Ọgbakọ Zuru ọha
Ọrụ ebube niile, Ndị mmụọ ozi, na Ike nke Ọkwa nchụaja
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Ọrụ ebube niile, Ndị mmụọ ozi, na Ike nke Ọkwa nchụaja

Ọ bụrụ ma ị chọọ ngọzi niile nke ọkwa nchụaja, tinyere ọrụ ebube niile na ije ozi nke ndị mmụọ ozi, jee ije n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ niile Chineke na-emewo ka ọ dịrị.

Ọtụtụ taa na-asị na ọrụ ebube niile adịzighị, na ndị mmụọ ozi bụ akụkọ ifo, nakwa na eluigwe niile emechiwo. Ana m agba ama na ọrụ ebube niile akwụsịbeghị, ndị mmụọ ozi nọ n’etiti anyị, ma eluigwe niile ghere oghe n’ezie.

Mgbe Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, O nyere onyeisi Ozi Ya Pita ọtụghe niile nke Ọkwa nchụaja Site na ọtụghe ndị a, Pita na Ndị ozi ndị ọzọ duru Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta. Mana mgbe Ndị ozi ahụ nwụrụ, ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja ka ewepụrụ n’ụwa.

Ana m agba ama na ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja ndị mgbe ochie ka eweghachiteworo n’ụwa. Pita, Jemis, na Jọn na ndị amụma mgbe ochie ndị ọzọ pụtara dị ka ndị bilitere n’ọnwụ, na-enyefe n’isi Onye amụma Josef Smit ihe Onyenwe anyị kọwara dị ka “ọtụghe niile nke alaeze m, na ọgbọ nke ozi ọma.”

Otu ụdị ọtụghe ndị ahụ abụrụwo ihe enyefere site na ndị amụma ruo ndị amụma tutu ruo taa. Ndịikom 15 ahụ anyị na-akwado dị ka ndị amụma, ndị ọhụụ, na ndị mkpughe na-eji ha edu Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta. Dị ka ọ dịịrị mgbe gboo, e nwere otu onyeisi Ozi onye nke na-ejide ma bụ onye e nyere ikike itinye ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja n’ọrụ. Ọ bụ Onyeisi Russell M Nelson, onye amụma na Onyeisi nke Nzukọ nsọ nke Kraịst eweghachitere n’ụbọchị anyị taa: Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a.

Site na Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta, anyị na-anata ngọzi niile nke ọkwa nchụaja—tinyere ike nke Chineke iji nyere anyị aka niime ndụ anyị. Site n’okpuru ọtụghe niile nke ọkwa nchụaja ji ikikere, anyị na-ekwe Chineke nkwa niile dị nsọ ma nata emume nsọ niile nke na-akwado anyị ibi niihu Ya. Ịmalite na baptizim na emume nnabata, ma mesịa niime tempụl, anyị na-aganiihu n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ niile nke na-edughachi anyị na-ebe Ọ nọ.

Site n’aka ebikwasịrị anyị n’isi, anyị na-anatakwa ngọzi niile nke ọkwa nchụaja, tinyere ntuziaka, nkasai obi, ndụmọdụ, ọgwụgwọ, na ike nke isoro Jizọs Kraịst. N’oge ndị m niile agọziwo m site na nnukwu ike nke a. Dị ka ekpugheworo ya na akwụkwọ nsọ, anyị na-arụ ya aka dị ka ike nke Ọkwa nchụaja Melkizedek dị nsọ.

N’oge ntoroọbịa m e nwetere m nnukwu ugwu maka ike nke a, kachasị dị ka egosịpụtara ya na ngọzi niile nke ọkwa nchụaja. Ebe m n’eje ozi dị ka nwata onye mgbasa ozi ọma na Chile, mụ na onye nsiso m ka anwụchiri ma kewaa. Enwetụghị mgbe a gwara anyị ihe kpatara ya. Ọ bụ oge ụwa juputara n’oke ọgba aghara nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Puku kwuru puku ndị mmadụ ka anwụrụla kpọchie site n’aka ndị agha uwe ojii ma anụkwaghị site na ha ọzọ.

Mgbe a gbachara m ajụjụ, a nọdụrụ m naanị m n’ụlọ mkpọrọ, na-amaghị ma m ga-ahụkwa ndị m hụrụ naanya ọzọ. A kpọkuru m Nna m nke Eluigwe, na-arịọsi ike: “Nna a kuziworo m mgbe niile na Ị na-elekọta ndị mgbasa ozi ọma Gị. Biko Nna, Abụghị m ihe pụrụ iche, mana anọ m na-erube isi ma a chọrọ m enyem aka Gị n’abalị a.”

Mkpụrụ niile nke enyem aka nke a ka akụworo ọtụtụ afọ gara aga. Ka emesịrị m baptizim, e mere m onye otu nke Nzukọ nsọ ahụ ma e nyere m onyinye nke Mmụọ Nsọ. Dị ka m kpere ekpere, naanị m, na-azụ ebe akpọchiri m, Mmụọ Nsọ ozugbo ozugbo bịakwutere m ma kasie m obi. O wetere n’uche m otu ederede pụrụ ezigbo iche sitere na ngọzi nke petrak m, nke bụ ngọzi ọzọ nke ọkwa nchụaja. Niime ya, Chineke kwere m nkwa na site na ikwesị ntụkwasị obi m aga m enwe ike ịrachi na tempụl maka oge na mgbe niile ebighị ebi nye onye inyom juputara n’ịhụnaanya na omume ọma na ịhụnaanya, nke na anyị ga-abụ nne na nna nke ụmụ ndị nwoke na ụmụada dị oke ọnụ ahịa, nakwa aga m abụ onye a gọziri agọzi ma bulie elu dị ka onye nna niime Israel.

Okwu ndị ahụ kpatere mmụọ gbasara ọdịniihu m juputara obi m n’udo. A maara m na ha si n’aka Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya bịa, onye na-edobe nkwa Ya mgbe niile. N’oge ahụ, e nwetere m mmasi obi ike na m ga-enwete ntọghapụ ma bie ndụ ịhụ nkwa ndị ahụ bịa na mmezu.

Ka ihe dị ka otu afọ gasịrị, Nna nke Eluigwe jiri otu nwunye nke juputara na mma na omume ọma na ịhụnaanya gọzie m. Mụ na Lynette ka arachiri na tempụl. Ejiri ọmarịcha ụmụ nwoke atọ na ụmụ nwanyị anọ gọzie anyị. A ghọrọ m onye nna dị ka otu nkwa niile nke Chineke siri dị niime ngọzi niile nke onye petrak m natara dị ka nwata nwoke gbara afọ 17.

Ya mere, ụmụnne m ndị nwoke [na ndị nwanyị] m hụrụ naanya, ọ bụ na ọrụ ebube niile akwụsiwo niihi na Kraịst agbagowo n’eluigwe? …

“… Mba; ọ bụghị ma ndị mmụọ ozi akwụsịwo izi ozi nye ụmụ nke mmadụ.”

Ana m agba ama na ọrụ ebube niile na izi ozi niile nọ na-aganiihu eme niime ndụ anyị, ọtụtụ mgbe dị ka ndapụta nke ike Ọkwa nchụaja. Ụfọdụ ngọzi nke ọkwa nchụaja ka ana emejuputa ozugbo ozugbo, n’ụzọ ndị anyị nwere ike ịhụ ma ghọta. Ndị ọzọ na-ekpughe nwayọ nwayọ ma gaghị emejuputacha niime ndụ nke a. Mana Chineke na-edobe nkwa Ya niile, mgbe niile, dị ka egosịpụtara niime nkọwapụta nke a sitere n’agụgụala ezi na ụlọ anyị:

Nna nna m na ebe a mụrụ nna m, Grant Reese Bowen bụụrụ nwoke nwere nnukwu okwukwe. Echetara m nke ọma ịnụ ka ọ na-akọgharị otu o siri nata ngọzi nke petrak ya onwe ya. Niime jonalụ ya, o dedatara: “Onye petrak ahụ kwere m nkwa onyinye nke ọgwụgwọ. O kwuru, ‘Onye ọrịa ga-enweta ọgwụgwọ. Ee, onye nwụrụ anwụ ka a ga-ekulite site n’aka gị.’”

Ka afọ ole na ole gasịrị, Nna nna nọ na-ekpokọta ọnụ ahịhịa kpọrọ nkụ mgbe o metụrụ ya ịlaghachi n’ụlọ. Nna ya zutere ya na-abịa ebe ọ nọ. “Grant, nne gị anwụwo mgbe na-adịbeghị anya,” ka nna ya kwuru.

Ana m eńomi ọzọ site na jonal nke Nna nna m: Akwụsịghị m mana jiri ọsịsọ banye niime ụlọ ahụ ma pụta niihu ụlọ ebe enyuwara ya n’obere akwa a na-enu aka. E lere m ya anya ma nwee ike hụ na-enweghị ihe gosịrị ndụ dị niime ya. Echetara m nke onye petrak m na nkwa ekwere na ọ bụrụ ma m nwee okwukwe, site na okwukwe m onye ọrịa ga-enweta ọgwụgwọ; ma onye nwụrụ anwụ ka aga ekulite. E bikwasịrị m ya aka n’isi, ma a gwara m Onyenwe anyị na ọ bụrụ na nkwa nke O kweworo m site n’aka nke onye petrak bụ eziokwu, ime ka ọpụta ihe n’oge nke a ma kulie nne m ịdị ndụ ọzọ. E kwere m Ya nkwa na ọ bụrụ na Ọ ga-eme nke a, enweghị m ike igbu oge ime ihe niile dị n’ike m maka iwulite Alaeze Ya. Dị ka m kpere ekpere, o meghere anya ya ma kwuo, ‘Grant, kulite m. Anọ m rịị na ụwa mmụọ, mana ịkpọghachitewo m azụ. Ka nke a nọgịde na-abụ ama nye gị ma nye ezi na ụlọ m fọdụrụ.’”

Onyeisi Russell M. Nelson akuziworo anyị ịchọ ma tụọ anya ọrụ ebube niile. Ana m agba ama na niihi na eweghachitewo ọkwa nchụaja, ike na ikike nke Chineke nọ n’elu ụwa. Site na ọkpụkpọ oku na kansụl niile, ndị nwoke na ndị nwanyị, nwata na agadi, nwere ike isonye n’ọrụ nke ọkwa nchụaja. Ọ bụ ọrụ nke ọrụ ebube niile, nke ndị mmụọ ozi na-ahụ maka ya. Ọ bụ ọrụ nke eluigwe, ma ọ na-agọzi ụmụ Chineke niile.

Na 1989, ezi na ụlọ anyị dị asaa sitere na ọpụpụ nke ngalaba ukwu na-alọta. Oge agawo. Lynette naara atụanya nwa anyị nke isii. O nwetara mkpate siri ike ikechi eriri oche ya, nke o chefuworo ime. Obere oge nke ahụ mechara anyị bịarutere na nkọnkọ ụzọ; otu ụgbọala kufere ahịrị bịa bata na okporo ụzọ nke anyị. Ebe m naara agba maịlụ 70 (112 km) n’otu awa, e chipụrụ m iji gbochie ịkụta ụgbọala nke na-abịa abịa. Ụgbọala anyị kpugharịrị, na-agbada n’okporo ụzọ awara awara ahụ, ma gbapụ n’ụzọ, n’ikpeazụ bịa kwụsị, ma were akụkụ nke ebe ana ebu mmadụ daba n’ebe apịtị.

Ihe ọzọ m chetara bụ ịnụ olu Lynette: “Shayne, anyị ga-achọ ị pụ site n’ọnụ ụzọ gị.” Ebegooro m n’ikuku site n’eriri oche m. O weere tịkọm tịkọm ole ma ole iji nweta onwe m. Anyị malitere ikuputa onye ọbụla niime ụmụ ntakịrị anyị n’ụgbọala ahụ site na mpio m, nke nọ ugbu a dị ka silin nke ụgbọala ahụ. Ha naara ebe akw, na-eche ihe meworo.

Mgbe na-adịghị anya anyị matara na Emily nwa anyị nwanyị gbara afọ 10, efuola. Anyị tikuru aha ya, mana enweghị azịza. Ndị otu ngalaba ukwu, ndị naara alakwa n’ebe obibi, nọọrọ ebe ahụ ihe mere gbalịsie ike na-achọ ya. Itiri agbaala nke ukwuu. Elebakwara m anya n’ụgbọala ahụ ọzọ jiri ọkụ ori ọna ma, n’oke egwu m, hụ obere ahụ Emily kpafaara n’okpuru ụgbọala ahụ. E tiri m mkpu n’ụjọ, “Anyị ga-ebupụ ụgbọala ahụ site na-ahụ Emily.” A dọọrọ m elu ụgbọala ahụ ma dọlaa ya azụ. Ma enwere mkpụrụ mmadụ ole ma ole ndị ọzọ so na-ebu, mana n’ịtụnaanya ụgbọala ahụ dagharịrị ma kwụrụ n’ụkwụ ya, na-egosi ahụ Emily na-adịkwaghị.

Emily anaghị eku ume. Ihu ya naara acha purple plum. E kwuru m, “Anyị kwesịrị inye ya ngọzi.” Otu ezi enyi na onye otu ngalaba ukwu soro m gbisa, ma site n’ikikere nke Ọkwa nchụaja Melkizedek, n’aha nke Jizọs Kraịst, anyị nyere ya iwu ịdị ndụ. N’otu oge ahụ, Emily kworo otu ogologo ume.

Mgbe ihe yiri ọtụtụ awa gachara, ambulans bịaziri n’ikpeazụ. Ebugara Emily n’ụlọ ọgwụ ọsịsọ ọsịsọ. O nwere ngụ dara ada na akwara ndị chabiri achabị n’ikpere ya. Mmebi ụbụrụ naara atụ echiche niihi oge ndị ahụ ọ na-enweghị ume ndụ. Emily dabara n’ụra ọnwụ otu ụbọchị na ọkara. Anyị gara n’ihu ikpe ekpere ma buo ọnụ maka ya. E jiri mgbake zuru oke wee gọzie ya. Taa, Emily na di ya, Kevin, bụ nne na nna nke ụmụ ada asaa.

N’ịtụnaanya, ndị niile ọzọ nwere ike ịpụ. Obere nwa Lynette bu n’afọ oge ahụ bụ Tyson. Yanwa kwa enwetaghị mmerụ ahụ ọbụla ma amụrụ ya na Febrụwarị na-esote. Ka ọnwa asatọ gasịrị, mgbe ọ natasịrị ahụ nke elu ụwa ya, Tyson laghachikwuru Nna nke Eluigwe. Ọ bụ nwa anyị nwoke onye mmụọ ozi na-edu anyị. Anyị na-enwete mmetụta ya niime ezi na ụlọ anyị ma na-atụanya ịnọnyekwara ya ọzọ.

Ndị ahụ bupụrụ ụgbọala ahụ site n’ahụ Emily hụtara na ụgbọala ahụ yiri ka ọ nyịghị arụ ọbụla. A maara m na ndị mmụọ ozi nke eluigwe so tinye aka ha na ndị mmụọ ozi nke elu ụwa iji bupụ ụgbọala ahụ n’ahụ Emily. A makwaara m na akpọghachitere Emily na ndụ site n’ike nke ọkwa nchụaja dị nsọ.

Onyenwe anyị kpughere eziokwu nke a nye ụmụ odibo Ya: “Aga M ebutere unu ụzọ. Aga m anọ n’aka nri unu ma n’aka ekpe unu, ma Mmụọ m ga-anọ n’obi unu, ma ndị mmụọ ozi m ga-agba unu gburugburu ịkwalite unu.”.

Ana m agba ama na “Ọkwa nchụaja Dị nsọ, dị n’usoro nke Ọkpara Chineke”—Ọkwa nchụaja Melkizedek—ya na ọtụghe ya niile, ikike, na ike ka eweghachiteworo n’ụwa n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. Ama m na ebe na ọ bụghị ọnọdụ niile na-adaba dị ka otu anyị nwere ike tụọanya ma kpee ekpere maka ya, Ọrụ ebube nke Chineke ga-abịa mgbe niile dị ka otu uche Ya, oge Ya, na atụmatụ Ya maka anyị siri dị.

Ọ bụrụ ma ị chọọ ngọzi niile nke ọkwa nchụaja, tinyere ọrụ ebube niile na ije ozi nke ndị mmụọ ozi, ana m akpọku gị ije ije n’okporo ụzọ nke ọgbụgba ndụ niile Chineke na-emewo ka ọ dịrị nye onye ọbụla niime anyị. Ndị otu na ndị ndu nke Nzukọ nsọ ahụ hụrụ gị naanya ga-enyere gị aka ịzọpụ nzọ ụkwụ nke ọzọ.

Ana m agba ama na Jizọs Kraịst, Ọkpara nke Chineke, dị ndụ na na-edu Nzukọ nsọ Ya site n’aka ndị amụma dị ndụ ndị ji ma na-etinye n’ọrụ ọtụghe niile nke Ọkwa nchụaja. Mmụọ Nsọ dị ire. Onye Nzọpụta nyere ndụ Ya iji gwọọ anyị, nweghachi anyị, ma kpọlata anyị na-ebe obibi.

Ana m agba ama na ọrụ ebube niile akwụsịbeghị, na ndị mmụọ ozi nọ n’etiti anyị, ma eluigwe niile ghere oghe. Ma o, lee ka ha si ghere oghe! Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen