Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Jenesis 14


NAJS, Jenesis 14:25–40 (tụlee ihe dị iche na Jenesis 14)

(Nnukwu nkwusa ozi-ọma nke Melkizedek ka a kpọtụrụ ọnụ; ike nile na ngọzi nile nke Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek ka a kọwara nke ọma.)

25 Melkizedek weli kwara olu ya elu gọzie kwa Abram.

26 Ugbua Melkizedek bụ nwoke nke okwukwe, onye rụrụ ọrụ ezi-omume; mgbe ọ bụkwaara nwanta ọ tụrụ egwu Chineke, kwụsị kwa ọnụ nile nke ọdụm, menyụọ kwa mbibi nke ọkụ.

27 Na site otua, ebe o nwetara nkwado nke Chineke, e chiri ya echichi onye isi nchụ-aja dịka usoro nke ọgbụgba-ndụ ahụ nke Chineke na Inọk mere.

28 Ya bụ dịka usoro nke Ọkpara nke Chineke nke usoro ya bịara, ọbụghị site na mmadụ ma-ọbụghị site n’uche nke mmadụ, ọbụghị kwa site na nna ma-ọbụ nne; ọbụghị kwa site na mmalite nke ụbọchị nile ma-ọbụ ọgwụgwụ nke afọ nile, kama ọbụ site n’aka Chineke;

29 Enyerekwara ya n’aka ndị mmadụ site na ịkpọ-oku nke olu ya, dịka uche nke ya onwe ya siri dị, nye ka ha ra bụ ndị kwere n’aha ya.

30 N’ihi na ebe Chineke na-an̄ụwo iyi nye Inọk na nye mkpụrụ ya jiri onwe ya n̄ụọ iyi na onye ọbụla nke e chiri echichi dịka n’usoro na ịkpọ-oku nke a ga-enwe ike site n’okwukwe igburi ugwu nile, ikewa oke osimiri nile, ịmịkọ mmiri nile, ịtụgharị ha pụọ site n’ụzọ njem ha;

31 Idobe na nguzogide ìgwè ndị agha nile nke mba dum, ikewa ụwa, ịdọbi ụdọ ọbụla, iguzo n’iru nke Chineke; ime ihe nile dịka uche ya siri dị, dịka inye iwu ya siri dị, merie ala ọkpara-eze nile na ike nile; na nke a site n’uche nke Ọkpara Chineke onye dị site tutu ntọ-ala nke ụwa.

32 Na ndị mmadụ bụ ndị nwere okwukwe nke a, ndị rịgotere n’usoro nke a nke Chineke, e nwogharịrị ha welie kwa ha baa n’elu-igwe.

33 Na ugbua, Melkizedek bụ onye nchụ-aja nke usoro nke a, ya mere, o nwetara udo na Salem, e wee kpọọ kwa ya Ọkpara-eze nke udo.

34 Na ndị ya rụrụ ọrụ ezi-omume, nweta kwa elu-igwe, wee chọọ kwa nnukwu obodo nke Inọk nke Chineke na-ewereworị na mbụ, o kewapụrụ ya site n’ụwa, o chekwara ya nye kwa ụbọchị ndị ikpeazụ, ma-ọbụ ọgwụgwụ nke ụwa;

35 Ọ kwuwokwa, n̄ụwo kwa iyi jiri ịn̄ụ-iyi, na elu-igwe nile na ụwa ga-abịakọta ọnụ; na ụmụ ndịkom nke Chineke ka a ga-anwale otua site na-iji ọkụ.

36 Na Melkizedek nke a, mgbe o siworo otua hiwesịa ezi-omume, ndị ya wee kpọ ya eze nke elu-igwe, ma-ọbụ n’okwu ndị ọzọ, Eze nke udo.

37 O wee welie kwa olu ya elu, o wee gọzie kwa Abram, n’ihi na ọ bụ onye isi nchụ-aja na onye na-edobe ụlọ-akụ nke Chineke;

38 Ya onwe ya onye Chineke nyeworo ọkwa ịnata otu ụzọ n’ụzọ iri maka ndị ogbenye.

39 Ya mere, Abram wee kwụọ ya otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe nile o nwere, nke akụ na ụba nile nke o nwere, nke Chineke nyeworo ya karịa nke o nwere mkpa maka ha.

40 Na o wee ruo, na Chineke gọziri Abram, wee nye kwa ya akụ na ụba, na ùgwù, na ala nile maka inwe ha ruo mgbe nile na-adịgide, dịka ọgbụgba-ndụ ahụ nke o meworo, na dịka ngọzi ahụ nke Melkizedek jiworo gọzie ya.