Ọgbakọ Zuru ọha
Mkpụrụ Okwu niile Dị Mkpa
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Mkpụrụ Okwu niile Dị Mkpa

Okwu niile na-edozi ihe. Ha na-ekwupụta echiche anyị niile, mmetụta niile, na nhụmihe niile, maka ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.

Ụmụnne ndị nwoke, ndị nwanyị, na ndị enyi n’ofe ụwa, e nwere m nkwanye ugwu ịgwa nnukwu ndị a na-ege ntị okwu, ọtụtụ n’ime ha bụ ndị otu Nzukọ nsọ anyị ma ọtụtụ bu ndị enyi ma bụrụ ndị na-ege ntị ọhụrụ na mgbasa ozi ọgbakọ a. Nnọọnụ!

Ozi niile a na-ezipụ site na ikpo okwu a bụ site na mkpụrụ okwu niile. A na-enye ha n’asụsụ Bekee ma tụgharịa ha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ asụsụ 100 dị iche iche. Mgbe ọ bụla okwu ahụ bụ otu ihe . Mkpụrụokwu niile. Ma mkpụrụokwu niile dị oke mkpa. Ka m kwuo nke ahụ ọzọ. Mkpụrụokwu niile dị mkpa!

Ha bụ ihe ndabere nke otu anyị si ejikọta, ha na-anọchite anya nkwenye anyị niile, omume ọma niile, na echiche anyị niile. Mgbe ụfọdụ anyị na-ekwu okwu; oge ndị ọzọ anyị na-ege ntị. Okwu niile na-edozi ihe. Ha na-ekwupụta echiche anyị niile, mmetụta niile, na nhụmihe niile, maka ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.

N’ụzọ dị mwute, okwu niile nwere ike ịbụ ihe enweghị isi, dị ngwa ngwa, ma na-enye mwute. Ozugbo e kwuru ya, anyị enweghị ike iweghachi ha azụ. Ha nwere ike ịmerụ ahụ, nye ntaram ahụhụ, betuo, ma ọbụna duba n’omume mbibi niile. Ha nwere ike ị bụrụ anyị ibu arọ.

N’aka nke ọzọ, okwu niile nwere ike ime ememe mmeri, nwee olileanya na agbamume. Ha nwere ike ime ka anyị chegharịa echiche, malitegharịa, ma tụghrịa ụzọ anyị. Mkpụrụ okwu niile nwere ike imeghe uche anyị nye eziokwu.

Ya kpatara, nke mbụ na mbụ, okwu niile nke Onyenwe anyị dị mkpa.

N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn , Onye amụma Alma na ndị ya n’America oge ochie zutere agha na-adịghị agwu agwu ha na ndị ahụ leghaara okwu nke Chineke anya, mee ka obi ha sie ike ma mebie omenala ha. Ndị kwesịrị ntụkwasị obi gaara alụ ọgụ, mana Alma nyere ndụmọdụ: “Ma ugbua, dịka ịkwusa okwu ahụ nwere nnukwu ike idu ndị ahụ ime ihe ahụ nke zịrị-ezi—e, o nweworịị nsonazụ kara sie ike n’obi nile nke ndị ahụ karịa mma-agha ahụ, ma-ọbụ ihe ọzọ ọbụla, nke meworo ha—ya mere Alma chere na ọ dị mkpa na ha ga-anwale ezigbo omume nke okwu Chineke ahụ.”

“Okwu nke Chineke” karịrị okwu ndị ọzọ niile. Ọ bụ ka ọdị site n’Okike nke ụwa mgbe Onyenwe anyị kwuru: “Ka ihé dị: ma ihé dị kwa.”

Site n’aka Onye Nzọpụta ka mmesi obi ike ndị a n’ime Agba Ọhụrụ si bịa: “Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m niile agaghị agabiga.”

Ma nke a: “Ọ bụrụ na mmadụ hụrụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m niile: ma Nna m ga-ahụkwa ya n’anya, ma anyị ga-abịakwute ya, ma mee kwa ka anyị na ya biri.

Ma site n’aka Meri, nne nke Jizọs, ka ịgba ama umeala nke a si bịa: “Lee oru-nwanyị nke Onyenwe anyị; ka ọ diri m dịka okwu gị si dị.”

Ikwere na ịńa ntị n’okwu Chineke ga-adọta anyị nso nye Ya. Onyeisi Russell M. Nelson ekwewo nkwa, “ Ọ bụrụ na ị ga-amụ okwu Ya niile, ike gị ịdị ka Ya ga-abawanye.”

Ọ bụ na anyị niile achọghị ịbụ, dịka abụ ahụ na-ekwu, “ị nweta ngọzi na ịdị nsọ karịa—karịa, Onye Nzọpụta, dịka gị”?

A na m ahụ nwa okorobịa Josef Smit ka ọ nọ n’ikpere ya na-anụ mkpụrụ okwu niile nke Nna Ya nke Elu-igwe: “[Josef,] Nke a bụ Okpara M Hụrụ n’anya. Nụrụ olu Ya!”

Anyị “na-anụ olu Ya” n’ime mkpụrụ okwu niile nke akwụkwọ nsọ, mana anyị na-ahapụ ha ka ha n’ọdụ otu ahụ, ma ọ bụ anyị ghọtara na Ọ na-agwa anyị okwu? Anyị na-agbanwe?

Anyị “na-anụ olu Ya” na mkpughe nke onwe na mkpali niile sitere na Mmụọ Nsọ, nime azịza niile nye ekpere, na oge ndị ahụ mgbe naanị Jizọs Kraịst, site n’ike nke Aja mgbaghara mmehie Ya, nwere ike ịbụpụ ibu anyị niile, nye anyị mgbaghara na udo, ma makụọ anyị “n’ogweaka nke ịhụnaanya ya.”

Nke abụọ, okwu niile nke ndị amụma dị mkpa.

Ndị amụma na-agba ama maka ịdị-nsọ nke Jizọs Kraịst. Ha na-akuzi ozi ọma Ya ma gosi ịhụnaanya Ya maka mmadụ niile. A na m agba ama m na onye-amụma anyị dị ndụ, Onye-isi Russell M. Nelson, na-anụ, ma na-ekwu okwu nke Onyenwe anyị.

Onyeisi Nelson nwere uzọ o si ekwu okwu niile. O kwuola, “Nọgide n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ,” ”Kpokọta Izrel,” ”Ka Chineke merie,” ”Wuo akwa mmiri niile nke nghọta,” ”Nye ekele,” ”Mụbaa okwukwe nime Jizọs Kraịst,” ”Na-elekọta ọgbụgba ama gị,” ma “Bụrụ onye na-eme udo.”

N’oge na-adịghị anya ọ gwara anyị ka anyị “Chee maka celestial.” “Mgbe nsogbu chere gị ihu,” o kwuru, “chee maka celestial! Mgbe a nwara gị site n’ọnwụnwa, chee maka celestial! Mgbe ndụ ma ọbụ ndị ịhụrụnaanya gharịpụrụ gị, chee maka celestial! Mgbe mmadụ nwụchuru ọnwụ, chee maka celestial. …Mgbe nrụgide nke ndụ na-adakwasị gị, chee maka celestial! … Dịka ị na-eche maka celestial, obi gị ga-eji nwayọọ na-agbanwe, … Ị ga-ahụ ọnwụnwa niile na mmegide n’ụzọ ọhụrụ, … [ma] okwukwe gị ga-amụba.”

Mgbe anyị na-eche maka celestial, anyị na-ahụ “ihe niile dịka ha dị n’ezie, na … dị ka ha ga-adị n’ezie.” N’ụwa a nke jupụtara na mgbagwoju anya na esemokwu, echiche ahụ dị anyị niile mkpa.

Okenye George Albert Smith, ogologo oge tupu ọ ghọọ Onyeisi nke Nzukọ nsọ, kwuru okwu maka ịkwado onye amụma na ịge ntị n’okwu ya niile. O kwuru: “Ọrụ anyị na-arụ mgbe anyị weliri aka anyị elu … bụ nke kachasị nsọ. … Ọ pụtara … na anyị ga-egozo n’azụ ya; anyị ga-ekpe ekpere maka ya; … ma anyị ga-agbalịsi ike imezu ntuziaka ya niile dị ka Onyenwe anyị ga-enye ntuziaka.” N’aka nke ọzọ, anyị ga-eji ịdị uchu mee ihe n’okwu niile nke onye amụma anyị.

Dịka otu nime ndị amụma, ndị ọhụụ, na ndị mkpughe 15 a kwadoro ụnyahụ site n’aka Nzukọ nsọ anyị zuru ụwa, A chọrọ m ị kọrọ unu nhụmihe m niile n’ịkwado onye amụma ahụ na ịnabata okwu ya niile. Maka mụ ọ dịrị ka onye amụma Jekọb, onye kọrọ, “A nụrụ m olu nke Onyenwe anyị ka ọ na-agwa m okwu n’ime okwu ya ọbụla.”

Foto, oyiyi
Okenye na Nwanne nwanyị Gong nime Thailand.

Na Ọktoba gara aga nwunye m, Melanie, na mụ nọ nime Bangkok, Thailand,dị ka m na-akwado iraranye ihe ga-abụ tempụl nke 185 nke Nzukọ nsọ. Maka m, ọrụ ahụ bụ ma nke a na-enyefe onwe na obi umeala. Nke a bụ tempụl mbụ dị na southeast Ashịa peninsula. A haziri ya nke ọma—ụlọ elu isii, ihe ewuru n’ụzọ itoolu, “nke a hazisiri ike” ị bụ ụlọ nke Onyenwe anyị. Nime ọtụtụ ọnwa A na m atụgharị uche na ịdo-nsọ ahụ. Ihe dabara nime mkpụrụ obi m na uche m bụ na obodo ahụ na tempụl ahụ ka e jikwasịrị nime ogweaka nke ndị amụma na ndị ozi. Onye-isi Thomas S. Monson mara ọkwa tempụl ahụ ma Onyeisi Nelson mere nraranye ya.

Foto, oyiyi
Tempụl Bangkok Thailand.

A kwadoro m ekpere ịdo-nsọ ahụ ọtụtụ ọnwa gara aga. Atụgharịwo okwu niile dị nsọ ahụ n’asụsụ 12. Anyị dịịrị njikere. Ma ọ bụ ka m chere.

N’abalị bọtara ụbọchị nraranye ahụ, A kpọtere m n’ụra m site na mmetụta na-adịghị mma, dị ngwa ngwa gbasara ekpere nraranye ahụ. A gbalịrị m iwepụ mkpali ahụ, na-eche na ekpere ahụ dị mma. Mana Mmụọ ahụ ekweghị ịhapụ m aka. A chọpụtara m na ụfọdụ okwu na-efu efu, ma site n’ichepụta dị nsọ ha bịakwutere m na mkpughe, ma m tinyere okwu ndị a n’ekpere ahụ dị nso na njedebe: “Ka anyị na-eche echiche selestịal, na-ekwe ka Mmụọ Gị na-emeri na ndụ anyị, ma na-agbalịsi ike ịbụ ndị na-eme udo mgbe niile.” Onyenwe anyị nọ na-echetara m ka m ńaa ntị n’okwu niile nke onye amụma anyị dị ndụ: “Chee maka celestial,” “Kwee ka Mmụọ ahụ merie,” “Gbalịsie ike ị bụ ndị ome udo.” Okwu niile nke onye amụma dị Onyenwe anyị na anyị mkpa.

Nke atọ, ma dị oke mkpa, bụ okwu niile nke anyị. Kwenyere m, n’ụwa anyị jupụtara na emoji, okwu anyị dị mkpa.

Okwu anyị nwere ike ịkwado ma ọ bụ iwe, ọńụ ma ọ bụ obi ọjọọ, ọmịiko ma ọbụ tufuo ya. N’ime okpomọkụ nke oge a, okwu niile nwere ike ịgba ma mikpuo site ninye mgbu n’ime mkpụrụ obi—ma nọrọ nebe ahụ. Okwu anyị na ịntanetị, ozi ederede, social media, ma ọbụ tweets na-ewere ndụ nke onwe ha. Ya mere kpachara anya ihe ị na-ekwu ma ka isi kwuo ya. N’ime ezinaụlọ anyị niile, karịsịa ndị dị, ndị nwunye, na ụmụ, okwu anyị nwere ike ime ka anyị dịrị n’otu ma ọbụ gbasa anyị.

Ka m tụọ aro nkebi okwu atọ dị mfe anyị nwere ike iji wepụ ihe ụfụ site na ihe isi ike na esemokwu niile, bulie, ma mesie onwe anyị obi ike:

“Ị meela.”

“Ndo”

Na “A hụrụ m gị n’anya.”

Echekwala nkebi okwu ndị a dị umeala n’obi maka ihe omume pụrụ iche ma ọ bụ ọdachi. N’eji ha eme ihe mgbe niile n’akwa n’ezi obi, n’ihi na ha na-akwanyere ndị ọzọ ugwu. Okwu na-adị ọnụ ala ; esola ụkpụrụ ahụ.

Anyị nwere ike sị “ịmela” n’ime igwe mbuli elu, n’ebe a na-adọba ụgbọala, n’ahịa, n’ọfis, n’ahịrị, ma ọbụ anyị na ndị agbataobi ma ọ bụ ndị enyi anyị. Anyị nwere ike si “gbaghara m” mgbe anyị mejọrọ, hapụ nzukọ, chefuo ụbọchị ọmụmụ, ma ọ bụ hụ onye nwere ihe mgbu. Anyị nwere ike sị “A hụrụ m gị n’anya” ma okwu ndị ahụ na-ebu ozi ahụ “Ana m eche maka gị,” “E nwere m mmetụta ebe ị nọ,” A nọ m ebe a maka gị,” ma ọ bụ “Ị bụ ihe niile nye m.”

Ka m kọọ maka otu ọmụmatụ onwe. Ndị dị , geenụ ntị. Ụmụnne nwanyị, nke a ga-enyekwara unu aka. Tupu e kenye m ọrụ oge niile na Nzukọ nsọ, A gara m ọtụtụ ebe maka ebe m na-arụ ọrụ. A gara m nke ọma ruo ebe dị anya n’ime ụwa. Na ngwucha nke ụbọchị m, n’agbenyeghị ebe m nọ, a na m akpọ ebe obibi mgbe ọbụla. Mgbe nwunye m, Melanie, bulitere ekwe ntị m kpọrọ ya, mkparịta ụka anyị na-eduga anyị mgbe niile ikwupụta na “m hụrụ gị n’anya.” Kwa ụbọchị, okwu ndị ahụ jere ozi dị ka arịlịka nye mkpụrụ obi m na omume m; ha bụụrụ m ihe nchebe pụọ n’atụmatụ ọjọọ. “Melanie, A hụrụ m gị n’anya” kọwara maka ntụkwasị obi dị oke ọnụ nọ n’etiti anyị.

Onyeisi Thomas S. Monson naara ekwu, “Enwere ụkwụ ndi aga agbazi, aka ndi aga ejigide, echiche ndi aga agba ume, obi ndi aga akwalite, na mkpụrụ obi ndị aga azọpụta.” Ị kwu “ị meela,” “ndo,” “A hụrụ m gị n’anya” ga-eme ihe a chọrọ.

Ụmụnne nwoke na Ụmụnne nwanyị, okwu niile dị mkpa.

A na m ekwe nkwa na ọbụrụ na anyị “rie oriri n’elu okwu niile nke Kraịst” nke na-eduga na nzọpụta, okwu onye amụma anyị na-eduzi ma na-agba anyị ume, na okwu nke onwe anyị nke na-ekwu maka onye anyị bụ na ihe anyị ji kpọrọ ihe, ike nke eluigwe ga-awụkwasị anyị. “Okwu niile nke Kraịst ga-agwa unu ihe niile unu kwesịrị ime.” Anyị bụ ụmụ nke Nna nke Eluigwe ma Ya bụ Chineke anyị, ma Ọ na-atụ anya ka anyị kwuo okwu jiri “asụsụ nke ndị mmụọ ozi” site n’ike nke Mmụọ Nsọ.

A hụrụ m Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’anya. “Ọ bụ, nime okwu niile nke onye amụma Aịzaya Agba Ochie, “Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke bụ Dike, Nna nke Mgbe nilie na-adigide, Eze nke Udo.” Ma dịka Onye ozi Pọl kọwara, Jizọs Kraịst n’Onwe Ya bụ “Okwu ahụ.”

Na nke a Ana m agba ama dị ka Onye ozi a kpọrọ oku ije ozi dị nsọ nke Onyenwe anyị—ịkwupụta okwu Ya—ma a kpọrọ oku iguzo dị ka onye aka ebe pụrụ iche nke Ya. Site n’aha nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.