Akwụkwọ nsọ
Echiche ndị Enwere ike Iji Mee Ọmụmụ akwụkwọ nsọ Nke Ezi na ụlọ Adị mma


“Echiche ndị Enwere ike Iji Mee Ọmụmụ akwụkwọ nsọ Nke Ezi na ụlọ Gị Adị mma,” Echiche Banyere Ọmụmụ akwụkwọ nsọ (2021)

“Echiche ndị Enwere ike Iji Mee Ọmụmụ akwụkwọ nsọ Nke Ezi na ụlọ Gị Adị mma,” Echiche banyere Ọmụmụ Akwụkwọ nsọ

Foto, oyiyi
Ezi na ụlọ ndị na-amụ akwụkwọ nsọ

Echiche ndị Enwere ike Iji Mee Ọmụmụ akwụkwọ nsọ Nke Ezi na ụlọ Gị Adị mma

Ezi na ụlọ ịmụ akwụkwọ nsọ mgbe niile bụ ụzọ siri ike iji nyere ezi na ụlọ gị aka mụọ ozi ọma. Ugboro ole na oge ole unu tinyere iji mụọ akwụkwọ nsọ dị ka ezi na ụlọ adịchaghị mkpa dị ka ịnọgidesi ike na mbọ unu siri dị mkpa. Mgbe unu na-eme ọmụmụ akwụkwọ nsọ a bụrụ akụkụ dị mkpa na ndụ ezi na ụlọ gị, ị ga-enyere ndị otu ezi na ụlọ gị aka ịbịakwute Jizọs Kraist nso ma wukwasị ama ha n’elu ntọala nke okwu Ya

Tulee ajụjụ ndịa na-esote:

  • Olee otu i nwere ike iji gbaa ndị otu ezi na ụlọ ume ịmụ akwụkwọ nsọ n’onwe ha?

  • Gịnị ka i nwere ike ime iji gbaa ndị otu ezi na ụlọ ume iji kọwaa ihe ha na-amụ?

  • Olee otu inwere ike iji mee ụkpụrụ ndị ị na-amụ n’akwụkwọ nsọ oge ndị a na-enwe nkuzi ụbọchị niile esie ike

Cheta na ebe obibi bụ ebe kacha mma maka ọmụmụ na nkuzi ozi ọma. Inwere ike mụọ ma kuzie ozi ọma na-ebe obibi n’ụzọ ndị na-ekweghị omume na klas Nzukọ nsọ. Nwee ekeereuche mgbe ị na-eche maka ụzọ ndị inwere ike iji nyere ezi na ụlọ gị aka ịmụ ihe site n’akwụkwọ nsọ niile. Tụlee ụfọdụ echiche ndị a na-esote iji kwalite ọmụmụ akwụkwọ nsọ ezi na ụlọ gị.

Jiri Egwu

Kwee ukwe niile ga-eme ụkpụrụ ndị a kuziri niime akwụkwọ nsọ niile esie ike.

Foto, oyiyi
ndikom na nwata nwanyị na-amụ akwụkwọ nsọ niile

Kọwaa Akwụkwọ nsọ niile Bara uru

Nye ndị otu ezi na ụlọ ohere iji kọwaa edereede ndị nke akwụkwọ nsọ ha chọpụtara bara uru n’oge ọmụmụ ihe nke onwe ha.

Were Okwu Nke Gị mee ihe.

Kpọkuo ndị otu ezi na ụlọ ka ha chịkọta ọnụ n’okwu nke ha ihe ha na-amụta site n’akwụkwọ nsọ unu na-amụ.

Tinye Akwụkwọ nsọ ahụ na Ndụ Ị na-ebi

Mgbe ị gụchara otu edereede akwụkwọ nsọ, gwa ndị otu ezi na ụlọ ka ha kọwaa ụzọ ndị edereede ahụ jiri gbasa ndụ ha.

Jụọ otu Ajụjụ

Kpọkuo ndị otu ezi na ụlọ ka a jụọ ajụjụ ozi ọma, ma wepụta oge chọọ maka amaokwu ndị nwere ike inye aka zaa ajụjụ ahụ.

Gosi otu Akwụkwọ nsọ

Họrọ otu amaokwu ị hụrụihe bara uru, ma debe ya ebe ndị otu ezi na ụlọ ga-ahụkarị ya. Kpọkuo ndị otu ezi na ụlọ ka ha bịa otu otu na-ahọrọ akwụkwọ nsọ a ga-egosi.

Depụta na ahịrị aha Akwụkwọ nsọ

Dị ka ezi na ụlọ, họrọ amaokwu dị iche iche nke ọ ga-amasị gị ịkparịta ụka na ya n’izu ụka na-abịa abịa.

Buru Akwụkwọ nsọ niile n’uche

Họrọ otu edereede akwụkwọ nsọ nke baara ezi na ụlọ gị uru, ma kpọkuo ndị otu ezi na ụlọ ka ha buru ya n’uche site na ị na-ekwugharị ya kwa ụbọchị ma ọ bụ na-eme ihe egwuregwu mbu nuuche.

Gosị Ọmụmụ ihe ndị Enwere ike imetụ aka

Chọta ihe ndị enwere ike imetụ aka gbasara isi na amaokwu ndị unu na-agụ dị ka otu ezi na ụlọ. Kpọkuo ndị otu ezi na ụlọ ka ha kwuo okwu banyere nke ọbụla ihe a na-ahụ anya gbasara nkuzi ndị dị niime akwụkwọ nsọ.

Foto, oyiyi
onye inyom na-akụziri nwata ihe

Họrọ otu Isiokwu

Kwe ka ndị otu ezi na ụlọ bịa otu otu họrọ otu isiokwu nke ga-amasị ezi na ụlọ ahụ ịmụkọta ọnụ. Were Ntụzi aka nke Isiokwu, na Ọkọwa okwu Baịbụl, ma ọ bụ Nduzi nye Akwụkwọ nsọ niile (scriptures.ChurchofJesusChrist.org) maka ịchọta edereede akwụkwọ nsọ niile gbasara isiokwu ahụ.

See Eserese

Gụọ amaokwu ole na ole dị ka ezi na ụlọ, ma nyezie ohere maka ndị otu ezi na ụlọ ise ihe nke gbasara ihe unu na-agụ. Wepụta ohere kparịta ụka na ihe onye ọbụla niime unu sere.

Werenụ Akụkọ a Mee ihe egwuregwu

Mgbe a gụchara otu akụkọ, kpọkuo ndị otu ezi na ụlọ ka ha were ya mee ihe egwuregwu. Emesịa nke a,kwuo otu egwuregwu ahụ jiri gbasa ihe niile unu na-enwe mmetụta na otu na otu dị ka otu ezi na ụlọ.

Okenye Devid A. Bednar kuziri na: “Ekpere ezi na ụlọ ọbụla, oge ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke ezi na ụlọ ọbụla, na nnọkọ mgbede n’ebe obibi ọbụla bụ ihe aka nka nọ n’elu kanvas nke mkpụrụ obi anyị. O nweghị otu ihe omume nwere ike iyi ka ihe magburu onwe ya ma ọ bụ kwesịrị ncheta. Kama dị ka otite agba ọbụla nke na-acha odo odo na nke na-acha ka ọla edo,na nke na-acha aja aja na-enyere ibe ha aka ma wepụta agba magburu onwe ya, otu ahụkwa ka anyị ịkwụsi ike n’ihe anyị na-eme nwere ike yie ihe nta nwere ike iduba na ndapụta ihe ndị nke ime mmụọ bara uru” (“Ị ka Rụsie ọrụ ike ma Ka Nwee mmetụta n’Ebe obibi,” Liahona, Nov. 2009, 19–20).