Ọgbakọ Zuru ọha
Ịhụnaanya, Ikekọrịta, Ikpọku
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Ịhụnaanya, Ikekọrịta, Ikpọku

Dị ka anyị na-enwe ịhụnaanya, n’ekekọrịta, ma na-akpọkuo, anyị na-esoro n’ọrụ ahụ dị ukwuu ma dị ebube nke na-akwado ụwa maka nlọghachị nke Mezaya ya.

Soro m chee echiche, nwa oge, na-eguzo n’elu ugwu ukwu dị na Galili, na-agba akaebe ịtụnaanya na ebube nke Onye Nzọpụta bilitere n’ọnwụ gara ileta ndị n’eso ụzọ Ya. Ụdị ịtụnaanya itule n’onwe ịnụta okwu ndịa, nke O kesaara ha, iwu Ya dị nsọ nke “ya mere gaanụ, ma kuziere mba niile, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.”1 N’ezie, okwu ndịa ga-enye onye ọbụla n’ime anyị ike, kpatee mmụọ, ma kpalite anyị, dị ka ha mere Ndị Ozi Ya. N’ezie, ha raara ndụ ha fọdụrụ nye na-ime naanị nke ahụ.

Nke mmasị, ọbụghị naanị Ndị Ozi tinyere okwu niile nke Jizọs n’obi. Ndị otu isimbụ nke Nzukọ nsọ, site na onye kachasị ọhụrụ ruo na ndị kachasị dịrị, tinyere aka na nnukwu iwu nke Onye Nzọpụta, n’ekesasị ozi dị mma nke ozi ọma ahụ n’etiti ndị ha zutere ma mara. Mkpebi si ike ahụ ikekọrịta ama ha nke Jizọs Kraịst nyeere Nzukọ nsọ Ya emepụtara ọhụrụ aka tolite ebe ọ dị ukwuu.2

Anyị onwe anyị kwa, dị ka ndị na-eso ụzọ nke Kraịst, ka akpọkuru ịṅa ntị nye iwu Ya taa, dị ka ma ọ bụrụ na anyị nọọrọ n’elu ugwu ukwu ahụ dị na Galili mgbe ọ mara ọkwa ya na mbụ. Iwu nkea malitere ọzọ na 1830, mgbe Josef Smith dopụrụ iche nwanne ya nwoke Samuel dị ka onye mgbasa ozi ọma isimbụ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst.3 Kemgbe ahụ, ihe karịrị ndị mgbasa ozi ọma nde 1.5 emewo njem gburugburu ụwa na-akuziri mba niile ma na-eme ndị ahụ nabatara ozi ọma nke ozi ọma eweghachitere baptizim.

Nke a bụ ozizi anyị. Ọchịchọ dị anyị ụtọ.

Site na ụmụ anyị dị nta ruo na ndị kachasị okenye n’etiti anyị, anyị na-achọsi ike maka oge mgbe anyị ga-aṅa ntị nye ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta ma kesaa ozi ọma na mba niile nke ụwa. O doro m anya na unu ndịikom nta na ndịinyom nta nwere otu ụdị mmetụta ịma aka na-enye ike site n’aka onye amụma anyị echi gara aga dị ka ọ kpọkuru unu ikwado maka ije ozi mgbasa ozi ọma n’uju dị ka Onye Nzọpụta na Ndị Ozi Ya mere.

Dị ka ndị na-agba ọsọ nọ na okwute mmalite, anyị ji atụmaanya n’eche maka ọkpụkpọ oku nke onyeisi, zuru ezu nwere akara nke onye amụma, na-egosi mmalite nke ọsọ ahụ! Ọchịchọ nke a dị mma ma na-akpali mmụọ; kosiladị, ka anyị tulee ajụjụ nkea: gịnị kpatara na anyị niile agaghị amalite ugbua?

I nwere ike jụọ, “Olee otu m ga-esi a bụ onye mgbasa ozi ọma n’enweghị bajị aha?” Ma ọ bụ anyị agwa onwe anyị, “E dopụrụ ndị mgbasa ozi ọma n’uju oge iche ime ọrụ nkea. Ọ ga-amasị m inye aka mana elemaanya emesịa mgbe ndụ dajutụrụ obere.”

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ọ dị mfe karịa otu ahụ! N’ekele, nnukwu iwu nke Onye Nzọpụta ka enwere ike imetali site na ụkpụrụ niile n’enweghị aghụghọ, dị mfe nghọta akuziri nye onye ọbụla n’ime anyị site n’oge nwata: ịhụnaanya, ikesa, na ikpọku.

Ịhụnaanya

Ihe mbụ anyị nwere ike ime bụ inwe ịhụnaanya dị ka Kraịst si nwee ịhụnaanya.

Obi anyị dị arọ site na ntaram ahụhụ na obi mgbali elu nke anyị na-ahụta gburugburu ụwa n’oge ọgbaghara ndịa niile. Kosiladị, anyị nwekwara ike nwete mkpalite mmụọ site na nnupụta nke ọmịiko na ọrụ enyemaka ndị mmadụ nke egosipụtaworo site n’aka ndị mmadụ ebe niile site na mgbalị ha irute ndị ekewapụrụ iche—ndị ahụ achụpụrụ site n’ebe obibi ha, e kewapụrụ site n’ezi na ụlọ ha, ma ọ bụ na-agabiga ụdị mwute na obi nkoropụ ndị ọzọ.

Na nso nso a, isi mmalite ozi kọrọ ka otu ndị nne dị n’ime Poland, n’ihi nchegbu maka ezi na ụlọ ndị na-achọsike ịgbafu, hapụrụ igwe ụmụaka akwajuru ihe na ọdụ ụgbọ oloko n’ọgbara dị ọcha, akwadoro ma na-eche maka ndị nne na ụmụ ntakịrị ọgba ọsọ ndụ ndị ga-achọ ha n’ofe oke ahụ dị ka ha gbadara site na ụgbọ oloko. N’ezie, Nna anyị nke Eluigwe na-amụ amụ maka omume niile nke afọma n’achọghị ọdịmma onwe ya dị ka ndịa, n’ihi na dị ka anyị n’eburịkọta ibu arọ nke otu onye n’ibe ya, anyị “n’emejupụta iwu nke Kraịst.”4

Mgbe ọbụla anyị gosipụtara ịhụnaanya yiri Kraịst nebe onye agbata obi anyị nọ, anyị nekwusa ozi ọma—ọbụna ma ọ bụrụ na anyị ekwupụtaghị otu mkpụrụ okwu.

Ịhụnaanya maka ndị ọzọ bụ ngosipụta ukwuu nke iwu nsọ nke abụọ kachasị ukwuu inwe ịhụnaanya n’onye agbata obi anyị;5 ọ na-egosipụta usoro nnụcha nke Mmụọ Nsọ na-arụ ọrụ n’ime mkpụrụ obi anyị. Site n’igosipụta ịhụnaanya nke Kraịst nye ndị ọzọ, anyị nwere ike mee ndị ahụ na-ahụta ọrụ ọma anyị iji “nye Nna [anyị] nke bi n’eluigwe otuto.”6

Anyị na-eme nkea n’enweghị ihe nlọghachi anyị na-achọ.

Olileanya anyị, nezie, bụ na ha ga-anabata ịhụnaanya anyị na ozi anyị, nagbanyeghị otu ha ga-esi emeghachi omume bụ nke na anọghị n’ike anyị.

Ihe anyị na-eme na onye anyị bụ n’ezie bụ.

Site na ịhụnaanya yiri Kraịst maka ndị ọzọ, anyị n’ekwusa njirimara niile dị ebube, na agbanwe ndụ nke ozi ọma nke Kraịst, ma anyị n’esoro mee ihe pụtara ìhè n’imejupụta nnukwu iwu Ya.

Kekọrịta

Ihe nke abụọ anyị nwere ike ime bụ ikekọrịta.

N’oge ọnwa isimbụ niile nke ọgbaghara COVID-19, Nwanne nwoke Wisan sitere na Thailand nwetere mmetụta ikekọrịta mmetụta na echiche ya niile nke ihe ọ naara amụ n’ihe ọmụmụ ya nke Akwụkwọ nke Mọmọn na akaunt sochịal midia ya. N’otu n’ime nzipụ ozi ya metụrụ ya n’onwe, o kekọrịtara otu akụkọ nke ndị mgbasa ozi ọma abụọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn, Alma na Amulek.

Nwanne ya nwoke, Winai, agbanyeghị ịnọgide na nkwenye okpukperechi ya niile, ka ozi nzipụ ahụ metụrụ ma zaghachi, na-atụghị anya na-ajụ, “E nwere m ike inwete akwụkwọ ahụ na Thai?”

Wisan ji amamiihe hazie ka ụmụnne nwanyị mgbasa ozi ọma abụọ nyefee ya otu kọpị Akwụkwọ nke Mọmọn, ndị malitere ikuziri nwanne ya nwoke.

Wisan sonyere ọmụmụ ihe n’ikuku, n’oge nke o kekọrịtara mmetụta ya niile banyere Akwụkwọ nke Mọmọn. Winai mụtara iji mmụọ na-achọ eziokwu ekpe ekpere ma na-amụ ihe, ikwere ma nabata eziokwu. N’ime ọnwa ole ma ole, Winai mere baptizim!

Wisan mesịrị si, “Anyị nwere oke na ọrụ ị bụrụ ngwa ọrụ n’aka Chineke, ma anyị ga-adịrịrị njikere maka Ya ime ọrụ Ya n’ụzọ Ya site na anyị.” Ọrụ ebube ezi na ụlọ ha bịara n’ihi na Wisan naanị kekọrịtara ozi ọma n’ụzọ eke nkiti.

Anyị na ndị ọzọ niile n’ekekọrịtara ụmụ ihe. Anyị na-emekarị ya. Anyị na-ekekọrịta ụdị ihe nkiri na nri na-amasị anyị, ihe ndị na-akpa ọchị anyị na-ahụ, ebe ndị anyị gara nleta, nka na-amasị anyị, okwu nrutu na-akpali anyị.

Olee ka anyị ga-esi nnọọ gbakwunye n’ime ndepụta niile anyị kekọrịtaworo ihe anyị hụrụ naanya banyere ozi ọma nke Jizọs Kraịst?

Okenye Dieter F. Uchtdorf kọwara: “Ọbụrụ ma otu onye ajụọ banyere ngwụcha izu ụka gị, egbula oge ikwu banyere ihe ịmụrụ na nzukọ nsọ. Gwa ha maka obere ụmụ aka ndị guzoro n’ihu ndị nzukọ ma jiri obi ha niile gụọ otu ha si agbalị ịdịrị ka Jizọs. Kwuo banyere otu ndị ntoroọbịa ndị weere oge inyere ndị okenye nọ ebe obibi ezumike aka dekọọ agụgụala niile nke onwe.”7

Ikekọrịta abụghị banyere “ị na-ere” ozi ọma. Ọdịghị mkpa na ị ga-ede okwuchukwu ma ọbụ gbazie nghọtaghe nke otu onye.

Mgbe ọ rụrụ na ọrụ mgbasa ozi ọma, Chineke anaghị achọ ka gị bụrụ sheriff Ya; Ọ na, kosiladị, asị ka gị bụrụ onye n’ekere Ya ihe.

Site anyị na ndị ọzọ ikekọrịta nhumiihe anyị dị mma n’ime ozi ọma, anyị n’esoro imejupụta nnukwu iwu nke Onye Nzọpụta.

Kpọkuo.

Ihe nke atọ i nwere ike ime bụ ikpọku.

Nwanne nwanyị Mayra bụ onye gbanwere na nso nso a si Ecuador. Ọṅụ ya n’ime ozi ọma gbagoro elu ngwa ngwa isote baptizim ya dị ka ọ kpọkuru ndị enyi na ndị ọ hụrụ naanya gburugburu ya site na akaụnt sochịal midia. Ọtụtụ ndị otu ezi na ụlọ na ndị enyi ndị hụrụ ozi nzipụ ya jiri ọtụtụ ajụjụ zaghachi. Mayra jikọrọ ya na ha, mgbe ụfọdụ ikpọku ha nebe obibi ya izukọta ọnụ ndị mgbasa ozi ọma.

Ndị nne na nna Mayra, ụmụnne ya, daada ya, nwa nwanne nna abụọ, na ọtụtụ ndị enyi ya ka e mere baptizim n’ihi na o ji obi ike kpọkuo ha “ịbịa ma lee,” “ịbịa ma jee ozi,” na “ịbịa ma sonyere.” Site na ọkpụkpọ oku ya niile, ihe karịrị ndị mmadụ 20 anabatawo ọkpụkpọ oku ya ịbụrụ ndị otu Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst e mere baptizim. Nkea kwere omume n’ihi na Nwanne nwanyị Mayra na-akpọku ndị ọzọ n’ụzọ dị mfe ịbịa nwete ọṅụ ọ na-enwete dị ka onye otu nke Nzukọ nsọ.

Foto, oyiyi
Nwanne nwanyị Mayra na ndị ahụ ọ kpọkuru inwete ọṅụ nke ozi ọma

E nwere narị kwuru narị ọkpụkpọ oku anyị nwere ike isetịpụrụ ndị ọzọ. Anyị nwere ike kpọkuo ndị ọzọ “ịbịa ma lee” nzukọ oriri nsọ, ihe omume nke ngalaba ukwu, vidio dị n’ikuku nke na-akọwa ozi ọma nke Jizọs Kraịst. “Bịa ma lee” nwere ike bụrụ ọkpụkpọ oku ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn ma ọ bụ gaa nleta na tempụl ọhụrụ n’oge mmepe ụlọ ya tupu a rara ya nye. Mgbe ụfọdụ ọkpụkpọ oku bụ otu ihe anyị na-agbatị na-ime—ọkpụkpọ oku nye onwe anyị, na-enye anyị mmata ihe na ọhụ nke ohere ọma niile gbara anyị gburugburu ime ihe na ya.

N’oge Dijitalụ anyị a, ndị otu mgbe ụfọdụ n’ekekọrịta ozi niile site na sochịal midia. E nwere narị kwuru narị, ma ọbụghị ma puku kwuru puku, nke ihe ndị na-ebuli elu i nwere ike ịhụta zuruoke nke nkekọrịta. Ọdịnaanya nkea na-enye ọkpụkpọ oku iji “bịa ma lee,” “bịa ma jee ozi,” na “bịa ma sonyere.”

Dị ka anyị na-akpọku ndị ọzọ ịmụta karịa banyere ozi ọma nke Jizọs Kraịst, anyị na-esoro n’oku nke Onye Nzọpụta isoro n’ọrụ nke iwu Ya.

Mmechi

Ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị m hụrụ nanya, taa anyị ekwuwo okwu banyere ihe atọ dị mfe—ihe ndị na-araghị ahụ—nke onye ọbụla nwere ike ime. Ihe ndị nwere ike ime! Elemaanya ị malitewo ime ha—ọbụna na-amataghị n’uju na ị na-eme!

Ana m akpọku gị itule ụzọ ndị ị nwere ike isi enwe ịhụnaanya, ekekọrịta, ma kpọkuo. Dị ka ị na-eme otu, ị ga-enwete mmetụta ọtụtụ ọṅụ ị mara na ị na-ege ntị n’okwu niile nke Onye Nzọpụta anyị hụrụ naanya.

Ihe m na-agba unu ume ime abụghị atụmatụ ọhụrụ. Ị nuwo ụkpụrụ ndịa na mbụ. Nke a abụghị “ihe nnukwu ọzọ” ahụ Nzukọ nsọ na-asị ka i mee. Ihe atọ ndịa bụ naanị mgbatị nke onye anyị bụ ugbua dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.

Ọdịghị baajị aha ma ọ bụ akwụkwọ ozi achọrọ.

Ọdịghị ọkpụkpọ oku edere n’akwụkwọ ozi achọrọ.

Dị ka ihe atọ ndịa na-abụrụ akụkụ eke nke onye anyị bụ na otu anyị si biri, ha ga-abụrụzi ngosipụta nke ezi ịhụnaanya na-abịara onwe ya a na-amanyeghị amanye.

Dị ka ndị ahụ na-eso ụzọ nke Kraịst ndị gbakọtara ọnụ ịmụta ihe n’aka Ya n’ime Galili afọ 2000 gara aga, anyị onwe nwekwara ike nabata iwu nke Onye Nzọpụta ma gaa n’ime ụwa niile n’ekwusa ozi ọma.

Dị ka anyị na-enwe ịhụnaanya, n’ekekọrịta, ma na-akpọkuo, anyị na-esoro n’ọrụ ahụ dị ukwuu ma dị ebube nke na-akwado ụwa maka nlọghachị nke Mezaya ya.

Na anyị ga-enwe ike gee ntị n’ọkpụkpọ oku nke Onye Nzọpụta ma gbalịsie ike itinye aka na nnukwu ọrụ Ya bụ ekpere m n’aha Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Matiu 28:19.

  2. Gịnị kpatara uto nke Nzukọ nsọ isimbụ? Otu onye agụgụala na-atụ arọ: “Ihe mbụ nke gaara akpalite oké ajụjụ banyere ọdịdị nke okpukperechi bụ mmekọ nke onwe na ndị ọzọ kwere ekwe. … Ibikọ ma rụkọọ n’akụkụ ndị ahụ sooro Jizọs, ịgba aka ebe agwa ha n’ebe dị nso, na ige ntị dị ka ha na-ekwu okwu banyere ozi ọma n’etiti ihe omume nkiti ha kwa ụbọchị bụ ka ihe akaebe nke ndụ gbanwere agbanwe chee gị ihu. N’uche nkea, ike nkwanye nke okpukperechi Christian garịrị mgbe ụfọdụ enwe na-abụghị ọtụtụ n’ime nkwupụta nke ọha nke ndị nnọchianya akachasị mara dị ka n’ime ọgbụgba ama dị jụụ nke ndị n’efe Jizọs ofufe na-agba akaebe nye izi ezi nke mkpebi ha site na agwa ọma, nnọgide, na inwe ohere maka ndị ọzọ” (Ivor J. Davidson, Ọmụmụ nke Nzukọ nsọ: Site na Jizọs ruo na Constantine, AD 30–312 [2005], 108–9).

  3. Lee Lucy Mack Smith, Agụgụala, 1845, peeji 169, josephsmithpapers.org.

  4. Ndị Galetia 6:2.

  5. Lee Matiu 22:39.

  6. Matiu 5:16.

  7. Dieter F. Uchtdorf, “Ọrụ Mgbasa ozi ọma: Ikesa Ihe Nọ n’ime Obi Gị,” Liahona, Me 2019, 17.