Ọgbakọ Zuru ọha
Ọdịdị Gị si na Chi na Akaraka dị Ebighị ebi
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Ọdịdị Gị si na Chi na Akaraka dị Ebighị ebi

Ana m akpoku unu ka unu dobe ndụ unu n’etiti Jizọs Kraịst ma cheta ntọala eziokwu niile dị nime isiokwu nke Ndị Iyom Nta ahụ.

Ụmụnne ndị nwanyị ọma, unu emela maka ị nọ ebe a. Ọ bụ ugwu nyere m isonye nime ogbakọ zuru ọha nke Ndị Iyom nke a. N’otu oge e nwetawo m ohere i jee klasị niile nke Ndị Iyom Nta. Mana ka m rụtụ aka ihe doro anya—A bụghị m nwata, ma abụghịkwa m nwanyị! Amụtawo m, nagbanyeghi, na o dịghị ka m bụ onye furu efu mọbụrụ na m ga-esoro ndị iyom nta gụọ isiokwu Ndị Iyom Nta. Ozizi pụrụ iche nke akụziri nime isiokwu Ndị Iyom Nta ahụ1 dị mkpa maka ndị iyom nta, mana ọ gbasakwara onye niile, tinyekwara ndị ahụ nime anyị n’abụghị ndị iyom nta.

Isiokwu Ndị Iyom Nta bidoro otua, “Abụ m nwada nke nne na nna nke eluigwe hụrụ naanya, nwere ọdịdị dị nsọ na akaraka dị ebighị ebi.”2 Okwu a nwere eziokwu anọ dị mkpa. Nke mbụ, ị bụ nwada ahụrụ naanya. Enweghi ịhe ị ga-eme—mọbụ nke ị gaghị eme—nwere ike ịgbanwo nke ahụ. Chineke hụrụ gị n’anya nihi ị bụ nwa Ya nke nwanyị nke mmụọ. Mgbe ụfọdụ, anyị agaghị enwe mmetụta ịhụnaanya Ya, mana ọ nọ ebe ahụ mgbe niile. Ịhụnaanya nke Chineke zuru oke.3 Ume anyị nwere iji nwete mmetụta ahụ adịghị otu ahụ.

Mmụọ ahụ na-arụ ọrụ dị mkpa iji gosi anyị ịhụnaanya Chineke.4 N’agbanyeghi, mmetụta nke Mmụọ Nsọ ka enwere ike ikpuchi “site na mmetụta niile nke siri ike nke obi, dị ka iwe, ịkpọ asị, … [mọbụ] ụjọ, … dị ka ịgba mbọ ị nụ ụtọ nke mkpụrụ osisi grape mgbe ị natakwa ose jalapeño. … [Ụtọ nke otu] n’emeri kpam kpam nke ọzọ.”5 Otu ahụ kwa, agwa ndị nke n’ewezuga anyị nso n’ebe Mmụọ Nsọ nọ, nke gụnyere mmehie,6 n’eme ka ọ raa anyị ahụ ị nụta ịhụnaanya Chineke nwere maka anyị.

N’otu aka ahụ, mmetụta anyị n’enwe maka ịhụnanya Chineke nwere ike nyụọ nkọ nihi ọnọdụ ịma aka niile, ma nrịanrịa nke anụ ahụ mọbụ nke uche, tinykwara ndị ọzọ. N’ihe ndịa niile, ndụmọdụ nke ndị ndu dị ntụkwasị obi mọbụ ndị ọka mmụta nwere ike baa ezigbo uru. Anyị nwekwara ike gba mbọ iwulite ike anyị ji anụta ịhụnanya Chineke site n’ịjụ onwe anyị ajụjụ, “Ịhụnanya m nwere maka Chineke ọ guzoro kwem, mọbụ na m hụrụ Ya nanya mgbe m nwere ụbọchị ọma n’abụghị mgbe m nwere ụbọchị ọjọọ?”

Eziokwu nke abụọ bụ n’anyị nwere nne na nna nke eluigwe.7 Ozizi maka Nne nke Eluigwe n’abịa site na mkpughe ma ọ bụ nkwenye ejirimara dị n’etiti Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ. Onyeisi Dallin H. Oaks akọwawo mkpa dị nime eziokwu nke a: “Nkuzi okpukperechi anyị n’ebido site na nne na Nna nke eluigwe. Ebumnobi anyị nke kacha elu bụ ị dị ka ha.”8

Ihe ntakịrị ka ekpughere banyere Nne nke Eluigwe, mana ihe nke anyị maara ka apịakọtara ọnụ nime ederede isiokwu nke oziọma nke a ga-achọta nime app nke Ọdọ Oziọma anyị.9 N’otu ntabi anya ị gụrụ ịhe nọ ebe ahụ, ị ga-amata ịhe niile nke m maara maka isiokwu ahụ. A chọkwara m ị mata karịa. Ị nwere ike ịnwekwara ajụjụ ma chọọ ị chọta azịza karịa. Ị chọ nghọta ọzọ bụ otu akụkụ dị mkpa maka mwulite nke ime mmụọ anyị, mana biko kpachara anya. Ịche echiche a gaghị anọchi anya mkpughe.

Nchefe echiche agaghị ewete nnukwu mmata ihe nke ime mmụọ mana ọ nwere ike butere anyị nghogbu mọbụ bupu uche anyị site n’ihe nke ekpugheworo.10 N’ịmatụ, Onye Nzọpụta kuziri ndị n’eso ụzọ Ya, “Unu ga na-ekpere Nna oge nile n’aha m.”11 Anyị n’eso atụmatụ nke a ma anyị na efe ofufe nye Nna nke Eluigwe n’aha nke Jizọs Kraịst ma anyị anaghị ekpeere Nne nke Eluigwe.12

Ka mgbe Chineke kpọrọ ndị amụma, ha anatawo ikike ikwu okwu n’aha Ya. Mana ha anaghị ekwupụta ozizi niile nke ha rọpụtara “n’ọnwe ha site n’uche [ha]”13 mọbụ kuzie ihe a na-ekpughebeghi. Cheegodi maka okwu niile nke Balam bụ onye amụma nke Agba Ochie, onye e nyere ngarị ka ọ bụọ Ndị Izrel ọnụ maka uru Moab. Balaam kwuru, “Ọ bụrụ na [eze nke Moab] ga-enye m ụlọ ya nke jupụtara na ọlanchara na ọlaedo, a gaghịm ekwu karịa okwu nke Onyenwem Chineke m nyere m, mọbụ mee nke karịrị nta mọbụ ukwu.”14 N’otu aka ahụ ndị amụma nke ụbọchị ikpeazụ enweghikwa ụdị ike ahụ. Ị machi Chineke n’olu ka ọ nye gị mkpughe bụ enweghi nsọpụrụ ma ọ nweghikwa isi. Kama, anyị ga-echere Onyenwe anyị ma n’oge Ya ka ọ kpughee eziokwu Ya niile site n’ụzọ nke Ọ hiwere.15

Eziokwu nke atọ nime mmepe okwu nke isiokwu ndị Iyom Nta ahụ bụ na anyị nwere “ụdị ọdịdị nsọ.” Nke a dị oke mkpa maka onye anyị bụ. Ọ bụ “ejirimara” nke ime mmụọ nke anyị nwetere site n’aka ndị nne na nna anyị nke eluigwe,16 ma enweghi ọrụ dịịrị anyị ga-eme maka ya. Nke a bụ ejirimara anyị nke kacha dị oke mkpa, nagbanyeghi otu ọbụla anyị họọrọ iji kọwaa onye anyị bụ. Ịghọta nnukwu eziokwu nke a dị mkpa maka onye ọbụla mana nke ka nke maka ndị ahụ sonyere n’otù ndị achụpụrụ n’akụkụ, ndị emegidere mọbụ pịgịde n’ala ka mgbe agụgụala nke ụwa. Chetakwa na ejirimara gi nke kachasị mkpa metụtara ụdị okike nsọ nke gị dị ka nwa nke Chineke.

Eziokwu nke anọ bụ n’anyị nwere “akaraka nke ebighi ebi.” Ụdị akaraka nke a abụghị nke a ga-anyawa anyị n’olu. Mgbe ọnwụ gafesịrị, anyị ga-anata ịhe anyị tozuru ịnata ma “ga-an̄ụrị ọn̄ụ [naanị] maka nke ahụ [anyị] dị na njikere ị nata,”17 Wee na-amata na akaraka nke ebighi ebi anyị dabere n’elu nhọrọ niile anyị. Ịhe ọ chọrọ bụ ị mee ma idobe ọgbụgbandụ niile dị nsọ. Okporo ụzọ ọgbụgbandụ nke a bụ ụzọ anyị ji abịakwute Kraịst ma ọ dabere n’elu eziokwu kwụrụ chim ma dị ebighiebi, iwu n’adịghị agbanwe agbanwe. Anyị agaghi ekepụta okporo ụzọ nke onwe anyị ma chọkwa ịhe mpụta niile Chineke kwere na nkwa. Ị chọọ ngọzị niile Ya mgbe anyị n’anaghị esoro iwu ebighi ebi nke dabere n’elu ha18 bụ ịhe nduhie, dị ka ịche n’anyị ga-akpasa stove dị ọkụ aka ma “kpebie” na ọ gaghị ere anyị ọkụ.

Ị nwere ike ị mara na a bụbụrụm onye n’agwọ ndị nrịanrịa nwere nkuchi obi. Ọgwụgwọ kacha mma ndị enwetere bụ nihi na esoro atụmatụ ọgwụgwọ ehiwere nke enyochaworo ọfụma. N’agbanyeghi na ha mara nke a, ụfọdụ ndị nrịanrịa n’ekwu na ha chọrọ atụmatụ ọgwụgwọ ọzọ. Ha kwuru, “A chọghịm ị ñụ ọtụtụ ọgwụ” mọbụ “A chọghịm ị mee ọtụtụ mnwale nnyochaa.” N’ezie, ndị nrịanrịa ahụ nwere nhọrọ onwe ha ịme mkpebi obi ha, mana ọ bụrụ na ha hapụ atụmatụ ọgwụgwọ nke dị mma, ịhe nchọpụta ha ga-ata ahụhụ. Ndị nrịanrịa nwere obi nkuchi enweghi ike ịhọrọ atụmatụ n’adịghị mma ma emesịa ha ama onye dọkịnta ha ikpe maka ndapụta ndị n’adịghị mma.

Nke a bụkwa eziokwu maka anyị niile. Atụmatụ nke Nna nke Eluigwe rọpụtara n’ebute ihe ndapụta kacha mma nke ebighi ebi. Anyị nwere ohere nhọrọ, mana anyị agaghi ahọrọ ihe ndapụta niile nke sitere na ị hapụ isoro okporo ụzọ ahụ nke ekpughere.19 Onyenwe anyị kwuru, “Nke ahụ nke na-emebi iwu ma n’anaghị erube isi n’iwu, mana na-achọ ịbụ iwu nye onwe ya, … enweghi ike ido ya nsọ site n’ịwụ, ọbụghị ma-ọbụ site n’ebere, ikpe ziri-ezi, ma-ọbụ ikpe.”20 Anyị enweghi ike isi n’ụzọ nke Nna nke Eluigwe pụọ ma emesịa taa Ya ụta maka ndapụta ndị n’adịghị mma.

Amaokwu nke abụọ dị nime isiokwu nke Ndị Iyom Nta ahụ n’ekwu: “Dị ka onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst, a na m agbasi mbọ ike ịdị ka Ya. A na m achọ mkpughe nke onwe ma na-etinye ya n’ọrụ na-elekọta ndị ọzọ n’aha nsọ Ya.” Anyị nwere ike ịnwete ọgbụgba ama nke Jịzọs Kraịst site na ime ihe n’okwukwe.21 Anyị nwere ike ị nwete onyinye nsọ ahụ “ị mata na Kraịst bụ Ọkpara nke Chineke, ma na a kpọgburu ya n’ihi mmehie nile nke ụwa.” Mọbụ anyị nwere ike ịnata onyinye nke ịkwere n’okwu niile nke ndị ahụ ma ya,22 ruo mgbe anyị matara ya n’onwe anyị. Anyị nwere ike isoro nkụzi niile nke Onye Nzọpụta ma nyere ndị ọzọ aka bịakwute Ya. Site n’ụzọ nke a, anyị esonye ya nime ọrụ Ya.23

Isiokwu nke Ndị Iyom Nta gara n’ihu, “A ga m eguzo ka onye ama Chineke oge niile na n’ihe niile nakwa na-ebe niile.” Ndị otù niile nke Nzukọ nsọ ahụ ka achọrọ ka ha bụrụ ndị ama nke Chineke,24 nagbanyeghi na Ndị Ọzi na ndị Iri Asaa ka akpọrọ ị bụ ndị ama pụrụiche nke aha nke Kraịst.25 Legodu otu ọdị na nime nsọ mkpi egwuruegwu sọkaa nke nani ọche gol n’echekwa ịnye gol. Ma enweghi enyemaka nke ndị otù ya, ọche gol ahụ agaghị enwe ike ịchekwa ịnye gol, ma ndị otù ya ga adarịrị mgbe niile. N’otu aka ahụkwa, onye ọbụla dị mkpa nime otù nke Onyenwe anyị.26

Amaokwu nke ikpeazụ nke isiokwu nke Ndị Iyom Nta ahụ bidoro otu a, “Dị ka m na-agbasi mbọ ike itozu oke maka mbuli elu, onyinye nke nchegharị na-amasị m nke ukwuu ma a na m achọ ka ndụ m na-adịwanye mma ụbọchị ọbụla.” Nihi aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, anyị nwere ike ịchegharị, mụta ihe site na njehie niile anyị, ma ghara ima anyị ikpe site na ha. Onyeisi Russell M. Nelson kụziri: “Ọtụtụ mmadụ n’ewere nchegharị dị ka ntarama ahụhụ. … Mana echiche nke-a na nchegharị bụ ntarama-ahụhụ bụ nrọpụta nke Setan. Ọ na-chọ i gbochi anyị k’anyị ghara ị lekwasị Jizọs Kraịst anya, ọnye guzoro-ọtọ ma gbasaara anyị aka ya, nwee olileanya ma dị na njikere ị gwọ, ị gbaghara, ị sacha, ị gba ume, ma ị mee k’anyị dị nsọ.”27

Mgbe anyị nwere ezigbo nchegharị, enweghi ọnya ime mmụọ nke ga-afọnụ, n’agbanyeghi ihe nke anyị meworo, otu ịdị ukwuu ya dị, mọbụ ugboro ole anyị megharịrị ya.28 Ma ugbọrọ ole ọbụla nke anyị chegharịrị ma chọọ mgbaghara mmehie jiri ezigbote ebum-nʼobi, a ga-agbaghara anyị.29 Nke a bụ onyinye chapụrụ achapụ sitere na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst!30 Mmụọ Nsọ ahụ ga-akasị anyị obi na agbagharawo anyị. Dị ka anyị n’enwe mmetụta ọñụ na udo,31 a ga-azachapụ ikpe ọmụma,32 ma anyị agaghị enwezi ntarama ahụhụ nke mmehie anyị.33

Ọbụna mgbe anyị nwere ezigbo nchegharị, otú ọ dị, anyị nwere ike sụọ ngọngọ. Isụ ngọngọ apụtaghị na nchegharị ahụ ezughi ezu mana ọ nwere ike ọ n’egosi adịghị ike nke mmadụ. Ọ bụ ihe nkasị obi ịmata na “Onyenwe anyị na-ahụta adịghị ike niile n’ụzọ dị iche iche karịa otu O sị [ahụta] nnupu isi.” Anyị ekwesịghị ịnwe obi abụọ maka ume Onye Nzọpụta nwere maka ịnyere anyị aka nime adịghị ike niile anyị nihi “mgbe ọbụla Onyenwe anyị n’ekwu maka adịghị ike niile, ọ na-abụkarị n’olu ebere.”34

Isiokwu nke Iyom Nta ahụ mechiri site na nke a, “Site na okwukwe, a ga m akwalite ebe obibi m na ezinaụlọ m, mee ma dobe ọgbụgba ndụ niile dị nsọ, ma nata emume nsọ niile na ngọzi niile nke tempụl dị nsọ.” Ịgba ebe obibi na ezinụlọ ume pụtara ịrọpụta ihe njikọ nke mbụ nime ụdọ-igwe nke ikwesị ntụkwasị obi, wee buru ihe nketa nke okwukwe, mọbụ n’eweghachi ya azụ.35 N’agbanyeghị, ume n’abịa site na okwukwe nime Jizọs Kraịst ma n’idobe ọgbụgbandụ ndị dị nsọ.

N’ime tempụl, anyị n’amụta onye anyị bụ na n’ebe anyị nọburu na mbụ. Onye ọkà ihe ọmụma nke Roman bụ Cicero kwuru, “Ọbụrụ na amaghi maka ihe mere na mbụ tupu ọmụmụ gị, ọ pụtara ị ga-anọgide mgbe niile dị ka nwata.”36 N’ezie, ihe ọ na-ekwu maka ya bụ maka agụgụala nke ụwa, mana ihe nchọpụta nke ya nke a, ka enwere ike ị mụbakwa. Anyị bi mgbe niile dị ka ụmụaka mọbụrụ n’anyị amaghị maka echiche ebighi ebi nke a na-enwete niime tempụl niile. N’ebe ahụ, anyị n’eto nime Onyenwe anyị, “na anata Mmụọ Nsọ n’uju ya,”37 ma bụrụ ndị n’eso uzọ Onye Nzọpụta ndị tinyesịworo uchu ha n’uju ya.38 Dị ka anyị n’edobe ọgbụgba ndụ anyị niile, anyị n’anata ike Chineke nime ndụ anyị niile.39

Ana m akpoku unu ka unu dobe ndụ unu n’etiti Jizọs Kraịst ma cheta ntọala eziokwu niile dị nime isiokwu nke Ndị Iyom Nta ahụ. Ọ bụrụ na ịdị na njikere, Mmụọ Nsọ ga-eduru gị. Nna anyị nke Eluigwe chọrọ ka gị bụrụ nwa nketa Ya ma nata ịhe niile nke Ọ nwere.40 Ọ gaghị enye gị karịa otu a. Ọ gaghị ekwe gị nkwa karịa otu a. Ọ hụrụ gị nanya karịa otu ịma ma chọọ ka ị nwe añụrị nime ndụ nke a ma na ndụ nke n’abịa. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen