Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Jenesis 50


NAJS, Jenesis 50:24–38 (tụlee ihe dị iche na Jenesis 50:24–26; hụ kwa 2 Nifaị 3)

(Moses, Eron, na Joseph Smith ka a kpọrọ aha ha nile na ibu-amụma nke a nke Josef n’Ijipt. Ọzọ kwa Josef buru amụma na Akwụkwọ nke Mọmọn ga-abụ onye nsiso nye akụkọ ndekọta nke Juda.)

24 Josef wee sị kwa ụmụnne ya, Mụ onwe m gaje ịnwụ, gakwuru kwa ndị nna m ha; na jiri ọn̄ụ gbada n’ili m. Ka Chineke nke nna m Jekọb nọnyere unu, ịnapụta unu site na mkpagbu n’ụbọchị nile nke ịbụ-oru unu; n’ihi na Onye-nwe eletawo m, a natawo kwa m nkwa site n’aka Onye-nwe, na site na mkpụrụ nke úkwù m nile, Onye-nwe Chineke ga-ekulite ngalaba ezi-omume site n’úkwù m nile; nye kwa gị onye nke nna m kpọworo aha Israel, otu onye amụma; (ọbụghị Mesaịa onye a kpọrọ Shaịlo;) na onye-amụma nke a ga-anapụta ndị m site n’Ijipt n’ụbọchị nile nke ịbụ oru unu.

25 Na ọ ga-eru na a ga-ekposasị ha ọzọ; na a ga-agbajipụ otu alaka, a ga-eburu kwa ha baa n’ime otu mba tere anya; na-agbanyeghị a ga-echetakwa ha n’ọgbụgba-ndụ nile nke Onye-nwe, mgbe Mesaịa ahụ bịara; n’ihi na a ga-eme ka ọ pụta ihe nye ha n’ụbọchị ndị ikpe-azụ, n’ime Mụọ nke ike; a ga-ewepụtakwa ha site n’ọchịchịrị baa n’ìhè; site n’ọchịchịrị zoro ezo na site na ndọkpụ n’agha nye inwere-onwe.

26 Onye ọhụ-ụzọ ka Onye-nwe Chineke m ga-ekulite, onye ga-abụ onye ọhụ-ụzọ nke a họpụtara nye mkpụrụ nke úkwù m nile.

27 Otua ka Onye-nwe Chineke nke nna m ha kwuru nye m, Onye ọhụ-ụzọ nke a họpụtara ahọputa ka m ga-ekulite site na mkpụrụ nke ukwu gị nile, a ga-echekwa n’ụzọ dị elu banyere ya n’etiti mkpụrụ nke ukwu gị nile; n’aka ya ka m ga-enyekwa iwu-nsọ na ọ ga-arụrụ mkpụrụ nke ukwu gị nile ọrụ, ụmụnne ya.

28 Na ọ ga-eweta ha ka ha mata maka ọgbụgba-ndụ nile nke mụ na ndị nna gị ha meworo; ọ ga-arụ kwa ọrụ ọbụla m ga-enye ya n’iwu.

29 Na aga m eme ka ọ dị ukwuu n’anya m nile, n’ihi na ọ ga-arụ ọrụ m; ọ ga-adị kwa ukwuu dịka onye ahụ nke m kwuworo na m ga-ekulite nye gị, ịnapụta ndị m, o ụlọ nke Israel site n’ala nke Ijipt; n’ihi na ọhụ-ụzọ ka m ga-ekulite ịnapụta ndị m site n’ala nke Ijipt, na a ga-akpọ ya Moses. Na site na aha nke a, ọ ga-amata na ya sitere n’ụlọ gị; n’ihi na ọ bụ ada-eze ahụ ga-elekọta ya anya, a ga-akpọkwa ya nwa ya nwoke.

30 Na ọzọ, onye ọhụ-ụzọ ka m ga-ekulite elu site na mkpụrụ nke ukwu gị nile, na ọ bụ ya ka m ga enye ike iwepụta okwu m nye mkpụrụ nke ukwu gị nile; ọbụghị kwa nanị na-iwepụta okwu m, ka Onye-nwe kwuru, kama na nke ime ka ha kwenye n’okwu m, nke na-agapụworị n’etiti ha n’ụbọchị ndị ikpe-azụ.

31 Ya mere na mkpụrụ nke úkwù gị nile ga-ede, na mkpụrụ nke ukwu nile nke Juda ga-ede; na nke ahụ a ga-ede site na mkpụrụ nke ukwu gị nile, na kwa nke ahụ a ga-ede site na mkpụrụ nke ukwu Juda, ga-etokọta, ruo n’ịgbagwoju-anya nke ozizi ụgha nile, na mbuda n’ala nke ndọrọ-ndọrọ nile, na ihiwe udo n’etiti mkpụrụ nke úkwù gị nile, na iweta ha na ọmụma nke ndị nna ha nile n’ụbọchị ndị ikpeazụ; na kwa ọmụma nke ọgbụgba-ndụ m nile, ka Onye-nwe kwuru.

32 Na site na-adịghị-ike ka a ga-eme ka o sie ike, n’ụbọchị ahụ mgbe ọrụ m ga-aga n’iru n’etiti ndị m nile, nke ga-eweghachi ha, ndị bụ ndị ụlọ nke Israel, n’ụbọchị ndị ikpe-azụ.

33 Ọhụ-ụzọ ahụ kwa ka m ga-agọzi, na ndị ga-achọ ibibi ya ga-enwe mgbagwọ-ju-anya; n’ihi na nkwa nke a ka m na-enye gị; n’ihi na aga m echeta gị site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ; a ga-akpọkwa aha ya Joseph, ọ ga-abụ kwa n’igbaso aha nke nna ya; ọ ga-abụ kwa dịka gị onwe gị; n’ihi na ihe ahụ nke Onye-nwe ga-ewepụta site n’aka ya ga-eweta ndị m ruo na nzọpụta.

34 Na Onye-nwe n̄ụrụ iyi nye Josef na ya ga-echekwa mkpụrụ afọ ya ruo mgbe nile, na-asị A ga m ekulite Moses, mkpanaka ga-adị kwa n’aka ya, ọ ga-ekpokọtakwa ndị m ọnụ, na ọ ga-edu ha dịka otu igwe atụrụ, ọ ga-eji kwa mkpanaka ya tie mmiri nile nke oke osimiri uhie.

35 Na ọ ga-enwe ike iji kpee ikpe, ga-ede kwa okwu nke Onye-nwe. Ọ gaghị kwa ekwu ọtụtụ okwu, n’ihi na a ga m eji mkpịsị-aka nke aka m deere ya iwu m. A ga m emekwara ya onye nkwupụta okwu, a ga-akpọ kwa aha ya Erọn.

36 Na a ga-emekwara gị ya n’ụbọchị ndị ikpe-azụ, ọbụna dịka m n̄ụworo n’iyi. Ya mere, Josef wee sị ụmụnne ya, Chineke garịrị eleta unu, kpọpụta kwa unu site n’ala nke a, ruo n’ala ahụ nke o n̄ụrụ iyi nye Abraham, na Aịsak na nye Jekọb.

37 Na Josef wee mesie ọtụtụ ihe ndị ọzọ ike nye ụmụnne ya, o wee nara ịn̄ụ-iyi site n’aka nke ụmụ Israel, na-asị ha, Chineke ga-eleta unu n’ezie, unu ga-ebuli kwa ọkpụkpụ m nile site n’ebea.

38 Josef nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri; ha wee gbasi kwa ozu ya, tinye kwa ya n’igbe-ozu na Ijipt; ụmụ Israel wee dobe kwa ozu ya na-elighi ya eli, ka e wee bugo ya nyibe kwa ya n’ílì ya na nna ya. Na site otu a ha wee cheta iyi ahụ nke ha n̄ụrụ nye ya.