Ọgbakọ Zuru ọha
Ịnwe ọńụ nime Kraịst
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Ịnwe ọńụ nime Kraịst

Ụzọ kachasị mma ịchọta ọńụ nime ndụ nke a bụ isoro Kraịst na inyere ndị ọzọ aka.

Onyenwe anyị anaghị agwa ndị ntorobịa nke Ọkwa nchụaja Erọn anyị ka ha mee ihe nile, kama ihe Ọ chọrọ bụ inwe mbulite mụọ.

Afọ ole na ole gara aga, ezinaụlọ anyị dị nta hụrụ ihe ọtụtụ ezinaụlọ na ahụ nime ajọọ ụwa nke a. Nwa anyị nwoke kachasị nta, Tanner Christian Lund, nwere cancer. Ọ bụrụ nwanta obi ya mara oke mma, dịka ndị gbara afọ itolu na adịkarị. Ọ bụrụụ onye na emekarị ihe ọchị ma, na otu aka ahụ, nwee mụọ Chineke dị egwu. Ekwensu na mụọ ozi, onye ọjọ na onye ọma. Mgbe ọ dị nta ma ụbọchị were nsogbu ya na-eme ihe na-atụ anyị n’anya, anyị chere na ọ ga etolite ịbụ onye amụma ma ọbụ onye ohi ọba ego. Na ụzọ ọbụla, ọ yiri onye ga eme ihe ukwu na elu ụwa.

Ma ọ bịara daa ezigbo ọrịa. Na afọ atọ sotara, ọgwụ ọlọrọ ọhụrụ gbalịrị ịzọ ndụ ya, tinyekwara itinyegharị ụmị ọkpụkpụ ugboro abụọ, ebe o nwetara ọrịa oke oyii, mere ka ọ nọọ na ventilatọ izu ụka 10 na amaghị onwe ya. Na ụzọ dị ebube, o nweghachitere onwe ya obere oge; mgbe ahụ cancer ya lọhachitere.

Obere oge tupu ya nwụọ, ọrịa nke Tanner eriela ọkpụkpụ ya nile, ma na-agbanyeghị ọgwụ mgbochi mgbu siri ike, ọ nọra na-ahụ ụfụ. O nweghị ike ịpụta na akwa. Otu ụtụtụ Sọnde, nne ya, Kalleen, batara nime ụlọ ya ile ya tutu ezi-na-ụlọ ahụ agawa Nzukọ-nsọ. O juru ya anya ịhụ na o bilitewo kwado onwe ya ma nọrọ na elu akwa ya, were ahụ mgbu akpọchi ọdụmbi uwe ya. Kalleen nọrọ ọdụ na akụkụ ya. “Tanner,” ọ sịrị,” i chere na ahụ esiela gị ike ịga nzukọ-nsọ? Inwere ike nọrọ na ụlọ ma zuo ike taa.”

O lere anya na ala. Ọ bụụra onye dikọn. O nwererịị kworum. Ma o nwere ọrụ e nyere ya.

“E kwesiri m inye oriri-nsọ taa.”

“Ọ dị mma, O doro m anya na onye ọzọ nwere ike mere gị ihe ahụ.”

“Ee,” ka o kwuru, “kama … a na m ahụ ka ndị mmadụ si ele m anya mgbe m na enye oriri-nsọ. E chere m na ọ na enyere ha aka.”

Ya mere Kalleen nyere ya aka kpọchie ọdụmbi efe ya na ịdọ taị ya, ma ha kwọọrọ ụgbọ ala ga nzukọ-nsọ. Nke ahụrụ anya, Ihe dị mkpa nọọrọ na eme.

A batara m nzukọ-nsọ site na nzukọ ọzọ mere o ji ju m anya ịhụ Tanner nọrọọ ọdụ na oche ndị dikọn’. Kalleen jiri nwayọ gwa m ihe mere o ji nọrọ ebe ahụ na ihe o kwuru: “Ọ na enyere ndị mmadụ aka.”

Ya mere e lere m anya dịka ndị dikọn bilitere ga na tebụụl ọrịrị nsọ. Ọ dabeere na-ahụ onye dikọn ọzọ dịka ndị nchụaja nyefere ha efere achicha. Ma mgbe ahụTanner jisirike ga na ọnọdụ ya ma jide aka na isi oche inweta onwe ya dịka o nyere onye nọ na ihu ya oriri-nsọ.

Ọ dịịrị ka onye ọbụla nime ụlọ nzukọ ahụ na-ele ya anya, n’anya mmiri na-ahụ ahụhụ ya dịka ọ na eje ozi ya. Ka ọdị Tanner kuziri ihe dịka o ji nwayọ, na aga site na ahịrị ruo na ahịrị—ọsụsụ ju ya n’isi nkwọcha—ịnọchite anya Onye nzọpụta na ụzọ ndị dikọn si eme. Onye dikọn a ahụ bụburịị ekwe ekwe ma ugbua bụzi onye esighị ike, nwere ọnya, nwee ndọka, dị na njikere ata ahụhụ n’ije ozi site na ibuba akara Aja mgbaghara mmehie nke Onye nzọpụta nime ndụ anyị.

Ị hụrụ ka o si chee ihe gbasara ịbụ onye dikọn mere ka anyị cheekwa echiche pụrụ iche—gbasara oriri-nsọ, gbasara Onye nzọpụta, na gbasara ndị dikọn, na ndị nkuzi, na ndị nchụaja.

Ọ na eju m anya na ọrụ ebube ọnụ apụghị ịkọ manyere ya ka ọ zaa oku n’obi ike dị jụụ na-adịgide, ọkpụkpọ ije ozi, na gbasara ume na ike nke ndị ntorobịa anyị nọ ugbu a dịka ha na agbalị ịza oku nke onye amụma isonye igwe ndị agha nke Chineke ma soro na ọrụ nke nzọpụta na mbuli-elu.

Mgbe ọbụla onye dikọn buliri efere oriri-nsọ, ọ na echetara anyị maka akụkọ dị nsọ nke Nri anyasị Ikpeazụ, banyere Getsemena, banyere Calvarị, na banyere ili ubi. Mgbe Onye nzọpụta gwara Ndị-ozi Ya, “Meenụ nke a na ncheta nke m,“1 Ọ na kwa ekwuru onye ọbụla nime anyị oge niile. Ọ nara ekwu maka ọrụ ebube nke Ọ ga-eweta dịka ndị dikọn, ndị nkuzi, na ndị nchụ-aja ọdịnihu ga enye ákárá Ya nile ma kpọkuo ụmụ Ya ka ha nata onyinye Aja mgbaghara mmehie Ya.

Ọdịmara niile nke oriri-nsọ na egosi anyị onyinye ahụ. Anyị na elekwasị anya na achicha ahụ Ọ dọwara na mbụ—na achicha nke ndị nchụaja na adowa nihu anyị ugbua. Anyị na eche echiche banyere ihe mmiri a gọziri agọzi pụtara, mgbe ahụ na ugbua, dịka ekpere oriri-nsọ ji nwayọ apụta site na ọnụ nke ndị nchụaja nta banye nime obi anyị na nime elu-igwe, na-emegharị ọhụrụ ọgbụgba-ndụ nke jikọtara anyị na ike nke nzọpụta nke Kraịst. Anyị nwere ike iche gbasara ihe ọ pụtara mgbe onye dikọn wetere anyị akara ndị ahụ dị nsọ, kwụrụ ka ọ kwụ ebe Jizọs ga akwụrụ ọ bụrụ na Ọ nọ ebe ahụ, na enye aka ibupụ ibu arụ anyị na ihe mgbu anyị.

Nke ka mma, ndị ikom nta na ndị inyom nta ekwesighị ịda ọrịa tutu ha achọta ọńụ na nzube na ijere Onye Nzọpụta ozi.

Okenye David A. Bednar kuziri na ito ma dị ka ndị mgbasa ozi ọma bụcha, anyị kwesịrị ịna eme ihe ndị mgbasa ozi ọma na eme, ma mgbe ahụ, “ahịrị nelu ahịrị na ozizi nelu ozizi,…[anyị] nwere-ike jiri nwayọ nwayọ bụrụ onye mgbasa oziọma … Onye nzọpụta tụrụ anya ya.”2

Otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị chọọ “ịdị ka Jizọs,”3 anyị kwesiri ime ihe Jizọs na eme, ma nime otu ahịrị okwu dị ịtụnaanya, Onyenwe anyị kọwara ihe Ọ na eme: Ọ sịrị, “Nihi ya lee, nke a bụ ọrụ m na ebube nke m—ịweta na mmezu anwụgh-anwụ na ndụ ebighi-ebi nke mmadụ.”4

Mgbasa ozi ọma nke Onye Nzọpụta mgbe ọbụla na ruo mgbe ebighị ebi bụ ijere Nna Ya ozi site na ịzọpụta ụmụ Ya.

Ma ụzọ kachasị mma ịchọta ọńụ nime ndụ nke a bụ isoro Kraịst na inyere ndị ọzọ aka.

Nke a bụ eziokwu kachasị dị mfe kwalitere mụọ nke ihe omume Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa.

Ihe omume nile na nkuzi nile nke Ụmụntakịrị na Ndị ntorobia na nkuzi niile nke ndị Ntoroọbịa bụcha maka inyere ndị dị nta aka ịdịkarị ka Jizọs site na ha iso Ya n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu Ya.

Ụmụntakịrị na Ndị ntoroọbịa bụ ngwa ọrụ eji enyere nwa Praịmarị ọbụla na ndị ntoroọbịa aka ito ịbụ onye ozi na inweta ọhụ jupụtara na okwukwe banyere ihe ụzọ nke ọńụ dị ka ya. Ha nwere-ike ịtụanya ma nwee oke agụụ maka ịchọta ụzọ ya na akara ngosi nile nọ na ụzọ nke ọgbụgba-ndụ, ebe aga eji onyinye nke Mụọ Nsọ mee ha baptism ma mee ha ndị otu ma duba ha nime kworum nile na klas nile nke ndi inyom nta, ebe ha ga enwe mmetụta ọńụ nke inyere ndị ọzọ aka site na ije ozi dịka Kraịst. Ha ga atụpụta uche, ndị ukwu na ndị nta, nke ga ejidezi ndụ ha ma nyere ha aka ịdịkarị ka Onye Nzọpụta. Nzukọ nile na magazin niile Maka Mgbam ume Ndị ntorobia, Friend, na Gospel Living app ga enyere ha aka nke ọma ịchọta ọńụ nime Kraịst. Ha ga atụanya ngọzi nile nke inwe tempụl rekọmend nke nwa oge nta ma nwee mmetụta mụọ nke Elaịja site na mmetụta nke Mụọ Nsọ dịka ha na achọ ngọzi nile nke tempụl na agụgụala ezinaụlọ. Ha ga enweta odudu site na ngọzi nile nke onye petrak. Oge na-adịghị anya, ha ga ahụ onwe ha ka ha na abanye nime tempụl nile inweta ike onyinye dị nsọ, ịchọta ọńụ ebe ahụ dịka ha na enwe njikọta ebigh-ebi, ka osina dị, ha na ndị ezinaụlọ ha nile.

Na agbanyeghị ufufe nke ọrịa mkpochapụ na nsogbu, iweta na mmezu nkwa e kwere Ụmụntakịrị na Ndị Ntorobia n’ihe omume ọhụrụ ka bụ ọrụ n’aga na ihu—ma ọdị ngwa-ngwa. Ndị ntoroọbia anyị enweghị ike echere ka ụwa mezie onwe ya tutu ha abia ịmara Onye nzọpụta ahụ. Ụfọdụ na eme mkpebi ugbua nke ha agaghị emeli ma ọbụrụ na ha mara ndị ha bụ—na nke Ya.

Ya mere oku dị ọkụ ọkụ sitere na igwe ndị agha nke Chineke na-enwe ọzụzụ site na okwukwe bụ “aka nile ịdị na ọrụ!”

Ndị nne na nna, ụmụ unu ndị nwoke chọrọ unu ịkwado ha ugbua dịka o metụrụ unu n’obi mgbe gara aga mgbe ha naara eme ihe ndị na-adịghị mkpa dị ka akara ndị ana etu na uwe na ntutu niile. Ndị nne na nna, ndị ndu ọkwa nchụaja na Ndị inyom Nta, ọbụrụ na ndị ntorobia unu nọ na agba mbọ, Ụmụntakịrị na Ndị ntorobia ga enye aka kpọta ha nye Onye Nzọpụta, ma Onye Nzọpụta ga enye ha udo.5

Ndiisi kworum na klas, bilitenụ ma were ọnọdụ unu nime ọrụ nke Onye-nwe-anyị.

Ndị bishop, jikọtanụ ọtụghe ụzọ unu na nke ndịisi kworum, na kworum unu nile—na ngalaba ukwu unu nile—ga agbanwe ruo mgbe nile.

Ma unu bụ ndị a mụrụ na ọgbọ na eto eto, a na m agba ama, dịka onye maara, na unu bụ ụmụ nwoke na ụmụ ada nke Chineke hụrụ nanya, ma O nwere ọrụ unu ga-arụ.

Dịka unu na agbago n’oche eze nke ọnọdụ unu, jiri obi unu nile, ike, uche, na ume unu niile, unu ga-abịa hụ Chineke nanya ma dobe ọgbụgba-ndụ unu nile ma tụkwasị ọkwa nchụaja Ya obi dịka unu na arụ ọrụ ịgozi ndị ọzọ, bido nime ebe obibi unu.

A na m ekpe ekpere na unu ga agbasi mbọ ike, n’ike karịrị nke mbụ tozuru oke na oge a, ije ozi, nwee okwukwe, chegharịa, ma gaaniihu ime nke ọma ụbọchị ọbụla, iji tozuo oke ịnata ngọzi nile nke tempụl na ọńụ na anọgide nke na abia nanị site na ozi ọma nke Jizọs Kraịst. A na m ekpe ekpere na unu ga akwado ịbụ onye mgbasa ozi ọma siri ike, di ma-ọbụ nwunye kwesiri ntụkwasị obi, nna ma ọbụ nne nwere ịhụnaanya, ekwere unu nkwa na unu ahaghị ịbụ ihe unu ga-abụ site na unu ịbụ ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.

A na m arịọ ka unu nye aka kwado ụwa maka mbịaghachi nke Onye Nzọpụta site na ịkpọku onye ọbụla ịbiakwute Kraịst ma nata ngọzi nile nke Aja mgbaghara mmehie Ya. Na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Luk 22:19.

  2. David A. Bednar, “Ịbụ Onye mgbasa oziọma,” Liahona, Nov. 2005, 46.

  3. “A na m agba mbọ ịdị ka Jizọs; A na m eso ụzọ ya nile. A na m agbalị igosị ịhụnanya dịka o mere, nime ihe nile m na eme ma na ekwu” (“A na m Agbalị Ịdị ka Jizọs,” Children’s Songbook, 78–79).

  4. Mozịs1:39.

  5. E nwere m obi ekele nye ndị nne na nna na ndị ndu siri ike na akụkọ anyị ndị gbasirila ike inyere ndi ntorobia aka inwe otuto. E kwenyere m na emume ọhụrụ nke Ụmụntakịrị na Ndị ntorobia si na ntụziaka nke emume na nrita ọbụla nke bu ya ụzọ.