Ọgbakọ Zuru ọha
Chineke Ga Eme Ihe Echeghị eche
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Chineke Ga Eme Ihe Echeghị eche

Chineke akwadoworị ụmụ Ya na Nzụkọ-nsọ Ya maka oge nke-a.

Oge n’etechaghị aka ha bịaruru Ndagwurugwu nke Salt Lake, Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazu bidoro wuwe tempụl ha dị nsọ. Ọ metụtara ha n’obi na ha emesiwo chọta otu ebe ha nwere ike ịfe Chineke ofufe n’udo ma gbanagharị mkpagbu.

Mana, dịka a n’ewusi isi-nkume nke tempụl ahụ, ndị agha nke United States biara ebe ahụ ka ha jiri ike-ike tinye aka-nachị steeti nke ọhụrụ.

N’ihi na ndị ndu Nzukọ-nsọ amaghị otu ndị agha ahụ g’esi akpa agwa, Brigham Young enye Ndị nsọ iwu ka ha were aja wuchisie isi-nkume tempụl ahụ.

A mara m nke ọma na ụfọdụ ndị otú Nzukọ-nsọ ga-eche ịhe kpatara mbọ niile ha n’agba iji wulie alaeze Chineke n’eji enwete mkpagbu oge niile.

N’ikpeazụ, ịhe egwu ahụ agafee, ma egwupụtakwara aja ndị mechiri isi-nkume tempụl ahụ ma legharịa ha anya. Ọ bụ mgbe ahụ ka ndị ọrụ ụlọ ahụ chọpụtara na ụfọdụ okwute-sandstone ahụ agbawasiwo, nke meziri ha adịghịzi mma ị bụ isi-nkume.

Nke kpatara, Brigham jiri mezie isi-nkume ahụ ka ha nwee ike bunwuo okwute-granite ahụ1 nke mgbidi niile nke tempụl Salt Lake.2 N’ikpeazu, Ndị nsọ nwere ike ị bụ abụ “How Firm a Foundation”3ma mara n’ezie na ụlọ nsọ tempụl ha ka arụrụ n’elu isi-nkume g’anọgide ruọ ọtụtụ ọgbọ niile.

Foto, oyiyi
Ntọala Tempụl Salt Lake

Akụkọ nke ga-akụziri anyị otu Chineke ji ejiri ọdachi wete mmezu ebumnuche Ya niile.

Ọrịa Zuru uwa niile

Ọ bụrụ na nke-a dara gị na ntị ka ịhe ịmara nke ọma n’ihi ọnọdụ nke anyị hụrụ onwe anyị taa, ọ bụ n’ihi otu ahụ k’ọdị.

Enweghi m obi abụọ na enwere onye n’anụ olu m, m’ọbụ n’agụ mkpụrụ-okwu m, onye ọrịa ozuru-ụwa nke-a n’emetụghị.

Maka ndị ahụ n’eru uju ọnwụ onye ezinụlọ m’ọbụ ndị enyi ha, anyị soro unu n’eru uju. Anyị n’arịọ Nna nke Ịgwe ka ọ kasie gị obi ma gbaa gị ume.

Ịhe ndapụta niile nke nje-virọs nkea abụghị nanị ahụ isi ike k’ọmetụtara. Ọtụtụ ezinụlọ enweghizi ohere ịkpata ego, ma ịhe ndi n’amaja ha bụ oke agụụ, amaghị otu echi g’adị na ụjọ. Anyị nwere mmasị maka mbọ niile nke ọtụtụ gbara iji gbochie mfesasị nke nje nke-a Anyị nwere obi-umeala maka ịtụ-aja na mbọ nwere ugwu nke ndị ahụ n’echeghị maka ndụ nke ha, iji nyere aka, gwọọ, ma kwado ndị mmadụ nọ na mkpa. Obi anyị jupụtara n’ekele maka ịdịmma na obi omiko nke unu.

Anyị n’ekpe ekpere ka Chineke meghe windo nke eluigwe ma jiri ngọzị ebighiebi niile nke Chineke wujuo ndụ unu.

Anyị Bụ Mkpụrụ

Enwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ nke ana amaghị maka nje-virus nke-a. Mana ọ bụrụ n’enwere otu ihe nke m mara, ọ bụ na nje-virus nkea abịaghị m’obụrụ na Chineke amaghị maka ya. Ọ pụtaghị na Ọ ga-akpọkọlata ịgwé ndị mmuo-ozi, m’ọbụ kpọ ọgbakọ nke mberede, m’ọbụ rọpụta ngwa-ọrụ niile eji eke ụwa maka iji gbọọ mkpa nke-a ana amaghị na ọ g’abịa.

Ozi m taa bụ, n’agbanyeghi na ọrịa nke-a abụghị ịhe anyị chọrọ m’ọbụ chere, Chineke akwadoworị ụmụ Ya na Nzụkọ-nsọ Ya maka oge nke-a.

Anyị ga-anagide, eeh. Mana anyị g’eme ]he karịrị ịta ikikere eze, ị nwee ndidi, ma ị chere maka mgbe ịhe niile ga-abịaghachi otu ọ dịburu na mbụ. Anyi niile ga aga n’ihu, ma anyị g’adi mma karia maka nke a.

N’otu ụzọ, anyị bụ mkpụrụ. M’ọbụrụ na mkpụrụ ndịa ahụ g’eru ogo ha kwesịrị, a ga eli ha n’ala tupu ha epuo. Ọ bụ akaebe m na n’agbanyeghi na mgbe ụfọdụ, ọ g’adị ka eliri anyị n’ime ala nke ọtụtụ mnwale, m’ọbụ ọchịchịrị nke echiche agba anyị okirikiri, ịhụnanya nke Chineke ma ngọzị niile nke oziọma Jizọs Kraịst eweghachiri ga-eme ka otu ịhe anyị n’atụghị anya ya puo ume.

Ngọzị n’abịa site N’ihe Isi ike

Ogbo ọbụla enwetawo oge mnwale na ịhe isi ike nke ya.

Ịnọk na ndị ya biri ndụ n’oge mmehie, ọtụtụ agha, ma ịkwafu ọbara. “Mana Onyenwe anyị bịara binyere ndị ya.” Ịhe O bu n’obi maka ha bụ ịhe ha n’atụghị anya. Ọ nyere ha aka hiwe Zayọn—ndị mmadụ nwere “otu obị na otu uche” ndị “biri n’ezi-omume.”4

Josef nta, nwa nwoke nke Jekọb, ka atụbara n’ime oluu, ree ya dịka ohuu, gọnarị ma tọgbọ ya atọgbọ.5 Josef ga-echerịrị n’obi ya ma Chineke ochefuwo ya. Chineke nwere ịhe O bu n’obi maka Josef nke a n’ atụghị anya ya. O jiri oge nke mnwale nke-a iji gba agwa Josef ume, ma dobe ya ọnọdụ nke g’eme ka ọ zọpụta ndị ezinụlọ ya.6

Foto, oyiyi
Josef Smit n’ime Nga nke Liberty

Chee maka Josef Onye amụma mgbe atụbara ya n’ime Nga nke Liberty, otu o si rịọ maka enyemaka n’isi ndị nsọ ahụ n’ata ahụhụ. Ọ g’abụrịrị n’ọchere otu ọ g’esi kwee omume ihiwe Zayọn n’udịrị ọnọdụ ndị ahụ. Mana Onyenwe anyị kwuru udo nye obi ya, ma mkpughe nke ebube nke sochiri ya wetere udo nye Ndị nsọ—ma ọ na agakwa n’ihu taa n’ewetere mụ na gị udo.7

Ọ bụ ugboro ole n’ole n’afọ mbido niile nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, ka Ndị nsọ nwere obi ịlọ mmiri ma n’echekasị obi ha na Chineke echefuwo ha? Mana site na mkpagbu niile, ịhe ịtụ egwu niile, ma mmaja nke mbibi agbụrụ, Onyenwe anyị Chineke nke ndị Izrel nwere ihe ọzọ o bu n’obi maka igwé atụrụ Ya. Otu Ịhe a n’atụghị anya ya.

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta site na ọmụmatụ ndịa—ma ọtụtụ narị ndị ọzọ dị n’ime akwụkwọ nsọ?

Nke mbụ: anaghị enye ndị eziomume ohere n’efu nke g’eme ka ha gbanarịa ndagwurugwu onyinyo. Anyị niile kwesịrị i gafee n’ime oge isi ike, n’ihi ọ bụ n’ime oge ndị mnwale ndịa k’anyị si amụta ukpuru niile nke g’eme ka agwa anyị sie ike, ma mee k’anyị bịaruo Chineke nso.

Nke abụọ: Nna anyị nke Igwe mara n’anyị n’ata ahụhụ, ma n’ihi anyị bụ ụmụ Ya, ọ g’aghị ahapụ anyị.8

Cheegodi maka onye ahụ bụ onye omiko, Onye nzọpụta, onye jiri ndụ Ya niile iji lekọta ndị ọrịa, ndị nọ nanị ha, ndị obi abụọ, ndị obi n’alọ mmiri.9 Ị chee na Ọ naghị eche maka gị taa?

Ndị enyi m ọma, ụmụnne m ọma ndị nwoke na nwanyị, Chineke geche unu nche ma chekwa unu dịka atụrụ n’oge nke ụjọ nke a. Ọ maara gị. Ọ na-anụta arịrịọ unu niile. Ọ kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ g’emezu nkwa Ya niile.

Chineke nwere otu ịhe o bu n’obi maka gị n’onwe gị ma maka Nzukọ nsọ ya niile—otu ọrụ dị ịtụ-n’anya na ihe iju anya.

Anyị N’ekele Gị, O Chineke, maka Onye-amụma

Ụbọchị nịịle kachasị mma nọ n’ihu anyị, n’abụghị n’azụ anyị. Ọ bụ ịhe-a kpatara Chineke ji enye anyị mkpughe nke agba ọhụrụ! M’ọbụghị ya, ndụ nwere ike ịdị ka ụgbọ-elu n’efegharị n’elu na nkịtị ma n’eche mgbe igirigi nke igwe ga-apụ k’anyị wee fedata n’ala n’udo. Ebumnuche nke Onyenwe anyị maka anyị karịrị nke ahụ. N’ihi nke-a bụ Nzukọ-nsọ nke Kraịst ahụ dị ndụ, ma n’ihi Ọ n’edu ndị amụma Ya, anyị n’aga n’ihu, n’agbago elu, ruo ebe niile ahụ anyị n’agabeghi mbụ, gbago elu nke anyị n’atụghi anya ya!

Ugbua, nke-a apụtaghị na ụgbọ-elu anyị agaghị enweta ọma jijiji nke igwe-oji n’ime njem nke ndụ anụ arụ nke-a. Ọ pụtaghị na agaghị enwe mgbe injin ụgbọ-elu g’enwe nsogbu, m’obụ otu ịhe emebie n’ime ya, m’obụ mbara igwe-oji agbarụọ. N’eziokwu, ọtụtụ ịhe nwere ike imebisi tupu ha adị mma.

Dịka onye agha elu, ma onye kaptịn ụgbọ-elu, a mụtara m na n’ihi enweghi m ike ịhọrọ ihe mnwale ga-abịara m mgbe m n’efe n’elu, enwere m ike ịhọrọ otu m si akwado na otu m g’esi akpa agwa. Ịhe achọrọ n’oge ịhe ịtụ egwu a bụ ị nọrọ jụụ ma nwe isi juru oyi.

Kedụ k’anyị g’esi eme nke-a?

Anyị g’ejidesi ihe ndị ahụ gbara ọkpụrụkpụ aka ike, jide ukpụrụ niile nke oziọma, ịhe ndị ahụ kachasị dị mkpa. Ị g’agba agwa okpukperechi gị ume—dịka ịkpe ekpere ma ịmụ akwụkwọ nsọ, ịdobe iwu niile nke Chineke. Ị g’eme mkpebi obi niile site n’ịsoro uzọ ndị nke gara nke ọma na mbụ.

Lekwasị anya n’ihe niile ndi ị nwere ike ime, ma hapụ ndị ahụ ị n’enweghi ike ịme.

Ị g’ewulite okwukwe gị. Ma gee ntị ị nụ okwu-ndu nke Onyenwe anyị na nke onye amụma Ya maka iduru anyị ruo na nchekwa.

Chetakwa, nke a bụ Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst—Ọ nọ n’isi ya.

Cheegodi maka ọtụtụ ịhe niile arọpụtaworo kemgbe afọ iri gara-aga. Ka ekwuo ụfọdụ n’ime ha:

  • Oriri-nsọ ka akọwaziri nke ọma na ọ bụ ịhe dị n’etiti ofufe anyị nke Ụbọchi nsọ.

  • Come, Follow Me ka arọpụtara ka ọ bụrụ ọmụmụ nke ezinụlọ, nke Nzụkọ-nsọ kwadoro iji gba ndị mmadụ na ezinụlọ niile ume.

  • Anyị bidoro ịme atụmatụ nlekọta onye niile n’ụzọ dị elu ma dịrịkwa nsọ karịa

  • Iji nka n’ụzụ n’ikesa oziọma, ma n’ịrụ ọrụ nke Onyenwe anyị agbasasiwo gburugburu Nzukọ nsọ niile.

Ọzọkwa, agba niile nke ọgbakọ zuru ụwa niile ndịa agaghị ekwe omume m’ọbụghị n’ihi ngwa-ọrụ ọma nke nka n’ụzụ.

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, n’ihi Kraịst nọ n’isi, ịhe niile agaghị nanị ezi ezi, ha ga-adịkwa itụnanya.

Ọrụ nke Mkpọkọlata Izrel N’aga N’ihu

Na mbụ, ọ g’adị ka ọrịa zuru uwa niile nkea g’abụ ịhe nnọchị-ụzọ nyere ọrụ nke Onyenwe anyị. N’imatụ, ụzọ ndị ama-ama iji kesaa oziọma na mbụ ekweghizidi omume ugbua. N’agbanyeghi, ọrịa zuru ụwa nkea egosiwo ụzọ dị ọhụrụ eji achọta ndị eziokwu nke obi. Ọrụ nke mkpokọta Izrel na-abawanye n’ike ma n’ọrụ. Ọtụtụ akụkọ ruru narị ma puku n’agba aka ebe nke-a.

Otu ezi enyi bi n’obodo ọma Norway detere mụ na Harriet ozi maka otu baptizịm ndị emere jiri gbagoo. “N’ebe niile Nzụkọ-nsọ dị ntakịrị,” ka ọ dere, “mkpisi osisi g’abụ obere ngalaba-osisi, ma obere ngalaba-osisi g’emesi bụrụ nnukwu ngalaba-osisi!!”

Na Latvia, otu nwanyị onye chọtara Nzụkọ-nsọ nke-a site na ịpị otu advert ọ hụrụ na intanet, nwere obi ụtọ ịmụta maka oziọma nke Jizọs Kraịst, nke mere ojiri bịa ọsịsọ karịa oge ha kwuru, ma tupu ndị mgbasa oziọma n’akuzisiwo nkuzi nke mbụ, ya ajụọ ha maka ụbọchị a g’eme ya baptịzim.

Na Eastern Europe, otu nwanyị onye ndị mgbasa oziọma kpọrọ n’ekwentị tiri mkpu, “Ụmụnne nwanyị, gịnị mere unu akpọbeghị m kemgbe? A nọ m n’eche kemgbe!”

Ọtụtụ ndị mgbasa oziọma anyị enweghi ezumike. Ọtụtụ ndị mmadụ n’akụziri ndị mmadụ karịa otu ha mere na mbụ. Enwere ọtụtụ mmmekọrịta dị n’etịtị ndị otú na ndị mgbasa oziọma karịa otu ọ dị na mbụ.

Na mbụ, enwere ike ụzọ eji eme ịhe na mbụ kechiri anyị anya, meziri na ọ bụ ọrịa zuru ụwa nke-a meghere anya anyị niile. Enwere ike ọ bụ okwute-sandstone k’anyị jiri n’ewu ụlọ ebe okwute-granite nọkwa anyị nso kemgbe. N’ihi mkpa ọ dị, anyị n’amatazi ugbua otu anyị were ike iji jiri ụzọ dị iche-iche, tinyekwara nka n’ụzụ, kpọọ ndị mmadụ ọkú—n’ụzọ ama-ama—ka ha bịa ma hụ, ka ha bịa ma nye aka, ka ha bịa ma sonye.

Ọrụ Ya, Ụzọ Ya

Nke-a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị. Ọ n’akpọ anyị okú k’anyị chọta ụzọ otu Ọ si eme ya, ma ha nwere ike dị iche site na nhụmịhe nke anyị nwegoro na mbụ.

Nke-a meworo Simon Pita ma ndị nso-ụzọ ndị ọzọ ndị jere igbu azụ na Osimiri nke Tiberias.

“Abalị ahụ, enweghi ihe ha jidere.

“Mana mgbe chi [bọrọ], Jizọs guzoro n’akụkụ mmiri. …

“Ma ọ gwara ha, Tụnye nu ọjọgọrọ ahụ [n’akụkụ]nke ọzọ nke ụgbọ-mmiri ahụ, ma unu ga achọta.”

Ma ha tụnyere ọjọgọrọ ha n’akụkụ nke ọzọ nke ahụ ma “ha enweghi ike ịdọbata ya n’ime n’ihi ọtụtụ azụ ndị ahụ.”10

Chineke n’ekpughe, ma n’agakwa n’ihu n’igosi aka ebube Ya. Ụbọchị g’abịa mgbe anyị g’ele anya n’azụ ma mara na n’oge isi ike nke-a, Chineke nọ n’enyere anyị aka ị chọta ụzọ ka mma karịa—ụzọ nke Ya—maka iwulite alaeze Ya n’elu isi nkume siri ike.

A na m agba aka ebe m na nke-a bụ ọrụ nke Chineke, ma Ọ ga aga n’ihu ị mee ọtụtụ ịhe dị ịtụnanya n’etiti ụmụ Ya, ndị Ya. Chineke ji anyị n’elu ọbọ aka Ya nke dị ịhụnanya ma nwee omiko.

A na m agba ama na Onye Isi nduzi Russell M.Nelson bụ onye amụma Chineke nke ụbọchị anyị.

Dịka Onye Ozi nke Onyenwe anyị, A na m akpọ unu okú ma n’agọzi unu ka “anyị mee ihe niile nke nọ n’ike anyị, n’iru ọchị, na mgbe ahụ ka anyị guzo n’otu ebe, na nchekwube kachasị, ịhụ nzọpụta nke Chineke, na ogwe-aka-ya nke ekpuheworo.”11 Ma a na m ekwe nkwa na Onyenwe anyị g’eme ka ịhe dị ịtụnanya bịa site na ọrụ aka eziomume anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Quartz monzonite that looked like granite, taken from a quarry at the mouth of Little Cottonwood Canyon, 20 miles (32 km) southeast of the city.

  2. For a more in-depth look at this period of history, see Saints: The Story of the Church of Jesus Christ in the Latter Days, vol. 2, No Unhallowed Hand, 1846–1893 (2020), chapters 17, 19, and 21.

  3. See “How Firm a Foundation,” Hymns, no. 85.

    The verses of this great anthem can serve as a theme for our times, and when we listen to the lyrics with new ears, it provides insight into the challenges we face:

    N’ime ọnọdụ niile—n’ime ọrịa, n’ime ahụ ike,

    N’ime olulu mbịam, mobu mgbe akụ nuba jupụtara.

    Nebe obibi anyị mọbụ ala ndị ọzọ, nelu ala mọbụ nelu mmiri—

    Otu ọbụla ụbọchị niile gi siri chọọ … Otu a ka ọzuzu ya gadị.

    Atụla Egwu, A Nọnyere-lem Unu; obi alọla gị mmiri,

    N’ihi abụ m Chineke gị ma aga m enyekwa gi enyemaka.

    A ga m agba gị ume, nyere gị aka, ma mee ka gị kulie,

    Bulie gị site na aka ezi omume m, … kachasị ike.

    Mgbe m ga asi gị siri n’ime mmiri di oke omimi gafee,

    Osimiri nta niile nke iri uju agaghị eri gi,

    n’ihi A ga m anọnyere gi, ma gozie nsogbu gị niile,

    Ma mee ka ịdị nsọ … mkpagbu gị nke di oke omimi.

    Mgbe oke mnwale nenwu ọkụ ga-anọchị ụzọ gị,

    Amara M, nke zuru ịhe niile, ka a ga-enye gị.

    Ire ọkụ agaghị emerụ gị ahụ; nanị ịhe m ga achọ

    Bụ ka uwe gi ree ọkụ … ma ka ewugharịa olaedo gi. …

    Mkpụrụ obi ahụ dabere na Jizọs maka nkasị obi

    A gaghị m mọlị, enweghi m ike mọlị ị tọgbọrọ ndị iro ya;

    Mkpụrụ obi ahụ, nagbanyeghi na ala ọkụ mmụọ niile gebuso ya,

    A gaghị m mọlị, mọlị … ahapụ ya!

  4. Lee Mozis 7:13–18

  5. Joseph was perhaps as young as 17 when his brothers sold him into slavery (see Genesis 37:2). He was 30 years old when he entered Pharaoh’s service (see Genesis 41:46). Can you imagine how difficult it was for a young man in his prime to be betrayed, sold into slavery, falsely accused, and then imprisoned? Joseph certainly is a model for not only the youth of the Church but also every man, woman, and child who desires to take up the cross and follow the Savior.

  6. See Genesis 45:4–11; 50:20–21. In Psalm 105:17–18, we read, “He sent a man before them, even Joseph, who was sold for a servant: whose feet they hurt with fetters: he was laid in iron.” In another translation, verse 18 reads, “They have afflicted with fetters his feet, Iron hath entered his soul” (Young’s Literal Translation). To me, this suggests that Joseph’s hardships gave him a soul as strong and resilient as iron—a quality he would need for the great and unimaginable future the Lord had in store for him.

  7. Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 121–23.

  8. If God commands His children to be aware of and compassionate toward the hungry, the needy, the naked, the sick, and the afflicted, surely He will be aware and merciful to us, His children (see Mormon 8:39).

  9. Lee Luk 7:11–17

  10. Lee Jọn 21:1–6

  11. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 123:17