Ọgbakọ Zuru ọha
Ike Ọgwụgwọ nke Jizọs Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Ike Ọgwụgwọ nke Jizọs Kraịst

Mgbe anyị bịakwutere Jizọs Kraịst site n’inwe okwukwe na Ya, enwe nchegharị, na-eme ma na-edobe ọgbụgba ndụ niile, ntiwa anyị—na-agbanyeghị ihe kpatara ya nwere ike nwee ọgwụgwọ.

Kemgbe mmalite afọ nke a, anyị ezutewo ọtụtụ ihe ndị mere a na-atụghị anya ya. Ntufu ndụ na ego site na ọrịa mkpochapụ zuru ụwa a kpaala ndị bi na gburugburu ụwa na akụnaụba aka ọjọọ.

Ala ọma jijiji, ọkụ ọgbụgba, na iju mmiri dị na mpaghara ụwa dị iche iche, nakwa ọghọm dị egwu ndị ọzọ metụtara ihu eluigwe, e mekpaala ndị mmadụ ahụ, ha dị ka ndị na-enweghị olileanya, nakwa obi mgbawa, ha a na-eche ma ndụ ha ọga adịkwa ka ọ naara adị.

Ka m kọọrọ unu akụkọ nke metụtara m gbasara obi mgbawa.

Mgbe ụmụaka anyị dị ntakịrị, ha kpebiri na ha ga-amụ ihe ọmụmụ pịano. Mụ na di m, Rudy chọburu inye ụmụ anyị ohere ime nke a, mana anyị e nweghị pịano. Anyị e nweghị ike ịzụtali pịano, ya mere Rudy malitere ịchọ nke aka ruo nwa ogbenye.

N’oge ekeresimesi nke afọ ahụ, o wetere pịano na-ịtụnaanya anyị, na-ọtụtụ afọ, ụmụ anyị mụtara ịpị ya.

Foto, oyiyi
Pịano ochie

Mgbe ụmụ anyị ndị nwoke tolitere ma hapụ ụlọ, uzuzu kpụgidere pịano ochie ahụ, ya mere anyị ji ree ya. Ka afọ ole na ole gasịrị, anyị enwee ike chekwaa ụfọdụ ego. Otu ụbọchị Rudy sịrị, “e chere m na oge eruole anyị ịzụ pịano ọhụrụ.”

A jụrụ m, “Gịnị mere anyị ji azụ pịano ọhụụ, ebe na-enweghị onye ọbụla nime anyị na-apị pịano?”

Ọ sịrị “O, mana anyị nwere ike inweta pịano na-apị onwe ya! Site na-iji iPad, i nwere ike hazie pịano ahụ ịpị ukwe karịrị 4,000, tinyere abụ, ukwe ndị nke Otu abụ Tabernacle, ukwe niile nke ndị Praịmarị, na ọtụtụ ndị ọzọ.”

Rudy bụ nnukwu onye oreahịa, ma ekwusịya ya otu ahụ.

Foto, oyiyi
Pịano ọhụụ

Anyị zụtara ọmarịcha pịano ọhụrụ, ka mkpụrụ ụbọchị ole na ole gasịrị, ndị ikom abụọ gbasiri ike bulatara ya n’ụlọ anyị.

E gosịrị m ha ebe ha ebe m chọrọ ya ma pụọ n’ụzọ.

Foto, oyiyi
Ibupụ pịano ahụ

O buru oke ibu, ibuba ya site n’ọnụ ụzọ, ha hịọpụsịrị ụkwụ ya jisie ike nyuwa ya nkọnkọ n’elu trọk ibu ha ji buleta ya.

Ụlọ anyị dịtụ n’ebe mkpọda ugwu, nke jọgburu onwe ya bụ na akụ mmiri dara n’ụtụtụ ụbọchị ahụ, mee ihe niile a dị mmiri mmiri na apịtị. Ụlọ anyị kpọdatụrụ na mgbada, ma ebe o ji jọọ njọ bụ na akụ mmiri igwe ebuwo ụzọ daa n’ụtụtụ ụbọchị ahụ, mee ihe niile adị mmiri mmiri ma dịkwa apịtị.

Mgbe ndị ikom ahụ bu pịano ahụ na-agbago n’ebe obere mkpọda ahụ, ọ mịpụrụ, m wee nụ ụda dị egwu. Pịano ahụ si na trọk ibu ahụ daa wee kụsie ike n’ala nke mere ka ogige ebe ahịhịa ya a kuziri nke ọma nwee nnukwu nkụbịa.

A siri, “O, e fuola m. Unu dịkwa Mma?”

N’obi juru n’ekele e nweghị ihe mere ndị ikom abụọ ahụ.

Ha kporopụrụ anya, ka ha lerịtara onwe ha anya, ma lee m wee sị, “Biko gbaghara anyị. Anyị ga-ebughachi ya n’ebe ụlọ ahịa ma mee ka onyeisi anyị kpọọ gị.”

Mgbe na-adịghị anya onyeisi ahụ na Rudy nọ na-akpa nkata ị hazi ka a ga-esi ebute pịano ọhụụ. Ruby nwere obi ọma ma nwee obi mgbaghara sịrị onyeisi ahụ na Ọ dịmma ma ọ bụrụ na ha emezie ebe mebiri emebi ma bughachikwa otu pịano ahụ, mana onyeisi ahụ kwusịrị ike na ha ga-ewetara anyị nke ọhụrụ.

Rudy zara, na-asị, ọ gaghị adị oke njọ. Naanị mezie ya ma bughachi ya.”

Onyeisi ahụ sịrị, “Osisi ahụ gbajiri agbaji, ma ebe ọ bụ na osisi ya a gbajiela, ụda ya enweghị ike abụ otu ọzọ. Ị ga-enweta pịano ọhụụ.”

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ọ bụ anyị niile ọ dịghị ka pịano nke a, gbajitụrụ agbaji, gbawaa agbawaa, ma mebie, na-eche na anyị a gaghị abụkwa ihe anyị bụ ọzọ? Ka osila dị, mgbe anyị bịakwutere Jizọs Kraịst site n’inwe okwukwe na Ya, enwe nchegharị, na-eme ma na-edobe ọgbụgba ndụ niile, ntiwa anyị—na-agbanyeghị ihe kpatara ya nwere ike nwee ọgwụgwọ. Usoro nke a, nke na-eweta ike ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta n’ime ndụ anyị, anaghị eweghachite anyị nnọọ n’ihe anyị bụbuuru kama ọ na-eme anyị adị mma karịa ka anyị dịbuuru. A maara m na site na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, e nwere ike imezi anyị niile, mee anyị e zuo oke, ma mejupụta nzube anyị, dịkwa nnọọ ka ọmarịcha-pịano ọhụụ-nwere ezi ụda.

Onyeisi Russell M. Nelson kuziri na: “Mgbe nnwale dị ọjọọ dakwasịrị anyị, ọ bụ oge imikpu okwukwe anyị n’ime Chineke, ịrụsi ọrụ ike, na ijere ndị ọzọ ozi. Ọ ga-agwọ obi anyị tiwara etiwa. Ọ ga-enye anyị udo na nkasi obi nke onwe anyị. Ngọzi ndị ahụ dị ukwuu agaghị ala n’iyi, ọbụlaghị site n’ọnwụ.”1

Jizọs kwuru:

“Bịakwutenụ m unu niile ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ ndi e boro ibu dị arọ Mụ onwe-m ga-emekwa ka unu nweta ume.

“Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m; n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi: mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.

“N’ihi na yok m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matthew 11:28–30).

Foto, oyiyi
Onyenwe anyị, Jizọs Kraịst

Ị gwọ mgbawa site n’ịbịakwute Ya, anyị kwesịrị inwe okwukwe na Jizọs Kraist. “Inwe okwukwe na Jizọs Kraist pụtara ịdabere na Ya kpamkpam—tụkwasị obi n’ike Ya na-enweghị nsọtụ … na ịhụnaanya. Ọ gụnyekwara ikwenye na nkuzi Ya niile. Ọpụtara n’ikwere na ọbụladị na anyị aghọtachaghị ihe niile, Ọ ghọtara. N’ihi na O nwetaworịị ihe mgbu anyị niile, mkpagbu nakwa nrịanrịa anyị, Ọ maara ka esi enyere anyị aka merie ihe ndị na-ara anyị ahụ kwa ụbọchị.”2

Mgbe anyị na-abịakwute Ya, “anyị nwere ike jupụta n’ọńụ, udo, na nkasi obi. Ihe niile [siri ike ma na-eche aka mgba] gbasara ndụ ka enwere ike imezi site na Aja mgbaghara mmehie nke JIzọs Kraist.”3 Onyewo anyị ndụmọdụ sị, “Lekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla; enwela obi abụọ, atụla egwu ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:36).

N’Akwụkwọ nke Mọmọn mgbe ọ fọdụrụ ihe ntakịrị ka ahụhụ e bukwasịrị Alma na ndị ya nyịgbuo ha, ndị ahụ rịọrọ maka enyem aka. Onyenwe anyị e wepụghị ibu arụ ha; kama O kwere ha nkwa:

Ma a gakwa m eme ka ibu-arọ unu niile dị mfe nke a tụkwasịworo n’elu ubu aka unu, na ọbụna unu agaghị enwe mmetụta mgbu ha n’elu azụ unu nile, ọbụna mgbe unu nọ n’ịbụ-oru; ma nke a ka m ga-eme ka unu wee guzoro dịka ndị aka-ebe nye m ma emesịa, ma na unu ga-amata n’ezie na m, Onye-nwe Chineke, na-eleta ndị m na mkpagbu ha nile.

“Ma ugbua o wee ruo na ibu-arọ nile nke atụkwasịrị Alma na ụmụnne ya nwoke ka e mere ka ha dị mfe; ee, Onyenwe anyị mere ka ha gbasie ike ka ha wee bulie ibu-arọ ha nile n’inwere onwe, ma ha nyefere onwe ha n’ọn̄ụ ma were ndidi ruo n’ọchịchọ nile nke Onyenwe anyị” (Mosaia 24:14–15).

Banyere ike nke ọgwụgwọ na ime ka ibu arụ dị mfe nke Onye Nzọpụta, Okenye Tad R. Callister kuziri sị:

Otu n’ime ngọzi nke Aja mgbaghara mmehie bụ na anyị nwere ike ị nata ike nkasi obi nke Onye Nzọpụta. Aịzaya kwuru banyere ọgwụgwọ nke Onyenwe anyị, n’ike ịbịajụ mmụọ ugboro ugboro. Ọ gbara ama na Onye Nzọpụta a ghọworo onye ọ na-enweghị ka ọ ha ya ebe e wusiri ike, ghọkwara ogbenye ebe e wusiri ike iji pụọ n’ahụhụ ya, ebe mgbaba iji zere oke3 mmiri ozuzo, ndo iji zere ekpom ọkụ’ (Aịzaya 25:4). Maka ndị n’eru uju, Aịzaya mara ọkwa na Onye Nzọpụta nwere ike i ’kasi ndị na eru uju obi’ (Aịzaya 61:2), ma ’hichapụkwa anya mmiri n’ihu niile’ (Aịzaya 25:8; leekwa Mkpughe 7:17); ‘tụtee mkpụrụ obi nke ndị ọ na-enweghị ka ọ ha ha’ (Aịzaya 57:15); na ’ikechi ọnya nke ndị e tiwara obi’ (Aịzaya 61:1; leekwa Luk 4:18; Abụ ọma 147:3). Ike nke enyem aka ya dị oke ukwuu nke na ọ ga-eji ịma mma dochie ntụ, mmanụ ańụrị ha ka eji dochie iru uju, akwa mkpokwasị nke na-eweta otuto ha ga-eji dochie mmụọ dara mba’ (Aịzaya 61:3).

“O, onye hụrụ ụdịrị olileanya jupụtara na nkwa ndị ahụ! … Mmụọ Ya na-agwọ ọrịa; ọ na-asacha; ọ na-enye nkasi obi; ọ na-enye obi ndị dara mba ndụ ọhụụ. O nwere ike ịgbanwe ihe nille jọrọ njọ na mpụ inwe mmeri na ihe na-abaghị uru na ndụ a ghọọ ihe na-enye ańụlị na otuto kachasị elu. O nwere ike ịgbanwe ntụ nke ndụ anụ ahụ ya a ghọọ ihe niile dị mma nke ebighị ebi.”4

A na m agba aka ebe na Jizọs Kraist bụ Onye Nzọpụta anyị dị ịhụnaanya, Onye mgbapụta anyị, Ọkacha Agwọ ọrịa na enyi kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụrụ na anyị abịakwute Ya, Ọ ga-agwọ anyị ma mee anyị ezuo oke ọzọ. A na m agba aka ebe na nke a bụ Nzukọ nsọ Ya ma Ọ na-akwado ịlọghachi n’ụwa nke a ọzọ ịchị n’ike na ebube. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Russell M. Nelson, “Jizọs Kraịst—Ọkacha Agwọ ọrịa,” Liahona, Nov. 2005, 87.

  2. Okwukwe n’ime Jizọs Kraist,” Gospel Topics, topics.ChurchofJesusChrist.org.

  3. Kwusaanụ Oziọma M: Ntụzi aka nyere Ozi Mgbasa Ozi ọma rev. ed. (2018), 52, ChurchofJesusChrist.org.

  4. Tad R. Callister, Aja Mgbaghara Mmehie Na-enweghị Ọgwụgwụ (2000), 206–7.