Akwụkwọ nsọ
Echiche ndị enwere maka Iji App Ọba akwụkwọ Ozi ọma Eme ihe


“Echiche ndị enwere maka Iji App Ọba akwụkwọ Ozi ọma Eme ihe,” Echiche ndị enwere banyere Ọmụmụ Akwụkwọ nsọ (2021)

Echiche ndị enwere maka Iji App Ọba akwụkwọ Ozi ọma Eme ihe,” Echiche ndị enwere banyere Ọmụmụ Akwụkwọ nsọ

Foto, oyiyi
otu onyeinyom na nwata ndị n’ele anya na tablet

Echiche ndị enwere maka Iji App Ọba akwụkwọ Ozi ọma Eme ihe

Gee ntị

Otu niime ụzọ ndị kachasị mma iji mụọ akwụkwọ nsọ bụ ige ntị na ihe ndị erekọdụrụ erekọdụ. Inwere ike ime nke a n’ebe obibi gị ma ọ bụ ebe ọbụla nnọọ Inwekwara ike ige ntị na otu ihe si aga ọkụ ọkụ n’ụzọ dị iche iche na na-asụsụ dị iche iche.

Site n’Isiokwu Mụọ ihe

Inwere ike chọta akwụkwọ nsọ ndị gbasara otu isiokwu site n’iji ihe eji eme nchọcha ma mgbe ahụ na-atụlegharị nchọgharị rezọọtụ ndị dị mkpa. Inwekwara ike iji mbipụta Isiokwu niile nke Ozi ọma ndị na-eweta ọkpụrụkpụ akwụkwọ nsọ maka isiokwu ọbụla enyere mee ihe.

Hazie Site n’Isiokwu

Inwere ike hazie ndịnaya site n’isiokwu n’iji “Tags” and “Notebooks.” Isiokwu ndị a nwere ike ịba uru mgbe ị na-akwado okwu a ga-ekwu ma ọ bụ ihe ọmụmụ.

Ngosipụta

Inwere ike mee obodobo ma ọ bụ nye akara n’akwụkwọ nsọ gị site na-ịhọrọ otu edereede ma mesịa ịhọrọ otu ụkpụrụ. Ụkpụrụ nwere ike ị bụ agwa dị iche iche a gwakọtara ọnụ na ahịrị a kanyere n’okpuru ma ọ bụ ime obodobo.

Kepụta Links

Inwere ike ikepụta links na-agbata akwụkwọ nsọ niile, ozi niile nke ọgbakọ zuru ọha, na ndịnaya ndị ọzọ. Nke a nwere ike inyere gị aka cheta ma mee ọsịsọ rute njikọ niile ndị imeworo.

Chọpụta Nkọwasị niile

Inwere ike chọpụta nkọwasị enyere mkpụrụ okwu n’akwụkwọ nsọ site n’ịhọrọ ya ma pịa ọdụmbi “Kọwaa.”

Jiri Bookmarks na Screens mee ihe

Inwere ike laghachi azụ ọsịsọ ị họrọ ọdịnaya site n’iji bookmarks iji na-amata ụfọdụ ebe na screens. Iji bookmarks mee ihe nwere ike nye gị ohere ighewe isi dị iche iche na ọdịnaya ndị ọzọ oghe n’otu mgbe ahụ.

Hiwe Usoro eji eme ihe

Inwere ike tụpụta atụmatụ ọmụmụ ihe ga-enyere gị aka ịhụba ama ọganiihu ị na-eme na ọmụmụ akwụkwọ nsọ gị. Inwekwara ike ihiwe ihe ncheta iji nyere gị aka mejupụta mbunoobi ọmụmụ ihe gị. Ihiwe usoro nwere ike nyere gị aka gaaniihu ya na usoro Bịanụ, Soro M ma ọ bụ gụọ n’onwe gị Akwụkwọ nke Mọmọn.