Ọgbakọ Zuru ọha
Jizọs Kraịst nọ N’etiti Ndụ Anyị
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Jizọs Kraịst nọ N’etiti Ndụ Anyị

Nnukwu ajụjụ nke mkpụrụ obi, ndị ahụ na-apụta n’awa anyị ndị ahụ nke kacha gbaa ọchịchịrị na mnwale kachasị elu, ka a na-azaghachi site na ịhụnaanya nke Jizọs Kraịst na-adịghị ada ada.

Dị ka anyị na-agafe njem ndụ anụ ahụ, anyị mgbe ụfọdụ na-ezute mnwale: oke mgbu nke ọnwụ onye anyị hụrụ naanya, ọgụ ike anyị na-alụsị nrịa nrịa, ihe ọgbụgba nke ikpe na-ezighị ezi, arịrị niile nke mmaja ma ọ bụ mmegbu, onyinyo nke enweghị ọrụ, mkpagbu niile nke metụtara ezi na ụlọ, akwa nkịtị niile nke ọwụ ọmụma, ma ọ bụ nsonaazụ niile na-agbawa obi nke esemokwu eji ngwa ọgụ. N’ụdị oge ndị dị otu a, mkpụrụ obi anyị na-achọ ebe mgbaba. Anyị na-achọsike ị mata: Ebee ka anyị ga-achọta balm nke udo? Nime onye ka anyị ga-edebe ntụkwasị obi maka inyere anyị aka jiri obisike na ume iji merie ịma aka ndị a? Onye nwere ndidi ahụ, ịhụnaanya nke kpuchitere ihe niile, na aka ahụ ji ike niile iji bulie ma kwado anyị?

Nnukwu ajụjụ nke mkpụrụ obi, ndị ahụ na-apụta n’awa anyị ndị ahụ nke kacha gbaa ọchịchịrị na mnwale kachasị elu, ka a na-azaghachi site na ịhụnaanya nke Jizọs Kraịst na-adịghị ada ada. Na Ya, na site na ngọzi ndị ekwere na nkwa nke ozi ọma Ya eweghachitere, anyị na-achọta azịza ndị anyị na-achọ. Ọ bụ site na Aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghi ọgwụgwụ ka a na-enye anyị onyinye gafere ntụtụ—nke bụ nke olileanya, ọgwụgwọ, na mmesi obi ike nke nnọnyere Ya nke nọ mgbe niile na-adịgide nime ndụ anyị. Onyinye nke a dịịrị onye niile ga-esetịpụ aka n’okwukwe, makọọ udo ahụ na mgbapụta ahụ nke Ọ na-enye n’efu.

Onyenwe anyị na-agbatịpụta aka Ya nye onye ọbụla nime anyị, ihe ngosi nke bụ ejirimara nke ịhụnaanya na obi ebere Ya dị nsọ. Ọkpụkpọ oku Ya nye anyị gafere oku dị mfe; ọ bụ nkwa dị nsọ, nke emesiri ike site na ike na-adịgide nke amara Ya . Niime akwụkwọ nsọ, O jiri ịhụnaanya mesie anyị obi ike sị:

“Bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndi e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.

“Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m; n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi: ma mkpụrụ obi unu ga-enweta ezumiike.

“N’ihi na yok m esighị ike, ma ibu m dịkwa mfe.”

Ido anya nke ọkpụkpọ oku Ya “bịakwutenụ m” na “nyaranụ yok m” na-ekwupụta eziokwu nke ịdị nnukwu nke nkwa Ya ahụ—nkwa nke dị ukwuu ma zuo oke nke gụnyere ịhụnaanya Ya, na-enye anyị nkwa dị nsọ: “Unu ga-enweta ezumiike.”

Dị ka anyị na-agbalịsike na-achọ odudu nke ime mmụọ, anyị na-abanye na njem dị omimi nke na-agba ama niile anyị ume. Dị ka anyị ghọtara ịdị ukwuu nke ịhụnaanya zuru oke nke Nna anyị nke Eluigwe na Jizọs Kraịst, obi anyị na-ejuputa na ekele, umeala, ma ọchịchọ obi enwogharịrị iji chọọ ụzọ nke iso ụzọ.

Onyeisi Russell M. Nelson akuziwo na mgbe “nlekwasị anya nke ndụ anyị bu n’ebe atụmatụ nke nzọpụta … na Jizọs Kraịst na ozi ọma Ya nọ, anyị nwere ike nwee mmetụta ọńụ na-agbanyeghị ihe na-eme—ma ọ bụ na-anaghị eme—niime ndụ anyị. Ọńụ na-abịa site na ma n’ihi Ya.”

Alma, dị ka ọ na-ekwuru nwa ya nwoke Hilaman, mara ọkwa: “Ma ugbua, O nwa m nwoke Hilaman, lee, ị nọ n’okorọbịa gị, ma ya mere, ana m arịọ gị ka i wee nụrụ okwu m nile ma mụta ihe site n’aka m; n’ihi na a matara m na ndị nile ga-etinye ntụkwasị-obi ha na Chineke a ga-akwado ha n’ime mnwale ha nile, na nsogbu ha nile, na mkpagbu ha nile, ma a ga-ebuli ha elu n’ụbọchị ikpeazụ ahụ.”

Hilaman, dị ka ọ na-ekwuru ụmụ ya ndị nwoke banyere ụkpụrụ ebighị ebi nke idebe Onye Nzọpụta n’etiti ndụ anyị: “Cheta, cheta na ọ bụ nʼelu oke nkume nke Onye Mgbapụta anyị, onye bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke, ka unu ga-ewurịrị ntọala unu.”

Nime Matiu 14 anyị mụtara na mgbe ọ nụrụ maka ọnwụ Jọn Omee baptizim, Jizọs gara nọrọ n’onwe ya. Na-agbanyeghi nke a, igwe mmadụ sooro Ya. Site na mkpali nke ọmịiko na ịhụnaanya, ma na-ekweghi ka obi mwute Ya dọpụ uche Ya site na ije ozi Ya, Jizọs nabatara ha, wee gwọọ ndị ọrịa nọ n’etiti ha. Mgbe o ruru mgbede, ndị na-eso ụzọ ya zutere ịma aka na-akụda mmụọ: igwè mmadụ ndị nwere ntakịrị ihe oriri. Ha tụrụ aro ka Jizọs zipu igwè mmadụ ahụ ka ha ga chọọ nrị, mana Jizọs, nihi ịhụnaanya na atụmanya dị elu, gwara ndị na-eso ụzọ kama ka ha nye ha nrị.

Mgbe ndị na-eso ụzọ na-echegbu onwe ha maka ịma aka nke a, Jizọs gosipụtara ntụkwasị obi Ya nime ma ịhụnaanya ọ nwere maka Nna Ya, tinyekwara ịhụnaanya na-adịghị ada ada ọ nwere maka ndị mmadụ. Ọ gwara ndị igwè mmadụ ka ha nọdụ ala n’elu ahịhịa, ma were naanị achịcha ise na azụ abụọ, Ọ họọrọ inye Nna Ya ekele, wee nakwere ike nrọpụta Chineke n’elu ike na ikikere nke Ya.

Mgbe O nyesiri ekele, Jizọs gbawara achịcha ahụ, ma ndị na-eso ụzọ kesara ya nye ndị mmadụ. N’ụzọ ọrụ ebube, ọ bụghị naanị na nri ahụ ezuola, kamakwa ọ bara ụba, wee fọdụ nkata iri na abụọ. Otù ahụ nyere ụmụnwoke, tinyere ụmụnwanyị na ụmụaka ruru puku ise nri.

Ọrụ ebube nke a na-akuzi mmụta ihe dị ukwuu: mgbe izutere ịma aka, ọ na-adịkarị mfe itinyecha uche n’ihe isi ike anyị. Mana, Jizọs Kraịst gosiri ọmụmaatụ nke ike nke ịlekwasị anya na Nna Ya, na-enye ekele, ma na anakwere na ọsịsa niile nye mnwale anyị anọghị anyị n’aka mgbe niile kama n’aka Chineke.

Mgbe anyị zutere ihe ndị isiike, ọ na-adịkarịrị anyị mfe ị lekwasị anya n’ọdachị niile nke chere anyị niihu. Ihe ịma aka anyị bụ nke a na-ahụ anya ma na-adọkpụrụ uche anyị, ma ụkpụrụ nke imeri ha nọ niime ihe anyị na-elekwasị anya. Site na-idebe Kraịst n’etiti nke echiche na omume anyị, anyị na-ahazi onwe anyị ịdaba adaba dị ka echiche na ume Ya sịrị dị. Nhazigharị nke a anaghị agụpụ mbọ anyị niile; kama, ọ na-enyere anyị aka gafee ha jiri odudu dị nsọ. Nihi nke a, anyị na-achọta ọsịsa na nkwado nke na-apụta site na amamiihe dị elu. Inabata nhụnuche nke a dabeere na Kraịst na-enye anyị ike jiri obi ike na nghọta iji gbanwee mnwale anyị ịbụzi mmeri, wee na-echetara anyị na nihi Onye Nzọpụta, ihe yiri oke nsogbu nwere ike bụrụ ụzọ ahụ eji enwete nnukwu ọganiihu ime mmụọ.

Akụkọ nke Alma Nta nime Akwụkwọ nke Mọmọn na-ekwu maka akụkọ na-akpali akpali nke mgbapụta na mmetụta dị ukwuu nke itinye ndụ mmadụ na gburugburu Kraịst. Na mbụ, Alma guzoro dị ka onye mmegide nke Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị, wee dufuo ọtụtụ site n’ụzọ nke ezi omume. Mana, otu enyemaka sinachi, nke nwere nleta mmụọ ozi, kpọtere ya site na ajọọ omume ya niile.

N’oge awa ọchịchịrị ya nke kachasị, nihi ntarama ahụhụ nke ikpe ọmụma na nchọsi ike ịchọta ụzọ isi na nhụjuanya ime mmụọ ya pụta, Alma chetara nkuzi niile nke nna ya banyere Jizọs Kraịst na ike nke Aja mgbaghara mmehie Ya. Jiri obi nke na-achọsịke mgbapụta, o jiri obi ya niile chegharịa ma jiri obi ike rịọ maka ebere nke Onyenwe anyị. Ohere nke a pụrụ iche nke irara onwe nyefee, wee kpọtacha Kraịst ruo nihu ihu nke echiche ya dị ka Alma jiri obi niile chọọ ebere Ya, kpakere mgbanwe dị ịrịba ama. Ụdọigwe niile dị arọ nke ikpe ọmụma na nke obi nkoropụ efuo ma edochie ha jiri mmetụta dị ukwuu nke ọńụ na udo.

Jizọs Kraịst bụ olile anya anyị, ma bụrụ azịza nye mgbu nke ndụ nke kachasị. Site na aja Ya, Ọ kwụrụ ụgwọ maka mmehie anyị ma wekwasị n’onwe Ya ahụhụ anyị—mgbu, ikpe na-ezighị ezi, na ụjọ—ma Ọ na-agbaghara ma na-agwọ anyị mgbe anyị tụkwasịrị obi na Ya ma chọọ ịgbanwe ndụ anyị maka nke ka mma. Ọ bụ Onye ọgwọ ọrịa anyị, wee na-akasị anyị obi ma na-emezi obi anyị site n’ịhụnaanya na ike Ya, dị ka otu O siri gwọọ ọtụtụ n’oge Ya n’elu ụwa. Ọ bụ mmiri ndụ ahụ, na-emejuta mkpa niile ndị dị omimi nke mkpụrụ obi anyị jiri ịhụnaanya na ebere ya na-adịgide. Nke a dị ka nkwa O kwere nye nwanyị Sameria n’olulu mmiri ahụ, wee na-enye “olulu mmiri nke na-abọlite ruo na ndụ ebighị ebi.”

A na m agba aka ebe dị nsọ na Jizọs Kraịst dị ndụ, na Ọ nọ n’isi Nzukọ nsọ Ya nke a dị nsọ, Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a. A na m agba ama na Ọ bụ Onye Nzọpụta nke ụwa, Onyeisi Udo, Eze ndị Eze, Onyenwe anyị nke ndị nwe, na Onye Mgbapụta nke ụwa. A na m ekwugharị n’eziokwu na anyị nọ mgbe niile nime obi na uche Ya. Dị ka ihe aka ebe nke a, O weghachiwo Nzukọ nsọ Ya n’ụbọchị niile nke ikpeazụ a ma kpọwo Onyeisi Russell M. Nelson dị ka onye amụma Ya na Onyeisi nke Nzukọ nsọ n’oge nke a. Ama m na Jizọs Kraịst nyere ndụ Ya ka anyị wee nwee ike nwe ndụ ebighị ebi.

Dị ka anyị na-agbalịsị ike idebe ya n’etiti ndụ anyị, mkpughe ga-emeghere anyị, ụdọ Ya nke dị nnukwu ga-ekpuchi anyị, ma aja mgbaghara mmehie Ya nke na-enweghi ọgwụgwụ ga-ewete mgbaghara na ọgwụgwọ nke anyị. Ọ bụ nime Ya ka anyị na-achọta ume ahụ eji enwe mmeri, ume ahụ eji anagide, na udo ahụ nke karịrị nghọta ọbụla. Ka anyị gbalịsie ike ụbọchị ọbụla ịbịaru Ya nso, isi iyi nke ihe niile dị mma, ihè nke olile anya nime njem anyị ịji laghachi n’ihu nke Nna anyị nke Eluigwe. N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.