Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Mkpughe 1


NAJS, Mkpughe 1:1–4 (tụlee ihe dị iche na Mkpughe 1:1–4)

(Jọn natara mkpughe site n’aka Jisus Kraịst nyefee kwa ya ndị ndu nke nzukọ asaa dị n’Esia.)

1 Mkpughe nke Jọn, onye odibo nke Chineke, nke e nyere ya site n’aka Jisus Kraịst, igosi ndị ọdibo ya ihe nile na-aghaghị imezu na nso, nke o zigara mee kwa ka ọ mara site n’aka mụọ-ozi ya nye onye odibo ya Jọn,

2 Onye gbara ama nke okwu Chineke, na nke ịgba-ama Jisus Kraịst, na nke ihe nile nke ọ hụworo.

3 Ngọzi na-adịrị ndị na-agụ, na ndị na-anụ na ghọta okwu nile nke amụma nkea, dobe kwa ihe nile ndị ahụ e deworo n’ime ya, n’ihi n’oge ahụ nke ọbịbịa nke Onye-nwe na-abịa nso.

4 Ugbua a nke a bụ ịgba-ama nke Jọn nye ndị odibo asaa ndị na-elekọta nzụkọ asaa dị n’Esia. Amara dịrị unu, ya na udo nke sitere n’aka ya bụ onye na-adị, onye dị kwa rị, na onye ga-abịa kwa; onye zipụworo mụọ-ozi ya site n’iru oche-eze ya, ịgba-ama nye ndị ahụ bụ ndị odibo asaa n’arụ nzukọ asaa ahụ.