Ọgbakọ Zuru ọha
Nkọwa Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, 2023
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2024


Nkọwa Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ, 2023

Nye Otu Ndịisi Mbụ nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị ikpeazu a

Ụmụnne ndị Nwoke: Dị ka mkpughe siri dị, dịka e dere nime nkeji 120 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Òtù Kansụl maka Imefu Otu ụzọ n’ụzọ iri niile—nke ndị mejuputara ya bụ Otu Ndịisi Mbụ, ndị Kworum nke Ndị Ozi Iri Na Abụọ, na nke Otu Bishọp Nduzi—bụ ndị enyere ikike imefu ego niile nke Nzukọ nsọ. Ngalaba Nzụkọ nsọ niile na-emefu ego niile dịka atụmatụ akwadoro maka mkpata na mmefu siri dị, dị ka kwa otu iwu na usoro niile akwadoro siri dị.

Nnyocha Nzukọ nsọ, nke ndị nọ niime ya bụ ndị ọkammụta ihe gbasara ego, ma ha enweghi ngalaba ọzọ nke Nzukọ nsọ nke ha nọ na okpuru ya, ha nwere oke na ọrụ ime nnyocha maka ido onye ọbụla anya gbasara ego niile e nwetara, mmefu niile e mere, nakwa nchekwa akụ na ụba niile nke Nzukọ nsọ.

N’ihi nnyocha niile e mere, Ngalaba Nnyocha nke Nzukọ nsọ kwekọtara na dị ka ihe niile siri dị, ego niile a natara, mmefu niile e mere, na akụ na ụba niile nke Nzụkọ nsọ nke afọ 2023 ka edekọtaworo ma mezuo dị ka atụmatụ nke Nzukọ nsọ kwadoro maka mkpata na mmefu siri dị, dị ka kwa otu iwu na usoro niile akwadoro siri dị. Nzukọ nsọ nkea, na-esorokwa nkuzi niile nke ha na-akuziri ndị otu ya maka ibi ndụ dịka otu ego akpa ha ha, hapụ iji ụgwọ, na na-edebe ego maka oge ọ ga-adị mkpa.

N’obi nsọpụrụ ka anyị na enyefe ndekọta nkea.

Ngalaba Nyochaa nke Nzukọ nsọ

Jared B. Larson

Onyeisi Nhazi