Ọgbakọ Zuru ọha
Kraịst Na-agwọ Ihe Nke Ghasara aghasa
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Kraịst Na-agwọ Ihe Nke Ghasara aghasa

O nwere ike ịgwọ mmekọrịta anyị na Chineke nke ghasara aghasa, mmekọrịta anyị na ndị ọzọ ghasara aghasa, na akụkụ ndị ghasara aghasa nke onwe anyị.

Afọ ole ma ole gara aga, na ọgbakọ ezi na ụlọ, William nwa nwanne m gbara-afọ-asatọ-mgbe-ahụ jụrụ nwa anyị nwoke kachasị okenye, Briton, ma ọ ga-amasị ya isoro ya gbaa bọọlụ. Briton n’oke mmasị zaghachịrị, “Ee! Ọ ga-amasị m! Mgbe ha gwuwororii egwuregwu ezigbo oge, bọọlụ dapụrụ Briton n’aka, na mberede tiwaa otu n’ime ite ihe ncheta nke nne na nna nnukwu ya.

Obi jọrọ Briton njọ. Dị ka ọ malitere na-atụtụlite iberibe ndị tiwara etiwa, William gakwuuru nwa nwanne nna ya ma n’ịhụnaanya kụtụ ya aka na-azụ. Mgbe ahụ ya agbaa ya ume, “Enyela onwe gị nsogbu, Briton. Enwere ihe m tiwara n’ụlọ Mama nnukwu na Papa nnukwu otu mgbe, ma Mama nnukwu konyere m ogwe aka ya ma sị, ‘Ọ dị mma William. Ị dị naanị afọ ise.’”

Nke Briton zaghachịrị, “Mana, William, a dị m afọ 23!”

Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe site na akwụkwọ nsọ banyere otu Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, ga-esi enyere anyị aka nyagharịa nke ọma ihe niile dị n’ime ndụ anyị ndị tiwara etiwa, na-agbanyeghị afọ ole anyị gbara. O nwere ike ịgwọ mmekọrịta anyị na Chineke nke ghasara aghasa, mmekọrịta anyị na ndị ọzọ ghasara aghasa, na akụkụ ndị ghasara aghasa nke onwe anyị.

Mmekọrịta Ghasara aghasa nke anyị na Chineke

Mgbe Onye nzọpụta naara akụzi ihe n’ime temple, otu nwanyị ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii kpọtaara Ya. Anyị amaghị akụkọ ya n’uju, naanị na e “weere ya n’ịkwa iko.”1 Ọtụtụ mgbe akwụkwọ nsọ n’enye naanị obere akụkụ nke ndụ mmadụ, ma n’ịdabere na akụkụ nke ahụ, anyị mgbe ụfọdụ na-achọsị ike ibuli elu ma ọ bụ ịma ikpe. Enweghị ndụ onye ọbụla enwere ike ịghọta naanị site n’otu ọmarịcha oge ma ọ bụ otu ndakpọ olileanya jọrọ njọ nke ọha. Nzube ndekọihe nke akwụkwọ nsọ ndị a bụ iji nyere anyị aka hụta na Jizọs Kraịst bụụrụ azịza mgbe ahụ, ma Ọ bụkwa azịza ugbua. Ọ maara akụkọ anyị zuru oke na kpom kwem ihe anyị na-agabiga, tinyekwara ị dị ike na adịghị ike anyị niile.

Nzaghachi nke Kraịst nye ọmarịcha nwaada nke Chineke nke a bụ “Ọ bụghị ma M na-ama gị ikpe: gawa, ma emehiekwala ọzọ.”2 Ụzọ ọzọ iji sị “gawa, ma emehiekwala ọzọ” nwere ike bụrụ “gaaniihu ma gbanwee.” Onye Nzọpụta naara akpọku ya ichegharị: ịgbanwe agwa ya, mkpakọrịta ya niile, otu o si eche gbasara onwe ya, obi ya.

N’ihi Kraịst, mkpebi anyị “ịganiihu ma gbanwee” nwekwara ike nye anyị ohere “ịganiihu ma nwete ọgwụgwọ,” n’ihi na Ọ bụ nsipụta nke ọgwụgwọ ihe niile nke ghasara aghasa n’ime ndụ anyị. Dị ka nnukwu Onye Ogbugbo na Onye Nkwuchite ọnụ anyị na Nna, Kraịst na-edo nsọ ma na-emezi mmekọrịta ghasara aghasa—nke kachasị, mmekọrịta anyị na Chineke.

Ntụgharị asụsụ nke Josef Smith mere ya e doo anya na nwanyị ahụ n’ezie sooro ndụmọdụ nke Onye Nzọpụta ma gbanwee ndụ ya: “Ma nwanyị ahụ nyere Chineke otuto site n’oge awa ahụ, ma kwere na aha ya.”3 Ọ dị mwute na anyị amaghị aha ya ma ọ bụ nkọwa ndị ọzọ gbasara ndụ ya mgbe oge nke a gasịrị n’ihi na ọ gaara abụ ihe gaara ewe mkpebi siri ike, obi umeala, na okwukwe n’ime Jizọs Kraịst maka ya ichegharị ma gbanwee. Ihe anyị maara bụ na ọ bụ nwanyị onye “kweere na aha ya” jiri nghọta na ya anọghị na ofe ike aja Ya dị ebighị ebi n’enweghị ọgwụgwụ.

Mmekọrịta nke mmadụ na Ndị Ọzọ Ghasara aghasa

N’ime Luk Isi nke 15 anyị na-agụ ụkabụilu nke otu nwoke onye mụworo ndị nwoke abụọ. Nwa nwoke nke nta jụrụ nna ya maka ihe nketa nke ya, mee njem ya banye mba dị anya ma mefusịa ihe ya site na i bi ndụ ọgba aghara.4

Ma mgbe o mefusịworo ihe dum, oke ụnwụ malitere n’ala ahụ; ma ọ bidoro ịnọ na-ụkọ.

“Ma ọ gara sonye onwe ya n’otu nwa amaala nke ala ahụ; ma o zigara ya n’ubi ya inye ezì ya ha nri.

“Ma ọ kpebiri iriju afọ ya site na nri ezì: ma enweghị onye nyere ya.

“Ma mgbe ọ matara onwe ya, ọ sịrị, ụmụ odibo nke nna m ole nwere achịcha zuru ma fọdụ, ma m na-ala n’iyi n’ihi agụụ!

“Aga m ebili ma jekwuru nna m, ma aga m asị ya, Nna, ejehiewo m megide eluigwe, ma n’ihu gị,

“Ma ekwesịghị kwaghị m ka a kpọọ m nwa gị nwoke: mee m ka otu ụmụ odibo gị.

“Ma o biliri, ma jekwuru nna ya. Mana mgbe ọ nọbụrịị n’ebe dị anya, nna ya hụrụ ya, ma nwee ọmịiko, ma gbaa ọsọ, ma daa n’olu ya, ma susuo ya ọnụ.”5

Eziokwu na nna ahụ gbara ọsọ jekwuru nwa ya nwoke, e kwere m, bụ ihe ịrịba ama. Mmekụta nke onwe nke nwa nwoke ahụ merụrụ nna ya miri emi nke ọma ma pụta ihé. N’otu aka ahụkwa, o nwere ike emenyere nna ahụ ihere n’ezie n’ihi omume niile nke nwa ya nwoke.

Ya mere, gịnị mere nna ahụ echeghị ka nwa ya nwoke ịrịọ mgbaghara? Gịnị mere ọ cheghị maka onyinye nkwụghachi na ime udo tupu isetipụ mgbaghara na ịhụnaanya? Nke a bụ otu ihe m na-atụgharị n’uche ọtụtụ mgbe.

Onyenwe anyị na-akuziri anyị na ịgbaghara ndị ọzọ bụ iwu nsọ zuru ụwa niile: “Mụ onwe m, Onyenwe anyị, ga-agbaghara onye m ga-agbaghara, mana maka gị ka ọ dịịrị ịgbaghara mmadụ niile.”6 Isetipụ mgbaghara nwere ike iwe nnukwu obi ike na obi umeala. O nwekwara ike iwe oge. Ọ na-achọ ka anyị tinye okwukwe na ntụkwasị obi anyị n’ime Onyenwe anyị dị ka anyị na-anabata ịza ajụjụ maka ọnọdụ nke obi anyị. Ebe a ka uru na ike nke ohere nhọrọ anyị nọ.

Site na ngosipụta nke nna nke a nime ụkabụilu nke nwa mmefu ahụ, Onye Nzọpụta kwusiri ike na mgbaghara bụ otu nime onyinye kachasi maa mma anyị nwere ike inye otu onye na ibe ya ma kachasị mkpa onwe anyị Ibupu obi anyị ibu site na mgbaghara anaghị adị mfe mgbe niile, mana site n’ike Jizọs Kraịst na-enye, ọ pụrụ omume.

Akụkụ Onwe anyị Ghasara aghasa

N’ime Ọrụ Isi nke 3 anyị na-amụ banyere otu nwoke onye a mụrụ na ngwọrọ na “onye ha na-enyiwa kwa ụbọchi n’ọnụ ụzọ ama nke tempụl nke a kpọrọ Ọmarịcha, ịrịọ arịrịọ n’aka ndị n’abanye n’ime tempụl.”7

Onye ngwọrọ onye arịrịọ ahụ agbaala karịa afọ 408 ma o biwo ndụ ya niile n’ọnọdụ yiri ka ọ gaghị ebi ebi nke ịchọ ihe na ime nchere, n’ihi na ọ dabeere na mmesapụ aka nke ndị ọzọ.

Otu ụbọchị ọ hụrụ “Pita na Jọn ka ha na-akwado ị banye n’ime tempụl ahụ [ma] rịọ ha arịrịọ.

“Ma Pita, n’elekwasị ya anya, ya na Jọn, kwuru, Lee anyị anya.

“Ma ọ gere ha ntị, ma na-atụanya ịnata ihe n’aka ha.

“Mgbe ahụ Pita kwuru, ọlaọcha na ọlaedo ọ dịghị nke m nwere; mana ụdị ihe m nwere a ga m enye gị: N’aha Jizọs Kraịst nke Nazareth, bilie ma jee ije.

“Ma ọ jidere ya n’aka nri, ma kulie ya elu: ma ozugbo ahụ ụkwụ ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya nwetere ike”

“Ma mgbe ọ na-awụli elu guzooro, ma jee ije, ma soro ha banye n’ime tempụl, n’eje ije, ma na-awụli elu, ma na-eto Chineke.”9

Mgbe ụfọdụ anyị nwere ike hụta onwe anyị, dị ka onye ngwọrọ ahụ nọ n’ọnụ ụzọ ama nke tempụl, n’enwe ndidi—ma ọ bụ mgbe ụfọdụ enweghị ndidi—“[na]-eche Onyenwe anyị.”10 Na-eche inwete ọgwụgwọ nke anụ ahụ ma ọ bụ nke mmetụta uche. Na-eche maka azịza ndị na abanye n’ime akụkụ kachasi omimi nke obi anyị. Na-eche maka otu ọrụ ebube.

Ichere maka Onyewe anyị nwere ike ịbụ ebe nsọ—ebe ọganiihu na ime mma ebe anyị nwere ike bịa iji mata Onye Nzọpụta n’ụzọ nke onwe dị omimi. Ichere maka Onyenwe anyị nwekwara ike bụrụ ebe anyị na-ahụta onwe anyị iju, “O Chineke, olee ebe ị nọ?”11—ebe ntachi obi ime mmụọ na-achọ ka anyị tinye okwukwe n’ime Kraịst site n’ịkpacha anya họrọ Ya ugboro ugboro na ugboro ugboro. Ama m ebe a, ma a ghọtara ụdị ihe ochiche nke a.

A nọrọ m ọtụtụ awa n’ụlọ ọrụ ebe ọgwụgwọ kansa, dịrị n’otu n’ahụhụ m mụ na ọtụtụ ndị ọ na-agụ agụụ inwete ọgwụgwọ. Ụfọdụ dịrị ndụ; ndị ọzọ adịghị. A mụtara ihe n’ụzọ miri emi na nnapụta site na mnwale anyị dị iche maka onye ọbụla n’ime anyị, ma ya mere nlekwasị anya anyị kwesịrị ị dị nta banyere ụzọ nke esi napụta anyị ma na-abụkarị banyere Onye Nnapụta ahụ n’Onwe Ya. Nkwusi ike anyị mgbe niile kwesịrị ị bụ na Jizọs Kraịst.

Inwe okwukwe n’ime Kraịst pụtara ịtụkwasị obi n’abụghị naanị n’uche nke Chineke kama n’oge nke Ya kwa. N’ihi na Ọ maara n’ezie ihe na-akpa anyị na mgbe anyị chọrọ ya n’ezie. Mgbe anyị nyefere onwe anyị n’uche nke Onyenwe anyị, anyị n’ikpeazụ ga-anata n’ọkpụrụkpụ karịa ihe nke ahụ anyị chọworo.

Ezi ndị enyi m, anyị niile nwere otu ihe n’ime ndụ anyị nke ghasara aghasa chọrọ ka e mezie, dozie ma ọ bụ gwọọ ya. Dị ka anyị na-abịakwute Onyenwe anyị, dị ka anyị na-etinye obi anyị na uche anyị na Ya, dị ka anyị n’echegharị, Ọ na-abịakwute anyị “jiri ọgwụgwọ dị na nku ya,”12 n’etinye ogwe aka ịhụnaanya Ya gburugburu anyị, ma na-asị, “Ọ Dị Mma. Ị dị naanị afọ 5—ma ọ bụ 16, 23, 48, 64, 91. Anyị nwere ike idozikọta nke a ọnụ!”

Ana m agba ama na enweghị ihe ọbụla n’ime ndụ unu ghasara aghasa nke karịrị ọgwụgwọ, mgbapụta, na ike nke Jizọs Kraịst na-enye. N’aha nsọ dị nsọ nke Ya onye bụ dike n’ịgwọ ọrịa, Jizọs Kraịst, amen.