Ọgbakọ Zuru ọha
Atụla Egwu: Naanị Kwere!
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Atụla Egwu: Naanị Kwere!

Malite nchọgharị gị maka aṅụrị site n’ịnabata onyinye nke anyị natawororịị site n’aka onye na-enye onyinye ọma niile.

Ana m enye ndị nta nke Nzukọ nsọ okwu m niile taa, nke pụtara onye ọbụla nke afọ Onyeisi Russell M. Nelson ma ọ bụ dị nta karịa. Anaghị m ejikarị ihe nlere, mana o kweghị m ịhapụ igosi nkea.

Foto, oyiyi
Leta site n’aka Marin Arnold

cri de coeur nkea na-abịa site n’aka enyi m Marin Arnold gbara afọ asatọ, e dere mgbe ọ dị afọ asaa. Aga m atụgharịrị unu asụsụ Ndị Ijipt ya agbanwere agbanwe:

Ezi Bishọp

generle confrins

gwụrụ ike gịnị mere

Anyị ọ kwesịrịrị

Ime ya? gwa m ihe mere

N’ezie, Marin

Arnold.1

N’ezie, Marin, okwu m na-achọ ikwu ugbua n’enweghị obi abụọ ga-agbawa gị obi ọzọ. Mana mgbe i degaara bishọp gị ozi mkpesa, ọ dị mkpa na gị gwara ya na aha m bụ “Kearon. Okenye Patrick Kearon.”

N’ihe fọrọ ntakịrị ruo afọ abụọ ọrịa mkposa oke niile nke dị nnukwuu ekpuchiwo ụwa anyị, ma mgbe ọrịa ahụ wetere nkwụsị n’ihe ruru ihe niile nke mmekọrịta n’etiti mmadụ, nke doro anya, o weteghị nkwụsị nke obi ọjọọ, ime ihe ike, na mbuso agha ọjọọ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị—ke mba ma ọ bụ nke mba na mba. Dị ka na nke ahụ ezughị, anyị ka na-agabiga aka mgba notere anya nke mmekọrịta n’etiti mmadụ na omenaala, nke sitere na nnaghara akụ na ụba ruo na mmebi gburugburu ebe obibi ruo ahataghị aha nke agbụrụ na ndị ọzọ.

Ụdị ifufe ndịa siri ike na ụbọchị ndịa gbara ọchịchịrị nwere ike ịda ndị ntoroọbịa dị n’etiti anyị mba, ndị ahụ anyị n’ele anya maka nchekwube na oke mmasị banyere echi niile nke ndụ anyị. E kwuwo ya na “ike nke ndị ntoroọbịa bụ akụ na ụba ejikọrọ aka nwee nke ụwa dum. Ndị … nta … bụ mbara ihu nke … ọdịniihu anyị.”2 Ọzọkwa, ụmụ anyị bụ ndị nlekọta a ga-etinye akara aka nke Nzukọ nsọ nkea n’aka ha.

Nihi otu oge anyị ugbua dị, o kwere nghọta ma ọ bụrụ na echiche nke ndị nta na-ebelata nwa obere. Dr. Laurie Santos, ọkammụta na Mahadum Yale, na nso nso a mepụtara klas akpọrọ Psychology na Ndụ Dị Mma. Afọ mbụ emere klas ahụ, ihe ruru [otu ụzọ n’ụzọ anọ] nke ụmụakwụkwọ mahadum [dum] debanyere aha.”3 Ihe karịrị ijeri mmadụ 64 mgbe ahụ gere podcast ya. Ide ihe banyere ihe nkea mere, onye odeakụkọ rụtụrụ aka ụdị mgbu ọ dị ịhụta ọtụtụ ụmụakwụkwọ nta, nwere ọgụgụ isi—na ndị okenye—na-achọsike “ịchọ ihe funahụrụ ha” ma ọ bụ, kacha njọ, n’enwe agụụ maka ihe ha n’enwetụbeghị.4

Arịrịọ m taa nye ndị ntoroọbịa, ma nye unu ndị nne na nna na ndị okenye ndị n’enye ha ndụmọdụ, bụ ibido nchọgharị maka ańụrị unu site n’ịnabata onyinye anyị nataworo site n’aka onye na-enye onyinye niile nke dị mma.5 N’oge ahụ kpọmkwem ọtụtụ n’ime ụwa n’ajụ ajụjụ mkpụrụ obi dị omimi, anyị kwesịrị iji “ozi dị mma”6 nke ozi ọma nke Jizọs Kraist na-enye azịza. Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, nke jidere ozi mgbasa na ozi nke Onye Nzọpụta nke ụwa elu, na-enye ụzọ pụtara ihè kachasị dị ebighị ebi nye ma ịchọta ịdị mma ma ime ihe dị mma n’oge ahụ dị ezigbo mkpa.

Onyeisi Russell M. Nelson ekwuwo na ndudugandu nkea nke ndị dị nta, nwere ike nke inwe mmekụta karịa [maka ịdị mma] n’elu ụwa karịa ndudugandu ọbụla gara aga.”7 Anyị, bụ mmadụ niile, kwesịrị ịdị “[na-]agụ egwu nke ịhụnaanya mgbapụta,”8 mana nke ahụ na-achọ ọzụzụ—“na-eso ụzọ,” ma ọ bụrụ ma ị chọọ—ụdị nke na-echekwa megide àgwà ọjọọ niile na àgwà ndị na-emebi ihe nke ga-akwapụ anyị n’ụzọ dị ka anyị na-agbalị ịgụ egwu nzọpụta ebighị ebi ahụ.

Ọbụna dị ka anyị na-anọrọ “n’akụkụ ebe anwụ na-acha n’okporo ámá,”9 anyị na-agbakwute onye ahụ site n’oge ruo n’oge onye kpebiri ịchọta ihe dị mwute n’enweghị olileanya banyere ihe niile. Ị maara ilu ya: “Ọ na-agba ọchịchịrị karịsịchaa tupu ya agbaa ọchịchịrị-ojii.” Lee ụdị nlereanya ọjọọ, ma lee ụdị ọdịdị n’enweghị obi ụtọ! Ee, anyị mgbe ụfọdụ nwere ike si ebe anyị nọ gbafuo, mana anyị n’ezie ekwesịghị isi n’onye anyị bụ gbafuo—ụmụ Chineke dị ndụ onye hụrụ anyị n’anya, onye dị njikere mgbe niile ịgbaghara anyị, na onye na-agaghị ma ọlị, mgbe ọbụla ahapụ anyị. Ị bụ arịa Ya dị oke ọnụ ahịa. Ị bụ nwa Ya, bụ onye O nyeworo ndị amụma na nkwa niile, onyinye nke ime mmụọ niile na mkpughe niile, ọrụ ebube niile na ozi niile, na ndị mmụọ ozi nọ n’akụkụ abụọ nke akwa mgbochi.10

O nyewokwa unu nzukọ nsọ nke na-enye ezi na ụlọ niile mgbam ume maka ndụ anụ ahụ ma jikọta ha ọnụ maka ndụ ebighị ebi. Ọ na-ewete ihe karịrị ngalaba ukwu na ngalaba nta 31,000 ebe ndị mmadụ na-agbakọ ma gụọ egwu ma buo ọnụ ma kpee ekpere maka otu onye n’ibe ya ma nye ndị ogbenye ihe ha nwere. Ebe a bụ ebe enyere onye ọbụla aha, a na-agụ onye niile, ma n’eje ozi nlekọta nye ma n’ebe ndị enyi na ndị agbata obi nkịtị n’obi ọma n’ejere otu onye n’ibe ya ozi n’ọkpụkpọ oku niile nke sitere na ọrụ ụkọchukwu ruo na ọrụ onye nche. Ndị okenye nta—nakwa ndị okenye ukwu—ruru puku kwuru puku n’eje ozi mgbasa ozi site na n’ego nke ha, n’enweghị ohere ikwu ebe ha ga-eje ọrụ, ma ndị otù nwata na okenye na-aga tempụl nwayọ nwayọ n’igwe ịga mee emume nsọ niile dị nsọ dị mkpa iji jikọta ezi na ụlọ ụmụ mmadụ ọnụ—ihe omume siri ike n’ụdị ụwa nkea kewara ekewa mana bụrụ nke na-ama ọkwa na ụdị nkebi ndịa bụ naanị nke ugbua. Ndịa bụ ihe ole ma ole kpatara anyị na-enye maka “olileanya nke nọ n’ime [anyị].”11

N’ezie, n’ụbọchị anyị taa, ihe ndị siri ike nke ukwuu n’ezute onye ọbụla n’eso ụzọ nke Jizọs Kraist. Ndị ndu nke Nzukọ nsọ nke a na-enye ndụ ha iji chọọ odudu nke Onyenwe anyị maka iji mezie aka mgba niile ndị a. Ọ bụrụ na emezighị ụfọdụ ruo otu onye niile siri chọọ, elemaanya ha mejupụtara akụkụ nke obe ahụ Jizọs kwuru na anyị ga ebukwasị iji nwee ike soro Ya.12 Ọ bụ kpọmkwem n’ihi na a ga-enwe ụbọchị ndị ga-agba ọchịchịrị na ihe ndị siri ike nke Chineke kwere nkwa na Ya ga, site n’igwe ojii n’ehihie ma ogidi ọkụ n’abalị, duo ndị amụma, nye mkpanaka ígwè, mepee ọnụ ụzọ ama dị mkpafa n’eduba n’ụzọ ahụ dị gịrịgịrị, ma karịsịa ihe niile nye anyị ike iji mezuo ọrụ ahụ.13

Ya mere biko, biko, nọrọ na oriri ahụ dum ọbụna ma ọ bụrụgodi na brokoli ahụ edoghị gị anya. Zuo ike n’ime ìhè Ya ma tinye kandụl gị n’ọrụ ahụ.14 Ha nwere ya n’eziokwu nime Praịmarị: Jizọs n’ezie na “[achọ gị] ka ị bụrụ ụzarị anyanwụ.”15

Mgbe onye ndu nke ndị Juu rịọrọ ka Jizọs gwọọ nwa ada ya gbara afọ 12, onye dinara n’ọnwụ ebe obibi, igwe mmadụ ahụ gbakọrọ kwụsịrị Onye Nzọpụta n’ike ogologo oge na otu nwa odibo ngwa ngwa bịara na-agwa nna ahụ na-echegbu onwe ya, “Nwa ada gị anwụwo; enyekwala Nna Ukwu nsogbu.”

Mana mgbe Jizọs nụrụ ya, ọ zaghachịrị ya, na-asị, Atụla egwu: naanị kwere, ma a ga-eme ya ezuo oke.”16

Ma ọ natara ọgwụgwọ. Ma gị onwe gị gakwa ezu. “Atụla egwu: naanị kwere.”

N’ihi na onye ọbụla n’ime unu nọ n’ọgbakọ a dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke ma na Nzukọ nsọ a, ana m eji nkwupụta pụrụ iche nke onye ozi emechi. Tupu gị anata nnọọ onyinye nke Mmụọ Nsọ, i nweburu Ihè nke Kraịst akụnyere n’ime mkpụrụ obi gị,17 “ìhè ahụ nke nọ n’ime ihe niile, … na-enye ihe niile ndụ,”18 ma ọ bụ mmetụta maka ịdị mma n’ime obi ndị mmadụ niile ọbụla biwororịị ma ọ bụ ga-ebikwa ndụ. Ìhè ahụ ka enyere iji chekwaa unu ma kuziere unu ihe. Otu n’ime isi ozi ya niile bụ na ndụ bụ ihe kachasị dị oke ọnụ ahịa n’onyinye niile dum, onyinye nke a na-enwete nke ebighị ebi naanị site na Aja mgbaghara mmehie nke Onyenwe anyị Jizọs Kraist. Dị ka Ìhè na Ndụ nke Ụwa,19 Ọkpara A Mụrụ Naanị Ya bịara ịnye anyị ndụ site n’imeri ọnwụ.

Anyị garịrị etinye onwe anyị n’uju nye onyinye ahụ nke ndụ ma rọpụta enyemaka nye ndị ahụ n’eme ka ha nwere ike ịhapụ onyinye a dị nsọ. Ndị ndu, ndị ndụmọdụ, ndị enyi, ezi na ụlọ—lezie anya maka ihe iriba ama nke obi ịda mba, enweghị okwukwe, ma ọ bụ ihe ọbụla na-egosipụta mmerụ onwe ahụ. Nye enyemaka gị. Gee ntị. Mee ụfọdụ ụdị ntinye ọnụ dị ka o kwesịrị.

Nke a bụ maka onye ntoroọbịa anyị ọbụla nọ ebe ọbụla onye na-adọlị ndọlị, ihe ọbụla bụ nchegbu ma ọ bụ ihe isi ike gị niile, o dowo anya n’ọnwụ site n’igbu onwe abụghị azịza. Ọ gaghị ebelata mgbu i na-enwete mmetụta ma ọ bụ nke dị gị ka ị nọ na-akpata. N’ime ụwa nke nwekarịsịrị mkpa nke ìhè niile o nwere ike inwete, biko ebelatakwala ìhè nke ebighị ebi Chineke tinyere n’ime mkpụrụ obi gị tupu ụwa nkea a dịrị. Gwa mmadụ okwu. Rịọ maka enyemaka. Emebi kwala ndụ nke Kraịst nyere ndụ Ya iji chebe. I nwere ike ibuli ndọlị niile nke ndụ anụ ahụ nkea n’ihi na anyị ga-enyere gị aka ibu ha. I siri ike karịa otu i si chee. Enyemaka bụ nke dị adị, site n’aka ndị ọzọ ma kacha nke site n’aka Chineke. A hụrụ gị n’anya ma gị e nwee ugwu ma achọrọ gị. Anyị chọrọ gị! “Atụla egwu: naanị kwere.”

Otu onye zutere ọnọdụ ndị kacharịsịrị nke mụ na gị nwere ike izute otu mgbe tiri mkpu: Gaa n’ihu [ndị enyi m nta m hụrụ n’anya]. Mgbam ume, … ma gaa n’ihu, n’ihu ruo na-mmeri! Ka mkpụrụ obi unu n̄ụrịa, ma nwebiga obi ụtọ oke.”20 Anyị nwere ọtụtụ ịhe nke ekwesịrị iji nwee obi ekele maka ha. Anyị nwere onye n’ibe ya, ma anyị nwere Ya. Agọnahụkwala anyị ohere inwe gị, ana m arịọ gị, naha nsọ na nke dị nsọ nke Onyenwe anyị Jịzọs Kraịst, Nna anyị Ukwu, amen.