Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Matiu 7


NAJS, Matiu 7:1–2 (tụlee ihe dị iche na Matiu 7:1–2)

(E kpela-ikpe na-ezighị ezi.)

1 Ugbua ndịa bụ okwu nile nke Jisus kụziere ndị na-eso ụzọ ya na ha ga-ekwu nye ndị ahụ.

2 Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, ka a ghara ikpe unu ikpe; kama kpee nụ ikpe ziri-ezi.

NAJS, Matiu 7:9–11 (tụlee ihe dị iche na Matiu 7:6)

(Unu na ndị ụwa ekerịtala ihe omimi nile nke ala-eze.)

9 Gaa nụ n’ime ụwa, na-asị mmadụ nile, Chegharịa nụ, n’ihi na ala-eze nke elu-igwe abịawo unu nso.

10 Na ihe omimi nile nke ala-eze ka unu ga-edobe n’ime onwe unu nile; n’ihi na o kwesịghị ekwesị inye nkịta ihe ahụ nke dị nsọ, ma ọbụghị kwa ịtụdara ézì ọla pel unu, adịghị ama ama ka ha ghara ịzọkwasị ha n’okpuru ụkwụ ha.

11 N’ihi na ụwa enweghị ike ịnata nke ahụ bụ nke unu, onwe unu, na-enweghị ike ibuli; ya mere unu agaghị enye ha ọla pel unu nile, adịghị ama ama ha ga-atụgharị dọkaa kwa unu.