Ọgbakọ Zuru ọha
Atụmatụ ahụ Ọ Na-arụkwa ọrụ?
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Atụmatụ ahụ Ọ Na-arụkwa ọrụ?

A na m agba ama na atụmatụ nke ańụrị ahụ n’arụ ọrụ. Ọ bụ Nna gị nke Eluigwe onye hụrụ gị n’anya, rọpụtara ya.

Atụmatụ ahụ ọ na-arụkwa ọrụ?

Oge n’eteghi aka, enwere m mkparita ụka mụ na otu ntọrọbịa ukwu onye jere ozi mgbasa oziọma ọtụtụ afọ gara aga ma ọ n’arụzi ọrụ ugbua. N’ụfọdụ ụzọ, ọ dịka ndụ ya n’aga ọfụma. Mana okwukwe ya na-ada ada. Ọ na-amịkpụ nime oshimiri nke obi abụọ banyere Onye Nzọpụta na Nzukọ-nsọ Ya. Ọ kọwara na ọ naghị enwete ngọzị niile nke ọ chere n’ọga ewete site n’ọziọma eweghachitere. Ọ dịghịdị ya ka atụmatụ nke ańụrị ahụ ọ n’arụ ọrụ nime ndụ ya.

Ozi m taa bụ maka ndị ahụ niile nwere ike ị n’enwe ụdị mmetụta dị otu a. A na m ekwuuru ndị ahụ nwebụrụ oge ha “nweworo mmetụ ịbụ abụ mgbapụta ịhụ-n’anya” mana ha anaghị “enwe mmetụ dị otu ahụ ugbua.”1

Nna anyị nke Eluigwe akwadowo atụmatụ dị itụnanya maka ańụrị ebigh-ebi nke anyị. Mana mgbe ndụ n’adịghị emezu n’ụzọ anyị chere mọbụ chọọ, ọ nwere ike ịdị dịka atụmatụ ahụ anaghị arụ ọrụ.

Enwere ike anyị na-eche otu ahụ ndị n’eso ụzọ Jizọs si wee chee mgbe ha nọ nime nnukwu ụgbọ mmiri, “n’etiti oké osimiri ahụ, ebili mmiri n’emekpa kwa ya aru; n’ihi na ifufe n’efegide ya.”2

Mgbe ahụ, n’isi isi ụtụtụ:

“Jizọs biakwutere ha, n’eje ije n’elu oké osimiri.

“Ma mgb͕e ndi n’eso uzọ ya huru ya ka Ọ n’eje ije n’elu oké osimiri, obi we lọ ha mmiri, … ha we tie mkpu site n’egwù.

“Ma ngwa ngwa Jizọs gwara ha okwu, si, Nwenu obi-ike; ọ bu Mu; unu atula egwu.

“Pita we za Ya, si, Onyenwe anyi, ọ buru na ọ bu gi onwe gi, sim biakwute gi n’elu mmiri.

“Ma ọ siri, Bịa. Ma Pita we si n’ugb͕ọ ukwu ahụ rida, je ije n’elu mmiri ahu, ijekwuru Jizọs.

“Ma mgb͕e ọ huru ifufe, ọ tua egwu; ebe ọ malitere imìkpu, o ti kwa mkpu, … Onyenwe anyi, zọputam.

“Ma ngwa ngwa Jizọs setipụrụ aka ya, ma jide ya, si ya, Onye okwukwe ntà, n’ìhi gini ka i ji nwe obi abuọ?”3

E nwere m ike ị kesara unu banyere ukpuru atọ nke m mụtara site n’aka Pịta? Ọ bụ ekpere m na ukpụrụ ndịa nwere ike nyere onye ọbụla aka onye n’eche na atụmatụ nke ańụrị ahụ anaghị arụ ọrụ nime ndụ ha.

Nke mbụ, mee ịhe n’okwukwe nime Jizọs Kraịst.

Okwukwe nke Pịta dị m ịtụnanya. Nihi mkpọkụ dị mfe nke Jizọs ka ọ “bịa,” ọ hapụrụ ụgbọ ukwu ya ahụ mmiri na-atụgharị. Ọ dị ka ọ matara na ọ bụrụ na Jizọs Kraịst kpokuo ya ka ọ mee ihe ọbụla ọ ga enwe ike menwuo ya.4 Pịta tụkwasịrị Onye Nzọpụta obi karịa ọtu o jiri tụkwasị ụgbọ ya obi. Ma okwukwe ahụ nyere ya ike iji were obisike mee ihe n’oge ọnọdụ nke nsogbu ma nke n’atụ ụjọ.

Okwukwe nke Pịta na-echetara m maka otu nhumihe nke m nụrụ n’aka Okenye José L. Alonso. Nso nso nwa nwoke Okenye Alonso nwụrụ, onye hapụrụ ezinụlọ nwere ụmụaka, Okenye Alonso nụrụ ka ụmụaka ahụ n’ekwu okwu.

“Kedụ ihe anyị g’eme?” ha jụrụ.

Nwa nke nwanyị dị afọ itolu zaghachiri, “Nna anyị dị Mma. Ọ na-ekwusa oziọma nke Jizọs Kraịst.

Dịka Pịta, nwata nwanyị nke a hụrụ gafee ịma aka niile ma tụkwasị obi na Jisọs Kraịst ma na Aja mgbaghara mmehie Ya. Okwukwe n’ebe Onye Nzọpụta nọ n’eweta udo na ume iji gaa n’ihu.

Ọ bụrụ na ịle anya n’azụ otu ndụ gị si gaa, e kwere m na ị g’ahụ na enwewo ọtụtụ oge ijiri okwukwe mee ihe. Ị bata nime Nzukọ nsọ nke a bụ omume okwukwe. Ị kwuru Nna nke Eluigwe okwu n’ekpere bụ omume okwukwe. Ị gụ akwụkwọ nsọ bụ omume okwukwe. Ị gee ntị nye ozi m nke ọgbakọ zuru ọha nke a bụ omume okwukwe. Dịka Onyeisi Russell M. Nelson kwuru, “Ebeletakwala okwukwe ahụ nke i nwere.”5

Nkụzi ọzọ m mụtara site na Pịta bụ nke a:

N’oge niile nke nsogbu, chewe ihu n’ebe Jizọs Kraist nọ ozugbo ozugbo.

Mgbe ọ n’ejekwu ebe Onye Nzọpụta nọ, Pịta tụrụ egwu n’ihi ikuku ahụ, ma bido imịkpu. Mana mgbe Pịta matara ihe n’emenụ, ọ gbaghị mbọ ije n’elu mmiri ahụ n’onwe ya mọbụkwanụ gwuwe mmiri ịlaghachi n’ebe ụgbọ mmịri ahụ nọ. Kama ị hapụ okwukwe ọ nwere na Kraịst, o jidesiri ya ike karịa, n’eti mkpu, “Onyenwe anyị, zọpụta m.”

“Ma ngwa ngwa Jizọs setipụrụ aka ya, ma jide ya.”6

Anyị niile n’ezute ajọọ ikuku nke n’emekpa okwukwe anyị ahụ ma mee k’anyị mikpuo. Mgbe nke a n’eme, biko cheta na atụmatụ añụrị nke Nna nke Eluigwe nwere aha ọzọ—atụmatụ nke mgbapụta. Atụmatụ ahụ abụghị maka anyị ị gafe na ndụ nke a n’ụzọ dị mfe, adaghị ada, emikpughi emikpu, nwee ịhu n’amụmụọ ọchị mgbe niile. Nna nke Eluigwe maara na ọ ga-adị mkpa na a ga-agbapụta anyị. Ọ bụ ya mere O jiri kwado atụmatụ nke mgbapụta.7 Ọ bụ ya mere O jiri zite Ọnye mgbapụta. Mgbe anyị n’adọlị—maka ịhe ọbụla—nke ahụ apụtaghị na atụmatụ ahụ anaghị arụ ọrụ. Ọ bụ mgbe ahụ k’anyị chọsịrị atụmatụ ahụ ike.

N’oge ndị ahụ, soro ọmụmatụ nke Pịta. Chewe ihu n’ebe Onye nzọpụta nọ ozugbo ozugbo.

“Ugbua bụ oge ahụ na ụbọchị nke nzọpụta unu. … Unu ghara igbu oge maka ụbọchị nchegharị unu.”8

Agbanyeghi ebe anyị nọ ma ebe anyị noburu, nchegharị bụ ụzọ ọganihu. Onyeisi Nelson akụziwo:

“Enweghi ịhe karịrị itọghapụ mmadụ, karịrị ị nye mmadụ ugwu, mọbụ dịịrị ito-eto nke mmadụ mkpa karịa nchegharị nke ụbọchi. …

“Mgbe ị na-agbalịsike n’eje ije n’ụzọ ọgbụgbandụ ahụ, m’ọbụ daa-ada, m’ọbụ si n’ụzọ ọgbụgbandụ ahụ pụọ, m’ọbụ ị nweghi ike ịhụ okporo ụzọ ọgbụgbandụ ahụ site n’ebe ị nọ, a nam arịọ gị ka ịchegharịa. Nweta ike nke ịchegharị ụbọchị nile—nke ị mee ịhe ọma m’ọbụ ị dị nma n’ụzọ ntakịrị karịa n’ụbọchị nile.”9

Ị bịakwute Kraịst pụtara karịa nanị iche maka Ya mọbụ ikwu maka Ya mọbụgodi ịhụ Ya na anya. Ọ pụtara isoro Ya. Ọ pụtara ibi ndụ n’ụzọ ahụ Ọ kuziri anyị ibi. Maka anyị niile, nke a pụtara ịchegharị, n’egbughi oge.

Otu nime ụmụ m nke nwanyị n’arụbu ọrụ na ụlọ ọzụzụ ndị mgbasa oziọma. Ọ gwara m maka otu okenye ọ kuziri onye gwara ya na ọ machaghị ma Akwụkwọ nke Mọmọn ọ bụ ezi-okwu. Ọ kpewo ekpere ma kpee maka akaebe nke ime mmụọ, mana ọ nataghị azịza ọbụla.

Nwa m nwanyị kpere ekpere ka ọ mata ihe ọ g’eme iji nyere onye mgbasa oziọma a aka. Mmetụta nke ọ natara bụ na enyeghi akwụkwọ nsọ niile nanị maka k’anyị gụọ ha ma nwete ịgba ama; enyekwara ha ka ha kuziere anyị otu esi edobe iwu nsọ niile nke Chineke. Nwa m nwanyị kesara onye mgbasa oziọma ahụ echiche nke a.

Emesịa, ọ hụrụ onye mgbasa oziọma ahụ ọzọ, ọ nweziri obi ụtọ karịa. Ọ gwara ya na ọ nataziele ịgba ama na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ezi-okwu. Ọ matara na akaebe nke a bịara nihi na ọ na-agba ezi mbọ iji mee ihe ahụ Akwụkwọ nke Mọmọn n’akụzi.

K’anyị soro ọmụmatụ nke Pịta site n’ichewe ihu n’ebe Onye Nzọpụta nọ n’oge niile nke nsogbu. Soro Jizọs Kraịst karịa ịdabere n’elu amamịhe na ume nke gị onwe gị. N’agbanyeghi na otewo aka kamgbe ị n’egwu mmiri ma Ọ nọghị ya, oge agabeghị mọlị ị setịpụ aka nye Ya. Atụmatụ ahụ na-arụ ọrụ!

Nkụzi nke atọ m mụtara site na Pịta na nhụmịhe ya bụ nke a:

Nwe obi umeala n’ihu Onyenwe anyị, ma Ọ ga-ebuli gị elu ruo ihe niile dị ukwu karịa.

Pịta egosiwo okwukwe, ma n’ije ije n’elu mmiri ma n’ịsetịpụ aka nye Onye Nzọpụta mgbe ọ chọrọ enyemaka. Agbanyeghi nke a, Onye Nzọpụta hụrụ nime Pịta ume maka ịme ihe ukwu ndị ọzọ karịa. “Onye okwukwe ntà,” Ka O kwuru, “n’ìhi gini ka i ji nwe obi abuọ?”10

Pịta gaara ewe iwe n’ihi mba nke a. Mana ọ nabatara ya n’obi umeala. Ọ gara n’ihu n’achọ okwukwe dị nnukwu nime Jizọs Kraist. Site na ọtụtụ nhụmihe ndị ọzọ n’ewulite okwukwe—ụfọdụ nime ha rara ezigbo ahụ—Pịta mesịrị bụrụ onye ndu siri ike nke ahụ Onyenwe anyị chọrọ ka ọ bụrụ. Ọ mezuru ọtụtụ nnukwu ihe nime ije ozi nke Onyenwe anyị.

Kedụ nnukwu ihe ndị ahụ Onyenwe anyị chọrọ ka ị mezuo? Nime Nzukọ nsọ na alaeze Ya, enwere ọtụtụ ohere iji jee ozi ma lekọta ndị ọzọ dịka otu Onye Nzọpụta siri mee. Ọ chọrọ ka isoro nime ọrụ ukwu Ya. Enweghi mgbe atụmatụ nke ańụrị ahụ g’adịrị gị ezi irè karịa mgbe ị n’enyere ndị ọzọ aka n’ibi ya.

N’oge mwulite okwukwe nke m, okwu niile nke Alma nke a bụụrụ okwu mgbanwe ndụ: “Ngọzi na-adịrị ndị na-enwe obi umeala na-abụghị na amanyere ha amanye inwe obi umeala.”11 K’anyị jiri obi umeala dobe onwe anyị n’ọnọdụ ebe Jizọs ga-enwe ike bulie anyị, duru anyị, ma jiri ume niile anyị nwere mepụta ihe.12

A na m agba ama na atụmatụ nke ańụrị ahụ n’arụ ọrụ. Ọ bụ Nna gị nke Eluigwe onye hụrụ gị n’anya, rọpụtara ya. Ọ na-arụ ọrụ nihina Jịzọs Kraịst emeriwo mmehie na ọnwụ site na Aja Mgbaghara mmehie Ya. Bịakwute Ya, soro Ya, ma “otu mgbe ahụ ka a ga-emezupụta nnukwu atụmatụ nke mgbapụta ahụ nye unu.”13 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Alma 5:26.

  2. Matiu 14:24. Enwere ọtụtụ ihe nke banyere ndụ agba ọhụrụ nke nadabaghị ya na agwa niile nke onye n’eso Jịzọs Kraịst. Anyị bi n’ụbọchị nke Onye Nzọpụta buru n’amụma mgbe “ihe nile ga-adị n’ọgba-aghara; ma n’ezie, mkpụrụ-obi ndị mmadụ ga-akwụsị ọrụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 88:91; see also Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 45:26).

  3. Matiu 14:25–31.

  4. Lee 1 Nifaị 3:7.

  5. Russell M. Nelson, “Kraịst Ebilitewo; Okwukwe na Ya Ga-eme Ugwu Anọgharịa,” Liahona, Me 2021, 104.

  6. Matiu 14:30–31.

  7. Okenye Lyn G. Robbins kuziri: “Nchegharị bụ onyinye nke Chineke dị anyị nso ịnwete nke na-ahapụ anyị ma mme k’anyị siri n’ọdịda gafee n’ọdịda n’enweghi obi ịda mba. Nchegharị abụghị atụmatụ nke adịghị ama ama Ya maka oge anyị nwere ike daa. Nchegharị bụ atụmatụ Ya, nihi ọ mazuru nanyị ga-ada. Nke a bụ oziọma nke ncheghari” (“Ruo mgbe Iri asaa gbakọrọ Asaa,” Liahona, May 2018, 22).

  8. Alma 34:31, 33.

  9. Russell M. Nelson, “Anyị Nwere ike Ime Ihe Kacha dị mma ma Dị Mma karịa,” Liahona, Me 2019, 67.

  10. Matiu14:31.

  11. Alma 32:16.

  12. Onyenwe anyị ekwuwo na “Ma onweghị onye ọbụla ga-enye aka n’ọrụ a m’ọbụghị ma ọ dị umeala ma jupụtakwa n’ịhụ n’anya” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 12:8).

  13. Alma 34:31.