Ọgbakọ Zuru ọha
Na-achịkọta Iwu nsọ Abụọ Dị Ukwuu
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Na-achịkọta Iwu nsọ Abụọ Dị Ukwuu

Ikike anyị iso Jizọs Kraịst dabeere n’ike anyị ibi ndụ iwu nsọ nke mbụ na nke abụọ na nguzozi ike na nha anya nranyere ha abụọ.

Ndubata

Dịka nwunye m, Lesa, na mụ na-ejegharị n’ebe e kenyere anyị ọrụ n’ụwa niile, anyị na-enwe ọńụ n’ihi ugwu nke iso unu zute n’ọgbakọ ndị ukwu na ndị nta. Nraranye unu n’ọrụ nke Onyenwe anyị na-akwali anyị elu ma guzoro dịka ịgba-ama maka ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Anyị si na njem ọ bụla na-alọta na-eche ma anyị nwere ike nye ihe dị ukwuu dị ka anyị nwetara n’aka unu.

Foto, oyiyi
Akwa mmiri Rainbow.
Foto, oyiyi
Akwa mmiri Tsing Ma.
Foto, oyiyi
Akwa mmiri Tower.

Mgbe anyị na-eme njem, anyị na-enwe obere oge maka nlegharị anya. Ka o sila dị, na mgbe ọ bụla o kwere, M na-etinye oge ole na ole n’ime otu ọchịchọ. E nwere m mmasị na achịtechọ na dizaịn na mmasị pụrụ iche na akwa mmiri. Akwa mmiri ndị ko n’elu na-eju m anya. Ma ọ bụ Akwa mmiri Rainbow na Tokyo, Akwa mmiri Tsing Ma dị na Hong Kong, Akwa mmiri Tower dị na London, ma ọ bụ ndị ọzọ m hụrụla, ọ ga-eju m anya na nka injinia e wuru n’ime ụlọ ndị a gbagwojuru anya. Akwa mmiri niile na-ebuga anyị ebe ndị anyị na-agaghị enwe ike ịga. (Tupu m ga n’ihu, a hụrụ m na kemgbe akwadoro ozi a, ihe mberede akwa mmiri dị egwu mere na Baltimore. Anyị n’eru uju nke ndị tufuru ndụ ma na-akasị ndị ezinaụlọ niile o metụtara.)

Otu Akwa mmiri Mara-mma Ko n’elu

N’oge adịbeghị anya, otu ọrụ ọgbakọ kpọgara m California, ebe m gafekwara ọzọ akwa mmiri Golden Gate, nke a na-ewere dị ka ihe ịtụnaanya injinia nke ụwa Ihe oeuwu a dị egwu na-ejikọta ọnụ ụdị mara mma, ebumnuche ịrụ ọrụ, yana injinia dị egwu. Ọ bụ akwa mmiri nọ-n’elu mara mma nke nwere ụlọ elu niile bookend, nke nnukwu pier kwadoro. Agadagba ahụ, ụlọ elu ejima na-ebu nnukwu ibu dị arọ nke na-arị elu oke osimiri bụ mmewere ndị mbụ a rụrụ. Ha na-ejikọta ọnụ na-ebu ibu nke nnukwu eriri niile mkpochapụ nọ-n’elu na eriri niile ndị kwụsịrị ike, bụ ndị na-adọba n’okpro ụzọ dị n’okpuru. Ike pụrụ iche nke na-ejide ihe—ike nke ụlọ elu ahụ—bụ anwansi ahụ dị na injinia nke ịrụ akwa mmiri ahụ.

Foto, oyiyi
Akwa mmiri Golden Gate a na-arụ arụ.

Mpaghara Akwa mmiri Golden

Onyonyo niile ọrụ mbụ nke akwa mmiri ahụ na-agba akaebe nke ụkpụrụ injinie a. Mmewere akwa mmiri ọ bụla na-achọta nkwado ibu arọ site na ụlọ elu ndị ahụ, ebe ha abụọ jikọtara ọnụ na ibe ya.

Foto, oyiyi
Akwa mmiri Golden Gate a na-arụ arụ.

Getty Images/Underwood Archives

Mgbe arụchara ya, ụlọ elu abụọ ahụ guzosịrị ike, na pier niile a kwụnyere na ntọala nke akwa mmiri, bụ ihe onyonyo nke ike na ịma mma.

Foto, oyiyi
Akwa mmiri Golden.Gate.

Taa A na m akpọ gị oku ka ị lelee akwa mmiri a—mara mma, nke nwere ụlọ elu ejima ya na-agbago n’elu ewuru na ntọala siri ike—site n’anya nke ozi ọma.

Mgbe ọ fọdụrụ ntakịrị chi ejie nke oge ije ozi nke Jizọs Kraịst, nime ihe anyị na-akpọ ugbu a Izu Nsọ, otu onye Farisii bụ onye ọka iwu jụrụ Onye Nzọpụta ajụjụ nke ọ maara n’ọga ara ahụ ịza: “Onyenwe m, gịnị bụ iwu nsọ dị ukwuu n’ime iwu?” Onye ọka iwu ahụ, “na-ịnwa ya” ma na-ịchọ azịza nke iwu, site n’ebumnobi yiri nke enweghị uche, natara nzaghachi si na chi bụ eziokwu, dị nsọ.

“Jizọs gwara ya, Ị ga-ahụ Onyenwe gị Chineke gị n’anya jiri obi gị niile, na mkpụrụ obi gị niile, na uche gị niile.

“Nke a bụ ịhe mbụ na ihe ukwu enyere n’iwu-nsọ.” N’ịge ntị nye ntụnyere akwa mmiri anyị, ụlọ elu nke mbụ!

“Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dịka onwe gị.” Nke a bụ ụlọ elu nke abụọ!

“N’elu iwu nsọ abụọ ndị a ka iwu na ndị amụma niile bekwasịrị.” Mmewere ndị fọdụrụ nke akwa mmiri ahụ!

Ka anyị nwere ike inyocha nke ọ bụla nime nnukwu iwu abụọ ahụ, nke ekpughere na nke a gụgharịrị na nzaghachi Jizọs Kraịst. Ka anyị na-eme otu ahụ, ka ihe oyiyi nke ọmarịcha akwa mmiri ko n’elu, na-atụgharị n’anya nke uche gị.

Hụ Onyenwe anyị n’anya

Nke mbụ, ga-eji obi, mkpụrụ obi, na uche gị niile hụ Onyenwe anyị n’anya.

N’azịza nke a, Jizos Kraịst na-achịkọta ihe bụ isi n’iwu nke gụnyere nkuzi niile dị nsọ nke Agba Ochie. Ịhụ Onyenwe anyị n’anya na-agbakwasị ụkwụ na mbụ n’obi gị—ọdịdị gị a maara amara. Onyenwe anyị na-arịọkwa ka i nwee ịhụnaanya jiri mkpụrụ obi gị dum—onwe gị niile edoro nsọ—ma n’ikpeazụ, iji uche gị dum hụ n’anya—ọgụgụ isi na mmasị gị. Ịhụnaanya maka Chineke abụghị nke a kpara oke ma ọ bụ nwere ọgwụgwụ. Ọ bụ e nweghị ngwụcha ma dị ebighị ebi.

Maka m, omume nke iwu nsọ nnukwu nke mbụ nwere ike mgbe ụfọdụ dị ka ihe a gaghị emeli, ọbụna ihe na-akụda mmụọ. N’obi ekele, ka m na-atule mkpụrụ okwu niile nke Jizọs, iwu nsọ a na-ekwe nghọta nke ọma: “Ọ bụrụ na ị hụrụ m n’anya, dobe iwu nsọ m niile.” Nke a ka m nwere ike ime. E nwere m ike ịhụ Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst n’anya, nke na-eduba n’ekpere, ọmụmụ akwụkwọ nsọ, na ofufe nke tempụl. Anyị hụrụ Nna na Ọkpara ahụ n’anya site n’ịkwụ otu ụzọ n’ụzọ iri niile, na-edobe Ụbọchị izu ike nsọ, na-ebi ndụ nke ezi omume na ịdị ọcha, na irube isi.

Ịhụ Onyenwe anyị n’anya n’esi n’obere omume kwa ụbọchị, nzọụkwụ niile n’ụzọ ọgbụgba ndụ: maka ndị na-eto eto, iji social media wulite karịa ịkwatu; ịhapụ nnọkọ orịrị na ọńụńụ, ihe nkiri, ma ọ bụ ihe omume n’ebe e nwere ike ịgbagha ụkpụrụ; na-egosi nkwanye ugwu maka ihe ndị dị nsọ.

Tulee ihe ịma-atụ nke a dị nro. Ọ bụ Sọnde obubu ọnụ dịka Vance na Mụ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ nke obere, ụlọ dị umeala n’obi. Anyị na ndị dikọn ndị ọzọ nọ na kworum bịara ịtụ anya okwu ndị a, “Biko batanụ,” mkpu e tiri n’obi ọma n’olu German siri ike nke ukwuu ịnụ site na ụzọ ahụ. Nwanne nwanyị Muellar bụ otu n’ime ọtụtụ ndị inyom di ha nwụrụ na ngalaba ukwu ahụ. Ọ pụghị ịza ọnụ ụzọ ahụ ngwa ngwa, n’ihi na o kpuru isi n’ụzọ iwu kwadoro. Ka anyị banyere n’ime ụlọ ahụ na-adịghị ahụkebe ihé, o jiri ajụjụ obi ọma kelee anyị: Gịnị bụ aha unu? Kedụ ka unu mere? Unu hụrụ Onyenwe anyị n’anya? Anyị zara ma gwa ya na anyị bịara ịnata onyinye obubu ọnụ ya. Ọbụna dị na anyị ka bụ ụmụaka, ọnọdụ ya niile dị ntakịrị pụtara ngwa ngwa, ma nzaghachi ya jupụtara na okwukwe mmetụrụ anyị n’ahụ nke ukwuu: “E tinyere m otu mkpụrụ ego nelu counter nisi ụtụtụ a. Enwere m ezigbote obi ekele inye onyinye obubu ọnụ m. Ị ga-emere m ebere ị tinye ya n’ime evvelopu ma dejupụta akwụkwọ nnata onyinye obubu ọnụ m? Ịhụnaanya ya ebe Onyenwe anyị nọ buliri okwukwe anyị mgbe ọbụla anyị hapụrụ ebe obibi ya.

Eze Benjamin kwere ndị na-agbaso iwu nsọ dị ukwuu nke mbụ ahụ nkwa na ha ga-arụpụta ihe dị ịrịba ama. “A ga m achọ ka unu tụgharịa uche na ngọzi na ọnọdụ an̄ụrị nke ndị ahụ na-edebe iwu nsọ nIile. … A gọziri ha n’ihe niile, … ma ọbụrụ na ha a nọgide n’okwukwe ruo n’ọgwụgwụ a ga-anabata ha n’ime eluigwe … n’ọnọdụ an̄ụrị na-enweghị ọgwụgwụ.”

Ịhụ Onyenwe anyị n’anya na-eduba n’obi ụtọ ebighị ebi!

Hụ Onye agbata obi Gị N’anya

Jizọs mgbe ahụ kwuru, “Ma nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị” Nke a bụ ụlọ elu nke abụọ nke akwa mmiri ahụ.

N’ebe a Jizọs na-ejikọta anya elu nke eluigwe anyị, ịhụ Onyenwe anyị n’anya, jiri anya elu ụwa anyị, ịhụ ndị mmadụ ibe anyị n’anya. Otu na-adabere na nke ọzọ. Ịhụnaanya nke Onyenwe anyị ezughị oke ma ọ bụrụ na anyị eleghara ndị agbata obi anyị anya. Ịhụnaanya nke a na-ahụ anya gụnyere ụmụ Chineke niile n’agbanyeghị okike, ọkwa ọha, agbụrụ, mmekọahụ, ego, afọ, ma ọ bụ agbụrụ onye si pụta ụwa. Anyị na-achọ ndị ahụ emejọrọ na ndị obi tiwara, ndị a na-akpachapụ anya kpapụ, n’ihi na mmadụ niile “yiri otu n’ebe Chineke nọ.” Anyị “na-lekọta ndị n’adịghị ike, welite aka ndị ahụ lọdara ala, ma mesie ikpere ndị n’adịghị ike ka ha dị ike.”

Tụlee ihe ọma-atụ a: Nwanne nwoke Evans nwere ihe iju anya mgbe a kpaliri ya ịkwụsị ụgbọ ala ya ma kụọ aka n’ọnụ ụzọ ezinaụlọ ọ na-amaghị. Mgbe otu nne nwanyị isi mkpe mụrụ ụmụ 10 mepere ọnụ ụzọ ahụ, ọnọdụ ọjọọ ha na mkpa ha dị ukwuu pụtara ihé ngwa ngwa nye ya. Nke mbụ dị mfe, agba maka ebe obibi ha, sochiri ọtụtụ afọ nke ije ozi nlekọta anụ ahụ na nke ime mmụọ.

Nne a nwere obi ekele mechara dee maka enyi ya e zitere site n’eluigwe: “Ị nọrọla na ndụ gị leta ndị kacha nta n’ime anyị. Ọ ga-amasị m ịnụ ihe ndị ahụ Onyenwe anyị ga-agwa gị ka Ọ na-ekwupụta ekele Ya maka ezi ihe i meworo n’ụzọ ego na nke ime mmụọ, maka ndị ahụ naanị gị na Ya ga-amata. Daalụ maka ịgọzi anyị n’ọtụtụ ụzọ, … maka ndị mgbasa oziọma ị nyere maka. … A na m echekarị ma Onyenwe anyị họpụtara gị naanị, ma ọ bụ na ọ bụ naanị gị gere ntị.”

Ịhụ onye agbata obi gị n’anya gụnyere ezi omume niile yiri nke Kraịst nke omume obi ọma na ije ozi. Ị nwere ike hapụ iwe iwe, gbaghara ndị iro, nabata ma na-ejere ndị agbata obi gị ozi, ma na-enyere ndị agadi aka? Onye ọ bụla n’ime unu ga-enwe mkpalite mmụọ ka ị na-ewu ụlọ elu ịhụnaanya maka onye agbata obi.

Onyeisi Russell M. Nelson kuziri: “Inye ndi ọzọ enyemaka—n’eme mgbalị pụtara ihe ịlekọta gbasara ndi ọzọ dịka karịa otu ma ọbụ karịa ka anyị n’elekọta gbasara onwe anyị—bụ ọńụ anyị. Kacha nke … mgbe ọ n’adịghịrị anyị mfe na mgbe anyị anọghị ebe dị anyị mma. Ibi ndụ nke iwu nsọ ukwuu nke abụọ bụ ọtụghe nye ịbụrụzi ezi onye-na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst.”

Nkwenye n’Etiti

Jizọs gara n’ihu kuzie,“N’elu iwu nsọ abụọ ndị a ka iwu na ndị amụma niile bekwasịrị.” Nke a na-enye ezigbo ndụmọdụ. E nwere njikọ dị mkpa netiti ịhụ Onyenwe anyị n’anya na ịhụrịta ibe anyị n’anya. Maka Akwa mmiri Golden Gate iji rụọ ọrụ ahaziri ya, ụlọ elu abụọ ahụ siri ike ma n’otu aka ahụ buru ibu nke eriri niile nọ n’elu, okporo ụzọ, na ụgbọ ala na-agbafe akwa mmiri ahụ. Ma enweghị symmetry enjinia nke a, enwere ike imebi akwa mmiri ahụ, ọbụnadị ịduba n’ọdịda. Maka akwa mmiri ọ bụla nọ n’elu ịrụ ọrụ e jiri rụọ ya, ụlọ elu ya niile ga-arụkọtarịrị ọrụ ọnụ na nkwekọ zuru oke. N’otu aka ahụ, ikike anyị iso Jizọs Kraịst dabeere n’ike anyị ibi ndụ nke mbụ na nke abụọ n’iwu nsọ na nguzozi na nha anya nranyere ha abụọ.

Foto, oyiyi
Akwa mmiri Golden.Gate.

Esemokwu na-abawanye n’ụwa na-egosi otu o sila dị, na anyị mgbe ụfọdụ adịghị ahụ ma ọ bụ cheta nke a. Ụfọdụ na-elekwasị anya nke ukwuu n’idebe iwu nsọ nke mere na ha na-egosi ntakịrị nnabata maka ndị ha na-ahụ dị ka ndị ezi omume dị ntakịrị. Ọ na-esiri ụfọdụ ike ịhụ ndị na-ahọrọ ibi ndụ ha n’ụzọ na-abụghị ụzọ ọgbụgba ndụ ma ọ bụ ọbụna pụọ n’esonyeghị ihe okpukpere chi ọ bụla.

N’aka nke ọzọ, e nwere ndị na-emesi ike mkpa ọ dị ịhụ ndị ọzọ n’anya n’enweghị nkwenye na anyị niile ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke. Ụfọdụ na-ajụ kpam kpam n’echiche bụ na e nwere ihe dị ka eziokwu zuru oke ma ọ bụ ezi ihe na ihe ọjọọ ma naanị ihe achọrọ n’aka anyị bụ nnabata zuru oke na ịnakwere nhọrọ niile nke ndị ọzọ. Nke ọ bụla n’ime enweghị nhata ndị a nwere ike ime ka akwa mmiri ime mmụọ gị nwee nsogbu ma ọ bụ daa.

Onyeisi Dallin H. Oaks kọwara nke a mgbe o kwuru: “E nyere anyị iwu ịhụ onye ọbụla n’anya, ebe ụkabụilu nke Jizọs nke ezigbo onye Samerịa kuziri na onye ọbụla bụ onye agbataobi anyị. Kama ọnụnụ-ọkụ-nobi anyị idobe iwu-nsọ nke abụọ nke a ekwesighị ime ka anyị chefuo nke-mbụ ahụ, iji obi, mkpụrụ-obi, na uche anyị nile hụ Chineke n’anya.”

Ngwụcha

Ya mere ajụjụ dịịrị onye ọ bụla n’ime anyị bụ, Kedu ka anyị ga-esi wuo akwa mmiri nke okwukwe na nraranye—na-ewulite akwa mmiri toro ogologo nke ma ịhụ Chineke n’anya ma ịhụ ndị agbata obi anyị n’anya? Ọ dị mma, anyị ga-amalite nnọọ. Mgbalị mbụ anyị nwere ike ịdị ka atụmatụ dị n’azụ akwa ma ọ bụ ụkpụrụ mmalite nke akwa mmiri anyị tụrụ anya ịrụ. O nwere ike ịgụnye ebumnuche ole na ole ezi uche dị na ya ịchọ ịghọta ozi ọma nke Onyenwe anyị karịa ma ọ bụ ikwe nkwa ikpe ndị ọzọ ikpe ntakịrị. O nweghị onye dị oke nta ma ọ bụ oke okenye ibido.

Foto, oyiyi
Ihe osise akwa mmiri.

Ka oge n’aga, site n’iji ekpere na nhazi echiche, a na-ańụcha echiche ndị siri ike. Omume ọhụrụ niile na-aghọ agwa. Ihe odide niile isi mbụ na-aghọ ụkpụrụ na-egbu maramara. Anyị na-ewu akwa mmiri ime mmụọ nke onwe anyị site n’obi na uche nke nrara onwe anyị nye Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ọ Mụrụ Naanị Ya tinyekwara ụmụnne anyị nwoke na nwanyị ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, na-egwu egwu na ebi ndụ.

N’ụbọchị ndị dị n’ihu, mgbe ị na-agafe akwa mmiri nọ n’elu dị ebube ma ọ bụ ọbụna mgbe ị hụrụ foto, ya na ụlọ elu ya niile na-arị elu, A na m akpọ gị oku icheta iwu-nsọ abụọ dị-ukwuu, nke Jizọs Kraịst kọwara n’ime Agba Ọhụrụ ahụ. Ka ntụziaka niile nke Onyenwe anyị na-akpali anyị. Ka obi anyị na uche anyị niile bulie elu ịhụ Onyenwe anyị n’anya ma tụgharịa ịhụ onye agbata obi anyị n’anya.

Ka nke a mee ka okwukwe anyị sie ike n’ime Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, nke a ka M na-agba ama, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. “Nime Agba Ọhụrụ, [okwu ahụ ọka iwu bụrụụ] kwekọrọ na odee akwụkwọ, onye bụ onye n’ọrụ ya bụ nwa akwụkwọ na onye nkuzi nke iwu, gụnyere iwu e dere ede nke Pentateuch, na kwa ‘omenaala ndị okenye’ (Matt. 22:35; Mak 12:28; luk 10:25)” (Baịbụl Dictionary, “Ọka iwu”).

  2. N’oge ochie, ndị ọka mmụta ndị Juu agụpụtawo iwu nsọ 613 naTorah ma rụsie ụka ike banyere ịdị mkpa nke otu amaokwu na nke ọzọ. Ikekwe ọka iwu ahụ buru n’obi iji aziza nke Jizọs megide Ya. Ọ bụrụ na O kwuru na otu iwu nsọ bụ nke kachasị mkpa, ọ pụrụ ime ka e nwee oghere iji bo Jizọs ebubo na o leghaara akụkụ ọzọ nke iwu ahụ anya. Mana nzaghachi nke Onye Nzọpụta mere ka ọnụ mechie ndị ahụ bịara ịnwụde Ya n’ọnya site n’okwu ntọ-ala na, taa, bụ ebe nchekwa maka ihe niile anyị na-eme nime Nzukọ nsọ.

  3. Matiu 22:36–40.

  4. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ nile 88:15.

  5. Jọn 14:15.

  6. A gbanwere aha niile n’ime akụkọ nke a iji chedo nzuzo.

  7. Mosaịa 2:41.

  8. Matiu 22:39.

  9. 2 Nifaị 26:33.

  10. Ozizi na ọgbụgba-ndụ niile 81:5.

  11. A gbanwere aha iji chedo nzuzo.

  12. Russell M. Nelson, “Nnukwu Iwu nsọ nke Abụọ,” Liahona, Nov. 2019, 100.

  13. Matiu 22:40.

  14. Dallin H. Oaks, “Abụọ Iwu nsọ Dị ukwuu,” Liahona, Nov 2019, 73–74.