Akwụkwọ nsọ
Gịnị mere eji Amụ Akwụkwọ nsọ?


“Gịnị mere eji Amụ Akwụkwọ nsọ?” Echiche banyere Ọmụmụ Akwụkwọ nsọ (2021)

“Gịnị mere eji Amụ Akwụkwọ nsọ?” Echiche banyere Ọmụmụ Akwụkwọ nsọ

Foto, oyiyi
Kraịst hiwere oriri nsọ na-etiti ndị Nifaị, nke si n’aka Andrew Bosley

Gịnị mere eji Amụ Akwụkwọ nsọ?

Mgbe anyị gbalịsiri ike mụọ akwụkwọ nsọ, anyị na-abịakwute Jizọs Kraist nso ma bịa ghọta ozi ọma na aja mgbaghara mmehie Ya nke ọma. Nifaị onye amụma gbara anyị ume n’ụzọ dị otu a:

“Ya mere, unu ga na-aga n’iru kwudesie ike n’ime Kraịst, na-enwe ìhè nke olileanya na-enweghị ntụpọ, na ịhụnanya nke Chineke na nke mmadụ nile. Ya mere, ọ bụrụ na unu ga na-aga n’iru, n’eri oriri n’elu okwu nke Kraịst, ma nọgide ruo ọgwụgwụ, lee, otu a ka Nna kwuru: Unu ga-enwe ndụ ebighi ebi” (2 Nifaị 31:20).

Foto, oyiyi
ezi na ụlọ na-agụ akwụkwọ nsọ

Nkuzi ndị si nakwụkwọ nsọ niile ga-enyere anyị aka laghachikwute Nna anyị nke Eluigwe. Ndị amụma anyị ụbọchị ikpeazụ a agwawo anyị mụọ ha mgbe niile dị ka na-onwe anyị na, ebe ọ dabara, dị ka ndị ezi na ụlọ. Ha akpọkuwo anyị ị mụta ihe site na nhụmiihe niile nke ndị ahụ nọ nime akwụkwọ nsọ niile ma tinye nkọwapụta na nkuzi niile nke akwụkwọ nsọ na ndụ anyị taa, dị ka Nifaị nyere na ndụmọdụ nime 1 Nifaị 19:23. Ma ndị amụma ndị mgbe gboo ma ndị nke taa a kpọkuwo anyị ịmụ akwụkwọ nsọ niile na “iri oriri n’elu okwu nke Kraịst” (2 Nifaị 32:3).

Foto, oyiyi
onye ikom na-agụ akwụkwọ nsọ

Onyeisi Russell M. Nelson kuzikwara ezi okwu nke a dị mkpa gbasara “iri oriri” n’elu akwụkwọ nsọ niile:

“Iri oriri pụtara karịa idetụ ọnụ. Iri oriri pụtara inwe ańụrị na nri dị ụtọ. Anyị na-enwe ańụrị n’akwụkwọ nsọ niile site na ịmụ ha na mmụọ nke nchọpụta n’obi ụtọ na nrube isi n’okwukwe. Mgbe anyị riri oriri n’elu okwu nke Kraịst, ha na-emikpu ‘niime ala ala obi’ [2 Ndị Kọrịnt 3:3]. Ha na-abụ akụkụ nke ọdịdị anyị dị oke mkpa” (“Ibi ndụ site na Ntụzi aka nke Akwụkwọ nsọ,” Ensign, Nọv. 2000, 17).

Mgbe anyị nọgidesịrị ike na-esepụghị aka na-eso na ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke onwe na nke ezi na ụlọ, anyị na ndị ezi na ụlọ anyị ga-enwe nduzi, nwee nchekwa, ma kwụrụ chịm megide ihe aka mgba niile nke ụbọchị anyị.