Ọgbakọ Zuru ọha
Akara ya aka na mbụ Ije Ozi
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Akara ya aka na mbụ Ije Ozi

Nna anyị nke Eluigwe nwere mmasị ị kpughere unu akara aka nke onwe unu na mbụ, ma Ọ ga-eme otu a dị ka ị na-achọọ ị mụta ma soro uche Ya.

Na mgbede a, A na m ekwuuru ndị ntorobịa nke Nzukọ nsọ, ndudugandu na-etolite etolite nke ndịinyom nta na ndị ikom nta ndị bụ ndị bu ọkọlọtọ nlereanya maka ndudugandu na-esote.

Na Ọctoba 2013, onye amụma anyị dị ịhụnaanya, Onyeisi Russell M. Nelson, kwupụtara: “Nna nke Eluigwe unu maara unu kemgbe ogologo oge. Unu, bụ ụmụ Ya ndị nwoke ma ọ bụ nwanyị, ka Ọ ghọọrọ ịbịa n’ụwa n’oge nke a akpọrọ aha, ị bụ onye ndu nime ọrụ Ya dị nnukwu n’elu ụwa.”

Afọ abụọ gara aga, Onyeisi Nelson gara niihu:

“Taa a na m ekwusigharị ya ike na Onyenwe anyị agwawo onye ikom nta ọbụla tozuru oke ma dị ike ịkwado maka ma ije ozi mgbasa ozi ọma. Maka ndị ikom nta nke Ndị nsọ Ubọchi ikpeazụ a, ije ozi nke mgbasa ozi bụ oke n’ọrụ nke ọkwa nchụaja. Ununwa bụ ndịikom nta ka echekwara maka oge nke a mgbe mkpokọta nke Izrel e kwere na nkwa na-aga n’ihu. …

“Maka unu bụ ndị iyom nta dị ike, mgbasa ozi bụkwa ọhere dị ike, ma dị nhọrọ. … Kpee ekpere ịmata ma Onyenwe anyị ọ ga-achọ unu ije ozi mgbasa ozi ọma, ma Mmụọ Nsọ ahụ ga-enye azịza nye obi na uche unu.”

Nrụtụ aka niile nke Onye amụma anyị maka ijide ndị ntoroọbịa nke ụbọchị anyị na nchekwa maka oge nke a nime mkpọkọta nke Izrel ma oku ya ịkpe ekpere imata ihe Onyenwe anyị ga-achọ ka anyị mee bụ, n’otu akụkụ, nrụtụ aka niile nye ndụ nke ibiworo na mbụ ya na ngọzi niile ị nataworo site n’aka Chineke tupu a muo unu n’elu ụwa nke a. Anyị niile a mụrụ n’elu ụwa nke a bibụụrụ na mbụ anyị na Nna nke Eluigwe dịka ụmụ Ya nke mmụọ. Onyenwe anyị gwara Mozis, “Mụ, Onyenwe Chineke, kere ihe nile … na mmụọ, tutu ha adịrị n’ụdị okike ya, n’elu iru nke ụwa.”

Mgbe ọ kere unu na mmụọ, Ọ hụrụ unu naanya dị ka ụmụ ya ndị nwoke na nwanyị nke mmụọ ma tinye niime onye ọbụla niime unu ọdịdị si na chi na akara aka ebighị ebi.

N’oge tupu ndụ tupu ndụ anụ ahụ, “unu wulitere ejirimara [unu] ma mụbaa ịdị ike nke ime mmụọ [unu].” Ejiri ohere nhọrọ ji gọzie unu, nke bụ ike nke iji mee nhọrọ niile maka onwe unu, ma unu mekwara nhọrọ niile dị mkpa, dị ka mkpebi obi unu isooro atụmatụ ańụrị nke Nna nke Eluigwe, nke “iji nweta ahụ anụ ahụ ma rite nhụmihe nke ụwa ịgan’ihu … ma n’ikpeazụ chọta ebe nketa nsọ [unu] dịka ndi nketa nke ndụ ebigh ebi.” Mkpebi nke a metụtara ndụ unu mgbe ahụ, na ndụ tupu ndụ anụ ahụ, ma ọ gara niihu na emetụtakwa ndụ unu ugbua. Dị ka nwa nke Chineke na-ebi n’oge ndụ tupu ndụ anụ ahụ gị, “unu toro n’amamịhe ma mụta otu esi ahụ eziokwu naanya.”

Tupu a mụọ unu, Chineke kenyere onye ọbụla niime unu imezu ọrụ ije ozi pụrụ iche n’oge ndụ unu nke ịnwụ anwụ n’elu ụwa. Ọ bụrụ ma ịnọgide na ntozu oke, ngọzi niile nke ọkwa ndụ tupu ndụ anụ ahụ ahụ ga-enyere unu aka ị nwete ọtụtụ ohere n’ụdị ha niile iji jee ozi nime Nzukọ nsọ ma iji sonye nime ọrụ ahụ kacha mkpa nke na-eme n’elu ụwa taa: mkpọkọta nke Izrel. Nkwa niile na ngọzi niile nke ndụ tupu ndụ anụ ahụ ndị ahụ ka akpọrọ akara aka gị na mbụ. Ozizi nke akara aka na mbụ metụtara onye niile bụ ndị otù nke Nzukọ nsọ.” Akara aka na mbụ apụtaghị na ị ga anatarịrị ụfọdụ ọkpụkpọ oku ma ọ bụ oke n’ọrụ. Ngọzi niile na ohere niile ndị a na-abịa na ndụ a niihi nhọrọ niile gị emere n’eziomume, dị ka kwa otu akara aka gị na mbụ nke ndụ tupu ndụ anụ ahụ bịara nihi ezi omume. Dị ka ị na-egosi na itozuru oke ma gaa niihu n’ụzọ ọgbụgba ndụ ahụ, ị ga-anata ohere niile iji jee ozi nime klass gị nke Ndịiyom Nta ma ọ bụ kworum nke ọkwa nchụaja gị. A ga agọzi gị jiri ije ozi nime tempụl, ị bụ nwanne nwoke na nwanyị na-eje ozi nlekọta, ma ije ozi mgbasa ozi ọma dị ka onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.

Kedụ ihe kpatara o jiri dị mkpa ị mata ma ghọta akara aka gị na mbụ? N’otu ụbọchị mgbe ajụjụ jupụtara, mgbe ọtụtụ na-achọ ịmata ezi ejirimara ha, eziokwu nke bụ na Chineke maara ma gọzie onye ọ bụla n’ime anyị n’otu n’otu tupu amụọ anyị n’elu ụwa nke a jiri “ejirimara[niile] dị oke mkpa nke … ndụ tupu ndụ anụ ahụ, ndụ ịnwụ anwụ, na ejirimara na ebumnuche ebighị ebi” na-ewete udo dị ụtọ na mmesi obi ike nye uche na obi anyị. Ị mata onye ị bụ na-ebido na nghọta nke ngọzi niile akara aka na mbụ nke Chineke nyekwasịrị n’isi unu tupu amụọ unu n’elu ụwa nke a. Nna anyị nke Eluigwe nwere mmasị ị kpughere unu akara aka nke onwe unu na mbụ, ma Ọ ga-eme otu a dị ka ị na-achọ ị mụta ma soro uche Ya.

Ọ na-amasị m ị gụ post niile nke Instagram nke Onyeisi Nelson. Otu nime nke kacha masị m bụ na Julaị 20, 2022. O dere:

“E kwere m na ọ bụrụ na Onyenwe anyị nọọrọ na-agwa unu okwu ihu niihu, ihe mbụ Ọ ga-achọrịrị ka unu ghọta bụ ezi ejirimara unu. Ndị ezi enyi m, unu bụ ụmụ Chineke nke mmụọ n’ezie n’ezie. …

“… Enwekwala nghọtahie gbasara ya: Ike mmepụta unu si na chi. Jiri obi nchọsike unu, Chineke ga-enyetu unu ohere ị hụ onye unu nwere ike ị bụ.”

Ọ bụ ka m kesara unu otu nna m nke ụwa jiri kuziere m otu esi achọta ejirimara m ya na atụmatụ Chineke nime ndụ m?

Otu ụtụtụ Satọde mgbe m dị afọ 13. A nọ m na-asụcha ahịhịa dị ka ọrụ ụlọ m nke izu ọbụla. Mgbe m rụsiworo, A nụrụ m ka emechiri ụzọ n’azụ ụlọ anyị ma lee wee hụ nna m ka ọ na-akpọ m i sonye ya. A garuru m na nrigote azụ ụlọ, ma ọ kpọkuru m ị nọdụkọta ala n’akụkụ ya n’elu stepụ. Ọ bụ ọmarịcha ụtụtụ. A ka m na-echeta dị ka ọ nọdụrụ nso akụkụ m nke mere ubu anyị niile na-emetụ. Ọ malitere site na-ịgwa m na ọ hụrụ m naanya. Ọ jụrụ m ihe bụ ebumnuche m niile nke ndụ bụ. E chere m, “Ngwanụ, nke ahụ dị mfe.” A mara m nnọọ ihe abụọ n’ezie: a chọbụrụ m ịtotukwo ogologo, ma a chọrọ m camping mgbe na mgbe. A bụ m mkpụrụ obi dị mfe. Ọ rara ihu ọchị, kwụsịtụ nwantiti oge, ma kwuo: “Steve, Ọ ga-amasị m ị kesara gị otu ihe dị ezigbote mkpa nyem. Ekpewom ekpere na Nna anyị nke Eluigwe ga-eme ka ihe m ga-ekwu ga-akanye niime uche na mkpụrụ obi gị apụghị apụ ka ị ghara ichefu ya ma ọlị.”

Mgbe ahụ ka nna m dọọrọ uche m n’uju ya. Ọ chigharịrị ma lee m na mkpụrụ anya ma kwuo, “Nwa m nwoke, chekwaa oge nke onwe niile nke ndụ gị.” Enwere ogologo mkwụsịtụ dị ka ọ hapụrụ ka ịhe nke a pụtara rikpuo nime ime obi m.

Ọ gara niihu, “Ị maara, n’ọge ndị ahụ mgbe ọ bụ nanị gị nọ ya ma enweghi ọnye ọzọ mara ihe ị na-eme? Oge ndị ahụ mgbe ị chere, ‘Nagbanyeghi ihe ọ bụla m mere ugbua ọ metụtaghị onye ọzọ ọbụla, ọ bụ sọsọ mụ’?”

Mgbe ahụ ọ kwuru, “Karịa oge ọbụla na ndụ gị, ihe ọ bụla ị na-eme n’oge niile nke onwe nke ndụ ga-akacha enwe nnukwu mmetụta n’otu ị si ezute ịma aka niile na obi mgbu ị ga-ezute; ma ihe ị na-eme n’oge niile nke onwe nke ndụ gị gakwa ga-akacha enwe nnukwu mmetụta n’otu i si ezute ọganiihu niile na ọńụ nke ị ga-enweta karịa oge ọzọ na ndụ gị.”

Nna m natara ọchịchọ nke obi ya. Ụda olu ya, na ịhụnaanya ya nke metụtara m nihi okwuọnụ ya, ka akanyere apụghị apụ nime uche na mkpụrụ obi m n’ụbọchị ahụ.

A mụtawo m kemgbe ọtụtụ afọ ndị ahụ na ọrụ ebube kachasị nke mere n’ụbọchị ahụ n’elu step niile nke ụlọ oge nwata m bụ na, n’oge niile nke onwe nke ndụ m, enwere m ike ị gakwuru Chineke n’ekpere iji nata mkpughe. Nna m nọ na-akụziri m otu m nwere isi amụta maka ngọzi akara aka na mbụ niile nke Chineke. N’oge ndị nke onwe ndị ahụ. A mụtara m na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ okwu nke Chineke. A mụtara m na Chineke akawo ya na mbụ mụnwa ije ozi mgbasa ozi ọma. A mụtara m na Chineke maara mụ ma na-anụ ma na-azakwa ekpere m nile. A mụtara m na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị.

Nagbanyeghi na emewo m ọtụtụ njehie kemgbe ụbọchị ahụ dị ncheta mụ na nna m nọ, ị gbalịsike ị chekwa oge niile nke onwe nke ndụ m a bụrụwo arịlịka n’etiti ebili mmiri niile nke ndụ ma ọ nyeworo m aka ị chọta ebe nchekwa na ọgwụgwọ, ngọzi niile nke agbam ume nke ịhụnaanya na aja mgbaghara nke Onye Nzọpụta anyị.

Ụmụnne m nta ndi nwoke na ndi nwanyị, dị ka ụnụ na-echekwa oge niile nke onwe nke ndụ unu jiri egwuruegwu dị mma; gee ntị nye egwu na-ebuli elu; gụọ akwụkwọ nsọ; kpee ekpere bara uru kwa mgbe; ma gbaa mbọ iji nata ma tulee ngọzị niile unu nke onye petrak, unu ga-anata mkpughe. Dị ka otu okwu niile nke Onyeisi Nelson dị, anya unu ga-abụzi ihe “ghee ezi oghe nye eziokwu nke na-ekwu na ndụ nke a n’ezie bụ oge ahụ eji eme mkpebi ụdị ndụ chọrọ ibi ruo ebighi ebi.”

Nna anyị nke Eluigwe ga-aza ekpere unu niile, tụmadị ekpere niile ekpere n’oge nke onwe niile nke ndụ unu. Ọ ga-ekpughere gị onyinye niile na onyinye chi unu nke akara aka na mbụ, ma unu enwe mmetụta ịhụnaanya Ya ka o kpuchiri unu, ma ọ bụrụ na ijiri ezi obi rịọ ma jiri obi ọcha nwe mmasị ị mata. Dị ka unu na-echekwa oge niile nke onwe nke ndu unu, nsonye unu nime emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke ozi ọma ga-abara unu uru karịa. Unu ga aka ekedo onwe unu nye Chineke nime ọgbụgba ndụ niile nke unu na Ya mere, ma a ga-ebuli unu elu ị wete nnukwu olile anya, okwukwe, na mmesi obi ike nime nkwa niile Ọ kwere nye unu. Unu chọrọ ị mata atụmatụ Chineke banyere unu? A nam agba aka ebe na Ọ chọrọ ka unu mata, ma Ọ kpaliri onye amụma Ya nye ụwa iji kpokuo onye ọbụla niime anyị ị kpe ekpere ma nata nhumihe mmepe-anya nke a maka onwe anyị. A na m agba aka ebe banyere ịdị irè na ike nke aja mgbaghara nke Onye Nzọpụta nke mere ojiri kwe omume ibi ndu ruo ma rite ngọzi niile akara aka na mbụ nke Chineke, na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Russell M. Nelson, “Mkpebi nile maka Ebigh-ebi,” Liahona, Nov. 2013, 107.

  2. Russell M. Nelson, “Ikwusa Ozi ọma nke Udo,” Liahona, Mee 2022, 6.

  3. Lee Russell M. Nelson, “Olileanya nke Izrel” (worldwide youth devotional, June 3, 2018), Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma: “Nna anyị nke Eluigwe edokwawo ọtụtụ mmụọ Ya ndị kachasị nwee ugwu—ikekwa, e nwere m ike ị sị, ndị otù Ya kachasị mma—maka nkeji ikpeazụ a. Mmụọ ndị ahụ kachasị mma—ndị otu egwuregwu ahụ kachasị mma, ndị dike ahụ—bụ unu!”

  4. Lee Jeremaịa 1:5.

  5. Mozis 3:5.

  6. Lee “Ezịnaụlọ: Ọkwa amara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; lee kwa, “Isiokwu Ndị Iyom Nta,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; “Isiokwu Ndị Kworum Ọkwa Nchụaja nke Erọn,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  7. Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ndụ tupu ndụ anụ ahụ: Nchịkọta,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  8. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  9. Lee Alma 13:1–4.

  10. Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Ndụ tupu ndụ anụ ahụ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma: lee kwa Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 138:55–56.

  11. Lee kwa Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Akara aka na mbụ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  12. Lee Russell M. Nelson, “Olileanya nke Izrel.”

  13. Isiokwu niile na Ajụjụ niile, “Akara aka na mbụ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma; lee kwa, Jeremaya 1:5; “Kedụ ihe Njikọ Netiti Lee Akara aka na mbụ na Nhọrọ?,” Liahona, Oct. 2023, 47; Odudu nye Akwụkwọ nsọ niile, “Akara aka na mbụ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  14. Lee Alma 13:1–4; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 130:20–21.

  15. Ezi na ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  16. Lee Jeremaịa 1:5.

  17. Russell M. Nelson, Instagram, July 20, 2022, Instagram.com/russellmnelson.

  18. Russell M. Nelson, “Nhọrọ niile maka Ebighị ebi” (worldwide devotional for young adults, May 15, 2022), Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  19. Lee Russell M. Nelson, “Mkpughe maka Nzukọ nsọ, Mkpughe maka Ndụ Anyị,” Liahona, Mee 2018, 93–96.