Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Ọpụpụ 34


NAJS, Ọpụpụ 34:1–2, 14 (tụlee ihe dị iche na Ọpụpụ 34:1–2, 14; Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 84:21–26)

(Ndozi mbadamba nkume nke abụọ e nyere Moses nwere iwu dịtụ obere karịa ndozi nke mbụ.)

1 Onye-nwe wee sị kwa Moses, waara onwe gị mbadamba nkume abụọ ọzọ dịka nke mbụ, na aga m ede kwa n’elu ha, okwu nile nke iwu ahụ, dịka otu e dere ha na mbụ n’elu mbadamba nile ahụ nke ị kụwara, kama ọ gaghị abụ n’ụdị nke mbụ, n’ihi na aga m ewepu ọkwa nchụ-aja site n’etiti ha; ya mere usoro m dị nsọ na emume-nsọ dị na ya a gaghị aga n’iru ha, n’ihi na iru m agaghị arigo na njem n’etiti ha, adịghị ama ama mụ ebibie ha.

2 Kama aga m enye ha iwu ahụ dịka na mbụ, kama ọ ga-abụ dịka iwu-nsọ nke anụ arụ; n’ihi na an̄ụwo m iyi n’oke iwe m na ha agaghị abata n’iru m, n’ime ezumike m, n’ụbọchị nile nke njem ha dị nsọ. Ya mere mee dịka m nyeworo gị n’iwu, nọkwara na njikere n’ụtụtụ, rịgota kwa n’ugwu ukwu Saịnaị n’ụtụtụ, guzokwara m onwe gị ebe ahụ n’elu ugwu ahụ.

(Jehova bụ otu aha nke ndị mmadụ Testament Ochie ji mara Onye-nwe Jisus Kraịst.)

14 N’ihi na ị gaghị efe chi ọzọ ofufe; n’ihi na Onye-nwe, onye aha ya bụ Jehova, bụ Chineke ekworo.