Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Mkpughe 19


NAJS, Mkpughe 19:15, 21 (tụlee ihe dị iche na Mkpughe 19:15, 21)

(Chineke na-eji okwu nke Kraịst na-emekpa mba nile arụ.)

15 Site kwa n’ọnụ ya ka okwu nke Chineke na-apụta, ya ka ọ ga-eji kwa mekpaa mba nile arụ; ọ ga-eji kwa okwu nke ọnụ ya chịa ha; ọ na-azọchakwa ihe mpita mmanya ahụ na ịdị egwu na ọnụma nke Chineke Pụrụ Ime Ihe nile.

21 Na ndị nke fọdụrụ ka e gburu jiri okwu nke onye ahụ nke nọkwasịrị n’elu ịnyịnya ahụ, bụ okwu nke na-esi n’ọnụ ya pụta; nnụnụ nile wee rijuo kwa afọ ha site na anụ arụ ha.