Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Jenesis 19


NAJS, Jenesis 19:9–15 (tụlee ihe dị iche na Jenesis 19:5–10)

(Lọt guzogidere ajọọ omume nke Sodọm.)

9 Ha wee sị kwa ya, Guzopụ n’ụzọ. Ha wesokwara ya iwe.

10 Ha wee sị kwa n’etiti onwe ha, Otu nwoke a bịara ịbụ ọbịa n’etiti anyị, na ugbua ọ chọwo ime onwe ya ịbụ onye-ikpe; ugbua anyị ga-eme ya ihe ọjọọ karịa ihe anyị ga-eme ha.

11 Ya mere, ha sịrị nwoke ahụ Anyị ga-ewere ndịkom ahụ na ụmụ gị ndịnyom kwa; na anyị ga-eji ha mee dịka ọ dị anyị mma.

12 Ugbua ihe a bụ gbasara ajọọ omume nke Sodọm.

13 Ma Lọt wee sị, Lee ugbua, enwere m ụmụ ndịnyom abụọ nke na-amabeghị nwoke; a na m arịo unu ka unu kwe ka m rịọ ụmụnne m ka m ghara ịkpọpụta ha nye unu; na ka unu ghara imeso ha dịka ọdị mma n’anya unu nile;

14 N’ihi na Chineke agaghị eme ka nwa odibo ya zie ezi n’ihe nke a; ya mere kwee nụ ka m rịọ ụmụnne m, otu ugboro nke a nanị, ka unu ghara ime ndịkom ndị a ihe ọbụla, ka ha nwee ike nweta udo n’ime ụlọ m; n’ihi nke a ka ha bịara n’okpuru ndọ nke ụlọ m.

15 Na ha wee weso Lọt iwe wee bịakwa nso itiwa ibo-ụzọ ahụ, kama ndị mụọ-ozi nke Chineke, ndị bụ ndịkom dị nsọ, setịpụrụ aka ha dọbata kwa Lọt n’ime ụlọ nye onwe ha, wee mechie kwa ụzọ.