Ọgbakọ Zuru ọha
Arachiri site nʻaka Mmụọ Nsọ nke Nkwa
Ọgbakọ zuruọha nke Ọktoba 2026


Arachiri site nʻaka Mmụọ Nsọ nke Nkwa

(Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:7)

Ịnata emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja na ịbanye niime ọgbụgba ndụ dị nsọ bụ nzọụkwụ ndị dị mkpa maka “ochichọ nke oge ndụ niile” iji mee ka obi anyị, uche anyị na ndụ anyị kwekọrịta nʻuche nke Chineke.

Amụtara m ihe ọmụmụ dị oke mkpa ọtụtụ afọ gara aga site nʻaka Onyeisi Boyd K. Packer. O kwuru:

“N’agbanyeghị mba ma ọ bụ agbụrụ mmadụ, ma ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, n’agbanyeghị ọrụ ma ọ bụ ọkwa agụmakwụkwọ gị, nakwa n’agbanyeghị ndudugandu mmadụ bi na ya, ndụ bụ njem ịlaghachi ebe obibi maka anyị niile, iji laghachi n’ihu nke Chineke.

“Emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile na-aghọ asambodo anyị maka ịbanye n’ihu Ya. Ịnata ha na ntozu okè bụ ọchịchọ nke ogologo ndụ niile; idebe ha ma emesịa bụ aka mgba nke ndụ anụ ahụ.”

Ọ bụ ekpere m na Mmụọ Nsọ ahụ ga-akụziri ma kọwaara onye ọbụla niime anyị dịka anyị na-atule mkpa emume nsọ na ọgbụgba ndụ niile dị dịka asambodo nke ime mmụọ maka njem anyị ịlaghachi nʻebe obibi ruo na Nna nke Eluigwe.

Ụkabụilu nke Paspọt ahụ

Aga m ebido jiri otu nkenke akụkọ. Otu mgbe otu nwoke chọrọ ịga leta ndị otù ezinụlọ ya bi nʻobodo dị anya. Ọ haziri njem ya, pịakọta akpati ya, ma fee ụgbọelu rute n’obodo ukwu ahụ ebe ndị ikwu ya bi.

Nwoke ahụ jiri obi ụtọ gbatuo nʻụgbọelu ma garuo nʻebe ahụ a na-ahụ maka paspọt. O nwere paspọt ziri ezi nke enyere ya site nʻaka ndị na-enye paspọt nke ọchịchị obodo ya. O gosiri onye ọrụ okèala paspọt ya, onye nyochara njirimara nwoke ahụ, obodo o si, na ihe kpatara nleta ya nʻobodo ahụ. Mana nwoke ahụ elekọtaghị paspọt ya anya nke ọma. Ihuakwụkwọ ozi nkeonwe abụrụwo nke nwere ntụpọ ma mebie. Ma otu ihuakwụkwọ dọkara adọka ka anyachiri jiri selotape na gụm nʻụzọ iwu akwadoghị.

Yamere, onye ọrụ okèala ahụ anabataghị paspọt ya ma jụ ịbịanye stamp dị mkpa maka ya ịbanye nʻobodo ahụ. Nwoke ahụ nwere nkụda mmụọ na mgbagwoju anya banyere ihe ọ ga-eme ọzọ.

Ihe mmụta dị niime akụkọ nke a dị mfe: ntosị nke paspọt ka ahaghị ilekọta ogologo oge. Ijide paspọt ziri ezi nyere nwoke ahụ ohere iji banye obodo ahụ, mana paspọt ahụ nʻonwe ya ekweghi nkwa na nʻezie na a ga-ahapụ ya ịbanye nʻobodo ahụ.

Nʻezie, nsikwu nke a dị mfe nwekwara njedebe. N’adịghị ka mmebi emebiri paspọt, nsogbu na ahụhụ ndị na-abịakwute anyị n’esighị anyị nʻaka anaghị eme ka nkwa Chineke kwere anyị ghara imezu ma ọ bụ mee ka ọgbụgba ndụ anyị ghara ịdị irè.

Ọgbụgba ndụ, Emume nsọ, na Ngọzi niile Ekwere na Nkwa

Maka ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, ịnata emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja na ịbanye niime ọgbụgba ndụ dị nsọ bụ nzọụkwụ ndị dị mkpa maka “oçhiçhọ nke oge ndụ niile” iji mee ka obi anyị, uche anyị na ndụ anyị kwekọrịta nʻuche nke Chineke.

Ọgbụgba ndụ bụ nkwa dị nsọ—mkpebi na-adịgide adịgide n’etiti Chineke na ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị. Chineke na-ewepụta ọnọdụ nke ọgbụgba ndụ ozi ọma niile, ma ụmụ Ya na-ejikwa ikike nhọrọ ha ịmụta banyere ma kwere nʻihe ndị Ọ na-agwa ha ka ha mee .

A na-anata ọgbụgba ndụ niile site nʻemume nsọ niile dị nsọ. Emume nsọ bụ ihe omume dị nsọ emere site nʻikike nke ọkwa nchụaja nke nwere ebumnuuche ime mmụọ na ịdị mkpa ruo ebighi ebi ma metụta iwu niile na ụkpụrụ niile nke Chineke. Emume nsọ niile nakwa akụziri anyị banyere ọdịdi nke ọgbụgba ndụ niile ahụ anyị nabatara niime ndụ anyị.

Ọgbụgba ndụ na emume nsọ nke oziọma Onye Nzọpụta eweghachitere bụ asambodo ime mmụọ nke nwere ike ịmeghecha mpio ohere niile nke eluigwe iji nabata niime ndụ anyị ebumnuuche sinigwe, ntụziaka, na ume. Chineke kwere ụmụ ya ndị nwoke na nwanyị nkwa ngọzi dị elu maka ịkwanyere ọgbụgba ndụ niile ugwu, gụnyekwa irube isi nye iwu niile na emume nsọ niile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst. A chọrọ ka anyị gaaniihu kwesị ntụkwasị obi ka o kwe ka asambodo ndị ahụ wee dịrị irè, nakwa ka e wee nweta ngọzi ndị e kwere na nkwa.

Mmụọ Nsọ ahụ bụ Mmụọ Nsọ nke Nkwa.

Mmụọ Nsọ bụ onye nke atọ nime Chukwu. Ọ bụ onye nwere ahụ nke mmụọ, na-agba ama maka eziokwu niile, ma bụrụkwa onye akaebe na onye ozi nke Nna na Ọkpara ahụ.

Akọwakwara Mmụọ Nsọ n’ime akwụkwọ nsọ dịka Mmụọ Nsọ nke Nkwa, onye na-akwado ma ọ bụ kwupụta na Chineke anabatawo ọrụ ndị ezi omume nke ụmụ Ya. N’ikpeazụ, emume nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile nke oziọma ka aga-arachi site nʻaka nke Mmụọ Nsọ nke Nkwa ahụ. Dịka Onyenwe anyị kpugheere Onye amụma Joseph Smith, “Ọgbụgba ndụ niile … nke a na-emeghị ma banye na ya ma rachie site na Mmụọ Nsọ nke nkwa … agaghị adị ire, nweghị ezi omume ma-ọbụ dị ike na mbilite n’ọnwụ na mgbe mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ gasịrị.”

Mgbe arachiri ya site nʻaka Mmụọ Nsọ nke Nkwa, emume nsọ, in̄ụ iyi, ma ọ bụ ọgbụgba ndụ na-adị irè ma n’ụwa na n’eluigwe. Nrachi nke a dabeere n’ọnọdụ ụfọdụ n’oge ndụ anụ ahụ ma enwere ike imebi ya ma ọ bụ tụfuo ya n’ihi ajọọ omume.

Ịnata nrachi nkwado nke a site nʻaka Mmụọ Nsọ anaghị abụkarị otu mmemme; kama, ọ bụ nke na-abịa site nʻoge ruo nʻoge dịka anyị na-eji obiọcha na-echegharị mgbe niile, kwanyere ọgbụgba ndụ anyị ugwu, ma nyefee Chineke obi anyị. Iji ezi omume na-achọ ngọzi nke a bụ “ihe aka mgba nke ndụ anụ ahụ,” dịka Onyeisi Packer jiri kọwaa.

Dị nnọọ ka nwoke ahụ nọ n’akụkọ paspọt m siri chọọ akara nkwado n’ime paspọtụ ya ka o nwee ike ịbanye na mba ọzọ, otu ahụ ka onye ọ bụla n’ime anyị chọkwara akaebe nkwenye sitere n’aka Mmụọ Nsọ nke Nkwa ahụ, ka anyị wee nwee ike ịnata ngọzi ebighị ebi ndị metụtara ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ dị iche iche nke ozi ọma Onye Nzọpụta.

Onye ọbụla niime anyị kwesịrị inwe obi ekele maka ohere niile dị nsọ iji “jee ije na emume nsọ niile nke Onyenwe anyị” na ịnata site nʻaka Mmụọ Nsọ nke nkwa, “ka oge na-aga,” nrachi nkwado nke na-ekwe nkwa ngọzị niile ekwere na nkwa.

Emume nsọ nke Nrachi

Nrachi nke otu nwoke na otu nwanyị niime ụlọ nke Onyenwe anyị bụ isi ọgbụgba ndụ na emume nsọ nke oziọma onye Nzọpụta eweghachitere. Ma nke dị mkpa, ịghọta mkpa ozizi nke emume nsọ nrachi dị nke arachiri site na Mmụọ Nsọ nke Nkwa na-enye aka ịza, nʻotu akụkụ, ajụjụ nkeonwe di omimi banyere ma nhọrọ onye ọzọ ọ nwere ike ịnapụ onye na-edebe ọgbụgba ndụ kwesịrị ntụkwasị obi ngọzi ebighị ebi niile.

Emume nsọ nrachi ahụ gụnyere akụkụ abụọ dị mkpa ma nwee njikọ: (1) njikọ ebighị ebi nke nwoke na nwanyị n’alụmdi—nke enwere ike ịghọta dị ka nrachi nke dị n’akụkụ—na (2) nrachi nke di na nwunye n’ime ezinụlọ ebighị ebi nke Chineke na ijikọta ụmụ mmadụ ruo na ndudugandu niile—nke enwere ike ịghọta dị ka nrachi n’usoro na-agbago elu. Mmewere abụọ nke emume nsọ ahụ dị oke mkpa.

Nzube niile achọro ma tinye nʻekpere niihi mpụtara nke nrachi nke tempụl n’etiti nwoke na nwanyị gụnyere uto ime mmụọ ogologo ndụ niile, nraranye alụmdi na nwunye, agbaghị na-ama, ịrụkọ ọrụ ọnụ iji merie ihe ndị a na-ejighị n’aka na ihe ịma aka nke ndụ anụ ahụ, na obi ụtọ na-adịgide adịgide.

Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ihe mwute na, nzube ndị ahụ achọrọ ma tinye nʻekpere anaghị emezukarị. Mmehie di ma ọ bụ nwunye, ịgba na-ama, ndapụ nʻokwukwe nkeonwe, ma ọ bụ ihe isi ike ndị ọzọ nwere ike ịkpata esemokwu, nkewa, na ọbụna ịgba alụkwaghịm. N’ọnọdụ ndị a, di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ntụkwasị obi nwere ike ịjụ, sị, “O nwere ike ịbụ na nhọrọ nke nʻezighi ezi sitere n’aka onye ọzọ ga-anapụnwu m ihe Chineke kwere na nkwa?” Azịza nke ajụjụ a bụ mba dara ụda!

Omume na-ekwesịghị ekwesị nke di ma ọ bụ nwunye nʻezie na-eweta obi mgbawa na mwute nye di ma ọ bụ nwunye nke ọzọ na ndị otù ezinụlọ ya. Agbanyeghị, ajọọ omume nke otu onye enweghị ike igbochi ma ọ bụ nabie ịhụnaanya nke Chineke, ike, na ngọzi niile nye onye ọzọ. Ike nke Aja mgbaghara mmehie na-enweghị ọgwụgwụ ma dị ebighị ebi nke Onyenwe anyị pụrụ imeri ihe niile, oge niile, ebe niile, maka onye ọ bụla nke na-ejidesi ọgbụgba ndụ ha na Ya ike.

Di ma ọ bụ nwunye nke na-emebi ọgbụgba ndụ ma na-echegharịghị na-ewezuga onwe ha site nʻinwetara onwe ya akara nrachi nke Mmụọ Nsọ nke Nkwa maka emume nsọ nrachi niile nke dị nʻakụkụ na nke gbagoro elu.

Di ma ọ bụ nwunye na-akwanyere ọgbụgba ndụ ha ugwu ma na-aga n’ihu n’okwukwe ga-anọgide na ntozu okè ịnata maka onwe ha, akara nkwado nke Mmụọ Nsọ nke Nkwa maka emume nsọ nrachi nke dị nʻakụkụ na ịnata ngọzi ndị ọzọ niile dị iche iche metụtara ha.

Ị nwere ike jụọ, “Kedụ otu nke a ga-esi kwee omume ma ọ bụrụ na alumdi na nwunye nke tempụl anaghị anagide?”

Ozizi ekpughere nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a anaghị azacha nʻuju ajụjụ banyere ụdị okwu ndị a. Amaghịm otu ma ọbụkwanụ ma m nwere ike ịkọwa kpọm kwem otu na mgbe a ga-anata ngọzi niile ekwere na nkwa. Mana a maara m na a ga-anatacha ngọzi niile ekwere na nkwa. Ọ dịghị onye na-eso ụzọ kwesịrị ntụkwasị obi a ga-anapụ n’ikpeazụ ngọzi ebighị ebi ọ bụla Chineke kwere nkwa ya, n’ihi nhọrọ nʻezighị ezi nke onye ọzọ.

Ana m emechi okwu m jiri akaebe nke Eze Benjamin nʻemesi obi ike: “Ma nke ka nke, aga m achọ ka unu tụgharịa uche na ngọzi na ọnọdụ an̄ụrị nke ndị ahụ na-edebe iwu nsọ niile nke Chineke. Niihi na lee, agọziri ha n’ihe niile, ma n’ihe nke anụ ahụ ma ihe nke ime mmụọ; ma ọ bụrụ na ha anọgide n’okwukwe ruo ọgwụgwụ a ga-anabata ha niime eluigwe, nke mere na ha na Chineke ga-ebi n’ọnọdụ an̄ụrị na-enweghị ọgwụgwụ. O chetanụ, chetanụ na ihe ndị a bụ eziokwu; niihi na Onyenwe anyị Chineke ekwuwo ya.”

Eji m obi ụtọ agba-ama eziokwu dị niime nkwa amụma nke Eze Benjamin n’aha dị nsọ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.

Hụba ama

  1. Boyd K. Packer, “Ọgbụgba ndụ,” Ensign, Me 1987, 24; agbakwunyere okwu.

  2. Lee Boyd K. Packer, “Ọgbụgba ndụ,” 23.

  3. Lee Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Emume nsọ,” Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma.

  4. Lee Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Ọgbụgba ndụ,” Ọba Akwụkwọ Ozi ọma.

  5. Lee Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Mmụọ Nsọ nke Nkwa,” Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

  6. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 132:7.

  7. Lee Mozis 7:21.

  8. Boyd K. Packer, “Ọgbụgba ndụ,” 24; agbakwunyere okwu.

  9. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 136:4.

  10. Mozis 7:21.

  11. Onyeisi Russell M. Nelson kuziri: “Di na nwunye na-agba ndụ ha na Chineke nakwa n’etiti onwe ha ịbụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ma na-eguzosi ike n’ihe nye ibe ha.. … Dị nnọọ ka alumdi niile na ezi na ụlọ niile na-enwekọrịta njikọ nke akụkụ pụrụ iche nke na-ekewapụta ịhụnaanya pụrụ iche, otu ahụkwa ka mmekọrịta ọhụrụ a malitere mgbe anyị na-ejikọ onwe anyị site na ọgbụgba ndụ gbagoro elu ruo Chineke anyị!” (“Ọgbụgba ndụ Ebighị ebi Ahụ,” Liahona, Okt. 2022, 6, 9).

  12. A kọwapụtara ngọzi ndị a n’ime ọgbụgba ndụ a natara site n’emume nsọ nrachi alụmdi. “Ebe nrachi ka dị irè, onye otù nke kwesịrị ntụkwasị obi nye ọgbụgba ndụ niile nke tempụl ga-anata ngọzi nkeonwe ndị ahụ ekwere nkwa ha n’ime tempụl. Nke a bụ eziokwu ọbụna ọ bụrụ ma di ma ọ bụ nwunye onye ahụ emebiwo ọgbụgba ndụ niile ma ọ bụ pụọ site na alụmdi ahụ. Ọzọkwa, Chineke agaghị achọ ka onye ọ bụla nọrọ na mmekọrịta nrachi ruo mgbe ebighị ebi niile megidere ọchịchọ ya. Nna nke Eluigwe ga-ahụ na onye ọ bụla nwetara ngọzi ọ bụla nke ọchịchọ na nhọrọ ya kwere ka o nwee” (Akwụkwọ ntụziaka Izugbe: Ijee ozi niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, 38.4.1.10, Ọba akwụkwọ maka Ozi ọma).

  13. Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ekwuwo sị: “Okwu m niile bụ ezie ma ha agaghị ada, … Mana ihe niile garịrị emezu n’oge ha” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 64:31–32).

  14. Mosaia 2:41.