Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Mkpughe 12


NAJS, Mkpughe 12:1–17 (tụlee ihe di iche na Mkpughe 12:1–17; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 77)

(Nwanyị ahụ [Nzukọ-nsọ], nwa ahụ [ala-eze Chineke], okporo ígwè ahụ [okwu nke Chineke], nkịta-ọhịa ahụ [Setan], na Maikael ka a kọwara. Agha ahụ di n’elu-igwe ka a gara n’iru na-alụ n’elu ụwa.)

1 Oke ihe iriba-ama e wee pụta kwa ìhè n’elu-igwe, n’oyiyi nke ihe ndị dị n’ụwa; otu nwanyị nke e yikwasịrị anyanwụ dịka uwe, ọnwa dịkwa n’okpuru ụkwụ ya abụọ, ọ na-ekpu kwa okpu-eze nke kpakpando iri na abụọ.

2 Na nwanyị ahụ n’ihi na ọ dị ime, wee tie mkpu, ebe ime na-eme ya, n’ihi na ọ nọ n’arụ-mgbu ịmụpụta nwa.

3 O wee mụpụta otu nwa nwoke, onye ga-achị mba nile jiri okporo igwe; e weliri nwa ya kwa gaa n’ebe Chineke nọ na n’ebe oche-eze ya dị.

4 Ihe iriba-ama ọzọ wee pụtakwa ìhè n’elu-igwe; na lee, otu nnukwu nkịta ohịa na-acha ọbara ọbara, nke nwere isi asaa na mpi iri, ọna-ekpu kwa okpu-eze asaa n’isi ya nile. Ọdụdụ ya dọọrọ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke kpakpando nile nke elu-igwe, o wee tụda kwa ha n’ụwa. Nkịta ọhịa ahụ wee guzo n’iru nwanyị ahụ nke mụpụtaworo nwa, jikere ka o ripịa nwa ya mgbe a mụsịworo ya.

5 Na nwanyị ahụ wee gbalaga n’ime ọzara, ebe o nwere ọnọdụ a kwadobere site n’aka Chineke, ka ha wee zụọ ya n’ebe ahụ otu puku, narị abụọ na iri afọ isii.

6 Na agha wee dị n’elu-igwe; Maikael na ndị mụọ-ozi ya buru agha megide nkịta-ọhịa ahụ, nkịta-ọhịa ahụ na ndị mụọ-ozi wee buo kwa agha megide Maịkael;

7 Nkịta ọhịa emerighị kwa Maịkael, ọbụghị nwa ahụ, ma-ọbụghị nwanyị ahụ nke bụ nzukọ nke Chineke, onye a napụtaworo na ihe mgbu ya nile, wepụta kwa ala-eze nke Chineke anyị na nke Kraịst ya.

8 Ọ dịghị kwa ọnọdụ a chọtara n’elu-igwe maka nnukwu nkịta ọhịa ahụ, onye a chụpụworo, bụ agwọ ochie ahụ a kpọrọ ekwensu, nke a kpọkwara Setan, nke na-eduhie uwa dum; a chụpụrụ ya baa n’ime ụwa; a chụdakwara ndị mụọ-ozi ya ha na ya.

9 Na m wee nụ oke olu na-ada n’elu-igwe na-asị, ugbụ a ka ọ bịaworo bụ nzọpụta, na ike, na ala-eze nke Chineke anyị, na ike nke Kraịst ya;

10 N’ihi na-achụdara onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo, nke na-ebo ha ebubo n’iru Chineke anyị ehihie na abalị.

11 N’ihi na ha emeriwo ya site n’ọbara Nwa-atụrụ ahụ, na site n’okwu nke ịgba-ama ha; n’ihi na ha ahụghị ndụ nke ha n’anya, kama ha dobere ịgba-ama ahụ ọbụna ruo n’ọnwụ. Ya mere n̄ụrịa nụ ọn̄ụ O elu-igwe nile na unu ndị bi n’ime ha.

12 Na mgbe ihe ndịa nile gasịrị m wee nụ olu ọzọ na-asị, Ahụhụ ga-adịrị ndị nile bi n’ụwa, e, na ha bụ ndị bi n’ala nile mmiri gbara gburu gburu nke oke osimiri! n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oke ọnụma, n’ihi na o matara na o nwere nanị oge dị mkpụ mkpụ.

13 N’ihi na mgbe nkịta ọhịa ahụ hụrụ na-achụdara ya n’elu ụwa, o wee sogbue nwanyị ahụ nke mụpụtara nwa nwoke ahụ.

14 Ya mere, e wee nye nwanyị ahụ nku abụọ nke oke ugo, ka o nwee ike ifeba n’ime ọzara, baa n’ọnọdụ ya, ebe a na-azụ ya otu oge, na ọtụtụ oge, na ọkara otu oge, pụọ site n’iru nke agwọ ahụ.

15 Na agwọ ahụ wee na-agbụpụta mmiri site n’ọnụ ya n’azụ nwanyị ahụ, dịka idee mmiri, ka o wee mee ka idee mmiri ahụ bupụ ya.

16 Na ala wee na-enyere nwanyị ahụ aka, ala wee na-emeghe kwa ọnụ ya, na-elomi kwa idee mmiri ahụ nke nkịta-ọhịa ahụ gbụpụtara site n’ọnụ ya.

17 Ya mere, nkịta ọhịa ahụ wee wesa nwanyị ahụ iwe, jee kwa ibu agha megide mkpụrụ ya nke fọdụrụ, bụ ndị na-edobe iwu-nsọ nile nke Chineke, ndị nwekwara ọgbụgba-ama nke Jisus Kraịst.