Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Luk 17


NAJS, Luk 17:21 (tụlee ihe dị iche na Luk 17:20–21)

(Ala-eze nke Chineke abịaworị.)

21 Ọbụghị na ha ga-asị hụrụ n’ebea! ma-ọbụ hụrụ n’ebe ahụ. N’ihi lee, ala-eze Chineke abịakwuteworị unu.

NAJS. Luk 17:36–40 (tụlee ihe dị iche na Luk 17:37)

(Jisus kọwara akụkọ ilu gbasara mkpokọta nke ndị ezi-omume.)

36 Ha wee zaa sị kwa ya, Onye-nwe, olee ebe, ka a ga akpọga ha?

37 O wee sị kwa ha, Ebe ọbụla e kpokọtara arụ ahụ, ma-ọbụ, n’okwu ndị ọzọ, n’ebe ọbụla ekpokọtara ndị-nsọ, n’ebe ahụ ka a ga-ekpokọta ugo nile n’otu; ma-ọbụ n’ebe ahụ ka a ga-ekpokọta ndị ahụ fọdụrụ n’otu.

38 Nke a ka o kwuru, ịbụ ihe iriba-ama nke mkpokọta nke ndị-nsọ ya; na nke ndị mụọ-ozi na-arịdata na-ekpokọtakwa ndị fọdụrụ nye ha; otu onye site n’àkwà, onye nke ọzọ site n’ebe ịkwọ ihe, onye nke ọzọ kwa site n’ubi, site n’ebe ọbụla ọ chọrọ.

39 N’ihi n’ezie elu-igwe ọhụrụ nile ga-adị, na ụwa ọhụrụ, nke ezi-omume bi n’ime ya.

40 Ihe na-adịghị ọcha a gaghị adị kwa, n’ihi na ụwa na-adịwa okenye, ọbụna dịka uwe, ebe na ọ mụbawo n’ire ure, ya mere o na-apụ n’anya, ma ihe mgbakwasa ụkwụ ahụ na-anọgide ebe e doro ya nsọ, a sachara site na mmehie nile.