Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Luk 16


NAJS, Luk 16:16–23 (tụlee ihe dị iche na Luk 16:16–18)

(Jisus nyere ọnọdụ-okwu maka akụkọ-ilu nke onye ogaranya na Lazarọs.)

16 Na ha wee sị ya, Anyị nwere iwu, na ndị amụma; kama maka nwoke a anyị agaghị anara ya ịbụ onye-ọchịchị anyị; n’ihi na ọ na-eme onwe ya ịbụ onye-ikpe n’elu anyị.

17 Mgbe ahụ Jisus wee sị ha, Iwu ahụ na ndị amụma na-agba ama maka m; e, na ndị amụma nile ndị deworo, ọbụna ruo na Jọn, ebuwo-ụzọ kwuo maka ụbọchị ndịa.

18 Site n’oge ahụ, ala-eze Chineke ka a na-ekwusa, onye ọbula nke na-achọ ezi-okwu na-enusike iba n’ime ya.

19 Na ọ dị mfe maka elu-igwe na ụwa ịgabiga, karịa na otu ihe dịkasịrị nta n’iwu ahụ ga-ada.

20 Gịnị mekwara unu na-akụzi iwu ahụ, na na-agọnarị nke ahụ e deworo; makwa ya ikpe bụ onye nke Nna ahụ zitere imezu iwu ahụ, ka e wee gbapụta unu?

21 O ndị-nzuzu! n’ihi na unu asịwo n’ime obi unu nile, Ọ dịghị Chineke dị. Unu na-agbanwe kwa ezi ụzọ; ma ala-eze nke elu-igwe na-ahụ ihe ike site n’aka unu; unu na-esogbu kwa ndị dị nwayọ; na n’ime ihe ike unu, unu na-achọ ibibi ala-eze ahụ; na unu na-akpụrụ ụmụ nke ala-eze n’ike. Ahụhụ na-adịrị unu, unu ndị na-akwa iko!

22 Na ha kwara ya emu ọzọ, ebe ha na-ewe iwe n’ihi ikwu okwu ahụ, na ha bụ ndị na-akwa iko.

23 Kama ọ gara n’iru, na-asị, Onye ọbụla na-achụpụ nwunye ya, lụrụ kwa nwanyị ọzọ, na-akwa iko; na onye ọbụla lụrụ kwa onye nke a chụpụrụ site na di ya, na-akwa iko. N’ezie a sị m unu, aga m atụnyere unu onye ọgaranya ahụ.