Dị ngwa ngwa Inyeaka, Dị nwayọ nwayọ Ikpe ikpe
Ịdị ngwa ngwa n’inyeaka na ịdị nwayọ nʻikpe ikpe bụ ụzọ mgbam ume dị mfe ma dị omimi maka onye ọbụla niime anyị ịdịrịkwu ka Onye Nzọpụta anyị.
Nkọnilu nke Ọdụmbi Mgbagwojuanya
“Obere nwata ga-edu ha.” Afọ ole na ole gara aga, akwụkwọ nsọ nke a n’ezie pụtara ihè na ndụ m. O mere n’otu mmemme Prịamarị ngalaba ukwu.
N’ụtụtụ Ụbọchị izuike ahụ, enyi m nta Jemis yi kootu ọhụrụ. Ka mmemme ahụ malitere, Jemis nọ na-enyocha ụfọdụ akụkụ kootu ọhụrụ ya kacha dị mmasị. Ihe kacha enwete uche ya bụ njirimara abụọ dị na jakeetị ya. N’aka jakeetị ya enwere ọdụmbi ma enweghị oghere. Na lapel aka ekpe jakeetị ya, enwere ọnụ ọdụmbi, mana enweghị ọdụmbi ọbụla. Ọ bụghị ma ọdụmbi ma ọ bụghị ma ọnụ ọdụmbi yiri ka ọ na-arụ ọrụ ọbụla bara uru.
N’ezie, Jemis n’ụzọ amamihe chọpụtaa ihe eji ha abụọ eme. Eji m ụjọ na-ele dị ka Jemis n’obi ụtọ gbachiri aka nri uwe ya na lapel dị n’aka ekpe jakeetị ya. Ebe obi tọrọ ya ụtọ mere obi amapụ ya ngwa ngwa, niihi na ozugbo Jemis gbachiri aka uwe ya n’obi ya, ọbụna jiri ikike ime mgbanwe nke nwata Prịamarị, o nweghị ike ịtọghepụ onwe ya. Jemis na mkpachapụanya, emepụtawo nke ọma, jakeetị otu aka.
Dị ka Jemis na-enwekwu nsogbu imegharị ahụ, iwe bịara na-ewe m nke ukwuu. Ọdụmbi mgbagwojuanya ka etinyeworo n’ọrụ na-adabachaghị ma, bụụrụ m, nke na-agbakasị ahụ. A nọ m na-efufe isi m na ndakpọ olileanya dị ka Jemis na-achọ ịga na pulpiit.
Naanị mgbe ahụ ahụrụ m obere nwata nta nwanyị nọdụ na nsote Jemis. Ọ gbawokwa aka ebe nsogbu nke Jemis, ya na nchekasị ya na-etolite etolite. Mana, kama iwe iwe, ọ na-achọ inye aka. Ngwa ngwa ịmata ihe nke aga eme, ọ gbatịrị aka ntakịrị ya, na-adịghị ekpe ikpe ma gbaghepụ ọdụmbi ahụ site n’ọnụ ọdụmbi ahụ. Anapụtara Jemis, ma azọkwara mmemme Praịmarị!
Ekutere m ume mana nweekwa umeala. Amatara ịba mba ahụ dị jụụ nke ọdụmbi edoghere ya na mkpịsịaka obere na-echetere m na m kwesịrị ịgba mbọ ịdị ka Jizọs. Oge ntakịrị ahụ dịkwa ebube nyeere m aka nabata ihe Okenye Patrick Kearon akọwawo dị ka “ntụgharị uche ọhụrụ dị ukwuu” nke mkpụrụ obi m. Anaghị m echetakwa isiokwu nke mmemme Prịamarị ụbọchị ahụ, mana ozi m natara site na Mmụọ Nsọ kpaliri nhazị ọhụrụ nke ime mmụọ. Obere nwata mere m ịmụta nke a: na ezigbo onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst na-adị ngwa ngwa inyeaka ma dịrị nwayọ ikpe ikpe.
Onye Nzọpụta Na-enyeaka (ma Naghị Ekpe) Nwanyị nọ n’Olulu mmiri ikpe
Onye Nzọpụta kuziri ụkpụrụ nke a dị ịhụnaanya nke iso ụzọ site na mmalite nke ije ozi ndụ anụ ahụ Ya. N’ozi ọma nke Jọn, O jeere nwanyị Samerịa ozi. Anyị amaghị aha ya. Anyị abịawo mata ya dị ka “nwanyị ahụ nọ ebe olulu mmiri.” Mkparịta ụka ya na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-akuzi ọtụtụ ihe mmụta. Otu ihe mmụta dị oke mkpa bụ ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta ịdị ngwa ngwa inye amara na enyemaka na-agbanwe mmadụ.
Dị ka mkparịta ụka ahụ malitere, ike gwụrụ Jizọs ma na mberede rịọrọ nwanyị ahụ maka ihe ọnụn̄ụ. Anyị pụrụ naanị iche mkpụrụ ụbọchị ole nwanyị nke a naara abịa n’olulu mmiri nke a n’oge awa nke a—tutu ruo ụbọchị taa. Nye ya, ọ bụ ụbọchị nkịtị—tutu ruo mgbe Jizọs bịaruru. N’ụbọchị nkịtị ya niile, o nwere ike ọ nagidewo ọtụtụ ndị na-ekpe ikpe, mana aka na-enyeaka ole ma ole—tutu ruo taa.
Nwanyị nke a nwere ike o mewo karịa ihe ga-akpata ikpe karịrị naanị ịgbaghe ọdụmbi ya ruo lapel. Otu ọ dị, o nwere usoro mmekọrịta mebiri emebi ma bụ, n’oge ahụ, ya na nwoke na-abụghị di ya ibi. Mana gịnị ka anyị maara n’ezie banyere ọnọdụ ya niile? Di ya ọ nwụrụ? ọ gbara alụkwaghịm? ahapụrụ ya? Anyị amaghị. Ugbu a, biko anghọtahiekwala m. Akụkọ ya dị oke mkpa, mana ndị a abụghị nkọwa ikpe anyị kwesịrị ịma banyere njem ya.
Kedụ ihe Kraịst na-elekwasị na ya? Nyee aka. Onyinye nke “mmiri ndụ.” Nnukwu Onye Mgbapụta nke onye niile maara nke ọma ihe niile gbasara nwanyị ana akpọghị aha, ma Ọ bịakwutere ya ịbụ aka ebe dị ndụ nke mmiri dị ndụ. Ọ nyere ya amara na enyemaka pụrụ mgbanwe.
Ọ gwara nwanyị ahụ okwu jiri ugwu, ọbụghị mmenye ihere. O geziri ntị nke ọma nye ajụjụ ya niile ma zaghachi jiri nkuzi, na-abụghị ime akaja. O jideghị ya na ndọkpụ agụgụala ya. Ọ gwara ya eziokwu na ntụkwasị obi. Jizọs Kraịst na-echetara anyị na inyere ndị mmadụ aka gbanwee ndụ ha, anyị ahaghị ile naanị oge ha gara aga—anyị ga-elerịrị n’ihe ga-ekwe omume n’aka ha. Ọ gawara n’olulu mmiri ụbọchị ahụ dị ka onye agụpụrụ agụpụ. O jiri nzube pụọ n’olulu mmiri ahụ. Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe “ịdị ngwa ngwa inyeaka na ịdị nwayọ nwayọ n’ikpe ikpe” dị ka ya.
Ịnọnyere Enyi na Ndị Otù Ọhụrụ n’Ụbọchị Ndị Nkịtị
Ụbọchị niile, ndị mgbasa ozi ọma na-ezute ndị mmadụ n’olulu mmiri ọlọrọ ọhụrụ gburugburu ụwa. Ha na-ama ọkwa na Jizọs bụ Kraịst, nnukwu “Abụ M.” Ha na-achọta, na-akuzi, na-eme baptizim, ma na-anabata ndị mmadụ nwere ike ịnọ n’egwu nke ikpe mana na mkpa enyemaka. Dị ka ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, ana akpọku anyị ịhazigharị mkpụrụ obi anyị ka anyị wee nwee ike nyere ndị enyi na ndị otù ọhụrụ aka n’ụzọ niile kacha yie nke Kraịst. Onyeisi Dallin H. Oaks n’ido anya na n’onwe ya akpọkuwo anyị “ịchọ ịdị nsọ, dị ka Onye Nzọpụta anyị.” Ịdị ngwa ngwa n’inyeaka na ịdị nwayọ nʻikpe ikpe bụ ụzọ mgbam ume dị mfe ma dị omimi maka onye ọbụla niime anyị ịdịrịkwu nsọ, ịdịkwu ka Onye Nzọpụta anyị, ịbụ ezi ndị na-eso ụzọ Ya.
Ekpere m bụ na mgbe ndịikom na ndịinyom ọlọrọ ọhụrụ ndị a nọ n’olulu mmiri zutere mụ na gị, ha ga-amata na ha “alọtawo ebe obibi.” Ekpere m bụ na ha ga-amata niime mụ na gị ndị na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst na-agba mbọ, dị njikere imejuputa ha jiri mmiri dị ndụ na nke dị ịhụnaanya. Ana m agba ama na mgbe anyị nyeere ndị mmadụ aka, n’otu n’otu, n’ụzọ anyị ndị dị ntakịrị ma dị mfe, kama ikpe ha ikpe, anyị na-akwado ụwa maka Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ nke Jizọs Kraịst. Otu a ka m si agba aka ebe ma gbaa ama n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.