Ọgbakọ Zuru ọha
Omenala nke Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Omenala nke Kraịst

Anyị nwere ike nabata nke ọma akụkụ omenaala nke onwe anyị kacha mma n’elu ụwa ma bụrụ ndị sonyere n’uju n’ime omenaala ebighi ebi nke na-abịa site na oziọma nke Jizọs Kraịst.

Ọ bụ ụwa dị ebube k’anyị bi n’ime ya ma bụrụ nke anyị na ndị ọzọ sooro nweere, ebe obibi nye ọtụtụ mmadụ, asụsụ, omenaala, na agụgụala dị iche iche—gbasaa agbasa n’ihe karịrị narị kwuru narị obodo ma nwee otú ruru puku kwuru puku, ndị ọbụla na nke ya jupụtara na omenaala. Mmadụ ekere eke nwere ọtụtụ ihe kwesịrị ịme ha obiọma ma ńụrịa na ya. Mana ọbụna agwa amụrụ amụ—ihe ndị ahụ nke egosiri anyị site na omenaala anyị tolitere n’ime ya—nwere ike dịrị dịka nnukwu ume n’ime ndụ anyị, o nwekwara ike, mgbe ụfọdụ, bụrụzie ọgbachị pụtara ihé.

O nwere ike dịrị dịka na omenaala mịrị emị nke ukwuu n’echiche na omume anyị nke n’enweghị ike ịgbanwe. Ọ bụ, emesịa ihe niile, mmetụta kacha nke n’emetụ anyị n’akọwa anyị ma site na ya anyị n’enwete mmụọ nke onye anyị bụ. O ga-bụrịrị ụdị mmetụta siri ike mere anyị aghara ịhụta adịghị ike ma ọbụ ezughị oké si na-aka mmadụ nke dị n’ime omenaala nke onwe anyị, nkea n’eme anyị obi abụọ iwezuga ụfọdụ ọdịnaala nke ndị nna anyị. Ịtụkwasị obi nke ukwuu na ejirimara omenaala nke mmadụ nwere ike dụbanye na ekweghị ekwe nke echiche, agwa, ma ọbụ omume—ọbụna nke si n’igwe—bara uru.

O rubeghị ọtụtụ afọ gara aga m matara m otu nwoke nwere ezi agwa onye n’enye aka igosipụta ụkpụrụ nkea zuru ụwa nke enweghị ezi nghọta maka omenaala. Ezutere m ya mbụ na obodo Singapore mgbe ekenyere m ọrụ ịbụ onye nkuzi nke ezi na ụlọ ya. Ọka mmụta pụrụiche nke Sanskrit na Tamil, ọ bụ onye si ndida nke India. Ọmarịcha nwunye ya na ụmụ ya ndị nwoke bụụrụ ndị otu Nzukọ nsọ, mana o nwebeghị mgbe o sonyere ma ọbụ gee ntị na nkuzi niile nke ozi ọma. O nweere obi ụtọ maka otu nwunye ya na ụmụ nwoke ya siiri etolite ma kwadoo ha n’uju n’ọrụ ha ma n’ọrụ Nzukọ nsọ ha niile.

Mgbe m kwụrụ ka m kuziere ya ụkpụrụ niile nke oziọma ma kekọrịta nkwenye anyị nye ya, na mbụ o kweghị. O were m nwa oge ịmata ihe kpatara nkea: ọ dịịrị ya dịka na o mee otu ahụ, ọ ga-abụ onye si na ndụ ya gara aga, ndị obodo ya, na agụgụala ya nụpụ isi! N’ụzọ nke echiche ya, ọ ga-agọnarị ihe niile ọ bụbụụrụ, ihe niile ezi na ụlọ ya kuziworo ya ị bụ, nketa Indịa ya. N’ime ọnwa ole ma ole sotere, anyị nwetere ohere kwuo banyere ihe ndịa niile. Ọ tụrụ m anya (n’agbanyeghị na o jughị m anya) otu oziọma nke Jizọs Kraịst nwere ike si mepee uche ya na nghọta dị iche.

N’ọtụtụ omenaala mmadụ mere, a ga-ahụta ma nke ọma ma nke ọjọọ, nke n’ebuli na nke n’ebibi.

Ọtụtụ n’ime nsogbu anyị nke ụwa bụ nihi esemokwu n’etiti ndị ahụ nwere echiche ma omenaala dị iche iche sitere na omenaala ha. Mana esemokwu na ọgbaghara niile ga-akwụsị ngwa ngwa m’ọbụrụ na ụwa nabata nnọọ “omenaala nke mbụ,” nke ahụ anyị niile nwere n’oge n’etebeghị aka gara aga. Omenaala nkea bidoro na ndụ tupu ndụ anụ ahụ. Ọ bụụrụ omenaala nke Adam na Inọk. Ọ bụụrụ omenaala ewulitere site na nkuzi nke Onye Nzọpụta na nnukwu nke oge, ma ọ dịịrị ndị iyom na ndị ikom niile ọzọ kwa n’oge anyị. Ọ pụrụ iche. Ọ bụ omenaala kachasị ha niile ma o sitere na nnukwu atụmatụ nke ańụrị, nke Chineke rọpụtara ma Kraịst eduo ya. Ọ na akpọkọta karịa ikesasị. Ọ na-agwọ ọrịa karịa imerụ ahụ.

Oziọma nke Jizọs Kraịst na-akuziri anyị na enwere nzube n’ime ndụ. Ọbịbịa anyị n’ebea abụghị nnọọ nnukwu mgberede ma ọ bụ njehie! Anyị nọ ebe a maka otu ebumnuche.

Omenaala nkea dakwasịrị na ọgbụgba ama ahụ na Nna nke Eluigwe dị ndụ, na Ọ dị ire ma nwee ịhụnanya n’ebe onye ọbụla n’ime anyị nọ n’otu n’otu. Anyị bụ “ọrụ Ya a na ebube [Ya].”1 Omenaala nkea na-akuzi na onye ọbụla nwere otu uru . Enweghị ihe dịka nkedo ma ọbụ klas. Emesịa ihe niile anyị bụ, ụmụnne nwoke na nwanyị, ụmụ nke mmụọ nke nne na nna nke eluigwe—na nkịtị. Enweghị obi ọjọọ ma ọbụ echiche nkewa nke “anyị na ha” dị n’ime omenaala ahụ kachasị ibe ya. Anyị niile bụ “anyị.” Anyị niile bụ “ha.” Anyị kwere na anyị ka ọ dịịrị n’aka ilegide ma nye nkọwa maka onwe anyị, onye ọbụla n’ibe ya, Nzukọ nsọ, na ụwa anyị. Ọrụ na ịnye nkọwa bụ ịhe ndị dị mkpa n’ime uto anyị.

Afọ ọma, ezi nlekọta dịka Kraịst, bụ ntọala nke omenaala anyị. Anyị n’enwete mmetụ maka mkpa nke mmadụ ibe anyị, nke ugbua na nke ime mmụọ, ma mee ihe na mmetụta ahụ. Nkea na-achụpụ obi ọjọọ na ịkpọasị.

Anyị n’erite omenaala nke mkpughe, dabeere n’okwu nke Chineke dịka otu ndị amụma natara (ma Mụọ Nsọ na-agwa anyị n’ọtu n’otu na ha bụ eziokwu). Mmadụ niile ekere eke nwere ike mata uche na obi nke Chineke.

Omenaala nkea n’akwado ụkpụrụ nke ohere nhọrọ. Ike nke ịhọrọ dị mkpa nke ukwuu maka nzulite na ańụrị anyị. Ime nhọrọ n’ezi uche dị mkpa.

Ọ bụ omenaala nke mmụta na ọmụmụ ihe. Anyị na-achọ amamihe na akọ na uche na nke kacha mma n’ihe niile.

Ọ bụ omenaala nke okwukwe na nrube isi. Okwukwe n’ime Jizọs Kraịst bụ ụkpụrụ nke mbụ nke omenaala anyị ma nrube isi nye nkuzi na iwu nsọ Ya niile bụ ihe na-apụta na ya. Ndịa na-akpọlite ike nke onwe.

Ọ bụ omenaala nke ekpere. Anyị kwere na Chineke agaghị nanị anụ ekpere anyị kama ọ ga kwa enyere anyị aka.

Ọ bụ omenaala nke ọgbụgba ndụ na emume nsọ, ịma ezi atụ dị elu, ịchụ aja, mgbaghara na nchegharị, na ilekọta tempụl nke anụ ahụ anyị. Ihe ndịa n’agba aka ebe ntụkwasị obi anyị nwere ebe Chineke nọ.

Ọ bụ omenaala ọkwa nchụaja n’achị, ikikere nke ime ihe n’aha nke Chineke, ike nke Chineke ịgọzi ụmụ Ya. Ọ na-akọwazi ma na-akwado ndị mmadụ ị bụ ezigbo mmadụ, ndị ndu, ndị nne, ndị nna, na ndị nsiso—ma ọ na-asacha ebe obibi.

Ezigbo ọrụebube n’ejupụta n’ime nkea, omenaala kacha gbaa afọ, arọpụtara site nokwukwe n’ime Jizọs Kraịst, ike nke ọkwa nchụaja, ekpere, mwulite nke onwe, ezi mgbanwe, na mgbaghara.

Ọ bụ omenaala nke ọrụ mgbasa oziọma. Ọnụ-ahịa nke mkpụrụ-obi nile dị ukwuu.

N’ime omenala nke Kraịst, ndị inyom ka ebuliri elu ruo ọnọdụ ha ziri ezi na nke dị ebighi ebi. Ha abụghị ohu nyere ndị ikom, dịka na ọtụtụ omenaala n’ime ụwa taa, kama ndị nsiso n’uju n’ụwa a na n’ime ụwa nke na-abịa.

Omenaala nkea kwadoro ịdị nsọ nke ezi na ụlọ. Ezi na ụlọ bụ isi akụkụ nke ebighị ebi. Ntozu oké nke ezi na ụlọ ruru ịchụ aja ọbụla n’ihi na, dịka a kuziwooro ya, “enweghị ọganihu nke nwere ike nọchie ọdịda mere n’ime ebe obibi.”2 Ebe obibi bụ ebe anyị na-arụ ọrụ kacha mma na ebe anyị n’enwete ańụrị kacha elu.

N’ime omenala nke Kraịst, enwere ebumnuche—na nlekwasị anya na odudu dị ebighị ebi. Omenaala nkea ka ihe niile dị mma gbasara! Ọ na-abịa site na oziọma nke Jizọs Kraịst, nke dị ebighị ebi, ma na-akọwa gịnị mere, kedụ na ebee nke ịdị ndụ anyị. (Ọ na-agụnye, n’abụghị ngụpụ.) N’ihi na omenaala nkea n’apụta ihé site n’itinye n’ọrụ nkuzi niile nke Onye Nzọpụta anyị, ọ na-enye aka rọpụta mmanụ ọgwụgwọ nke ụwa anyị chọsịrị ike.

Ọ bụ ngọzi ị bụ onye sonyere na ụzọ nke ndụ a dị ukwuu ma dịrị eziokwu! Ị bụ otu n’ime nkea, omenaala kacha elu, ga-achọ mgbanwe. Ndị amụma akuziwo na ọ dị mkpa ịhapụ ihe ọbụla dị n’ime omenaala ochie anyị nke n’adabaghị na omenala nke Kraịst. Mana nke ahụ apụtaghị na anyị ga-ahapụ ihe niile. Ndị amụma ekwusiwokwa ike na-ana akpọku anyị, otu onye na ndị niile, iwete okwukwe na akara aka na amamihe anyị—ihe niile nke dị mma n’ime ndu anyị na n’ime omenaala anyị n’otu n’otu—ya na anyị ma kwe ka Nzukọ nsọ “gbakwunye na ya” site n’ozi nke ozi ọma.3

Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraist nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a abụghị nke obodo Mepere epe mọlị m’ọbụ omenaala nke ndị Amerịka. Ọ bụ nzukọ nsọ gafere ọtụtụ ụwa, dịka o kwesịrị ịbụ mgbe niile. Karịa nke ahụ, ọ dị ebube. Ndị otú ọhụụ sitere na gburugburu ụwa n’ewebata ụba, ọdị iche, na obi ụtọ n’ime ezi na ụlọ anyị n’etolite mgbe niile. Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a n’ebe niile nakwa eme mmemme obodo ha ma na-akwanye ugwu nye njirimara na ndị mmerị ha, mana ugbua ha sonyekwara nime ihe dị ukwuu karịa. Omenala nke Kraịst n’enyere anyị aka ịhụta onwe anyị dịka anyị dị n’ezie, na mgbe anyị hụtara onwe anyị site n’anya nke ebighị ebi, nke ezi omume n’akpasu, ọ na-arụ ọrụ imelite ike eji emeju nnukwu atụmatụ nke ańụrị.

Ya mere gịnị mere enyi m ahụ? N’ezie, akuziiri ya nkuzi niile ahụ ma ya abata Nzukọ nsọ. Ezi na ụlọ ya ka arachiworo kemgbe maka ugbua na ebighị ebi niile na Tempụl Sydney Australia. Ọ hapụwo obere ihe—ma rite ihe niile. Ọ chọpụtara na ya nwekwara ike ńụrịa ọńụ nke agụgụala ya ma nwee kwa nnukwu ugwu maka nna nna nna ya, egwu ya na ịgba egwu na agụmagụ ya, nri ya, ala ya na ndị ya. Ọ chọpụtawo na enweghị nsogbu ma ọlị itinye omenaala obodo ya kacha mma n’ime omenaala kachasi elu. Ọ chọpụtara na iwebata nke ahụ dabara n’eziokwu na ezi omume site na ndụ ochie ya n’ime nke ọhụrụ ya na-abụ nanị imelite osiso ya n’etiti Ndị nsọ ma nyekwara ya aka chịkọta ihe niile n’otu n’ime obodo nke eluigwe.

Anyị nwere ike, n’ezie, nabata nke ọma akụkụ omenaala nke onwe anyị kacha mma n’elu ụwa ma bụrụkwa ndị sonyere n’uju n’ime omenaala kacha ochie n’ime ha niile—nke isi mbụ, nke kachasị elu, omenaala ebighi ebi nke na-abịa site na oziọma nke Jizọs Kraịst. Ọ bụ njirimara dị ebube k’anyị niile so na ya. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Mosịs 1:39.

  2. J. E. McCulloch, in Nkuzi niile nke Ndị isi Nzụkọ nsọ: David O. McKay (2011), 154.

  3. Lee Nkuzi niile nke Ndị isi Nzụkọ nsọ: George Albert Smith (2011), xxviii; Gordon B. Hinckley, “The Marvelous Foundation of Our Faith,” Liahona, Nov. 2002, 78–81.