Akwụkwọ nsọ
Echiche ndị Enwere ike Iji Mee Ọmụmụ akwụkwọ nsọ Nke onwe Gị Adị mma


“Echiche ndị Enwere ike Iji Mee Ọmụmụ akwụkwọ nsọ Nke onwe Gị Adị mma,” Echiche Banyere Ọmụmụ akwụkwọ nsọ (2021)

“Echiche ndị Enwere ike Iji Mee Ọmụmụ akwụkwọ nsọ Nke onwe Gị Adị mma,” Echiche banyere Ọmụmụ Akwụkwọ nsọ

Foto, oyiyi
onye inyom na-amụ akwụkwọ nsọ

Echiche ndị Enwere ike Iji Mee Ọmụmụ akwụkwọ nsọ Nke onwe Gị Adị mma

Nke a bụ ụfọdụ ụzọ ndị dị mfe enwere ike iji mee ọmụmụ okwu nke Chineke dị n’akwụkwọ nsọ niile ị na-eme ebuo ibu.

Kpee ekpere maka Mkpakemmụọ.

Akwụkwọ nsọ nwere okwu Chineke niime ha. Mgbe ị na-amụ ha, rịọ Nna gị nke Eluigwe maka nduzi Ya ma nata Mmụọ Ya iji nyere gị aka ịghọta ha.

Chọọ Ezi okwu ndị gbasara Jizọs Kraist

Akwụkwọ nsọ na-akụziri anyị na ihe niile na-agba ama banyere Kraịst (lee 2 Nifaị 11:4; Moses 6:63), ya mere chọọ Ya niile ndị a na-eme eme, niime akụkọ niile, na nkuzi niile nke akwụkwọ nsọ. Tụlee idedata ihe ma ọ bụ ịkanye ihe na amaokwu niile na-akuzi ihe banyere Onye Nzọpụta na otu esi eso Ya.

Chọọ maka Okwu ndị na-akpakemmụọ ma ọ bụ Nkebiokwu niile

Inwere ike chọpụta na ụfọdụ mkpụrụ okwu na nkebi okwu dị niime akwụkwọ nsọ dị gị mma, ma ọ bụ dị nnọọ ka eji maka gị dee ya. Ha nwere ike dị mkpa maka gị onwe gị ma na-akpakemmụọ na akwalite gị. Tụlee ịkanye ha akara niime akwụkwọ nsọ gị ma ọ bụ ide ihe banyere ha na jonal ọmụmụ ihe.

Chọọ Ezi okwu niile nke Ozi ọma

Mgbe ụfọdụ ezi okwu niile nke ozi ọma (ọtụtụ mgbe a kpọrọ ozizi ma ọ bụ ụkpụrụ niile) ka a na-ede n’ụzọ kwụ ọtọ, ma mgbe ụfọdụ a na-etinye ha n’uche site n’otu ọmụmaatụ ma ọ bụ akụkọ. Jụọ onwe gị, “Olee ezi okwu ndị nke ozi ọma a kuziri na-amaokwu ndị a?”

Gee Mmụọ ahụ ntị

Gee ntị na echiche gị niile na mmetụta gị niile, ọbụrụgodi na ọ dị ka ha emetụtaghị ihe ị na-agụ. Ihe ndị ahụ na-agbata n’uche nwere ike ị bụ nnọọ ihe ndị Nna gị nke Eluigwe chọrọ ka ị mụta ma nwee mmetụta.

Foto, oyiyi
Onye inyom na-amụ akwụkwọ nsọ 2

Were Akwụkwọ nsọ ahụ Tụnyere Ndụ Gị

Tụlee otu akụkọ niile na nkuzi niile ị na-agụ ji gbasa ndụ gị. Na-ịmaatụ, inwere ike ịjụ onwe gị, “Kedụ nhụmiihe ndị m nwetagoro yiri ihe m na-agụ?” ma ọ bụ “Olee otu m ga-eji e soro ọmụmaatụ nke onye nke a dị n’akwụkwọ nsọ?”

Jụọ Ajụjụ niile

Ịjụ ajụjụ ndị gbasara ozi ọma nwere ike nyere gị aka kpebie ihe ị ga-amụ. Mgbe ị na-amụ akwụkwọ nsọ, ọtụtụ ajụjụ nwere ike gbata gị n’uche. Ajụjụ ndị a nwere ike gbasa ihe ị na-agụ ma ọ bụ gbasa ozugbo ndụ gị. Tụlee uche banyere ajụjụ ndị a, ma chọọ azịza niile dị ka ị na-aganiihu ịmụ akwụkwọ nsọ. Mgbe ị mụchara ihe, jụọ maka ihe ọzọ Chineke ga-achọ ka ị mụọ, ma leba anya maka azịza niile noge awa na ụbọchị ndị na-abịa.

Were Onyinyeaka niile banyere Ọmụmụ Akwụkwọ nsọ

Na inweta mgbakwunye nghọta banyere amaokwu ndị ị na-agụ, were nkọwada niile, na Nduzi nke Isiokwu, na Ọkọwaokwu Baịbụl, na Nduzi nye Akwụkwọ nsọ niile (scriptures.ChurchofJesusChrist.org), na ihe ndị ọzọ ga-enye aka na-ịmụ ihe.

Tụlee Ọnọdụ nke Akwụkwọ nsọ niile

Inwere ike ịchọta nghọta ndị bara uru gbasara otu akwụkwọ nsọ ma ọ bụrụ na ị tulee ọnọdụ ya—ọnọdụ dị iche iche ma ọ bụ ntọ nke akwụkwọ nsọ ahụ. Na-ịmaatụ, ịma ndabere na nkwenye nke ndị mmadụ onye amụma gwara okwu nwere ike nyere gị aka ghọta ebumnuuche nke ozi ya niile.

Foto, oyiyi
onyeikom na-amụ akwụkwọ nsọ

Dedata Echiche Gị niile na Mmetụta Gị niile

E nwere ọtụtụ ụzọ esi ededata echiche na-agbata gị nobi mgbe ị na-amụ ihe. Na-ịmaatụ, inwere ike nye okwu bara uru ma ọ bụ nkebiokwu akara ma dedata echiche gị dị ka nootu niime akwụkwọ nsọ gị. Inwekwara ike debe jonalụ nke nghọta niile, mmetụta niile, na echiche ndị ị natara. Ma ọ bụ i nwere ike dedata ajụjụ ahụ ị jụrụ mbụ tupu mmalite ọmụmụ ihe gị, tinyere azịza ndị edubara gị na-esote.

Mụọ Okwu niile ndị Amụma na Ndịozi Ụbọchị ikpeazụ a

Gụọ ihe ndị amụma na ndịozi ụbọchị ikpeazụ a kuziworo gbasara ụkpụrụ niile ị na-ahụ nime akwụkwọ nsọ niile. Ozi ha niile nọ niime “Ọgbakọ Zuru ọha,” “Magazin niile,” na ihe ndị ọzọ ewekọtara dị na Ọba akwụkwọ Ozi ọma.

Gụọ Akụkọ ndị ahụ

Gụọ akụkọ ndị ahụ dị niime akwụkwọ nsọ, na-achọ ịghọta ọnọdụ ha (oge, ebe, okwu okwu, na ndị ọgbakọ). Akụkọ ndị si nakwụkwọ nsọ egosịpụtara bụcha oke njụ maka nke a, tụmadị maka ụmụntakịrị na ndị otu na-amachaghị ihe banyere akwụkwọ nsọ.

Kọọ Nghọta niile.

Ịkọwa ihe ndị aghọtara site na ọmụmụ ihe nke onwe gị bụ ụzọ dị mma iji kuziere ndị ọzọ ihe ma nye aka mee nghọta nke ihe ị gụrụ esie ike.

Bie ndụ site na Ihe Ị Na-amụ

Ọmụmụ akwụkwọ nsọnwere ike kpakeemmụọ anyị ma duba anyị na-ịgbanwe ụzọ anyị si ebi ndụ. Gee ntị na ihe Mmụọ ahụ na-akwagide gị ime mgbe ị na-agụ ihe ọgụgụ, ma kpebie ime ihe ndị ahụ a kwagidere gị.

Bipụta