Ọgbakọ Zuru ọha
Nkwado nke Ndị Ji Ikike Zuru ọha, Ndị Mpaghara Iri Asaa, na Ndị Ọrụ Zuru ọha
Ọgbakọ Zuruọha nke Ọktoba 2023


Nkwado nke Ndị Ji Ikike Zuru ọha, Ndị Mpaghara Iri Asaa, na Ndị Ọrụ Zuru ọha

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ọ bụ ohere m iwete Ndị Ji Ikike Zuruọha, Ndị Mpaghara Iri Asaa, na Ndị Ọrụ Zuruọha nke Nzukọ ahụ maka ntuli aka nkwado unu.

Biko gosịpụta nkwado unu n’ụzọ ahụ esi eme ya, n’ebe ọbụla unu nọ. Ọ bụrụ na-enwere ndị na-akwadoghị, anyị na-arịọ ka ị kpọtụrụ onyeisi stek gị.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo Russell Marion Nelson dị ka onye amụma, onye ọhụụ, na onye mkpughe na Onyeisi nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a; Dallin Harris Oaks dị ka Onye Ndumọdụ nke Mbụ n’ime Otu Ndịisi Mbụ; na Henry Bennion Eyring dị ka Onye Ndumọdụ nke Abụọ n’ime Otu Ndịisi Mbụ.

Ndị ahụ ọ masịrị nwere ike gosipụta ya.

Ndị ahụ megidere, ọ bụrụ n’enwere onye ọbụla, nwere ike gosipụta ya.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo Dallin H. Oaks dị ka Onyeisi nke Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ na M. Russell Ballard dị ka Onyeisi Nnọchi anya nke Kworum Ndị Ozi Iri na Abụọ.

Ndị ahụ ọ masịrị, biko gosipụta.

Onye ọbụla megidere nwere ike gosipụta ya.

A na-atụpụta ka anyị kwado ndịa sotere dịka Ndị-otu nke Ndị-ozi Iri-na Abụọ: M. Russell Ballard, Jeffrey R. Holland, Dieter F. Uchtdorf, David A. Bednar, Quentin L. Cook, D. Todd Christofferson, Neil L. Andersen, Ronald A. Rasband, Gary E. Stevenson, Dale G. Renlund, Gerrit W. Gong, na Ulisses Soares.

Ndị ahụ ọ masịrị, biko gosipụta ya.

Onye megidere nwere ike si otua gosipụta.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo Ndị ndụmọdụ n’ime Otu Ndịisi Mbụ na Ndị Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ dị ka ndị amụma, ndị ọhụụ, na ndị mkpughe.

Ndị niile ọ masịrị, biko gosipụta ya.

Onye ọ masịghị, ọ bụrụ n’enwere onye ọbụla, soro otu ụdị akara ahụ.

Dịka ekwupụtara na mbụ, anyị enyefewo ọkpụkpọ oku nye Alexander Dushku ka oje ozi dị ka onye Ji Ikike Zuru ọha nke Iri Asaa.

Ndị niile ọ masịrị, biko gosipụta ya

Ndị megidere ya, gosi site n’otu iriba ama ahụ.

Anyị ji obi ekele echeta ntọhapụ nke ndị Mpaghara iri Asaa abụọ ndị enwere ike ịchọta aha ha na website Nzukọ nsọ.

Ndị ahụ ọ masịrị isoro n’igosipụta obi ekele nye ụmụnne ndị nwoke ndịa maka ije ozi ha bụ ịgba nwere ike gosipụta ya.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo ndị ọzọ Ji Ikike Zuruọha na Ndị Mpaghara Iri Asaa, tinyekwara ndị Mpaghara Iri Asaa abụọ ọhụrụ a mara ọkwa ha na mbido izu ụka ndị edepụtara aha ha na website nke Nzukọ nsọ na Ndị Ọrụ Zuruọha dịka otu ha siri dị n’oge ugbua.

Ndị niile ọ masịrị nwere ike mee otua site na-iweli aka elu.

Ndị n’ekweghị, ọbụrụ n’enwere onye.

Unu emela, ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, maka okwukwe unu nogidere na ekpere niile n’isi ndị ndu nke Nzukọ nsọ ahụ.

Mgbanwe niile nye ndị Iri Asaa Mpaghara

Ndị Iri Asaa Mpaghara ndịa sotere ka akwadoro n’oge ọgbakọ nke ndị ndu nke emere dịka otu akụkụ nke ọgbakọ zuru ọha:

Rogério Boschi and Kirt L. Hodges.

Ndị Iri Asaa Mpaghara ndịa sotere ka atọghapụrụ n’oge ọgbakọ nke ndị ndu nke emere dịka otu akụkụ nke ọgbakọ zuru ọha:

Henry J. Eyring and Youngjoon Kwon.