Ọgbakọ Zuru ọha
Ike Ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta n’elu Agwaetiti niile nke Oke Osimiri
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Ike Ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta n’elu Agwaetiti niile nke Oke Osimiri

Site na ngọzi niile nke tempụl, Onye Nzọpụta na-agwọ ndị mmadụ, ndị ezinaụlọ, na obodo niile.

Nime afọ 1960 nna m kuziri ihe na College Nzukọ nsọ nke Hawaii nime Laie, ebe A mụrụ m. Ụmụnne m nwanyị asaa tọrọ m kwadoro na nne na nna m ga-agụ m “Kimo,” aha ndị Hawaii. Anyị birila nso Tempụl Laie Hawaii mgbe ọ nara ejere ọtụtụ ndị otu nke Nzukọ nsọ ozi nke mpaghara Asia Pacific, tinyere Japan.1 Na oge nke a, ọtụtụ otu nke Ndị-nsọ Japan bidoro na-abịa na Hawaii ị nata ngọzi niile nke tempụl.

Otu nime ndị otu a bụ otu nwanne nwanyị sitere na agwaetiti mara mma nke Okinawa. Akụkọ nke njem ya nye Tempụl Hawaii dị ịrịba ama. Ohu afọ gara aga, a lụrụla ya nime ọlụlụ di na nwunye ahaziri na omenala Budda. Naanị mgbe ọnwa ole na ole gachara,Japan lusoro Pearl Harbor, Hawaii agha, mere ka United States na Japan nọrọ na ọgụ. Na ọgụ nke agha dị ka nke Midway na Iwo Jima, ebili mmiri nke agha kwaara ndị agha Japan laa azụ na ikpere mmiri nke Okinawa, ahịrị nchekwa ikpeazu nke guzoro iji gbochie ndị agha Allied tupu ha abata nime obodo nke Japan.

Ruo ọnwa atọ nime afọ 1945 dị egwu, Agha nke Okinawa gara n’ihu. Ụgbọ mmiri nke ndị America dị 1,300 gbara agwaetiti ahụ gburugburu ma bọmbụọ ya. Ndị agha na ndị mmadụ egburu egbu dị ukwuu. Taa otu ihe ncheta dị na Okinawa depụtara ihe karịrị aha 240,000 ndị mmadụ ama ama lara n’iyi na agha ahụ.2

Na ịgbalị ịgbanahụ agha ahụ, nwanyị Okinawa a, di ya, na ụmụntakịrị abụọ ha gbabara nime oghere dị nime otu ọgba. Ha diiri ntaramahụhụ ọnụ na-apụghị ikwu nime izu ụka na ọnwa niile ahụ.

Otu abalị dị egwu nime agha ahụ, dịka agụrụ chọrọ igbu ezinaụlọ ya ma di ya enweteghị onwe ya, ọ tụgharịrị uche iji otu grenade nke aka kwụsị ntaram ahụhụ nke ezinaụlọ ya, nke ndị ọchịchị obodo nyere ya na ndị ọzọ maka ụdị nzube dị otu ahụ. Ka o sila dị, dịka ọ kwadoro ime otu ahụ, nhụmihe nke ime mmụọ dị omimi mere nke nyere ya ezigbo uche nke ịdị ndụ nke Chineke na ịhụnaanya Ya n’ebe ọ nọ, nke nyere ya ike ị ga n’ihu. Nime ụbọchị niile sotere, ọ kpọtere di ya ma were ahịhịa zụọ ezinaụlọ ya, mmanụ ańụ sitere na otu ańụ ọhịa, na ihe ekere eke niile anwụdere nime iyi dị nso. N’ịtụnaanya, ha nagidere ọnwa isii nime ọgba ahụ ruo mgbe ndị obodo bịara gwa ha na agha e biela.

Mgbe ezinaụlọ ahụ lọtara ụlọ ma bido iwugharị ndụ ha niile, nwanyị Japan a bidoro ịchọ aziza maka Chineke. O ji nwayọ kpalite inwe okwukwe nime Jizọs Kraist ma mkpa ọ dị ime baptizim. Ka o sila dị, o chere echiche banyere ndị o hụrụ naanya nwụrụla na-amaghị Jizọs Kraịst na baptizim, tinyere nne ya, onye nwụrụ mgbe ọ na-amụ ya.

Tulee udị ọńụ o nwere otu ụbọchị mgbe ndị mgbasa oziọma nwanne nwanyị abụọ sitere na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a bịara n’ụlọ ya ma kuziere ya na ndị mmadụ nwere ike ịnụ gbasara Jizọs Kraịst nime ụwa nke mmụọ. O nwere oke mmasị site na nkuzi ahụ na nne na nna ya nwere ike họrọ isoro Jizọs Kraịst mgbe ha nwụchara ma nabata baptizim emere maka ha nime ebe niile dị nsọ akpọrọ tempụl niile. A gbanwere ya na ezinaụlọ ya nye Onye Nzọpụta na baptism.

Ezinaụlọ ya rụsịrị ọrụ ike ma bido ịnwe ọganihu, ma nwekwuo ụmụ atọ. Ha nwere ntụkwasị obi ma kwụdesie ike nime Nzukọ nsọ. Mgbe ahụ, natụghị anya ya, di ya dara ọrịa strok ma nwụọ, nke mere ka ọ rụọ ọtụtụ ọrụ nime ọtụtụ afọ iji lekọta ụmụ ya ise.

Ụfọdụ ndị mmadụ nime ezinaụlọ ya na agbataobi ya katọrọ ya. Ha tara ya ụta na nsogbu ya niile bụ maka mkpebi ya ịbanye nzukọ nsọ ndị Kraịst. E nweghị ume ịda mba site na ihe ọjọ mere na nkọcha, ọ nọgidere na okwukwe ya nime Jizọs Kraịst, kpebisie ike ịga nihu, na-enwe ntụkwasị obi na Chineke maara ya ma na enwere ụbọchị ndị ka mma n’ihu.3

Ka afọ ole na ole gasịrị mgbe di ya nwụrụ, onyeisi mishọn nke Japan nwere mkpalite mmụọ ịgbaa ndị otu Japan ume ịrụ ọrụ ịga na tempụl. Onyeisi mishọn bụụrụ onye agha America nke Agha nke Okinawa, ebe nwanne nwanyị Okinawa na ezinaụlọ ya tara oke ahụhụ.4 Otu o si na dị, nwanne nwanyị ahụ dị umeala n’obi kwuru banyere ya: “Ọ bụ mgbe ahụ otu nime ndị iro anyị kpọrọ asị, kama ugbu a ọ bịara jiri oziọma nke ịhụnaanya na udo. Nke a, naanya m, bụ ọrụ ebube.”5

Ka ọ nụrụ ozi nke onyeisi mishọn ahụ, nwanne nwanyị ahụ di ya nwụrụ chọọ ka arachie ya nye ezinaụlọ ya nime tempụl otu ụbọchị. Ka o si la dị, ọ gaghị ekwe ya omume, n’ihi ihe mgbochi ego na nke asụsụ.

Mgbe ahụ ihe ngwọta ọhụrụ niile pụtara. Enwere ike belata ọnụ ahịa na ọkara ọbụrụ na ndị otu nọ na Japan goro ụgbọ elu dum iji fega Hawaii n’oge ahịa adịghị.6 Ndị otu rekọdụọ ma ree abụ ha kpọrọ Ndị-nsọ Japan Gụrụ. Ụfọdụ ndị otu rere ọbụna ụlọ niile. Ndị ọzọ kwụsịrị ọrụ iji were ga njem ahụ.7

Aka-mgba ọzọ maka ndị otu bụ na ihe ngosi nke tempụl adịghị na asụsụ Japan. Ndị ndu Nzukọ nsọ kpọrọ otu nwanne nwoke onye Japan ka ọ ga na tempụl Hawaii ịtụgharị asụsụ nke emume onyinye dị nsọ.8 Ọ bụ onye Japan mbụ tụgharịrị mgbe agha ahụ gasịrị, ebe ndị agha America kwesịrị ntụkwasị obi kụziri ya ma mee ya baptizim.9

Mgbe ndị otu Japan nwere onyinye dị nsọ bi na Hawaii nụrụ na mbụ ntụgharị asụsụ ahụ ha bere akwa. Otu onye-otu dere, “Anyị agawo tempụl ọtụtụ, ọtụtụ oge. Anyị nụrụ emume niile na asụsụ Bekee. [Kama] anyị enwebeghị mmetụta mmụọ nke ọrụ nke … tempụl ahụ dịka anyị na-enwe ugbu a [ịnụ ya] na asụsụ obodo anyị.”10

Ka e mesịrị n’otu afọ ahụ, ndị okenye na ụmụaka dị 161 si Tokyo gawa na Tempụl Hawaii. Otu nwanne nwoke onye Japan tụgharịrị uche na njem ahụ: “Dịka m lepụrụ anya site na ụgbọelu ma wee hụ Pearl Harbor, ma cheta ihe obodo anyị mere ndị ahụ na December 7, 1941, A tụrụ m egwu nime obi m. Ha ga anabata anyị? Kama ọ tụrụ m naanya na ha gosiri ịhụnaanya na obiọma karịrị nke m hụworo nime ndụ m.”11

Foto, oyiyi
A na-eji ifuru leis anabata Ndị nsọ Japan.

Ka Ndị nsọ Japan rutere, ndị otu Hawaii jiri flower enweghị ọnụ ọgụgụ nabata ha mgbe ha na-amakụ ma na-esusu ọnụ na nti, omenala n’adịghị adị na Japan. Mgbe ha nọchara ụbọchị 10 mgbanwe nime Hawaii, Ndị nsọ Japan lawara ka ha na-anụ abụ nke “Aloha Oe” nke Ndị nsọ Hawaii gụrụ.12

Njem ị ga tempụl nke abụọ ahaziri maka ndị otu Japan gụnyere nwanne nwanyị Okinawa ahụ di ya nwụrụla. Ọ gara njem maịlụ 10,000 (16,000-km) ahụ site na onyinye ndị mgbasa oziọma jere ozi na ngalaba nta ya nyere ya. Ka ọ nọ nime tempụl, o bere akwa nke ọńụ dị ka ọ nnọchitere anya maka ime nne ya baptizim ma rachie ya na di ya nwụrụ anwụ.

Ịga tempụl site na Japan gara n’ihu n’esepụghị aka ruo mgbe aranyere Tempụl Tokyo Japan na afọ 1980, nke mere ya tempụl nke 18 n’arụ ọrụ. Na ọnwa November nke afọ a, tempụl nke 186 ka a ga-aranye nime Okinawa, Japan. Ọ dị nso na ọgba dị na etiti Okinawa ebe nwanyị a na ezinaụlọ ya gbabara.13

Ọ bụ n’ezie na a hụghị m nwanne nwanyị a dị egwu si Okinawa, ihe nketa ya na-aga nihu site na ụmụ ụmụ ya kwesịrị ntụkwasị obi, ọtụtụ nke m mara ma hụ naanya.14

Nna m, onye agha nke Agha Ụwa II nke Pacific, nwere obi ụtọ mgbe m natara ọkpụkpọ-oku m ije ozi na Japan dị ka onye mgbasa ozi ọma. E rutere m Japan obere oge ka a ranyere Tempụl Tokyo ma hụ n’onwe m ịhụnaanya ha nwere maka tempụl ahụ.

Ọgbụgba ndụ niile nke tempụl bụ onyinye niile site n’aka Nna anyị nke Eluigwe nye ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-eso Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Site na tempụl, Nna anyị nke Eluigwe na-ejikọta ndị mmadụ na ezinaụlọ niile nye Onye Nzọpụta ahụ na ibe ya.

Onyeisi Russell M. Nelson kwuru n’afọ gara aga:

“Onye ọbụla nke mere ọgbụgba ndụ niile na fọnt ndị nke baptizim na niime tempụl niile—ma na-edobe ha—nwere ụzọ bara ụba esi enweta ike nke Jizọs Kraịst. …

“Ụgwọ ọrụ nke idobe ọgbụgba ndụ niile nke gị na Chineke bụ ike nke eluigwe—ike nke na-agba anyị ume iji nagide mnwale niile, ọnwụnwa niile, na obi mgbu niile n’ụzọ dị mma karịa. Ike nke a na-eme ka ụzọ anyị nwere onwe ya.”15

Site na ngọzi niile nke tempụl, Onye Nzọpụta na-agwọ ndị mmadụ, ndị ezinaụlọ, na obodo niile—ọbụna ndị ahụ n’ọburu dị ka ndị iro. Onyenwe anyị bilitere nọnwụ gwara ndị obodo ọgbaghara juru nime Akwụkwọ nke Mọmọn na nye unu ndị na atụ egwu “aha m, ka Ọkpara nke Ezi omume ga-eji ọgwụgwọ na nku ya nile bilite.”16

E nwerem obi ekele ịbụ onye aka ebe maka mmezu nke nkwa nke Onyenwe anyị na-aga n’ihu na “oge ahụ ga-abịa mgbe ọmụma nke Onye Nzọpụta ahụ ga-agbasa ruo mba, ebo, asụsụ, na ndị mmadụ,”17tinyekwa “n’elu ala niile nke mmiri osimiri.”18

A na m agba-aka-ebe maka Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst na nke onye amụma Ya na ndị-ozi n’ụbọchị niile ikpeazụ ndị a. A na m agba-ama nke ukwuu maka ike eluigwe nke ga-eke n’eluigwe ihe e kere agbụ n’elu ụwa.

Nke a bụ ọrụ nke Onye Nzọpụta, ma tempụl niile bụ ụlọ nsọ Ya.

Na nkwenye na-enweghị mgbagha, A na m ekwupụta eziokwu ndị a n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. A raara Tempụl Laie Hawaii nye n’afọ 1919 site n’aka Onyeisi Heber J. Grant. Dịka Onye ozi, o mepere Nzukọ nsọ ahụ nime Japan n’afọ 1901. Ọ bụụrụ tempụl nke ise na-arụ ọrụ ma bụrụ tempụl mbụ ewuru na mpụga kọntinent United States.

  2. Dị ka March 2, 2023, enwere aha 241,281 edere na ihe ncheta ahụ.

  3. Lee Gordon B. Hinckley, “Keep the Chain Unbroken” Brigham Young University devotional, Nov. 30, 1999), 4, speeches.byu.edu.

  4. Emerụrụ Dwayne N. Anderson ahụ nime Agha nke Okinawa. O jere ozi dịka onyeisi mishọn nime Japan bido na afọ 1962 ruo 1965 ma bụrụ onyeisi mbụ nke Tempụl Tokyo Japan, site na 1980 ruo 1982.

  5. A hụrụ m ndị ezinaụlọ ya mgbe mụ na nwunye m jere ozi dịka ndị ndu mgbasa ozi na Tokyo. Ha nyere m ozi a site na akụkọ ihe mere na ezinaụlọ ya.

  6. Lee Dwayne N. Andersen: An Autobiography for His Posterity, 102–5, Ọba Akwụkwọ Akụkọ Nzukọ nsọ, Salt Lake City.

  7. Lee Dwayne N. Andersen, 104.

  8. Lee Edward L. Clissold, “Translating the Endowment into Japanese,” nime Akụkọ niile nke Tempụl nime Laie, Hawaii, comp. Clinton D. Christensen (2019), 110–13.

  9. Onye ntụgharị asụsụ, Tatsui Sato, ka-emere baptizm na Julaị 7, 1946, site n’aka onye ọrụ agha US, C. Elliott Richards. Nwunye Tatsui, Chiyo Sato, ka emere baptizm otu ụbọchị ahụ site n’aka Boyd K. Packer. Iche iche, Neal A. Maxwell lụrụ ọgụ nime Agha nke Okinawa, ma L. Tom Perry sorola ndị Marịn mbụ gara nikpere mmiri na Japan ka emechara nkwekọrịta udo. Ndị Okenye Packer, Maxwell, na Perry ga-emecha bụrụ ndị otu nke Kworum nke Ndị-ozi Iri na Abụọ ahụ.

  10. Nime Clissold, “Ịtụgharị asụsụ Onyinye dị nsọ n’asụsụ Japan,” 112.

  11. Nime Dwayne N. Andersen, “1965 Japanese Excursion,” Akụkọ niile nke Tempụl nime Lā‘ie, Hawai‘i, 114.

  12. Lee Andersen, “1965 Japanese Excursion,” 114, 117.

  13. Ka emechara nime nnọkọ nke a nke ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2023, Onyeisi Russell M. Nelson mara ọkwa tempụl ọhụrụ 20, gụnyere Tempụl Osaka Japan, nke ga-abụ tempụl nke ise nime Japan.

  14. Na oge mgbasa oziọma anyị nime Tokyo site na 2018 ruo 2021, n’etiti aka-mgba niile nke ọgbaghara COVID, ezinaụlọ ya gosiri m na ezinaụlọ m nlekọta na ịhụnaanya, nke anyị ga-enwe obi ekele maka ya mgbe ebighị ebi.

  15. Russell M. Nelson, “Merie Ụwa ma Nweta Ezumiike,” Liahona, Nov. 2022, 96.

  16. 3 Nefi 25:2.

  17. Mosiah 3:20.

  18. 2 Nifaị 29:7.