Ọgbakọ Zuru ọha
Bụrụ Ndị na-eso ụzọ Kraịst Na-eme Udo
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Bụrụ Ndị na-eso ụzọ Kraịst Na-eme Udo

Ana m agba ama na “ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst na-eme udo” ga-achọta udo nke onwe na ndụ nke a ma na nzukọta nke eluigwe dị ebube.

Anyị bi n’oge mgbe “ndị na-eso ụzọ Kraịst hụrụ udo naanya”1 na-agabiga aka mgba ndị pụrụ iche. Ndị ahụ kwere na, na-efe ofufe n’obi umeala, ma na-agba ama Jizọs Kraịst enweteworịị nhụmiihe ọnwụnwa niile, mkpagbu, na ihe isi ike niile.2 Nwunye m, Meri, na Mụ adịghị iche. N’afọ ole ma ole gara aga anyị ahụtawo ọtụtụ niime ndị ezigbo enyi ụlọakwụkwọ sekọndịrị, ndị nsiso mgbasa ozi ọma anyị, ụfọdụ ọmarịcha ndị nwunye ha, na ndị bubuuru ndị otu ọrụ ka ha nwụrụ, ma ọ bụ, dị ka Onyeisi Russell M. Nelson kwuworo, garaniihu ruo aka nke ọzọ nke akwa mgbochi. Anyị ahuwo ụfọdụ ndị a zụlitere n’okpukperechi na nkwenye zọpụrụ ụkwụ n’ụzọ ọgbụgba ndụ.

Dị mwute, nwa nwa anyị nwoke gbara afọ 23 nwụrụ nihe mberede naanị otu ụgbọala. Ụfọdụ ndị enyi, ndị otu ezi na ụlọ, na ndị otu ọrụ anagidewokwa aka mgba ahụisi ike niile.

Mgbe ọbụla ọnwụnwa bịara, anyị na-eru uju ma na-agba mbọ iburikọta ibu nke onye na ibe ya.3 Anyị na-akwa akwa ihe ndị nke a na-agaghị emeteli na egwu ndị a na-agaghị agụ.4 Ihe ọjọọ na-emere ndị ezigbo mmadụ na njem anụ ahụ nke a. Ọkụ ọgbụgba mmebisi ihe niile na Maui dị niime Hawaii, mpaghara ndịda Chile, na mpaghara ọwụwa anyanwụ Canada bụcha ọmụmaatụ niile maka ihe omume ndị dị egwu nke ndị ezigbo mmadụ na-ezute.

Anyị na-agụ niime Pel dị Oke Ọnụ Ahịa na Onyenwe anyị kpugheere Abraham ọdịdị ebighị ebi nke mmụọ niile. Abraham mụtara ihe banyere ndụ tupu nke ụwa, ichi echichi site na mmalite, Okike ahụ, nhọpụta nke Onye Mgbapụta, na ndụ anụ ahụ nke a, nke bụ ọnọdụ nke abụọ nke mmadụ.5 Onye Mgbapụta mara ọkwa:

“Anyị ga-eme otu ụwa n’ebe ndị a nwere ike ibi

“Ma anyị ga-anwale ha jiri nke a, ịhụ ma ha ga-eme ihe niile ọbụla ọ bụ Onyenwe anyị Chineke ha ga-enye ha n’iwu.”6

Ugbua anyị niile nọ n’ebe a n’ọnọdụ nke abụọ na njem nke ọganiihu anyị chuwe ihu gawa alaeze dị ebube dị ka akụkụ nnukwu atụmatụ nke nzọpụta na mbuli elu nke Chineke. Anyị bụ ndị a gọziri agọzi nwere ohere nhọrọ na ịnọ n’okpuru mnwale niile nke anụ ahụ. Nke a bụ oge ekewapụtaara anyị iji kwadoo izute Chineke.7 Agọziri anyị ịmata maka Jizọs Kraịst na ọrụ Ya niime atụmatụ ahụ. Anyị nwere ohere ịghọ ndị otu nke Nzukọ nsọ Ya eweghachitere—Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a. Dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eme udo, anyị na-agba mbọ idobe iwu nsọ Ya niile. Ọ dịbeghị mgbe ọ dị mfe nye ndị na-eso ụzọ Ya. Ọbụghị ma ọ dịịrị Onye Nzọpụta mfe imejupụta ozi ndụ anụ ahụ Ya na nkwesị ntụkwasị obi.

Akwụkwọ nsọ doro anya: ọtụtụ ga-adaba n’aka agwa “rie, ńụọ, ma ńụrịa, niihi na echi anyị anwụọ”.8 Ndị ọzọ na-abụghị ndị kwere ekwe na-alaghachi azụ baa niime ogige gbara ọchịchịrị nke ndị nsonye nwere otu ụdị uche ndị na-ekwuchite maka “ihe ọhụrụ” nke ọzọ9 na fịlọsọfị niile nke ụmụ mmadụ.10 Ha amataghị ebe ha ga-achọta eziokwu.11

Ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eme Udo anaghị eso ụzọ nke ọbụla niime ha. Anyị bụ ndị otu obodo dị jụụ, na-arụ ọrụ n’ebe anyị bi. Anyị nwere ịhụnaanya, na-ekekọrịta ihe, ma na-akpọku ụmụ Chineke niile isoro nkuzi niile nke Kraịst.12 Anyị na-esoro ndụmọdụ nke onye amụma anyị hụrụ naanya, Onyeisi Nelson: anyị na-ahọrọ ọrụ nke “onye ome udo, ugbu a na mgbe niile.”13 Agwa mkpatemmụọ nke a dịnụụdị ma nduzi nke akwụkwọ nsọ niile ma nke amụma.

N’afọ 1829 ahazibeghị Nzukọ nsọ ahụ eweghachitere, ọbụghị ma ebipụtawo Akwụkwọ nke Mọmọn. Otu ntakịrị otu ndị mmadụ na-agba mbọ, ndị Mmụọ nke Chineke kwagidere, sooro Onye amụma Josef Smith. Onyenwe anyị kpugheere Josef ndụmọdụ maka oge ndị siri ike: “Atụla egwu, obere igwe anụ ụlọ; mee ezi ihe; kwe ka ụwa na ala mmụọ jikọta aka megide gị, niihi na ọ bụrụ na e wuru unu n’elu nkume m, ha enweghị ike emeri unu.”14 O nyekwara ha ndụmọdụ:

“Lekwasịnụ m anya n’echiche ọbụla; enwela obi abụọ, atụla ụjọ.

“… Kwesi ntụkwasị obi, debe iwu nsọ m niile, ma unu ga-eketa alaeze nke eluigwe.”15

N’eziokwu, emebighị akara aka anyị si n’eluigwe mgbe anyị gabigara ihe isi ike. Niime akwụkwọ Ndị Hibru enyere anyị ndụmọdụ “ịbịaru ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka n’oge mkpa.”16 Jizọs Kraịst bụ “odee nke nzọpụta dị ebighị ebi.”17

Okwu ndị nke Mọmọn na-amasị m, nke nwa ya nwoke Moronaị ńọmiri, na-akwado “ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eme udo … niihi ije gị na ụmụ mmadụ na-eme udo.”18

Ndị niime anyị nọ niime Nzukọ nsọ na-agba mbọ ịbụ “ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eme udo, ụbọchi na-amụke amụke karịa cheere anyị dị ka anyị na-elekwasị anya na Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Ọnwụnwa niile bụ akụkụ ndụ anụ ahụ ma na-eme niime ndụ nke onye ọbụla na gburugburu ụwa niile. Nke a gụnyere nnukwu nsogbu ndị dị n’etiti mba niile na mmadụ ọbụla.

Ndị ndu Nzukọ nsọ ka a na-ajụkarị mgbe niile, “Gịnị kpatara Chineke ziri ezi ji ekwe ihe ọjọọ ime, kachasị nke nye ndị ezigbo mmadụ?” ma “Gịnị mere ndị ahụ bụ ndị ezi omume ma nọrọ n’ozi nke Onyenwe anyị abụghị ma egbochighị ha site n’ụdị ihe ike ndị a?”

Anyị anaghị ama azịza niile; kosiladị, anyị maara ụkpụrụ ndị dị mkpa na-ekwe anyị izute mnwale, mkpagbu, na ihe isi ike niile jiri okwukwe na obisiike niime ọdịniihu na-egbuke egbuke nke cheere onye ọbụla niime anyị. Ọ dịghị ọmụmaatụ ka mma dị niime akwụkwọ nsọ dabeere na ngabiga mkpagbu karịa okwu nke Onyenwe anyị nyere Josef Smith, Onye Amụma, mgbe ọ bụ onye mkpọrọ nọ niime Ụlọ mkpọrọ Liberty.

Onyenwe anyị n’otu akụkụ mara ọkwa:

Ọ bụrụ ma agba niile nke ala mmụọ kpọmkwem ga-emeghe ọnụ nke ọma n’azụ gị, marakwa, nwa m nwoke, na ihe ndị a niile ga-enye gị nhụmiihe, ma ga-abụ maka ọdịmma gị.

“Ọkpara nke Mmadụ agbadawo n’okpuru ha niile. Ị dị ukwuu karịa ya?

“… Atụla egwu ihe mmadụ pụrụ ime, niihi na Chineke ga anọnyere gị ruo mgbe ebighị ebi niile.”19

O doro anya anyị nwere Nna bi N’eluigwe onye maara anyị ma hụ anyị naanya n’otu n’otu ma na-aghọta ntaram ahụhụ anyị n’ụzọ zuru oke. Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị.

Ma Onyeisi Russell M. Nelson ma Onyeisi M. Russell Ballard ekwusiwo ike nke ukwuu maka mkpa nke mbipụta ọhụrụ nke abụọ dị nke Kwusaa Ozi ọma M.20 Ana m enwekwa otu ụdị mmetụta mmasị ahụ. Mbipụta ọhụrụ nke a, na-akọwa akwụkwọ nsọ dị nsọ, na-ama ọkwa n’ike:

“N’aja mgbaghara mmehie Ya, Jizọs Kraịst wekwasịrị Onwe Ya mgbu anyị, mkpagbu niile, na adịghị ike niile. Niihi nke a, Ọ maara ‘dị ka otu anụ ahụ siri dị otu esi enyere ndị ya aka dị ka otu adịghị ike ha siri dị’ (Alma 7:12; lee kwa amaokwu 11). Ọ na-akpọku, ‘Bịakwutenụ m,’ ma dị ka anyị na-eme, Ọ na-enye anyị ezumiike, olileanya, ume, nhụnuuche, na ọgwụgwọ(Matiu 11:28; lee kwa amaokwu 29 ruo 30).

“Dị ka anyị na-adabere na Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, O nwere ike inyere anyị aka ịnagide mnwale, nrịa nrịa, na ihe mgbu anyị niile. Anyị nwere ike jupụta n’ọńụ, udo, na nkasi obi. Ihe niile na-adịchaghị mma banyere ndụ ka enwere ike imezi site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraist.”21

Anyị nwere ike na nnukwu ọńụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eme udo.

Atụmatụ obi ụtọ nke Nna anyị nke Eluigwe maka ụmụ Ya gụnyere ọbụghị naanị ndụ tupu ndụ anụ ahụ na ndụ anụ ahụ mana ikike maka ndụ ebighị ebi kwa, gụnyekwa nchịkọta dị ukwu ma dị ebube anyị na ndị anyị nwụrụ anwụ. Ihe niile n’ezighị ezi ka a ga-emezi, ma anyị ga-ahụ n’idoanya zuru oke na nhụnuuche na nghọta na-enweghị ụta.

Ndị ndu Nzukọ nsọ atụnyerewo nhụnuuche nke a na onye na-aga ije n’etiti ejije ihe omume atọ.22 Ndị ahụ na-enweghị ọmụma ihe nke atụmatụ nke Nna anaghị aghọta ihe mere n’ihe omume nke mbụ (ma ọ bụ ọdịdị tupu ndụ anụ ahụ) na ebumnoobi ndị ehiwere ebe ahụ; ọbụghị ma ha ghọtara idoanya na mkpebi na-abịa n’ihe omume nke atọ, nke bụ mmejupụta dị ebube nke atụmatụ nke Nna.

Ọtụtụ anaghị enye ekele na n’okpuru atụmatụ Ya dị ịhụnaanya ma dị ukwuu, ndị ahụ na-adị ka ha enweghị ịhụ ọma, site n’ụta na-abụghị nke onwe ha, anaghị enwe mmetụta n’ikpeazụ.23

Akwụkwọ nsọ doro anya: ndị na-eso ụzọ nke Kraịst na-eme udo ndị bụ ndị ezi omume, na-eso Onye Nzọpụta, ma na-edebe iwu nsọ Ya niile ka a ga-agọzi. Otu niime akwụkwọ nsọ ndị kachasị adị mkpa nye ndị bụ ndị ezi omume, na-agbanyeghị ọnọdụ ha n’ụwa, bụ akụkụ okwu nke Eze Benjamin nye ndị ya. Ọ na-ekwe nkwa na ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi n’idebe iwu nsọ niile ka agọziri nihe niile niime ndụ nke a ma “anabata baa niime eluigwe … [ma] biri ha na Chineke n’ọnọdụ nke obi ụtọ na-anaghị agwụ agwụ.”24

Anyị na-amata na ihe ruru anyị niile enwetewo nhụmiihe oké ifufe anụ ahụ na nke ime mmụọ na ndụ anyị, ụfọdụ na-agbawa obi. Nna nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, nwere ịhụnaanya, onye bụ isi nke Nzukọ nsọ Ya eweghachitere, ewetewooro anyị akwụkwọ nsọ na ndị amụma ịkwado anyị, dọọ anyị aka na ntị banyere ihe egwu niile, ma nye anyị odudu iji kwadoo ma chekwaa anyị. Ụfọdụ nduzi na-achọ ime ihe ozugbo, ma ụfọdụ na-ewete nchekwa ruo ọtụtụ afọ n’ọdịniihu. Okwu mmalite nke Onyenwe anyị nye Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, nkeji 1, na-adụ anyị ọdụ “ịṅa ntị n’okwu niile nke ndị amụma.”25

Nkeji 1 na-adọkwa anyị aka na ntị, “Kwadoonụ onwe unu, kwadoonụ onwe unu maka ihe ahụ nke ga-abịa.”26 Onyenwe anyị na-ewetere ndị Ya ohere iji kwadoo maka aka mgba ndị ahụ ha ga-ezute.

Onyenwe anyị nyere Onyeisi Brigham Young mkpughe dị ezigbo ike na Jenụwarị 14, 1847, na Winta Kwọtas.27 Mkpughe nke a bụ oke ihe atụ nke Onyenwe anyị ịkwado ndị mmadụ maka nke ahụ ga-abịa. Ndị nsọ kwesịrị ntụkwasị obi amaliteworịị ọpụpụ ha gaa ebe nsọ ugwu ukwu nke Ndagwurugwu Salt Lake. Ha arụwo nke ọma Tempụl Nauvoo ma nata emume nsọ nzọpụta ndị dị nsọ. Achụpụwo ha rịị site na Missouri, ma ndị na-emegbu ha achụpụwo ha rịị site na Nauvoo n’oge winta dị egwu. Mkpughe enyere Brigham nyere ndụmọdụ kwere omume ụzọ esi akwado maka ọpụpụ ahụ. Onyenwe anyị kwusiri ike n’ụzọ pụrụiche maka nlekọta ndị ogbenye, ndị isimkpe, ndị na-enweghị nna, na ezi na ụlọ nke ndị ahụ na-eje ozi na Batalion Mọmọn dị ka isi igwe nke Ndị nsọ garaniihu na njem ha dị egwu.

Na mgbakwunye iwete ndụmọdụ ndị ọzọ iji bie ndụ ezi omume, Onyenwe anyị kwusiri ike ụkpụrụ abụọ nke garaniihu daba adaba taa.

Na mbụ, Ọ gbara ha ume iji “ịbụ abụ jaa Onyenwe anyị mma, jiri egwu, jiri ite egwu, ma jiri ekpere nke ịja mma na inye ekele.”28

Nke abụọ, Onyenwe anyị nyere ndụmọdụ ọ bụrụ na ha “nọ n’iru uju, kpọkuo Onyenwe anyị Chineke gị n’ekpere, ka mkpụrụ obi unu wee n̄ụrịa.”29

Ndụmọdụ abụọ ndị a bụ ndụmọdụ dị ukwuu maka ụbọchi nke anyị. Ndụ ndị jupụtara n’otito, egwu, na inye ekele bụ nke agọziri agọzi n’ụzọ pụrụiche. Inwe an̄ụrị na idabere n’enyemaka nke eluigwe site n’ekpere bụ ụzọ dị ike ị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst na-eme udo. Ị na-agba mbọ mgbe niile inwe obi ụtọ na-enye aka zere ịda mba na mmụọ.

Ahịrị ikpeazụ ahụ nke abụ nwere uche na-enye azịza kachasị elu n’ọmarịcha ọdịdị: “Ụwa enweghị mwute nke eluigwe na-apụghị ịgwọ.”30

Dị ka Onye Ozi nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ana m agba ama na “ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst na-eme udo” ga-achọta udo nke onwe na ndụ nke a ma na nchịkọta nke eluigwe dị ebube. Ana m agba ezi akaebe nke ịbụ chị nke Onye Nzọpụta na eziokwu nke Aja mgbaghara mmehie Ya. Ọ bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen