Ọgbakọ Zuru ọha
Bụrụ Otu gị na Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Bụrụ Otu gị na Kraịst

Ejikọtara anyị ọnụ site n’ịhụnaanya anyị nke na okwukwe niime Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya. Isi ihe nke isonye n’ezie bụ ịbụrụ otu gị na Kraịst.

E nwetewo m mmetụta miri emi banyere Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst kemgbe m dị nta, mana nsiridị nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta doro m anya mgbe m gbara afọ 25. A ka m gụsịrị site na Ụlọakwụkwọ Iwu Stanford ma naara agụ akwụkwọ maka ule bar California. Nne m kpọrọ ma kwuo na nna m nke ukwu Crozier Kimball, onye biiri na Utah, nọ na ọnụ ọnwụ. O kwuru na ọ bụrụ na m chọrọ ịhụ ya, ọ ga-aka mma na m lọtara ụlọ. Nna m nke ukwu gbara afọ 86 ma na-arịa oke ọrịa. A gara m ezigbo nleta. Obi tọrọ ya ụtọ nke ukwuu ịhụ m ma kesaara m ama ya.

Mgbe Crozier gbara naanị afọ atọ, nna ya, David Patten Kimball, nwụrụ n’afọ 44. Crozier tụrụ anya na nna ya na nna ya nke ukwu, Heber C. Kimball, ga-akwado ndụ ya ma nwee mmetụta na ya adịwo eziokwu nye nketa ya.

Ndụmọdụ mbụ nke nna m nke ukwu nye m bụ izere ụdị uche ikike ọbụla ma ọ bụ ohere niihi ndị nna nna ha ndị a kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ gwara m na ntụkwasị anya m kwesịrị ịbụ na Onye Nzọpụta na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. O kwuru na anyị niile bụ ụmụ nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya. Agbanyeghị onye ndị nna nna anyị ha bụ, onye ọbụla niime anyị ga-enye Onye Nzọpụta repọọtụ gbasara otu dị mma anyị siworo debe iwu nsọ Ya niile.

Nna nke ukwu kpọrọ Onye Nzọpụta dị ka Onye Nchekwa nke Ọnụ ụzọ ama,” ihe nrụtụ aka nye 2 Nifaị 9:41. Ọ gwara m na ya tụrụ anya na ya adịwo nchegharị n’ụzọ zuru oke iji tozuo oke maka ebere nke Onye Nzọpụta.

O metụtara m nke ukwuu. A maara m na ọ bụrụwo nwoke ezi omume. Ọ bụụrụ petrak ma jee ozi n’ọtụtụ mishọn. Ọ kuziiri m na enweghi mmadụ nwere ike ịlaghachikwuru Chineke site n’ezi ọrụ naanị na-enweghị ihe nrite nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. E nwere m ike icheta ruo taa nnukwu ịhụnaanya na ekele Nna nke ukwu nwere maka Onye Nzọpụta na Aja mgbaghara mmehie Ya.

N’afọ 2019 oge otu ọrụ ekenyere niime Jerusalem, a gara m nleta nọnụ ụlọ dị nelu nke nwererịị ike ịdị nso n’ebe Onye Nzọpụta sachara ụkwụ nke Ndị Ozi Ya tupu Mkpọgbu n’obe Ya. O metụtara m niime mmụọ ma chee otu O siri nye Ndị Ozi Ya iwu ịhụ ibe ha naanya.

Echetere m Ekpere Mkpechite arịrịọ nke Onye Nzọpụta maka anyị. Ekpere nke a mere n’ezie na mmechi awa niile nke ndụ anụ ahụ Ya dị ka edekọrọ niime Ozi ọma nke Jọn.

Ekpere nke a ka a gwara ndị nsiso nke Kraịst, gụnyere anyị niile. Niime arịrịọ nke Onye Nzọpụta nye Nna Ya, Ọ rịọrọ “ka ha niile wee bụrụ otu; dị ka gị onwe gị, Nna, nọ niime m, ma Mụ nọ niime gị, ka ha n’otu aka ahụ nọrọ niime anyị.” Onye Nzọpụta mesịrị gaaniihu, “Ma otito ahụ nke i nyeworo m ka m nyeworo ha; ka ha wee bụrụ otu, ọbụna dị ka anyị bụ otu.” Ịbụ otu bụ ihe Kraịst kpere ekpere maka ya tupu orire na Mkpọgbu n’obe Ya. Ịbụ otu gị na Kraịst na Nna anyị nke Eluigwe ka e nwere ike inwete site na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta.

Ebere nzọpụta nke Onyenwe anyị adabereghị na agbụrụ, agụm akwụkwọ, ọnọdụ akụ na ụba, ma ọ bụ mba. Ọ dabeere na ịbụ otu gị na Kraịst na iwu nsọ Ya niile.

Onye amụma Josef Smith na Oliver Cowdery natara mkpughe maka nhazi na gọọmentị Nzukọ nsọ nafọ 1830, ngwa ngwa ahazisiri Nzukọ nsọ. Ihe bụ ugbu a nkeji 20 ka Onye amụma Josef gwụrụ nọgbakọ Nzukọ nsọ nke mbụ ma bụ mkpughe nke mbụ nke ọha na eze kwekọrịtara n’otu olu.

Ihe dị niime mkpughe nke a n’ezie dị ịrịba ama. Ọ na-akuziri anyị mkpa na ọrụ nke Onye Nzọpụta na otu esi enwete ike na ngọzi Ya niile site namara aja mgbaghara mmehie Ya. Onye amụma Josef gbara afọ 24 ma anataworịị ọtụtụ mkpughe ma atụgharịsiwo kpamkpam Akwụkwọ nke Mọmọn site n’onyinye na ike nke Chineke. Ma Josef ma Oliver ka amatara dị ka Ndị Ozi echiri echichi, site otu a inwe ikikere iji duzie Nzukọ nsọ.

Amaokwu 17 ruo 36 nwere niime ya nchịkọta nke ozizi Nzukọ nsọ dị mkpa, gụnyere ịdị adị nke Chineke, Okike nke mmadụ, Ọdịda ahụ, na atụmatụ nzọpụta nke Nna nke Eluigwe site Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Amaokwu 37 nwere niime ya ihe ndị achọrọ dị mkpa maka baptizim niime Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị. Amaokwu 75 ruo 79 kwuputara ekpere oriri nsọ niile anyị na-eji eme ihe Ụbọchị ezumiike niile.

Ozizi ahụ, ụkpụrụ niile, oriri nsọ niile, na omume niile nke Onyenwe anyị wepụtara site n’aka Josef Smith, Onye amụma nke Mweghachite, dị ike n’ezie.

Ihe ndị achọrọ maka baptizim, ọbụna na ha dị nnukwu, pụrụ iche n’ụzọ dị mfe. Ha na mbụ gụnyere ịdị umeala niihu Chineke, obi tiwara etiwa na mmụọ dị nchegharị, na-echegharị site na mmehie niile, na-ewekwasị nonwe anyị aha nke Jizọs Kraịst, na-anagide ruo ọgwụgwụ, ma na-egosi site n’ọrụ anyị na anyị anatawo Mmụọ nke Kraịst.

Ọ pụtara na ntozu oke niile maka baptizim bụ nke ime mmụọ. Ọdịghị nwete akụ na ụba ma ọ bụ nke ihu ọha dị mkpa. Ndị ogbenye na ndị bara ụba nwere otu ụdị ihe ime mmụọ ndị achọrọ.

Enweghị ihe ndị achọrọ nke mba, okike ọmụmụ, ma ọ bụ agbụrụ. Akwụkwọ nke Mọmọn na-eme ya e doo anya na akpọkuru onye niile iri ịdị mma nke Onyenwe anyị, ojii na ọcha, ndị eji eji na ndị nweere onwe, nwoke na nwanyị; … onye niile yiri nye Chineke.” Ụmụ mmadụ niile nwere ohere otu onye dịka ibe ya, ma ọdịghị ndị ọ na-amachibido.”

Nihi “oyiyi” anyị niihu Chineke, o nweghi isi ikwusi ndịiche anyị ike. Ụfọdụ agbawo anyị ume nụzọ n’ezighị ezi “iche na ndị mmadụ dị nnukwu iche site n’onwe anyị na site n’ibe anyị karịa ka ha dị n’ezie. [Ụfọdụ] na-ewe ndịiche ndị dị ire mana dị nta ma mụbaa ha ịghọ nnukwu mgbawa.”

Na mgbakwunye, ụfọdụ echewo n’ụzọ n’ezighị ezi na ndị mmadụ niile ka akpọkuru ịnata ịdị mma ya na ndụ ebighị ebi, enweghị omume ndị achọrọ.

Kosiladị, akwụkwọ nsọ na-agba ama na ndị niile ga-aza ajụjụ kwesịrị ichegharị site na mmehie niile ma debe iwu nsọ Ya niile. Onyenwe anyị na-eme ka o doo anya na onye niile nwere ezi ohere nhọrọ ma “nweere onwe ịhọrọ mnwere onwe na ndụ ebighị ebi, site na nnukwu Onye ogbugbo nke ụmụ mmadụ niile, … ma ńaa nti nye nnukwu iwu nsọ ya niile; ma kwesịrị ntụkwasị obi nye okwu ya niile, ma họrọ ndụ ebighị ebi.” Ịnata ngọzi niile nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, anyị ahaghị n’ezie itinye ezi ohere nhọrọ anyị n’ọrụ iji họrọ Kraịst ma rube isi nye iwu nsọ Ya niile.

N’oge ndụ m, mpụtara nke “ohere nhọrọ” na “uche mnwere onwe” ka egbubisịrị ma rụrịta ụka. Enweworịị ma ga-aganiihu inwe ọtụtụ nrụrụ ụka maka isiokwu ndị a.

Na mkpuchi nke mbipụta alumni mahadum bụ isi nso nso a, ọkammụta biologist a maara ama na-ekwusi ike, “Enweghị ohere maka uche mnwere onwe.” Na-adịghị atụnaanya, ọkammụta ahụ kwuru niime edereede ahụ dị ka ikwu, “Enweghị ụdị ihe dị ka Chineke, … ma enweghị uche mnwere onwe, … ma nke a buru ibu, adịghị iche, eluigwe na ala gba aka.” Enweghị m ike ịghọtahie karịa.

Ozizi dị mkpa nke okwukwe anyị bụ na anyị nwere ezi ohere nhọrọ, nke gụnyere uche mnwere onwe. Ohere nhọrọ bụ ike iji họrọ ma mee. Ọ dị mkpa nye atụmatụ nzọpụta. Na-enweghị ezi ohere nhọrọ, anyị enweghị ike ịmụ ihe, gaaniihu, ma ọ bụ họrọ ịbụ otu anyị na Kraịst. Niihi ezi ohere nhọrọ, anyị “nweere onwe ịhọrọ mnwere onwe na ndụ ebighị ebi.” Niime Kansụl N’Eluigwe tupu ndụ anụ ahụ, atụmatụ nke Nna gụnyere ohere nhọrọ dị ka mmewere dị mkpa. Lusifa nupuru isi ma “chọọ imebi ohere nhọrọ nke mmadụ.” Dị ka ọ dị, ohere nke inwe anụ ahụ pụrụ ịnwụ anwụ ka agọnarịrị Setan na ndị ahụ sooro ya.

Mmụọ ndị ọzọ na ndụ tupu ndụ anụ ahụ tinyere ohere nhọrọ ha n’ọrụ na-isoro atụmatụ nke Nna nke Eluigwe. Mmụọ niile agọziri site na-ọmụmụ na ndụ nke a pụrụ ịnwụ anwụ na-aganiihu inwe ohere nhọrọ. Anyị nweere onwe ịhọrọ na ime, mana anyị enweghị njikwa nke nsonazụ niile. “Nhọrọ niile nke ezi ihe na ezi omume na-eduba ruo obi ụtọ, udo, na ndụ ebighị ebi, ebe nhọrọ niile nke mmehie na ajọọ ihe n’ikpeazụ na-eduba na obi mgbu na nhujuanya.” Dị ka Alma kwuru, “Ajọọ omume adịghị mgbe ọ bụ obi ụtọ.”

Niime ụwa nke a na-ama aka nke ukwuu, enwere mgbalị na-anọgide iji mee nke ọma. Ịgbalị ịbụ nke kachasị mma anyị nwere ike ịbụ bụ mgbalịsike ezi omume na nke bara uru. Ọ dabara adaba ya na ozizi nke Onyenwe anyị. Mbọ niile iji belata ma ọ bụ leda ndị ọzọ anya ma ọ bụ kepụta ihe mgbochi niile nye ime nke ọma ha megidere ozizi nke Onyenwe anyị. Anyị enweghị ike ịta ọnọdụ niile ma ọ bụ ndị ọzọ ụta maka mkpebi ime ihe megide iwu nsọ niile nke Chineke.

Niime ụwa ugbu a, ọ dị mfe ilekwasị anya n’ọganiihu nke ngwa na nke ọrụ. Ụfọdụ na atọpụ anya nke ụkpụrụ niile na nhọrọ niile nke ebighị ebi nke nwere uru ebighị ebi. Anyị ga-enwe akọ na uche isoro ndụmọdụ nke Onyeisi Russell M. Nelson “iche selestịal.”

Nhọrọ ndị kacha baa uru ka enwere ike ime site naka ihe rukwara onye ọbụla na-agbanyeghị onyinye chi niile, ike niile, ohere niile, ma ọ bụ ọnọdụ akụ na ụba niile. Ikwusi ike na-idebe nhọrọ nke ezi na ụlọ niile n’isi dị mkpa. Nke a doro anya gburugburu akwụkwọ nsọ. Chee maka nkọwapụta dị niime 1 Nifaị ebe Lehi “pụrụ baa niime alaịkpa. Ma ọ hapụkwara ụlọ ya, na ala nke nketa ya, na ọla edo ya, na ọla ọcha ya, na ihe oke ọnụ ahịa ya, ma ọ dịghịkwa ihe ọbụla o ji pụọ, ma ọbụghị naanị ezi na ụlọ ya.”

Dị ka anyị na-ezute mgbanwe niile nke ndụ, ọtụtụ ihe ndị na-eme mere nihe nke anyị nwere obere ma ọ bụ enweghị njikwa ya. Aka mgba ahụike niile na ụmụ ihe mberede nezie pụrụ ịdaba niime ụdị nke a. Ọgba aghara COVID-19 nso nso a emetụtawo nke ukwuu ndị mmadụ mere ihe niile n’ụzọ ziri ezi. Maka nhọrọ niile kachasị mkpa, anyị nwere njikwa ha. Ileghachi anya n’ụbọchị mgbasa ozi ọma m niile, Okenye Marion D. Hanks, onyeisi mishọn anyị, mere ka anyị niile buru n’isi akụkụ uri poem sitere n’aka Ella Wheeler Wilcox:

Enweghị ohere ọbụla, enweghị akara aka, enweghị eke,

Nwere ike izere ma ọ bụ gbochie ma ọ bụ jikwaa

Mkpebi kwụrụ chịm nke mkpụrụ obi kpebisiri ike.

Gbasara ihe niile nke ụkpụrụ, omume, emume okpukpere chi, na ibi ndụ ezi omume, anyị nwere njikwa ha. Okwukwe anyị niime na ofufe nke Chineke na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, bụ nhọrọ nke anyị na-eme.

Biko ghọta na anaghị m ekwuchite inwe mmasị ntakịrị maka agụm akwụkwọ ma ọ bụ ọrụ. Ihe m na-ekwu bụ na mgbe mgbalị niile metụtara agụm akwụkwọ na ọrụ ka eweliri elu ofe isi ezi na ụlọ ma ọ bụ ịbụ otu gị na Kraịst, nsonazụ ndị ana ebughị n’obi nwere ike ịdị ọjọọ nke ukwuu.

Ozizi doro anya ma dị mfe ekwuputara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20 na-emetụ n’obi ma na-akpali mmasị dị ka ọ na-amụba ma dokwuo anya echiche ime mmụọ niile dị nsọ. Ọ na-akuzi na nzọpụta na-abịa dị ka Jizọs Kraịst na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-edokwa nsọ mkpụrụ obi niile niihi amara nke Onye Nzọpụta. Ọ na-edobe ọnọdụ maka ọrụ kacha mkpa nke Aja mgbaghara mmehie Ya.

Anyị kwesịrị ịgba mbọ ịgụnye ndị ọzọ niime okirikiri nke ịdị n’otu anyị. Ọ bụrụ ma anyị soro ndụmọdụ nke Onyeisi Russell M. Nelson ịkpọkọta Israel gbasasịrị agbasasị n’aka abụọ nke akwa mgbochi, anyị kwesịrị ịgụnye ndị ọzọ niime okirikiri nke ịdị n’otu anyị. Dị ka Onyeisi Nelson kuziworo nke ọma: “Na kọntinent ọbụla ma nofe agwaetiti nke oke osimiri, ndị kwesịrị ntụkwasị obi ka a na-ekpokọta niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a. Ndịiche niile nke omenaala, asụsụ, okike ọmụmụ, agbụrụ na mba na-agbaba niime adịghị mkpa dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-abanye n’ụzọ ọgbụgba ndụ ma bịakwute Onye Mgbapụta anyị dị ịhụnaanya.”

Ejikọtara anyị ọnụ site n’ịhụnaanya anyị nke na okwukwe niime Jizọs Kraịst na dị ka ụmụ nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya. Isi ihe nke isonye n’ezie bụ ịbụrụ otu gị na Kraịst. Emume nke baptizim na oriri nsọ ka ekwuputara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20, ya na ọgbụgba ndụ tempụl anyị, na-ejikọta anyị n’ụzọ ndị pụrụ iche ma kwe anyị ịbụrụ otu n’ụzọ ebighị ebi niile dị mkpa ma bie n’udo na ọńụ.

Ana m agba aka ebe m doro anya ma enweghị mgbagha na Jizọs Kraịst dị ndụ, na niihi Aja mgbaghara mmehie Ya, anyị pụrụ ị bụrụ otu anyị na Kraịst N’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Devid, n’afọ 17, enyeworịị aka iburu ụfọdụ niime Ndị nsọ ofe Osimiri Sweetwater juputara na akị mmiri mgbe ha tọrọ atọ n’elu ala larịị nke Wyoming (lee Ndị Nsọ: Akụkọ nke Nzụkọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst N’ụbọchị ikpeazụ ndị avolume 2, No Unhallowed Hand, 1846–1893 [2020], 237).

  2. Lee Moronaị 7:27-28.

  3. Onyeisi Rabbi nke Norway, Rabbi Michael Melchior, na m bụụrụ ndị na-ekwu okwu kacha mkpa na mkparịta ụka ndị ọkà mmụta nke Jewish-Latter-day Saint emere na Jun 5, 2019, na Ogige BYU Jerusalem dị niime Israel.

  4. Lee Jọn 17:20

  5. Jọn 17:21–22.

  6. Lee “The Conference Minutes and Record Book of Christ’s Church of Latter Day Saints, 1838–1839, 1844” (a maara dị ka the Far West Record), Jun 9, 1830, Church History Library, Obodo ukwu Salt Lake; Steven C. Harper, Making Sense of the Doctrine and Covenants (2008), 75.

  7. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20 bụ mkpughe nke mbụ ebipụtara na akwụkwọ akụkọ ụwa Nzukọ nsọ ma ndị mgbasa ozi ọma jiri ya mee ihe na ihe gbasara ma ozizi ma nchịkwa nke emume nsọ niile nke baptizim na oriri nsọ (see Harper, Making Sense of the Doctrine and Covenants, 75).

  8. Lee 2 Nifaị 2:7.

  9. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:37.

  10. 2 Nifaị 26:33.

  11. 2 Nifaị 26:28.

  12. Peter Wood, Diversity: The Invention of a Concept (2003), 20.

  13. Nehọ weere ọnọdụ nke a (lee Alma 1:4).

  14. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 29:49-50.

  15. 2 Nifaị 2:27-28.

  16. Stanford (publication of the Stanford Alumni Association), Dec. 2023, cover.

  17. Niime Sam Scott, “Dị ka Na I Nwererịị Nhọrọ,” Stanford, Dec. 2023, 44. Edereede ahụ matara ọka mmụta ahụ dị ka Robert Sapolsky, ọka mmụta Stanford nke biology, neurology, na neurosurgery, na odee a kacha mara na nke akwụkwọ sayensị niile. Edereede ahụ nwere niime ya echiche ndị megidere gụnyere site n’aka Alfred Mele, ọka mmụta nke filọsọfi na Mahadum Steetị Florida, onye chịrị nnukwu project John Tempụlton Foundation na mnwere onwe ime nhọrọ O kwuru, “Scientists most definitely have not proved that free will—even ambitious free will—is an illusion” (niime Sam Scott, “Dị ka Na I Nwererịị Nhọrọ,” 46).

  18. Lee D. Todd Christofferson, “Ezi Ohere nhọrọ” (Brigham Young University devotional, Jan. 31, 2006).

  19. Lee Ozizi na Ogbụgba ndụ niile 58:27.

  20. 2 Nephi 2:27.

  21. Moses 4:3

  22. Dị Eziokwu nye Okwukwe ahụ: Nrụaka maka Ozi ọma (2004), 12.

  23. Alma 41:10

  24. Lee Russell M. Nelson, “Chee Selestịal!,” Liahona, Nọv. 2023, 117–20.

  25. 1 Nifaị 2:4.

  26. Poetical works of Ella Wheeler Wilcox (1917), 129.

  27. Ana m enwekarị mmasị na nkwuputa Okenye Neal A. Maxwell kesara nke na-ekwu nke a nụzọ ejiji nkenke kachasị: Ọ bụrụ na ị họrọbeghị alaeze nke Chineke mbụ, nikpeazụ ọ gaghị adị iche ihe ị họrọwororịị kama” (attributed to William Law, an 18th-century English clergyman; quoted in Neal A. Maxwell, “Response to a Call,” Ensign, May 1974, 112).

  28. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:29–31. Nkà mmụta okpukpe Calvinism kwusiri ike ikpe ikpe ziri ezi na ido nsọ nke mkpụrụ obi ndị dara site na amara nke Jizọs Kraịst. Ọ kuziri na otu mgbe ahụ Chineke buru amụma akara aka nke otu mkpụrụ obi maka nzọpụta, enweghị ihe nwere ike ịgbanwe ndapụta ya. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20 na-eme mgbabi doro anya site na Calvinism. Ọ gụrụ, “E nwere ikwe omume na mmadụ nwere ike ịda site na amara ma pụọ site na Chineke dị ndụ” (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 20:32–34; Harper, Making Sense of the Doctrine and Covenants, 74).

  29. Russell M. Nelson, “Iwu Akwa mmiri,” Liahona,, Dec. 2018, 51.