ohere iji gosipụta nkwenye m; ma e nwere m nnwere onwe nke okpukperechi iji gbaa akaebe maka aha nsọ Ya.

Nke atọ. Okpukperechi n’akpali mmadụ ịnyere ndị ọzọ aka.

Mgbe ọbụla e nyere okpukperechi ohere na nnwere onwe ka o too eto, ndị okwukwe n’eje ozi ndị dị mfe ma mgbe ufọdụ nke dike. Okwu mgbe ochie nke ndị Juu “tikkun olam” nke pụtara “i mezi mọbụ gwọọ ụwa” ka a na-ahụta taa n’ime mgbalị niile nke ọtụtụ. Anyị ejikọtawa aka anyị na Catholic Charities, nke ama dị ka Caritas Internationalis, Islamic Relief, ma otù dị iche nke ndị Juu, Hindu, Buddhist, Sikh, ma otù Christian ndị ọzọ dị ka Salvation Army na National Christian Foundation. Site na njikọta aka, anyị ejeworo nde kwuru nde nọ na mkpa ozi, nke nso-nso a bụ ịnye ndị gbara ọsọ agha ụlọ ikwuu, akpati nrahụ ụra, na ihe oriri;20ma nrọpụta ọgwụ mgbochị, tinyekwara polio21na COVID.22 Ihe ndepụta ndị a n’eme toro ogologo, mana otu a ka mkpa niile dịkwa.

N’ajụghị ajụjụ, ndị okwukwe, mgbe ha rụkọrọ ọrụ ọnụ, nwere ike nye aka n’ụzọ pụrụiche. N’otu oge ahụ, ije ozi nke mmadụ na ibe ya bụ nke n’adịghị enwete ọjịja mana o jiri nwayọ n’agbanwe ọtụtụ ndụ.

Ana m eche maka ọmụmaatụ dị n’ime Luk mgbe Jizọs Kraịst setịpụrụ aka ya nye nwanyị isi mkpe nke Nain ahụ. Jizọs, ya ndị igwè ndị n’eso ya, bịakwutere ndị bu ozu nke nwa nwoke nke nwanyị isi mkpe ahụ. Nihi ọ nọghịzi ya, ihe mmebi n’adakwasị ya bụ nke mmetụta uche, nke ime mmụọ makwa nke mkpata ego. Jizọs, mgbe ọ hụrụ ihu ya nke anya mmiri juputara, kwuru sị, “Ebezina.”23 Ma emesịa, ọ kpasara akwụ ahụ bụ ozu ya aka, ma ndị bu ozu akwụsị.

“Nwa okorobia,” Ka Ọ nyere n’iwu, “A si m gị, Bilie.

“Ma onye ahụ nke nwụrụ anwụ wee bilie nọdụ ọdụ, ma bido kwuwe okwu. Ma [Jizọs] akpọgara ya nne ya.”24

Ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ bụ ọrụ ebube, mana omume ebere ọbụla na nchegbu maka onye na-adọlị ndọlị bụ ụzọ ọgbụgba ndụ nke ọnye ọbụla n’ime anyị ga-enwekwa ike “[gaa] ma mee ihe ọma,” ma mata na “Chineke [nọnyeere] [anyị].”25

Ma nke anọ. Nnwere onwe nke okpukperechi n’eme dị ka ihe njikọta na ike mgbakwuru maka ihazi agwa na ezi omume niile.

N’ime Agba Ọhụrụ, anyị n’agụta na ọtụtụ chigharịrị pụọ n’ebe Kraịst nọ, wee na-atamu maka ozizi Ya, “Nke a bụ ihe siri ike ikwu; onye ga-anụ ya?”26

Mkpu ahụ ka a ka na-anụ taa site na ndị ahụ n’achọ ịchụpụ okpukperechi site na mkparịta ụka ma ka ọ ghara ịnwe ike mmetụta. Ọbụrụ na okpukperechi anọghị ebe ahụ ị nye aka n’ịhazi omume ma belata oge ihe isi ike, onye ga-anọ n’ebe ahụ? Onye ga-akụzi ịkwụwa ọtọ, inwe obi ekele, mgbaghara, ma ndidi? Onye ga-egosipụta afọ ọma, ọmịiko, na obi ebere nye ndị ahụ echefuru echefu ma ndị azọgidere n’ala? Onye ga-anabata ndị ahụ dị iche ma n’agbanyeghi kwa tozuo ihe ruru ha, nihi onye niile bụ ụmụ nke Chineke? Onye ga-agbasa aka ya nye ndị ahụ nọ na mkpa ma n’achọ ịkwụghachu ụgwọ ha? Onye ga-akwanye ugwù nye udo ma rube isi nye iwu niile ahụ karịrịrị nke n’ewu-ewu nke taa? Onye ga-aza arịrịọ nke Onye nzọpụta “Gawa, ma mee otu ahụkwa”?27

Anyi ga-eme! Eeh, ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, anyị ga-eme ya.

A nam akpoku unu ka unu soro lụwa agha nke ịnwete nnwere onwe nke okpukperechi. Ọ bụ ihe ngosipụta ụkpụrụ ohere nhọrọ nke Chineke nyere.

Nnwere onwe nke okpukperechi bụ ihe ogbugbo n’etiti echiche niile ndị n’ama ibe ha aka. Ihe ọma dị n’ime okpukperechi, ebe nsọtụ ya niile, ma omume kwa ụbọchị nke ịhụnanya nke okpukperechi n’akpali n’obi n’amụba naanị mgbe anyị chekwara nnwere onwe nke ikwupụta obi ma mee ihe dị ka nkwenye anyị sịrị dị.

A na m agba ama na Onyeisi Russell M. Nelson bụ onye amụma Chineke dị ndụ. A na m agba ama na Jizọs Kraịst nọ n’isi ma n’edu Nzukọ nsọ nke a. Ọ tụrụ aja maka mmehie niile anyị, akpọgidere ya n’obe, ma bilie n’ọnwụ n’ụbọchị nke atọ.28 N’ihi Ya, anyị nwere ike i bi ndụ ọzọ ruo ebighi ebi; ma ndị ahụ nwekwara ụdị ọchịchọ nke a nwere ike ibinyere Nna anyị nke Eluigwe. Eziokwu nke a ka m n’ekwupụtara ụwa niile Enwere m obi ekele maka nnwere onwe iji mee nke a. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen