Ọgbakọ Zuru ọha
Nọrọ N’ezigbo Ọn̄ụ
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Nọrọ N’ezigbo Ọn̄ụ

Okwukwe anyị n’enweghị ọdịda n’ime ozizi nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere na-edu nzọm ụkwụ anyị ma n’enye anyị ọńụ.

Na ụbọchị ikpeazụ nke ndụ Ya, Jizọs Kraịst gwara Ndị Ozi Ya maka mmegide na ihe isi ike ha ga-ata ahụhụ na ya.1 O ji nnukwu mmasị obi ike a mechie okwu Ya: “Na ụwa unu ga enwe mkpagbu: ma na nọrọ n’ezigbo ọn̄ụ; E meriela m ụwa” (Jọn 16:33). Nke ahụ bụ ozi nke Onye Nzọpụta nye ụmụ niile nke Nna anyị nke Eluigwe. Nke ahụ bụ ozi dị mma kacha ibe ya nye onye ọbụla n’ime anyị na ndụ anụ ahụ anyị.

“Nọrọ n’ezigbo ọn̄ụ” bụkwaara mmasị obi ike achọrọ n’ime ụwa nke Kraịst biliteworo site n’ọnwụ zipụrụ Ndị Ozi Ya. “Anyị nwere nsogbu n’akụkụ niile,” Onye ozi Pọl mesịrị gwa ndị Kọrịnt, “n’agbanyeghị anyị anaghị enye nsogbu; anyị nwere mgbagwojuanya, mana ọ bụghị n’enweghị okwukwe; emegidere anyị, mana egwu adịghị atụ anyị; achọpụrụ anyị, mana ebibighị anyị”(2 Ndị Kọrịnt 4:8–9

Foto, oyiyi
Jizọs n’ejere mmadụ ozi otu na otu

Ka puku afọ abụọ gasịworo, anyị nakwa “enwe nsogbu n’akụkụ niile,” ma anyị chọkwara otu ụdị ozi ahụ n’abụghị iji daa mba kama iji nwe ihu ọchị. Onyenwe anyị nwere ịhụnanya na mmetụta pụrụ iche maka ụmụada Ya dị oke mkpa. Ọ maara maka ọchịchọ unu niile, mkpa unu niile, na ụjọ unu niile. Onyenwe anyị bụ onye kachasị ike niile. Tụkwasị Ya obi.

Akuziiri Onye Amụma Joseph Smith na “ọrụ niile, atụmatụ niile, na ebum-n’obi niile nke Chineke agaghị enwe ihe ga-akwụsị ya, ma-ọbụ ihe ga-enwe ike ime ka ọ bụrụ ihe efu” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 3:1). Maka ụmụ Ya ndị na-adọlị, Onyenwe anyị nyere mmasị obi ike ndịa:

“Lee, nke a bụ nkwa nke Onyenwe anyị nye unu, O unu ndị odibo m.

“Ya mere, nọrọ nụ n’ezigbo ọn̄ụ, ma atụla ụjọ, n’ihi na mụ Onye-nwe nọnyere unu, ma ga-eguzogide unu; ma unu ga-agba ama maka m, ọbụna Jisus Kraịst, na a bụ m Ọkpara nke Chineke dị ndu” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 68:5–6).

Onyenwe anyị n’eguzo n’akụkụ anyị, ma O kwuwo si:

“Ihe m kwuru nye otu onye ekwuru m nye mmadụ nile, nọrọ n’ezigbo ọn̄ụ, ụmụ-ntakịrị; n’ihi na a nọ m n’etiti unu, ma a hapụghị m kwa unu” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 61:36).

“N’ihi mgbe mkpagbu gasịrị ngọzi na-abịa” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 58:4).

Ụmụnne nwanyị, A na m agba ama na nkwa ndịa niile, enyere n’etiti mmegide na ihe ndabata dị egwu nke onwe, tụnyeere onye ọbụla n’ime unu n’ọnọdụ nsogbu unu niile taa. Ha dị oke mkpa ma n’echetere onye ọbụla n’ime anyị ị nọrọ n’ezigbọ ọn̄ụ na inwe ọn̄ụ na ozuzu nke oziọma dịka anyị n’aganihu site na aka mgba niile nke ndụ anụ ahụ.

Mkpagbu na aka mgba niile bụ nhumihe ndị dị iré nke ndụ anụ ahụ. Mmegide bụ akụkụ dị mkpa nke atụmatụ dị nsọ maka ịnyere anyị aka tolite,2 ma n’etiti usoro nke ahụ, anyị nwere mmasi obi ike nke Chineke na, n’ezi nghọta nke ebighị ebi agaghị ekwe ka mmegide merie anyị. Site na enyem aka Ya na okwukwe na nnọgide anyị, anyị ga enwe mmerị. Dịka ndụ anụ ahụ nke ha bụ otu akụkụ, mkpagbu niile anaghị adịgide. N’esemokwu ndị mere tupu alụọ agha ọjọọ ahụ, Onyeisi United States Abraham Lincoln jiri amamịhe cheteere ndị ọ na-agwa okwu maka akọnuche gboo dị nime okwu a “nkea, kwa, ga agafe.”3

Dịka unu maara, mkpagbu niile nke ndụ nke m n’ekwu maka ya—nke n’eme ya e sie ike ị nọrọ n’ezigbo ọn̄ụ—mgbe ụfọdụ na-abịara anyị na nkiti ya na ọtụtụ ndị ọzọ, dịka nde kwuru nde mmadụ ugbua na-adọlị site n’ụfọdụ ọtụtụ nsonazụ mbibi nke ọrịa zuru ụwa COVID-19. N’otu aka ahụ, n’ime United States nde kwuru nde mmadụ na-ata ahụhụ site na oge nke iro na esem okwu nke n’esokarị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke onyeisi mana n’oge nkea kacha raa ahụ nke ọtụtụ n’ime ndị okenye n’etiti anyị nwere ike icheta.

Na nghọta nke onwe m, onye ọbụla n’ime anyị na-agba lika lika n’onwe anyị banyere ụfọdụ mkpagbu nke ndụ, dịka ịda ogbenye, ịtụ agbụrụ, nrịa nrịa, ọrụ ifulahụ ma ọbụ ngharịpụ nile, ụmụ na-agba n’ezi, ọlụlụ ọjọọ ma ọbụ alụghị alụ, na nsonazụ nke njọ—nke anyị ma ọbụ nke ndị ọzọ’.

Emesịa, n’etiti ndịa niile, anyị nwere ndụmọdụ si n’igwe ị nọrọ n’ezigbo ọn̄ụ ma chọta ọn̄ụ n’ime ụkpụrụ na nkwa niile nke oziọma na mkpụrụ niile nke aka ọrụ anyị.4 Ndụmọdụ ahụ anọworịị otu ahụ, nye ndị amụma na anyị niile. Anyị maara nkea site na nhumihe ndị butere anyị ụzọ na ihe Onyenwe anyị gwara ha.

Foto, oyiyi
Nwanne nwoke Joseph

Cheta ọnọdụ niile nke Onye-amụma Joseph Smith. Ile site n’anya nke mkpagbu, ndụ ya bụụrụ nke ịda ogbenye, mmegbu, nkụda mmụọ, iru uju ezinụlọ, na ogbugbu n’ihi oke okwukwe. Dịka ọ tara ahụhụ ịnọ na nkpọrọ, nwunye ya na ụmụ ya na Ndị nsọ ọzọ tara ahụhụ ihe isi ike dị egwu dịka achụpụrụ ha pụọ na Missouri.

Mgbe Joseph rịọrọ maka enyem aka, Onyenwe anyị zara:

“Nwa m, udo dịrị mkpụrụ obi gị, ihe isi-ike gị na nsogbu nile gị ga-abụ maka nwa oge nta;

“Ma mgbe ahụ, ọ bụrụ na ị nagide ya nke ọma, Chineke ga-ebuli gị n’elu, i ga-emeri ndị iro gị nile” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 121:7-8).

Nkea bụ ndụmọdụ ebighị ebi nke onwe nke nyeere Onye Amụma Joseph aka ịnọgide n’omume ihu ọchị eji mara ya na ịhụnanya na ntụkwasị obi ike nke ndị ya. Ụdị njirimara ndịa gbara ndị ndu niile na ndị isi mbụ ume ndị sonyere ma nwere ike ịgba kwa unu ume.

Foto, oyiyi
Ndị mgbasa ozi ọma Isimbụ n’aga ije n’ụzọ nnukwu snow

Chee maka ndị otú isi mbụ! Ugboro ugboro, achụpụrụ ha site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ. N’ikpeazụ ha zutere aka mgba nke iwulite ebe obibi ha na Nzukọ nsọ n’ime ọzara.5 Afọ abụọ gasịrị kemgbe ndị isi mbụ butere ụzọ rute na ndagwurugwu nke Nnukwu Salt Lake, njigide nlanarị nke ndị isi mbụ n’ebe ahụ jọrọ njọ edoghị anya. Ọtụtụ ndị otú ka nọ n’ụzọ gafere n’oke ọzara ahụ ma ọbụ na-adọlị inwete akụrụngwa ime otu ahụ. N’agbanyeghị nkea ndị ndu na ndị otú naara enwe olile anya na ezigbo ọn̄ụ.

N’agbanyeghị ọbụna na ụkwụ esibeghị Ndị Nsọ ike n’ebe obibi ọhụrụ ha, na ọgbakọ Zuru-ọha Ọktoba 1849 ezipụrụ otú ndị mgbasa ozi ọhụrụ gaa na Scandinavia, France, Germany, Italy, na South Pacific.6 Site n’ọnọdụ echere na-ọgaara abụ ọnọdụ ha kacha nta, ka ndị isi mbụ si tolite ruo n’ogo dị elu nke ọhụrụ. Ma nanị mgbe afọ atọ gasịrị, mmadụ 98 ndị ọzọ ka akpọkwara ibido ịkpọkọta Izrel gbasasịrị agbasa. Otu n’ime ndị ndu nke Nzukọ nsọ kọwara na mgbasa ozi ndịa “n’ihe niile, agaghị abụ nke ga eto ogologo; ihe dị ka afọ 3 ruo 7 ga abụ oge nke nwoke ọbụla agaghị anọnyere ezi na ụlọ ya.”7

Ụmụnne nwanyị, Otú Ndị isi Mbụ nwere nchegbu banyere aka mgba unu niile. Anyị hụrụ unu n’anya ma n’ekpere unu ekpere. N’otu oge ahụ, anyị n’enye ekele mgbe na mgbe na aka mgba nke anụ ahụ anyị—ewezuga ala ọma jijiji, ọkụ ọgbụgba, ide mmiri, na ajọ ifufe—na-abụkarị ntakịrị ihe ịtụnyere ihe ndị butere anyị ụzọ zutere.

N’etiti ihe isi ike ndịa, mmasị obi ike si n’igwe na abụkarị nkea “nọrọ n’ezigbo ọńụ, n’ihi na m ga-edu gị n’ụzọ ahụ. Ala-eze ahụ bụ nke unu ma ngozi nile dị na ya bụ nke unu, ma akụ na ụba nile nke mgbe ebighi-ebi bụ nke unu” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 78:18). Kedu otu nkea si eme? Kedu otu o siri meere ndị isi mbụ? Kedu otu ọ ga-esi emere ndị inyom nke Chineke taa? Site anyị isoro odudu eburu amụma, “ọnụ ụzọ nke ala mmụọ agaghị emegide [anyị],” Onyenwe anyị kwuru site na mkpughe na Eprel 1830. “E,” O kwuru si, “… Onye-nwe Chineke ga-agbasasị ike nke ọchịhịrị site n’iru unu, ma mee ka elu-igwe nile ma jijiji, n’ihi ọdịmma unu, na ebube nke aha ya” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 21:6 “Atula egwu, igwe-anụ nta; mee ihe-ọma; ka ụwa na ala-mụọ gwakọta megide gị, n’ihi na ọbụrụ na e wuru unu n’elu oke nkume m, ha agaghị emeri unu” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:34).

Site na nkwa nke Onyenwe anyị, anyị “n’ebuli obi [anyị] [niile] ma na ańụrị ọńụ” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 25:13), ma site n’obi jupụtara n’ekele na ezi ihu jupụtara na ọńụ” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 59:15), anyị na-aganihu n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ. Ọtụtụ n’ime anyị anaghị eme mkpebi nke dị ukwuu, dịka ịhapụ ebe obibi anyị soro mepee ala amaghị maka ya. Mkpebi anyị dum na-abụkarị gbasara usoro ime ihe kwa ụbọchị nke ndụ, mana dịka Onyenwe anyị gwaworo anyị, “A dakwala mba na ime ihe dị mma, n’ihi na unu na etinye ntọala nke nnukwu ọrụ. Ma site n’ihe nta nile ka oke ihe si apụta” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 64:33).

E nwere ike n’enweghị ọgwụgwụ n’ime ozizi nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere. Okwukwe anyị n’enweghị ọdịda n’ime ozizi ahụ na-edu nzọm ụkwụ anyị ma n’enye anyị ọńụ. Ọ n’eme ka uche anyị mara ma n’enye ume na obisike nye omume anyị. Odudu na mmata ihe na ike nkea bụ onyinye ndị ekwere nkwa anyị nataworo site n’aka Nna nke Eluigwe. Site na nghọta na ikwe ndụ anyị dakọrịta ya na ozizi ahụ, tinyekọta onyinye dị nsọ nke nchegharị, anyị nwere ike nọrọ n’ezigbo ọńụ dịka anyị n’edebe onwe anyị n’ụzọ chere ihu n’akara aka ebighị ebi anyị—nzukọta na mbuli elu anyị na nne na nna anyị nke eluigwe.

I nwere ike n’ezute aka mgba ndị karịrị akarị,” Okenye Richard G. Scott kuziri. “Mgbe ụfọdụ ha jupụtara nke ukwuu, ha anaghị ekwe ekwe, nke ga-eme unu echee na unu agaghị enwe ike ebuli ya. Ekwela ka nanị luso ụwa nkea ọgụ. ‘Tụkwasị obi nOnyenwe anyị jiri obi gị niile; ma adaberekwala na nghọta nke onwe’ [Ilu 3:5]. … E mere ya ka ndụ nwee ihe ịma aka, ọbụghị ka ị daa, kama na ị ga-eme nke ọma site n’inwe mmerị.”8

Ha niile bụ akụkụ nke atụmatụ nke Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, nke m na-agba ama ya, dịka m n’ekpe ekpere na anyị niile ga-anọgidesiike n’ebe anyị na-aga n’eluigwe, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Lee Jọn 13:16.

  2. Lee 2 Nifaị 2:11.

  3. Abraham Lincoln, address to the Wisconsin State Agricultural Society, Milwaukee, Sept. 30, 1859, in John Bartlett, Bartlett’s Familiar Quotations, 18th ed. (2012), 444.

  4. Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 6:31.

  5. Lee Lawrence E. Corbridge, “Surviving and Thriving like the Pioneers,” Ensign, July 2020, 23–24.

  6. Lee “Minutes of the General Conference of 6 October 1849,” General Church Minutes Collection, Church History Library, Salt Lake City.

  7. George A. Smith, n’ime Jonalụ Agụgụala Nzụkọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, Aug. 28, 1852, 1, Church History Library, Salt Lake City.

  8. Richard G. Scott, Ịchọta Udo, Ańụrị, na Ọńụ (2007), 248–49.