Ọgbakọ Zuru ọha
E kwere m na Ndị Mmụọ ozi
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


E kwere m na Ndị Mmụọ ozi

Onyenwe anyị maara ihe aka mgba niile ị na-ezute. Ọ maara unu, Ọ hụrụ unu n’anya, ma ana m ekwe nkwa, Ọ ga ezita ndị mmụọ ozi inyere unu aka.

Ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, e kwere m na ndị mmụọ ozi, ma ọ ga amasị m ị kọrọ unu nhụmihe m nwere ebe ha nọ. Na ime nke ahụ, enwere m olileanya ma kpee ekpere na anyị ga-amata mkpa ndị mmụọ ozi dị n’ime ndụ anyị.

Ndị a bụ okwu nke Okenye Jeffrey R. Holland site na ọgbakọ zuruọha gara aga: “Mgbe anyị na ekwu okwu banyere ndị ahụ bụ ngwa ọrụ n’aka Chineke, a na echetara anyị na ọbụghị ndị mmụọ ozi niile si n’ala mmụọ bia. Anyị na ụfọdụ ha na agarịta ije ma na ekwurịta okwu—ebe a, ugbua, ụbọchị niile. Ụfọdụ ha bi na-agbata obi anyị. … N’ezia elu-igwe adịghị nso karịa mgbe anyị hụrụ ịhụnanya nke Chineke egosipụtara na afọ-ọma na ịhụnanya nke ndị mmadụ dị mma na enweghị ntụpọ na mmụọ ozi nanị bụ mkpụrụ-okwu na-agbata mmadụ n’obi” (“ Nlekọta nke Ndị mmụọ ozi,” Liahona, Nov. 2008, 30).

Ọ bụ ihe gbasara ndị mmụọ ozi nọ n’ụwa nke a ka m chọrọ ikwu maka ha. Ndị mụọ-ozi anyị na ha na agarịkọta ije n’ime ndụ anyị ụbọchị niile bụ oke ihe na echetara anyị ịhụnanya nke Chineke nwere maka anyị.

Ndị mmụọ ozi mbụ m ga akpọ aha bụ ndị mgbasa ozi ọma ndị nwanyị abụọ kuziiri m ozi ọma mgbe m bụ nwata nwoke: Nwanne nwanyị Vilma Molina na Nwanne nwanyị Ivonete Rivitti. Nwanne m nwanyị nta na mụ gara ihe omume nke Nzukọ-nsọ ebe anyị zutere ndị mmụọ ozi abụọ ndị a. Onweghị mgbe m tụrụ anya na obere ihe omume ahụ ga agbanwe ndụ m.

Nne na nna m na ụmụnne m enweghị mmasị ịmụta karịa ihe gbasara Nzukọ-nsọ oge ahụ. Ha enweghị dị mmasị ịnabata ndị mgbasa ozi ọma n’ime ebe obibi anyị, ya mere m ịnọ nime ụlọ Nzukọ-nsọ nata ihe mmụta niile. Obere ọnụ ụlọ ahụ nọ n’ime ụlọ-ụka ghọrọ “oke ọhịa dị nsọ” nke m.

Foto, oyiyi
Nwa Okenye Godoy na nwanne ya nwanyị

Ka otu ọnwa gachara mgbe ndị mmụọ ozi ndị a kuzichara m ozi ọma ahụ, e mere m baptism. A gbara m afọ16. Ebe oji jọọ njọ, e nweghị m foto nke emume nsọ ahụ, kama e nwere m foto nke mụ na nwanne m nwanyị sere na oge anyị soro n’ime ihe omume ahụ. E nwere m ike ịkọwa onye bụ onye n’ime foto nke a. A bụ m onye nke ka ogologo nọ n’aka nri.

Dịka inwere ike chee, ịnọgidesị ike n’ime Nzukọ-nsọ bụụrụ ihe aka mgba nye nwata nwoke ndụ ya ka gbanwere ma ndị ezi na ụlọ ya esoghị ụzọ ya.

Dịka m na agbali ịnọkwata na ndụ ọhụrụ m, omenala ọhụrụ, na ndị enyi ọhụrụ, E nweteghị m onwe m. Obi m dara mba ma dị ka onye ajụrụ-ajụ ọtụtụ oge. A mara m na Nzukọ-nsọ ahụ bụ ezi-okwu, kama a hụsiri m anya inwe mmetụta ị bụ onye otu ya. Ka ọ naraara m ahụ dịka M na agbali ịnọkwata n’ime okpukpe chi ọhụrụ m, e nwere m obisike isonye na nzukọ abali atọ nke ndị ntorobia, nke m chere ga enyere m aka nwete ndị enyi ọhụrụ. Nke a bụ mgbe M hụrụ mụọ-ozi nzọpụta ọzọ akpọrọ Mônica Brandão.

Foto, oyiyi
Nwanne nwanyị Godoy

Ọ bịara ọhụrụ na mpaghara ahụ, si na akụkụ nke Brazil ọzọ bia. O kpọlatara uche m ọsisọ ma, ihe ọma mere m, ọ nabatara m ka enyi ya. E chere m o lere m anya site na ime m karia na ahụ m.

Maka o mere m enyi ya, o gosịrị m ndị enyi ya niile, biakwara bụrụ ndị enyi m dịka anyi nwere ọńụ na ọtụtụ ihe omume ndị ntorobia m gara mgbe e mesịrị. Ihe omume ndị ahụ nyere aka nke ukwuu kpọbata m n’ime ndụ ọhụrụ nke a.

Foto, oyiyi
Ndị enyi nke Okenye Godoy

Ndị ezi enyi ndịa mere nnukwu ihe pụrụ iche, kama ebe na-anaghị akuzi ozi ọma ahụ n’ime ebe obibi m ebe nkwado ezinaụlọ dị mkpa tinyere usoro mgbanwe m na nsogbu. Ozọma M nenye n’ime Nzukọ-nsọ bia bụrụ ihe dị oke mkpa nye mgbanwe m na eto-eto. Mgbe ahụ ezitere ndị mụọ-ozi abụọ ọzọ site naka Onyenwe anyị maka inye aka.

Otu n’ime ha bụ Leda Vettori, onye nkuzi seminary isi ụtụtụ m. Site na nnabata ịhụnanya na nkuzi nkwalite mụọ ya, o nyere m kwa ụbọchị “okwu Chineke dị mma” (Moronaị 6:4), nke m chọrọ ụbọchị niile. Nke a nyeere m aka inweta ume nke ime mmụọ nyere m aka ịdị na-aganiihu.

Mmụọ ozi ọzọ ezitere inyere m aka bụ onyeisi Ndị Ikom nta, Marco Antônio Fusco. A kpọkwara ya ịbụ onye otu nke okenye m na nkuzi n’ebe obibi. Agbanyeghị enweghị nhụmihe m na mpụta n’ụzọ dị iche-iche, o nyere m ọrụ ịkuzi ihe na nzukọ nke ndị kworum ọkwa nchụaja anyị na ime nleta inye nkuzi n’ebe obibi. O nyere m ohere ime ihe ma mụta ihe na-abụghị naanị ịbụ onye ileanya nke ozi ọma ahụ. Ọ tụkwasịrị m obi, karịa ka m tụkwasịrị onwe m.

Ekele dịrị ndị mmụọ ozi ndia, na ọtụtụ ndị ọzọ m zutere na afọ ndị ahụ dị mkpa, m natara mgbam ume zuru oke ịnọgide na okporo ọgbụgba-ndụ dịka m nwetara aka-ebe nke ime mmụọ nke eziokwu ahụ.

Ị maara, nwata nwanyị onye mmụọ ozi ahụ, Mônica? Ka anyị abụọ gachara mgbasa ozi-ọma, ọ ghọrọ nwunye m.

E cheghị m na ọbụ ihe ndapụta na ezi ndị enyi, ọrụ niile nke Nzukọ-nsọ, na ọzụzụ site na okwu ọma nke Chineke bụụrụ akụkụ nke usoro ahụ. Onyeisi Gordon B. Hinckley kuziri na amamihe: “Ọ bụghị ihe dị mfe ime ihe mgbanwe ịbata na Nzukọ nsọ nke a. Ọ pụtara ịhapụ ihe ochie niile. Ọ pụtara ịhapụ ndị enyi. O nwere ike ịpụta ịhapụ nkwenye ndị anabatara. O nwere ike chọọ mgbanwe omume njiri mara na ndigbu nke agụụ ime ihe. N’ọtụtụ oge ọ pụtara owu ọmụma na ụjọ nke ihe amaghị-ama. A ga enwerịrị ọzụzụ na mgbam ume n’oge ihe isi ike na ndụ nke onye agbanwere” (“A ga Enwerịrị Ndị ozi,” Ensign,Oct. 1987).

Ka emesịrị ọ kuzikwara, “Onye ọ bụla n’ime ha nwere mkpa ụzọ ihe atọ: enyi, oke na ọru, na ọzụzụ site na ‘okwu Chineke dị mma’” (“Ndị agbanwere na Ndị Ikom Nta,” Ensign,Mee 1997, 47).

Olee ihe m ji a kọrọ unu nhụmiihe ndị a nile?

Nke mbụ, ọ bụ izi ozi nye ndị na agabiga usoro dị otu a ugbua. Enwere-ike ị bụ onye agbanwere ọhụrụ, ma-ọbụ ịlọghachitere na Nzukọ-nsọ ka ị wagharịchara oge nta, ma-ọbụ nnọọ onye na agbalị ịnọkwata. Biko, biko, agharịpụla na mgbalị gị niile ịbụ akụkụ nke ezinaụlọ ukwu nke a. Ọ bu ezi Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst!

Abia na ọńụ na nzọpụta gị, ọ bụ ihe kwesịrị omume ị na- abga mbọ. O kwesịrị omume ịgba mbọ ịgbanwe akparama agwa gị na omenala gị niile. Onyenwe anyị maara ihe aka mgba niile ị na-ezute. Ọ maara unu, Ọ hụrụ unu n’anya, ma ana m ekwe nkwa, Ọ ga ezita ndị mmụọ ozi inyere unu aka.

Na okwu nke Ya Onye Nzọpụta sịrị: “A ga m ebutere unu ụzọ. Aga m anọ n’aka nri gị ma n’aka ekpe gị, … Mụọ nke m ga-anọ [n’obi] unu niile, ma ndị mụọ-ozi m ga-anọ gburu-gburu unu ikwalite unu” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 84:88).

Nzube m nke abụọ maka ịkọwa nhumihe niile ndị a bụ izi ozi nye ndị otu Nzukọ nsọ niile—nye anyị niile. Anyị kwesịrị icheta na ọdịghị mfe maka ndị agbanwere ọhụrụ, ndị enyi lọghachitara, na ndị ahụ nwere obibi ndụ pụrụ iche ịdabanye ozugbo. Onyenwe anyị maara ihe aka mgba niile n’abiakwute ha, ma Ọ na atụanya ndị mmụọ ozi ga-adị njikere inye aka. Onyenwe anyị na-atụanya mgbe ọbụla maka ndị wepụtara onwe ha ịbụ ndị mmụọ ozi na ndụ ndị ọzọ.

Ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, unu ga-adị na njikere ịbụ ngwa ọrụ n’aka Onyenwe anyị? Unu dị na njikere ịbụ otu onye n’ime ndị mmụọ ozi ndị a? Ị bụ onye ozi, ezitere site n’aka Chineke, si n’ụwa nke a, maka onye Ọ na echekasị maka ya? Ọ chọrọ gị. Ha chọrọ gị.

Nezia, anyị nwere ike mgbe ọbụla tụkwasị ndị mgbasa ozi ọma anyị obi. Ha nọ ya mgbe ọbụla, ndị mbụ wepụtara onwe ha maka ọrụ mmụọ ozi nke a. Kama ọnụ ọgụgụ ha ezubeghị.

Ọbụrụ na ilegharịa anya nke ọma, ị ga ahụ ọtụtụ nwere mkpa enyem aka onye mmụọ ozi. Ndị a nwere ike ha anaghị eyi uwe ọcha, ma ọbụ uwe ndị ọbụla etosịrị iyi ịbọchị Sọnde. Ha nwere ike ị nọrọ onwe ha, n’ebe azụ chapel ma-ọbụ n’ime klas, mgbe ụfọdụ ya ana eme dịka ndị anaghị ahụ anya. Enwere ike ụdịrị isi ha bu gbara oke iche ma-ọbụ asụsụ ha pụrụ iche, kama ha nọ ebe ahụ, na-agbalị.

Ụfọdụ nwere ike na eche, “E kwesịrị m ịdị na-alọghachi? Ekwesịrị m ị na agbalị? Ndị ọzọ nwere ike na eche ma otu ụbọchị ọ ga-emetụ ha na-anabatawo ha ma hụkwa ha naanya. Achọrọ ndị mmụọ ozi, ugbua; ndị mmụọ ozi dị na njikere ịhapụ ebe ọma ha nọ nyere ha aka; “[ndị dị] oke mma ma dị oke ọcha na mmụọ ozi bụ nanị mkpụrụ okwu na-abia n’uche [ịkọwa ha]” (Jeffrey R. Holland, “Ije ozi nke Ndị Mmụọ ozi,” 30).

Ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, e kwere m na ndị mmụọ ozi! Anyị niile nọ ebe a taa, oke ndị agha nke ndị mmụọ ozi edokwara maka ụbọchị ikpeazụ ndị a, ịjere ndị ọzọ ozi dịka mgbatịpụ aka nke Onye okike hụrụ anyị nanya. A na m ekwe nkwa na ọ bụrụ na anyị dị na njikere ije ozi, Onyenwe anyị ga enye anyị ohere ịbụ ndị mmụọ ozi na eje-ozi. Ọ mara onye chọrọ enyem aka onye mmụọ ozi, ma Ọ ga edobe ha n’okporo ụzọ anyị. Onye-nwe-anyị na edobe ndị chọrọ enyem aka mmụọ-ozi n’okporo ụzọ anyị kwa ụbọchị.

E nwere m obi ekele maka ọtụtụ ndị mmụọ ozi nke Onye-nwe-anyị dobere na ụzọ m n’oge ndụ m niile. Ha bara m uru. E nwekwara m obi ekele maka ozi ọma Ya na enyere anyị aka ịgbanwe ma nye anyị ohere ịdị mma karịa.

Nke a bụ ozi ọma nke ịhụnanya, ozi ọma nke ije ozi. Nke a ka m na-agba ama ya n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.