Ọgbakọ Zuru ọha
Obi umeala iji Nabata ma Soro
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Obi umeala iji Nabata ma Soro

Obi umeala bụrịrị otu ihe achọrọ n’aka anyị iji dị njikere ilaghachi niihu nke Chineke.

Nime Alma isi ise ajụrụ otu ajụjụ eji atule uche: “Unu nwere ike ịkwu, ọbụrụ na akpọrọ unu ịnwụ n’oge a, n’ime onwe unu, na unu adịwo umeala zuru oke?”1 Ajụjụ ahụ pụtara na obi umeala bụrịrị otu ihe achọrọ n’aka anyị iji dị njikere ilaghachi nihu nke Chineke.

Ọ na-amasị anyị niile iche na anyị nwere obi umeala zuru ezu, mana ụfọdụ nhụmihe na ndụ n’eme ka anyị mata na nganga ahụ nọ nnọọ nime nwoke ma ọ bụ nwanyị dị nnọọ ndụ nime anyị.

Ọtụtụ afọ gara aga, mgbe ụmụ anyị ndị nwanyị ka bi n’ebe obibi anyị, ekpebiri m i gosi ha na nwunyem ngalaba azụmahịa nke m nọ n’isi ya n’ebe ụlọ ọrụ ebe m na-arụ ọrụ.

Ebumnuche m nke bụ eziokwu bụ igosi ha ebe, nke n’adịghị ka ebe obibi anyị, ebe onye niile ga-eme ihe otu ahụ m si gwa ha na-ajụghị m ajụjụ ọbụla. Dị ka anyị bịaruru nihu geti, nke na-ejikarị aka ya emehe mgbe ọ bụla ụgbọala m bịarutere, ọ tụrụ m anya na ọ meheghi n’oge nke a. Kama, otu onye nche m na-ahụbeghi mbu na ndụ m bịarutere ụgbọala m ma jụọ m maka ID ụlọọrụ.

A gwara m ya na enwebeghi mgbe m jiri ID nyabata ụgbọala m nime ụlọ ahụ ma mgbe ahụ ajụrụ m ya ajụjụ nganga ahụ ama ama: “Ị makwa onye ị na-agwa okwu?”

Nke ọ zaghachiri, “Ngwanụ, ebe ịnweghi ID ụlọọrụ gị, E nweghi otu m si amata onye ị bụ ma ebe m nọ na getị nke a, a gaghị ekwe ka ị baa n’ebe ogige ahụ ma ijighi njirimara ziri ezi.”

Ọ metụrụm n’obi ịlee anya na enyo nke azu ịlele omume ụmụ m dị nwanyị banyere ihe ndịa niile, mana A maaram na ha nọ n’enwe obị ụtọ maka oge ahụ! Nwunye m nọ m n’akụkụ nọ na-efufe isi iji gosi na ọ nabataghị agwa m. Ihe ikpeazụ m mere bụ irịọ onye nche ahụ mgbaghara ma gwa ya n’obi dị m mwute maka otu dị njọ m jiri kpasụ ya agwa. “Agbagharawo gị,” ka o kwuru, “mana ma ijighi ID, ụlọọrụ ị gaghị abata nime taa!”

Mgbe ahụ ejiri m wayọ nyaghachi ebe obibi ị ga weta ID m, ebe ikekwe amụtawom nkụzi nke a dị oke ọnụ: Na mgbe anyị họọrọ ghara ịdị umeala, n’ikpeazụ anyị ga-anata mkparị.

Nime Ilu anyị na-agụ, “Mpako mmadụ ga-adọdata ya n’ala: mana nsọpụrụ ga-akwado onye dị umeala na mmụọ.”2 Ọ bụrụ na-achọrọ iwulite obi umeala, anyị kwesịrịrị ịghọta ịhe ọ pụtara nime nkọwa nke ozi ọma.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-agbagha ịdị umeala n’obi ya na ihe ndị ọzọ dị ka, n’ọmụmatụ ịda ogbenye. Mana enwere nnọọ ọtụtụ ndị dara ogbenye ma nwe mpako makwa ọtụtụ ndị bara ụba ma kama nwe obi umeala. Ndị ọzọ n’eme ezigbote ihere ma ọ bụ nwee obere nsọpụrụ nke onwe nwere ike nwee ọdịdị obi umeala nke anya n’ahụ mana n’ala ala obi ha jupụtara na mpako.

Ya mere kedụ ihe bụ obi umeala? Dịka Kwusaa Ozi ọma M, ọ bụ “ịdị njikere ịnyefee nye uche Onyenwe anyị. … Ọ bụ ị nabata nkuzi. … [Ọ bụ] otu ihe dị oke mkpa maka uto nke ime mmụọ.”3

N’ezie enwere ọtụtụ ohere maka anyị niile imelite agwa nke a yiri Kraịst. Ọ ga-amasị m ibu ụzọ nyochaa otu anyị si dị umeala n’obi, ma ọ bụ kwesịrị ịdị, n’isoro ndụmọdụ nke onye amụma anyị. Ajụjụ dịịrị onye ọbụla nime anyị nwere ike ị bụ:

  • Anyị ọ na-ekwupụta aha niile nke Nzukọ-nsọ nime mkparịta anyị niile? Onyeisi Russell M. Nelson kwuru, “Iwepụ aha nke Onyenwe anyị site na Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị bụ nnukwu mmerị nye Setan.”4

  • Anyị ọ na-ekwe ka Chineke merie na ndụ anyị site na ịnabata ọkpụkpọ oku nke a nke onye amụma anyị? “Taa a na m akpọku ndị otu anyị ebe niile ibute ụzọ n’ịhapụ akparam agwa na omume ndị nke ịkpọ asị.”5

  • Anyị ọ na-emeri ụwa, na-atụkwasị obi na ozizi nke Kraịst karịa echiche niile nke ụmụ mmadụ, dị ka onye amụma kuziri?6

  • Anyị ọ ghọwo ndị ome udo site n’ikwu okwu ọma nye ma banyere ndị mmadụ? Onyeisi Nelson kuziiri anyị n’oge ọgbakọ zuru ọha gara aga ihe ndịa “Ọ bụrụ na e nwere ihe ọbụla nwere omume ọma, dị ezigbo mma, ma ọ bụ dị mma okwukwu ma ọ bụ inye otuto nke ahụ ka anyị nwere ike ikwu gbasara onye ọzọ—ma ọ bụ niihu ya bụ nwoke ma ọ bụ na-azụ ya bụ nwanyị—nke ahụ kwesịrị ịbụ ọkọlọtọ mkparịta ụka anyị .”7

Ndịa niile bụ nkuzi ndị dị mfe ma dịkwa ike. Cheta na, naanị ihe ndị nke Moses naara ịme iji nata ọgwụgwọ bụ ịle agwọ ọla kọpa ahụ anya nke ọ buliworo elu.8 Mana “ma n’ihi esighị-ike nke ụzọ ahụ, ma-ọbụ n’ihi ịdị mfe ya, e nwere ọtụtụ n’ime ha lara n’iyi.”9

N’oge ọgbakọ nke a anyị anụwọ ma kaga anụ ndụmọdụ n’adịghị ada ada nke ndị amụma na ndị ozi anyị. Ọ bụ ohere zuru oke iji wulite obi umeala ma ghara ka echiche anyị ahụ ndị dị ike bụrụ nke elomiri site na nkwenye nke ka ya di ike nke bụ na Onyenwe anyi na-ekwụ n’ezie site n’ọnụ ndị ndu ndịa ahọworo.

Nke ka nke, n’iwulite obi umeala, anyị kwesịrị ịghọtakwa ma nabata na anyị enweghi ike imeri ịma aka anyị niile ma ọ bụ mezuo akara aka anyị n’uju ya site naanị na mgbalị nke onwe anyị. Ndị na-ekwu okwu mkpali, ndị edemede, ndị nkuzi na ndị n’emetụta mmadụ gburugburu ụwa, tụmadị n’ebe platfom nke digital, ga-ekwu na ihe niile dabeere naanị n’anyị ma na omume anyị. Ụwa kwenyere n’aka nke anụ arụ.

Mana site na ozi ọma eweghachitere, anyị mụtara na anyị dabere nke ukwuu n’elu ịdị mma nke Nna nke Eluigwe na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst, “n’ihi na anyị ma na ọ bụ site n’amara ka a ga-azọpụta anyị, mgbe anyị mesịworo ihe niile anyị nwere ike ime.”10 Ọ bụ nke kpatara ojiri dị oke mkpa ị mee ma idebe ọgbụgba ndụ anyị na Chineke, nihi na ime nke a ga-enye anyị ohere zuru oke iji rite site na Aja mgbaghara mmehie Ya ike Jizọs Kraịst na-agwọ ọrịa, nke na-akpake na nke na-etozu oke.

Ị ga nzukọ oriri nsọ izu ọbụla ma ife ofufe n’ebe tempụl mgbe na mgbe iji sonye nime emume nsọ niile na iji nata na mee ka ọgbụgba ndụ dị ohụrụ bụ ihe iriba ama na anyị nabatara ndabere anyị n’elu Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta anyị Jizọs Kraịst. Nke ahụ ga-akpọku ike Ha nime ndụ anyị iji nyere anyị aka merie nsọgbu anyị niile ma n’ikpeazu mezuo ebumnuche nke ejiri kee anyị.

Mgbe n’etechaghi aka ogo obi umeala na nghọta m nwere maka ndabere m n’elu Onyenwe anyị ka emere mnwale ọzọ. A nọ m nime taxi n’eje ọda ụgbọelu iji baa ụgbọelu feeruo ebe enwere otu nsogbu siri ike ekwesịrị idozi. Onye ọkwọ taxi ahụ, onye n’abụghị onye otu Nzukọ nsọ, leere m anya site na enyo ma kwuo, “A na m ahụ na ijichaghi ahụ taa!”

“Ị na-ahụ ya?” A jụru m.

“N’ezie,” ka o kwuru Mgbe ahụ o kwuru ihe dị ka, “Eziokwu, ị nwere ajọọ ihé gburugburu gị!”

A kọwara m ya na enwere m ọnọdụ siri ike nke m na-achọ idozi mgbe ọ mesịrị jụọ m, “Imewo ihe niile dị gị n’ike iji dozie nke a?”

A zaghachirim na emewom ihe niile m nwere ike ị mee.

Mgbe ahụ o kwuru otu ihe m na-agaghị echefu ma ọlị, “Ọbụrụ ya hapụ ihe a n’aka Chineke, ma ihe niile ga-adị mma.”

Ka m kwuo eziokwu na anwara ọnwụnwa m ịjụ ya, “Ị mara onye ị na-agwa okwu?” Mana ajụghi m! Ihe m mere bụ ịnwedata onwe m ala n’ekpere nihu Onyenwe anyị n’ime ụgbọ elu ahụ otu elekere ahụ, na-arịọ maka enyemaka sinachi. Dị ka m ahapụ ụgbọelu ahụ, a mụtara m na ọnọdụ ahụ siri ike nke m kwesịrị idozi ka ebidowororịị ogbugbo ya ma na ọ dịghịzi mkpa mụnwa ị nọ n’ebe ahụ.

Ụmụnne ndi nwoke na ndi nwanyị, iwu ahụ, ọkpụkpọ oku ahụ, na nkwa ahụ sitere na Onyenwe anyị doro anya ma dị nkasị obi: “Ka ịdịrị umeala; na Onyenwe Chineke gị ga-ejide gị n’aka, ma nye gị ọziza nke ekpere gị nile.”11

Ka anyị dịrị umeala iji soro ndụmọdụ ndị amụma anyị ma nabata na naanị Chineke na Jizọs Kraịst nwere ike ịgbanwo anyị—site n’emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile anatara na Nzukọ nsọ Ya—ị bụrụ mmadụ ahụ nke kacha mma na ndụ nke a ma, otu ụbọchị, mee ka anyị zuo ike na Kraịst. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen