Ọgbakọ Zuru ọha
Vidio: “Unu bụ Ụmụnwanyị ndị Ọ Hụrụ N’Ọhù”
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Vidio: “Unu bụ Ụmụnwanyị ndị Ọ Hụrụ N’Ọhù”

N’afọ 1979 Onyeisi Spencer W. Kimball nọ na ụlọ ọgwụ ma rịọ nwunye ya, Camilla, ka ọ gụọ okwu ya nye n’otu nzukọ nke ụmụnwanyị zuruọha.

Nwanne nwanyị Camilla Kimball: “Nnukwu uto kacha nke na-abịara Nzukọ nsọ n’ụbọchi ikpeazụ ndị a ga-abịa n’ihi na ọtụtụ ezigbo ụmụnwanyị nke ụwa (n’onye nke enwere mgbe ụfọdụ ụdị ime uche nke ime mmụọ) ka a ga-akpọbata na Nzukọ nsọ na ọnụ ọgụgụ dị ọtụtụ. Nke a ga-eme nihi na ụmụnwanyị nke Nzukọ nsọ ga-egosi eziomume na mkpakọta ọnụ n’ime ndụ ha ma nihi na ụmụnwanyị nke Nzukọ nsọ ka a na-ahụ dị ka ndị pụtara ihè nke ọma ma dị iche—n’ụzọ niile n’enye ọńụ—site na ụmụnwanyị nke ụwa.”1

Onyeisi Russell M. Nelson: “Ezi ụmụnne m ndị nwanyị, unu ndị bụ ndị otù anyị dị mkpa n’oge nkwachị a, ụbọchị ahụ nke Onyeisi Kimball hụrụ n’ọhù bụ taa. Unu bụ ụmụnwanyị ọ hụrụ n’ọhù! Omume ọma, ihè, ịhụnaanya, ume, agwa, okwukwe, na ndụ ezi omume gị niile ga-akpọbata ezigbo ụmụnwanyị nke ụwa, ha na ezi na ụlọ ha, na Nzukọ nsọ n’ọnụọgụgụ a n’apụghị ịgụta!

“Anyị … chọrọ ume unu, mgbanwe unu, nkwenye unu, ike unu iji duo, amamihe unu, na olu unu. Alaeze nke Chineke abụghị ma ọ gaghị ezu ezu ma ewezuga ụmụnwanyị ndị na-eme ọgbụgba ndụ dị nsọ ma mgbe ahụ debe ha, ụmụnwanyị ndị nwere ike iji ike na ikike nke Chineke kwuo okwu! …

“… Agbanyeghi nke bụ ọkpụkpọ okù unu, ihe ọbụla bụ ọnọdụ unu, anyị chọrọ echiche unu, nghọta unu na mkpate mmụọ unu. Anyị chọrọ ka unu kwulite okwu ma kwupụta okwu na kansụl ngalaba ukwu na nke stek. Anyị chọrọ ka nwanne nwanyị ọbụla lụrụ di kwuo okwu dị ka ‘onye mmekọ na-atụpụta uche ma zuo oke’ dị ka unu n’ejikọ aka unu na di unu n’iduzi ezi na ụlọ unu. Ma ị lụọla ma ị nọọrọ onwe gị, unu bụ ụmụnne nwanyị nwere ike pụtara ihè na akọnuche pụrụ iche unu nataworo dị ka onyinye sitere n’aka Chineke. Anyị ụmụnne ndị nwoke enweghị ike imepụtali ụdị mmetụta pụrụ iche nke unu.

“Anyị maara na emume mmechi nke okike niile bụ okike nke nwanyị! Anyị chọrọ ume unu! …

“… Ana m ekele unu, ezi ụmụnne m ndị nwanyị, ma na-agọzi unu ibili ruo ogo gị n’uju, imejupụta atụ nke okike gị, dị ka anyị n’eje ije aka na aka n’ọrụ dị nsọ nke a. N’ịdị n’otu, anyị ga-enye aka kwadoo ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Onyenwe anyị.”2

Hụba-ama

  1. Nkuzi niile nke Ndịisi niile nke Nzukọ nsọ ahụ: Spencer W. Kimball (2006), 222-23.

  2. Russell M. Nelson, “Arịrịọ nye Ụmụnne M Nwanyị,” Ensign ma ọ bụ Liahona, Nov. 2015, 96, 97.